“A Sịkwa Nnọọ na Ndị Mmadụ Maara nke A!”
“A Sịkwa Nnọọ na Ndị Mmadụ Maara nke A!”
MGBE David gụsịrị akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị, bụ́ mgbe obi ọtụtụ ndị ntorobịa na-adị n’ịchụso ihe onwunwe, obi David dị n’ihe ọzọ. Na September 2003, ya na otu enyi ya si Illinois, nke dị na United States, kwaga Dominican Republic. * Davey, bụ́ aha ndị enyi na ndị ezinụlọ ya na-akpọ ya, malitere ịmụ asụsụ Spanish ma sonyere ọgbakọ Ndịàmà Jehova nke aha ya bụ Ọgbakọ Navas n’ọrụ nkụzi Bible ha. Ndị ọgbakọ ahụ nabatara ya. “Davey rụrụ ọrụ ọ bụla e nyere ya,” ka Juan, bụ́ nanị okenye e nwere n’ọgbakọ ahụ, na-ekwu. “Ọ na-ewepụta onwe ya mgbe nile ijere ndị ọzọ ozi, ụmụnna hụkwara ya n’anya.”
Davey nwere mmasị n’ozi ya. “Obi dị m nnọọ ụtọ ebe a,” ka o degaara otu enyi ya nọ na United States n’akwụkwọ. “Ozi ọma na-enye m nnọọ ume ọhụrụ! Anyị na-anọru ihe dị ka minit 20 n’ụlọ ọ bụla, n’ihi na ndị mmadụ chọrọ ịnụ ihe nile anyị chọrọ ịgwa ha. Ka ọ dị ugbu a, amalitewo m iduziri mmadụ isii ọmụmụ Bible, ma anyị ka chọkwara enyemaka. N’otu nzukọ ọgbakọ anyị nwere, mmadụ 103 bịara, ma ndị nkwusa Alaeze nọ n’ọgbakọ anyị dị 30!”
N’ụzọ dị mwute, n’April 24, 2004, Davey na otu nwa okorobịa ọzọ nọ n’ọgbakọ ahụ nwụrụ n’ihe ọghọm. Davey nọgidere jiri ịnụ ọkụ n’obi na-eje ozi ya ruo ọnwụ ya, ọ gbakwara ndị ntorobịa ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ o si bịa ume isonyere ya. “Ọ ga-eme ka otú i si ele ihe anya gbanwee,” ka ọ gwara otu Onyeàmà na-eto eto.
Otu mgbanwe Davey n’onwe ya mere n’ụzọ o si ele ihe anya bụ n’ebe ihe onwunwe dị. “N’otu oge ọ lọtara ụlọ,” ka papa ya na-echeta, “a kpọrọ Davey ka o soro gaa njem maka egwuregwu a na-eme na snow. Ọ jụrụ ego ole ọ ga-ewe. Mgbe a gwara ya, Davey kwuru na ya agatụghị emefu ego ha otú ahụ nanị n’egwuregwu, ebe ọ bụ na ego ha otú ahụ ga-edu ya ruo ọtụtụ ọnwa na Dominican Republic!”
Ịnụ ọkụ n’obi Davey metụtakwara ndị ọzọ. “Mgbe m nụrụ banyere ihe nile Davey na-eme nakwa obi ụtọ ọ na-enwe,” ka otu onye ntorobịa nọ n’obodo o si bịa kwuru, “o mere ka m mata na mụ onwe m pụkwara imeli ihe ndị dị otú ahụ. Ọnwụ Davey emewo ka m chee echiche banyere ihe ndị mmadụ ga-ekwu banyere m ma m nwụọ, meekwa ka m chee echiche ma m̀ ga-enwe mmetụta dị mma otú ahụ ná ndụ ha.”
Dị ka Ndịàmà Jehova, nne na nna Davey na ụmụnne ya nwere obi ike dị ukwuu na Chineke ga-akpọlite Davey n’ọnwụ n’ime ụwa ọhụrụ ezi omume na-abịanụ. (Jọn 5:28, 29; Mkpughe 21:1-4) Ka ọ dịgodị, ha na-enweta nkasi obi site n’ịmara na Davey ji ndụ ya mee ihe n’ụzọ kasị mma—o ji ya jeere Onye Okike ya ozi. (Eklisiastis 12:1) Ka Davey na-atụgharị uche ná mkpebi o mere ije ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu, o kwuru n’otu oge, sị: “Ọ dị m nnọọ ka onye ọ bụla na-eto eto jee ozi yiri nke a ma nwee ụdị afọ ojuju m na-enwe. O nweghị ihe dị mma karịa iji ihe nile anyị nwere jeere Jehova ozi. A sịkwa nnọọ na ndị mmadụ maara nke a!”
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 2 Dị ka David, ọtụtụ n’ime Ndịàmà Jehova ejiriwo ọchịchọ obi ha wepụta onwe ha ma kwaga n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu maka ndị nkwusa Alaeze, ọbụna ụfọdụ amụtawo asụsụ ala ọzọ iji kụziere ndị ọzọ eziokwu nke Okwu Chineke. Ihe karịrị narị mmadụ anọ n’ime ndị ọrụ afọ ofufo dị otú ahụ na-eje ozi ugbu a na Dominican Republic.