Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọrụ Dị Ùgwù Nne Na-arụ

Ọrụ Dị Ùgwù Nne Na-arụ

Ọrụ Dị Ùgwù Nne Na-arụ

ỌTỤTỤ mgbe, a dịghị eji ọrụ ilekọta ụlọ nke nne na-arụ akpọrọ ihe, a na-eledadị ya anya. Iri afọ ole na ole gara aga, ụfọdụ mmadụ malitere ileda ọrụ ilekọta ụmụ anya. Echiche ha bụ na ọ dịrughị mkpa ka ịrụ ọrụ ego, ha lekwara ya anya ọbụna dị ka mmegbu. Ọ bụ ezie na ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ ga-ewere echiche dị otú ahụ dị ka nke na-ezighị ezi, a na-emekarị ka ndị nne na-eche na ịnọ na-elekọta ụmụaka ma na-edozi ụlọ bụ ọrụ ụmụaka. Ụfọdụ na-echedị na ụmụ nwanyị kwesịrị ịdị na-aga ọrụ ka e wee nwee ike ịhụ ihe ha ga-emeli.

N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ ndị bụ́ di na ụmụaka ejighị ọrụ nne na-arụ n’ụlọ egwuri egwu. Carlo, bụ́ onye na-eje ozi n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Philippines, kwuru, sị: “Ihe mere m ji nọrọ ebe a taa bụ n’ihi ọzụzụ nne m nyere m. Nna m na-enyekarị mmadụ ntaramahụhụ, ọ naghịkwa egbu oge n’inye ya. Ma, mama anyị nyeere anyị aka site n’ịkọwara anyị ihe nke ọma na iso anyị kwurịta ha. Ụzọ o si kụziere anyị ihe masịrị m nnọọ.”

Peter, bụ́ onye nọ na South Africa, bụ otu n’ime ụmụaka isii nne ha na-agụghị oké akwụkwọ. Nna ha hapụrụ ha. Peter chetara, sị: “Ego mama m na-akpata ebutụghị ibu n’ihi na ihe ọ na-arụ bụ ihichasịrị ndị mmadụ ụlọ na ọfịs. O siiri ya ike ịkwụrụ anyị nile ụgwọ akwụkwọ. Ọtụtụ mgbe, anyị na-anọ agụụ alakpu ụra. O siiri ya nnọọ ike ịkwụ ụgwọ ụlọ anyị bi. N’agbanyeghị ihe isi ike a nile, mama m adaghị mbà. Ọ gwara anyị ka ọ ghara ịdị mgbe anyị ga-eji onwe anyị tụnyere ndị ọzọ. A sị na ọ bụghị mbọ nile ọ gbara, anyị agatụghị enwe ihe ịga nke ọma ná ndụ otú anyị si nwee ya.”

Otu nwoke nọ na Nigeria, bụ́ Ahmed, kwuru otú aka nwunye ya nyere n’ịzụlite ụmụ ha dị ya n’obi, sị: “Ejighị m ọrụ nwunye m na-arụ egwuri egwu. Mgbe m na-anọghị n’ụlọ, obi na-esi m ike na a na-elekọta ụmụ m nke ọma. Kama ilewe nwunye m anya dị ka onye na-ama m aka, ana m ekele ya ma na-eme ka ụmụ anyị mara na ha aghaghị ịkwanyere ya ùgwù otú ha si akwanyere m.”

Otu nwoke Palestaịn na-aja nwunye ya mma mgbe nile n’ihi ihe ọma ndị ọ rụrụ dị ka nne. O kwuru, sị: “Lina rụrụ ọrụ dị egwu n’ebe nwa anyị nwanyị nọ. O kekwaara òkè dị ukwuu n’ịhụ na ezinụlọ anyị ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe. Ka m si hụ ya, ihe mere o ji nwee ike ime ihe ndị a bụ n’ihi okpukpe ya.” Lina bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova, ọ na-agbasokwa ụkpụrụ Bible n’ịkụziri nwa ya nwanyị ihe.

Olee ụfọdụ n’ime ụkpụrụ ndị ọ na-agbaso? Gịnị ka a pụrụ ikwu banyere ụzọ Bible si ele ndị nne anya? Olee otú e si kwanyere ndị nne nke oge gboo ùgwù dị ka ndị na-akụziri ụmụ ha ihe?

Ile Ndị Nne Anya n’Ụzọ Kwesịrị Ekwesị

Mgbe e kere mmadụ, e nyere nwanyị ọrụ dị ùgwù n’ime ezinụlọ. Akwụkwọ mbụ nke Bible kwuru, sị: “Jehova, bụ́ Chineke, wee sị, Ọ dịghị mma ka mmadụ ahụ nọrọ nanị ya; M ga-emere ya onye inyeaka kwesịrị ya.” (Jenesis 2:18) Nwanyị mbụ, bụ́ Iv, si otú a bụrụ onye e kere ịbụrụ Adam onye inyeaka, ma ọ bụ onye ibe. E kere ya nnọọ otú ọ ga-abụ onye inyeaka kwesịrị ya. Ọ gaje iso mezuo nzube Chineke bụ́ ka ha mụọ ụmụ, lekọta ha, lekọtakwa ụwa na ụmụ anụmanụ ndị dị na ya. Ọ ga-akpali di ya ịrụ ọrụ ma nye ya nkwado dị ka ezigbo onye ọrụ ibe ya. Lee ka obi si dị Adam ụtọ inweta ọmarịcha onyinye a sitere n’aka Onye Okike!—Jenesis 1:26-28; 2:23.

Mgbe e mesịrị, Chineke setịpụrụ ụkpụrụ nduzi banyere otú a ga-esi na-emeso ụmụ nwanyị ihe. Dị ka ihe atụ, e kwesịrị ịsọpụrụ ndị nne nọ n’Izrel, ọ bụghị ịkparị ha. Ọ bụrụ na nwatakịrị ‘akọchaa nna ya ma ọ bụ nne ya,’ a na-egbu ya. A gbara ndị ntorobịa bụ́ Ndị Kraịst ume ‘irubere ndị mụrụ ha isi.’—Levitikọs 19:3; 20:9; Ndị Efesọs 6:1; Deuterọnọmi 5:16; 27:16; Ilu 30:17.

Ná nduzi nke di ya, nne gaje ịkụziri ụmụ ha, ma ndị nke nwoke ma ndị nke nwanyị, ihe. E nyere nwatakịrị nwoke iwu ka ọ ghara ‘ịhapụ iwu nne ya.’ (Ilu 6:20) Ọzọkwa, Ilu isi 31 kwuru banyere “ibu e boro [Eze Lemuel] nke nne ya ji dọọ ya aka ná ntị.” O ji amamihe nye nwa ya nwoke ntụziaka ka o zere ịṅụbiga mmanya ókè, na-asị: “Ka ndị eze ghara ịṅụ mmanya vaịn; ka ndị isi gharakwa ịsị, Ole ebe ka ihe ọṅụṅụ nke na-aba n’anya dị? Ka ha wee ghara ịṅụ, wee chezọọ ụkpụrụ a tọrọ, wee gbanwee ikpe nke ndị nile e wedara n’ala.”—Ilu 31:1, 4, 5.

Ọzọkwa, nwa okorobịa ọ bụla na-achọ ịlụ nwanyị kwesịrị ịtụle otú nne Eze Lemuel si kọwaa “nwanyị nke na-ejide onwe ya nke ọma.” O kwuru, sị: “Ọnụ ahịa ya karịrị ruby nke ukwuu.” E mesịa, mgbe ọ kọwachara ọrụ dị mkpa nwanyị dị otú ahụ na-arụ n’ụlọ, nne eze ahụ kwuru, sị: “Amara bụ ụgha, ịma mma bụkwa ihe efu: ma nwanyị nke na-atụ egwu Jehova, nwanyị ahụ ga-enwe otuto.” (Ilu 31:10-31) N’ụzọ doro anya, Onye Okike anyị kere ụmụ nwanyị ka ha nwee ọnọdụ dị ùgwù na nke inye ọzụzụ n’ime ezinụlọ.

N’ọgbakọ Ndị Kraịst, a na-asọpụrụkwa ndị nwunye na ndị nne ma jiri ha na-akpọrọ ihe. Ndị Efesọs 5:25 na-asị: “Ndị bụ́ di, nọgidenụ na-ahụ nwunye unu n’anya.” Nne nwa okorobịa ahụ bụ́ Timoti na nne ya ochie zụlitere ya iji “ihe odide ndị ahụ dị nsọ” kpọrọ ihe. E nyere ya ndụmọdụ a sitere n’ike mmụọ nsọ, sị: “Na-arịọ . . . ụmụ nwanyị meworo okenye [arịrịọ] dị ka ndị nne.” (2 Timoti 3:15; 1 Timoti 5:1, 2) N’ihi ya, nwoke kwesịrị ịkwanyere nwanyị meworo okenye ùgwù dị ka à ga-asị na ọ bụ nne ya. N’eziokwu, Chineke ji ụmụ nwanyị kpọrọ ihe ma nye ha ọnọdụ dị ùgwù.

Na-egosipụta Ekele Gị

Otu nwoke a zụlitere n’obodo a na-ele ụmụ nwanyị anya dị ka ndị dị ala, kọrọ, sị: “Ọzụzụ e nyere m bụ banyere ụmụ nwoke, ahụkwara m ka e si emegbu ụmụ nwanyị ma ghara ịkwanyere ha ùgwù. N’ihi ya, ọ bụworo m ọgụ na mgba ile ụmụ nwanyị anya otú Onye Okike si ele ha—ile ha anya dị ka ndị inyeaka n’ụlọ nakwa dị ka ndị ha na nwoke ga-agbakọ aka zụlite ụmụ ha. Ọ bụ ezie na ọ na-esiri m ike ịja nwunye m mma, amaara m na àgwà ọma ụmụ m na-akpa bụ n’ihi ọrụ nwunye m rụrụ.”

N’ezie, ndị nne, bụ́ ndị na-arụ ọrụ dịịrị ha dị ka ndị na-enye ọzụzụ, pụrụ iji ọrụ ha rụrụ nyaa isi. Ọ bụ ọrụ kwesịrị ekwesị. Ha kwesịrị ka a jaa ha mma ma jiri obi ọcha too ha. Ihe anyị na-amụta n’aka ndị nne karịrị akarị—omume ndị na-abara anyị uru ná ndụ, àgwà ọma ndị na-eme ka anyị na ndị ọzọ na-enwe ezi mmekọrịta, nakwa ọtụtụ mgbe, ọzụzụ metụtara omume ọma na ihe ime mmụọ bụ́ nke na-eme ka ọtụtụ ndị ntorobịa na-ebi ndụ dị mma. Ì kelewo nne gị na nso nso a maka ihe ndị o mewooro gị?

[Foto dị na peeji nke 9]

Nne Peter kụziiri ya ka ọ ghara ịda mbà

[Foto dị na peeji nke 10]

Ahmed na-enwe ekele dị ukwuu n’aka nwunye ya na-enyere ya n’ịzụlite ụmụ ha

[Foto dị na peeji nke 10]

Di Lina na-ekwu na ihe mere nwa ha nwanyị ji akpa àgwà ọma bụ n’ihi okpukpe nwunye ya