Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

A Tụrụ Ha Mkpọrọ, Ma Ha Nweere Onwe Ha!

A Tụrụ Ha Mkpọrọ, Ma Ha Nweere Onwe Ha!

A Tụrụ Ha Mkpọrọ, Ma Ha Nweere Onwe Ha!

Site n’aka onye edemede Teta! na Mexico

ISLAS MARÍAS dị kilomita iri itoolu site n’etiti ebe ọdịda anyanwụ nke ụsọ oké osimiri Mexico. * María Madre, nke bụ́ otu n’ime agwaetiti ndị a dị n’Oké Osimiri Pacific, bụ ebe gọọmenti etiti Mexico nọworo na-enye ndị mmadụ ntaramahụhụ kemgbe afọ 1905. E nwere oge ịkpọga mmadụ ebe ahụ bụ ntaramahụhụ a na-atụ ụjọ. Ma ugbu a, ndị mkpọrọ na-akpa ezi àgwà pụrụ ịrịọ ka a kpọga ha ebe ahụ!

Otu ihe kpatara ya bụ na a na-ekwe ka ụfọdụ ndị mkpọrọ kpọrọ ezinụlọ ha gaa biri n’ebe a. Kama ibi n’ọnụ ụlọ mkpọrọ ndị e ji ígwè gebichie, ndị mkpọrọ a na-ebi n’obere ụlọ. Ogige ahụ nwere ọtụtụ n’ime ihe ndị e nwere n’obodo nta ọ bụla ọzọ. Telifon, teligraf, telivishọn, nakwa post ọfịs ndị e nwere ebe a, na-enye aka eme ka ndị mkpọrọ a na mmadụ ndị nọ n’obodo dị iche iche na-emekọrịta ihe. Ụmụaka pụrụ ịga ụlọ akwụkwọ praịmarị n’ebe a. Ma ha ga-alaghachirịrị na Mexico iji gaa ụlọ akwụkwọ sekọndrị. Ọ bụkwa ezie na a naghị ekwecha ndị mmadụ bịa ebe ahụ mgbe nile, otu ugboro n’izu, ụgbọ mmiri nke ndị agha mmiri na-ebute ndị njem na ihe ndị dị ka ihe oriri n’agwaetiti a.

Gịnịkwanụ banyere ọzụzụ a na-enye ha iji gbanwee omume ọjọọ ha? Ndị mkpọrọ ahụ—bụ́ ndị na-akpọ onwe ha colonos, ma ọ bụ ndị mbịarambịa—aghaghị ịrụ ọrụ ruo awa ole na ole kwa ụbọchị. Ọ bụghị nanị na nke a na-enye aka eme ka ọ dịkwuoro ha mfe iso ndị mmadụ mekọọ ihe mgbe a tọhapụsịrị ha, kama a na-esikwa na ya enweta ego e ji elekọta ha. Ndị mkpọrọ ahụ nwekwaara onwe ha ịrụ ọrụ nke aka ha, ndị dị ka ịkọ ugbo na ịkpà ihe iji na-enweta ego. Nke ahụ apụtaghị na ọ dịkwaghị iwu na-achịkwa ha ma ọlị. Ha ga-abịarịrị zaa aha ha n’isi ụtụtụ ma hụ na ha rubere isi n’iwu onye apụtakwala èzí ma ọ kụhaala elekere itoolu nke abalị.

Ndị Nọ n’Agwaetiti Marías Enwere Onwe Ha n’Ụzọ Ime Mmụọ

N’ihe dị ka afọ 1985, otu onye mkpọrọ nke ndị ezinụlọ ya bụ Ndịàmà Jehova, rịọrọ ka e nyere ya aka n’ụzọ ime mmụọ. A malitere iduziri ya ọmụmụ Bible site n’idegara ya akwụkwọ ozi. Ka oge na-aga, a bịara nwee ìgwè ndị a na-eduziri ọmụmụ Bible. Ha malitekwara inwe nzukọ Ndị Kraịst. Mgbe Ndịàmà Jehova natara ikike site n’aka gọọmenti, ha malitere ịga n’agwaetiti ahụ mgbe nile—njem na-ewe awa iri na atọ site n’obodo Mazatlán, Mexico. Kemgbe ọtụtụ afọ ugbu a, iri ndị mkpọrọ anọ amụtawo eziokwu nke Okwu Chineke ma mee baptizim, a tọhapụkwa ha mgbe ha nọzuru afọ mkpọrọ ha. N’oge a na-ede akụkọ a, e nwere Ndịàmà isii merela baptizim ka nọ n’agwaetiti a. Ihe dị ka mmadụ iri abụọ na ise ná nkezi na-abịakwa nzukọ Ndị Kraịst.

Ndị ọrụ gọọmenti na-aja Ndịàmà Jehova mma n’ihi mbọ ha na-agba. Mmadụ nile na-akwanyekwara ndị mkpọrọ bụ́ Ndịàmà ùgwù. Na nso nso a, osote onyeisi nke ogige a, gwara otu Onyeàmà bịara ileta ogige ahụ, sị: “Ọ dị nnọọ mma na unu nwere mmasị n’ịhụ maka ọdịmma nke ndị a nọ mkpọrọ ma n’ụzọ anụ ahụ́ ma n’ụzọ omume! Anyị ga-akwado unu n’ụzọ ọ bụla anyị nwere ike.” O kwuru na ya ga-arụzi ụlọ ebe e nyere ụmụnna anyị ịnọ na-enwe nzukọ.

Otu Onyeàmà merela baptizim—onye nọ mkpọrọ kemgbe afọ iri—kwuru, sị: “Mgbe ụmụnna na-eleta anyị jụrụ m ma m̀ ga-achọ ịla, ana m agwa ha na m chọrọ ịnọgide ebe a na-eje ozi; eweere m ya ka ókèala e kenyere m ije ozi, n’ihi na e nwere mkpa dị ukwuu n’ebe a. Ma, m ga-achọ ịdị na-aga mgbakọ ma soro Ndị Kraịst ibe m kpakọrịta.” A ga atọhapụ ya n’afọ ọzọ n’ihi àgwà ọma ya.

A kọrọ na n’ógbè ịta ahụhụ dị na Islas Marías, a na-enwetụ ihe ịga nke ọma n’ime ka ndị mkpọrọ gbanwee mewe omume ọma. Ma, ozi Alaeze ahụ emewo ka ha nwere onwe ha n’ezie n’ụzọ ime mmụọ nakwa n’ụzọ omume. Ọ bụkwa “ntọhapụ nye ndị a dọọrọ n’agha” na “mmeghepụ ụlọ mkpọrọ gwa ndị e kere agbụ.”—Luk 4:18; Aịsaịa 61:1.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Ọ bụ ezie na a na-akpọkwa ya Islas Tres Marías, nke pụtara “Ndị María atọ,” ọ bụ agwaetiti anọ mejupụtara obodo a. Mmadụ ebighị n’atọ n’ime ha.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 27]

O Si n’Ịbụ Onye Ọgwụ Ike Riri Ahụ́ Gaa n’Ịbụ Okenye n’Ọgbakọ Ndị Kraịst

A tụrụ Guillermo mkpọrọ n’ihi ire na ịṅụ ọgwụ ike. Mgbe a kpọgasịrị ya n’agwaetiti Islas Marías, ọ nọgidekwara na-aṅụ ọgwụ ike. Ma ọ chọpụtara na ụfọdụ ndị a tụrụ mkpọrọ ogologo oge n’ihi ịda iwu ndị dị ka ịtụ mgbere ọgwụ ike na-eji ejiji dị mma, na-enwe obi ụtọ, ma bụrụ ndị mkpọrọ e ji ama atụ. Mgbe ọ chọpụtara na ha na Ndịàmà Jehova na-amụ Bible, ọ nabatara òkù a kpọrọ ya ịga nzukọ ha. Mgbe e mesịrị, a malitere iduziri ya ọmụmụ Bible.

Guillermo mere mgbanwe dị ukwuu ná ndụ ya, ọ dịghịkwa anya a tọhapụ ya. Ozugbo ọ pụtara, ya achọọ Ndịàmà Jehova iji nwee ike ịga n’ihu n’ọmụmụ ihe ya. Taa, ọ bụ okenye n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Mmadụ iri na asaa ná ndị ezinụlọ ya bụkwa Ndịàmà Jehova ugbu a. O kwuru, sị: “Ọ bụụrụ m nnukwu ihe ùgwù ịmara Jehova na ịhapụ àgwà ọjọọ ndị ahụ m naara akpa. Ọtụtụ n’ime ndị bụ́bu enyi m anwụọla n’ihi ọgwụ ike. Ọgwụ ike kpatụrụ ụbụrụ m aka ọjọọ, nke mere ka icheta ihe na-esiri m ike. Ma ụzọ Ndịàmà si amụ ihe nyere aka mee ka ụbụrụ m dịkwuo mma. Ọ tụrụ ndị dọkịta n’anya n’ihi na ha chere na ọ dịtụghị mgbe m ga-agbake. Ihe eziokwu Bible meere mụ na ezinụlọ m abụghị ihe e ji ọnụ ekwu. Ọ dịtụbeghị mgbe anyị gosiworo onwe anyị ịhụnanya. Ma ugbu a, anyị na-emekọ ihe ọnụ.”

[Map ndị dị na peeji 26]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Mazatlán

Islas Marías

María Madre

[Foto dị na peeji nke 26]

Ndị mkpọrọ na ndị ezinụlọ ha na-aga nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị na María Madre