Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nchegbu—Ihe Ndị Na-akpata Ya na Mmetụta Ndị Ọ Na-enwe

Nchegbu—Ihe Ndị Na-akpata Ya na Mmetụta Ndị Ọ Na-enwe

Nchegbu—Ihe Ndị Na-akpata Ya na Mmetụta Ndị Ọ Na-enwe

GỊNỊ bụ nchegbu? A pụrụ ịkọwa ya dị ka ahụ́ ma ọ bụ obi erughị mmadụ ala n’ihi ọnọdụ ụfọdụ ọ nọ na ya. Nke a ọ̀ pụtara na nchegbu dị njọ mgbe nile? Ee e. Dị ka dọkịta bụ́ Melissa C. Stöppler si kwuo, “inwe nchegbu na ahụ́ erughị ala ruo n’ókè dị mma pụrụ ịba uru mgbe ụfọdụ. Anyị inwetụ nchegbu mgbe anyị na-arụ ọrụ ma ọ bụ na-eme ihe omume na-emekarị ka anyị rụta ọrụ ahụ ma jiri ike anyị nile rụọ ya.”

Ya mere, olee mgbe nchegbu bụ nsogbu? Stöppler kwuru, sị: “Ọ bụ nanị mgbe mmadụ malitere ichegbubiga onwe ya ókè, ma ọ bụ mgbe ọ na-achịkwaghị ya nke ọma, ka a na-ahụ mmetụta ọjọọ ya.” Tụlee ihe ụfọdụ na-akpatakarị nchegbu.

Nchegbu nke Ịkpata Ihe E Ji Ebi Ndụ

Eze Solomọn kwuru, sị: “Ọ dịghị ezi ihe dị n’ime mmadụ [karịa ịdị] na-eri ihe na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ, na-emekwa ka mkpụrụ obi ya hụ ezi ihe n’ime ndọgbu nke ọ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ.” (Eklisiastis 2:24) N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ ndị na-enwe oké nrụgide n’ebe ha na-arụ ọrụ.

Otu akụkọ e si n’aka Ụlọ Ọrụ Europe nke Na-ahụ Maka Nchebe na Ahụ́ Ike n’Ebe Ọrụ nweta kwuru na ndị ọrụ na-enwekarị nchegbu n’ọrụ ha n’ihi na ha na ndị were ha n’ọrụ adịghị enwe ezi nkwurịta okwu. Ihe ndị ọzọ na-eme ka ha na-enwekarị nchegbu n’ọrụ ha bụ na ndị ọga ha adịchaghị ekwe ka ha tinye ọnụ ná mkpebi ndị metụtara ha nakwa n’ihi na ha na ndị ọrụ ibe ha na-ese okwu. Ihe ndị ọzọkwa na-akpata ya bụ mmadụ ejighị ọrụ ya n’aka ma ọ bụ ọrụ ya ịbụ nke a na-akwụ obere ego na ya. Ihe ọ sọkwara ya bụrụ ya na-akpata ya, nsogbu a na-enwe n’ebe ọrụ pụrụ ime ka nne ma ọ bụ nna na-arụ ọrụ gharazie inwe ume ọ ga-eji lebara mkpa ezinụlọ ya anya. Mkpa ndị ahụ pụkwara ịkarị akarị. Dị ka ihe atụ, n’ime otu afọ na United States, ihe dị ka nde mmadụ iri ise lekọtara onye òtù ezinụlọ ha na-arịa ọrịa ma ọ bụ nke merela agadi. Nsogbu ego pụkwara ịbụ nnọọ ihe na-akpata nchegbu n’ime ezinụlọ. Rita, bụ́ nwanyị ji ụmụ abụọ, nwere nsogbu ego mgbe di ya, bụ́ Leandro, nwere ihe mberede ụgbọala, nke mere ka o jirizie oche nkwagharị na-aga. Rita kwetara, sị: “Nsogbu ego na-eme ka obi ghara iru mmadụ ala. Mgbe ị na-enweghị ego ị ga-eji gboo mkpa nile e nwere n’ụlọ, ọ na-emetụta otú obi na-adị gị.”

Nrụgide Ndị Nne Ma Ọ Bụ Nna Nanị Ha Na-azụ Ụmụ Na-enwe

Ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ ụmụ na-enwekwa oké nchegbu ka ha na-agbalị igbo mkpa ezinụlọ ha. Ihe ndị pụrụ ime ka ike gwụ nne ma ọ bụ nna nanị ya na-azụ ụmụ, meekwa ka ọ daa mbà n’obi bụ ibili n’isi ụtụtụ iji sie nri, ịkwado ụmụaka na ịkpọga ha ụlọ akwụkwọ, ịgbaga ọrụ n’oge, na ịmalitezi ịrụ ọrụ ndị dịịrị ya n’ụlọ ọrụ ha. Mgbe onye bụ́ nne mechikwara ọrụ, ihe ndị ọzọ na-akpata nchegbu na-esochi. Ọ ga-eji ọsọ gaa kpọlata ụmụ ya n’ụlọ akwụkwọ, ọ ga-esi nri abalị ma rụọ ọrụ ndị dị n’ụlọ. María, bụ́ nwanyị na-enweghị di nke na-azụ ụmụ agbọghọ anọ, kwuru, sị: “Nchegbu m na-enwe na-akarị m akarị n’ahụ́ nke na ọ na-adị m ka m ga-agbabi abụọ.”

Ụmụaka Ndị Na-enwe Nchegbu

Ronald L. Pitzer bụ́ ọkà ná mmekọrịta mmadụ na ibe ya kwuru, sị: “Ọtụtụ ndị na-eto eto na-enwe oké nchegbu.” Ha na-anagide mgbanwe ahụ́ ha na uche ha na-agbanwe n’oge ha na-eto eto. Ha na-enwekwa nrụgide n’ụlọ akwụkwọ. Dị ka akwụkwọ bụ́ Childstress! si kwuo, n’ụlọ akwụkwọ, ụmụ akwụkwọ “na-enwekarị nsogbu na nrụgide ndị pụrụ ịkpata nchegbu—n’ihe ọmụmụ ha, n’egwuregwu, ná mmekọrịta ha na ndị ọgbọ ha na nke ha na ndị nkụzi.”

N’ebe ụfọdụ, egwu a na-atụ n’ihi ihe ike a na-eme n’ụlọ akwụkwọ so akpata nchegbu—e kwuwebedịghị banyere ụjọ ọtụtụ ndị ntorobịa na-atụ ugbu a n’ihi mwakpo nke ndị na-eyi ọha egwu na ọdachi ndị ọzọ. Otu nwanyị dị afọ iri na ụma dere, sị, “Ọ bụrụ na ndị nne na nna na-ekwukarị banyere otú ụwa si dị egwu ugbu a, ọ ga-eme ka ụjọ tụwa anyị.”

Ndị nne na nna kwesịrị ịbụ isi iyi nke ike nye ụmụ ha. Ma, Pitzer kwuru, sị: “Ọtụtụ n’ime oge ụmụaka na-akọrọ ndị mụrụ ha ihe na-enye ha nsogbu n’obi, ndị mụrụ ha na-ewere nsogbu ha dị ka ihe na-enweghị ihe ọ bụ. Mgbe mgbe, ha anaghị eji ọnọdụ ụmụ ha akpọrọ ihe ma ọ bụ mee ihe ọ bụla banyere ya. Mgbe ụfọdụ, ha anaghịdị enye ụmụ ha ohere ịkọrọ ha nsogbu ha.” Ihe mere ndị nne na nna na-ejighị enyere ụmụ ha aka mgbe ụfọdụ bụ n’ihi na nne na nna ahụ na-ese okwu. “O yiri ka nne m na nna m hà na-alụ ọgụ mgbe nile,” ka Tito dị afọ iri na otu, bụ́ onye nne ya na nna ya mesịrị gbaa alụkwaghịm kwuru. Dị ka akwụkwọ bụ́ Childstress! si kwuo, “ọ bụghị nanị ịlụ ọgụ na ịba mba na-eme ka obi ghara iru ụmụaka ala. Iwe e bu n’obi, ọbụna mgbe e ji okwu ịhụnanya zochie ya, na-eme ka ahụ́ ghara iru ụmụaka ala.”

Ihe Nchegbu Na-efu

Ma ị̀ bụ nwata ma ị̀ bụ agadi, ọ sọ ya ya bụrụ ọrụ ma ọ bụ ụlọ akwụkwọ na-akpatara gị nchegbu, oké nchegbu pụrụ ịkpatara gị ọrịa. Otu onye na-ede banyere ahụ́ ike kọwara, sị: “A pụrụ iji ihe na-eme n’ahụ́ mmadụ mgbe ọ na-enwe nchegbu tụnyere ihe na-eme n’ụgbọelu mgbe ọ na-achọ ifeli efeli.” Mgbe ị na-enwe nchegbu, obi gị na-amalite ịkụsi ike, ọbara gị na-agbalikwa elu. Shuga dị n’ọbara gị na-amụba. Mmiri ọgwụ ahụ́ na-abanye n’ọbara gị. “Ọ bụrụ na mmadụ anọgide na-enwe nchegbu,” ka onye edemede ahụ gara n’ihu ikwu, “akụkụ ahụ́ nile nchegbu na-emetụta (ụbụrụ, obi, akpa ume, akwara, na uru ahụ́) na-abụ ndị a kpaliri ịrụbiga ọrụ ókè ma ọ bụ ịghara ịrụru ọrụ otú kwesịrịnụ. Ka oge na-aga, nke a pụrụ ịkpatara onye ahụ ọrịa ma ọ bụ uche mkpasasị.” Ọrịa ndị nchegbu pụrụ iso kpata karịrị akarị: ọrịa obi, ọrịa strok, nsogbu nke ahụ́ enweghị ike ịlụso ọrịa ọgụ, ọrịa cancer, ọrịa ndị na-emetụta uru ahụ́ na ọkpụkpụ, na ọrịa shuga, ndị a bụ nanị ole na ole n’ime ha.

Ihe na-enye nsogbu n’obi karịsịa bụ ụzọ ọjọọ ọtụtụ ndị—nke ka nke ndị na-eto eto—si anwa ịchịkwa nchegbu ha. Dr. Bettie B. Youngs kwara arịrị, sị: “Ọ bụ ihe na-egbu mmụọ ịchọpụta na ka ndị dị afọ iri na ụma na-achọ izere ịta ahụhụ, ha na-amalite ịṅụ ọgwụ ike na ịṅụbiga mmanya ókè, ịtụ ụjọ akwụkwọ, ime isi ike, inwe mmekọahụ aghara aghara, ime ihe ike, na ịgbapụ n’ụlọ—ihe ndị na-eduba ha ná nsogbu ndị karịrị nnọọ ndị nke ha na-anwa izere.”

Nchegbu bụ ihe ya na ndụ nke oge a so aga; a pụghị ịgbata ya n’ọsọ. Ma dị ka isiokwu na-esonụ ga-egosi, e nwere ọtụtụ ihe anyị pụrụ ime iji chịkwaa ya!

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]

“Nchegbu m na-enwe na-akarị m akarị n’ahụ́ nke na ọ na-adị m ka m ga-agbabi abụọ”

[Foto dị na peeji nke 5]

Ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ ụmụ na-enwekarị nrụgide ná ndụ

[Foto dị na peeji nke 6]

Ụlọ akwụkwọ na-emekarị ka ndị ntorobịa na-enwe nrụgide karịrị akarị