Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Chineke Ọ̀ Nọ Ebe Nile?

Chineke Ọ̀ Nọ Ebe Nile?

Echiche nke Bible

Chineke Ọ̀ Nọ Ebe Nile?

A NA-AKỌWA Chineke n’ụzọ dabara adaba dị ka onye pụrụ ime ihe nile na onye maara ihe nile. Ma, mgbe ụfọdụ ndị chọkwuru ịkọwa ịdị ukwuu ya, ha na-enye ya utu aha ọzọ—onye nọ ebe nile. Ha kweere na Chineke nọzu ebe nile.

Ọ bụ ezie na ọ dịghị nke ọ bụla n’ime utu aha ndị a dị na Bible, Akwụkwọ Nsọ na-akwado nnọọ na Chineke bụ onye pụrụ ime ihe nile na onye maara ihe nile. (Jenesis 17:1; Ndị Hibru 4:13; Mkpughe 11:17) N’ezie, Chineke bụ onye pụrụ ime ihe nile, ọ bụkwa onye maara ihe nile n’echiche bụ́ na ọ dịghị ihe ọ bụla a pụrụ izonahụ ya. Ma, Chineke ọ̀ nọzu ebe nile, ka ọ̀ bụ onye, nke nwere ebe dị adị o bi?

Ebee Ka Chineke Nọ?

N’ọtụtụ amaokwu Bible, e kwuru na “eluigwe” bụ ‘ọnọdụ obibi guzosiri ike’ nke Chineke. (1 Ndị Eze 8:39, 43, 49; 2 Ihe E Mere 6:33, 39) Ma, otu akụkụ Bible ji okwu ndị a na-esonụ kọwaa ịdị ukwuu Jehova Chineke: “Ọ̀ bụ ezie na Chineke ga-ebinyere mmadụ n’elu ụwa? lee, eluigwe na eluigwe nke eluigwe agaghị anagide Gị; ụlọ a nke m wuworo, ọ̀ ga-esikwa aṅaa ruo ịnagide Gị.”—2 Ihe E Mere 6:18.

Bible na-ekwu na “Chineke bụ mmụọ.” (Jọn 4:24) N’ihi ya, o bi n’ógbè ndị bụ́ mmụọ, nke na-abụghị eluigwe a na-ahụ anya. Mgbe Bible na-ekwu na “eluigwe” bụ ebe obibi Chineke, ọ na-ezo aka n’otú ebe o bi si dị elu karịa ụwa a na-ahụ anya nke anyị bi na ya. Nke ka mkpa, Bible na-akụzi na ebe Chineke bi dị nnọọ iche n’eluigwe na ụwa nke a na-ahụ anya, ma n’otu mgbe ahụ, ọ bụ otu ebe.—Job 2:1-2.

Chineke Bụ Onye

Jizọs kwuru banyere ebe Jehova bi mgbe ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “N’ụlọ Nna m ọtụtụ ebe obibi dị. . . . M na-aga ịkwadebere unu ebe.” (Jọn 14:2) Olee ebe Jizọs gara? O mesịrị “[banye] . . . n’ime eluigwe n’onwe ya, ịpụta ugbu a n’ihu Chineke n’onwe ya maka anyị.” (Ndị Hibru 9:24) Ihe ndekọ a na-akụziri anyị ihe abụọ dị mkpa banyere Jehova Chineke. Nke mbụ, o nwere ebe o bi. Nke abụọ, ọ bụ onye, ọ bụghị ikike nkịtị a na-apụghị ịkọwa akọwa nke nọzu ebe nile.

Ọ bụ ya mere Jizọs ji kụziere ndị na-eso ụzọ ya ikpe ekpere otú a: “Nna anyị nke nọ n’eluigwe.” Nke pụtara na onye ha ga-ekpegara ekpere bụ onye, nke aha ya bụ Jehova, onye nọ n’eluigwe nke ndị bụ́ mmụọ bi. (Matiu 6:9; 12:50) Ozizi a kwekọrọ n’otú e si kụziere ndị na-efe Chineke ka ha siri na-ekpe ekpere kemgbe ihe karịrị afọ 1,500 gara aga. Ihe odide kasị ochie e dere n’ike mmụọ nsọ Chineke, bu ekpere a na-esonụ: “Si n’ebe obibi nsọ Gị, si n’eluigwe, lee anya, gọzie ndị Gị.”—Deuterọnọmi 26:15.

Mmụọ Nsọ Chineke nke Na-eru Ebe Nile

Ọ bụ ezie na Bible na-ekwu mgbe nile na e nwere ebe Chineke bi, ọ na-ekwukarị banyere mmụọ nsọ dị ka ihe nọzu ebe nile. Ọbụ abụ bụ́ Devid, jụrụ, sị “Olee ebe m ga-alanahụ Mmụọ Gị? Ma ọ bụ olee ebe m ga-esi n’ihu Gị gbalaga?” (Abụ Ọma 139:7) Akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị dị otú a agbagwojuwo ụfọdụ ndị anya, ha pụkwara ikpebi na Chineke nọzu ebe nile. Ma, mgbe a tụlere ihe a na-ekwu n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ a nakwa ihe akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ọzọ na-ekwu, ọ na-edo nnọọ anya na Jehova pụrụ ịnọ n’ebe ọ nọ mee ka mmụọ nsọ ya—ma ọ bụ ike ya nọ n’ọrụ—ruo ebe nile anya mmadụ pụrụ ịhụ.

Dị ka nna na-esetị aka ya iji gụgụọ ma nyere ụmụ ya aka, aka Jehova—ma ọ bụ mmụọ nsọ—pụrụ iru n’ebe ọ bụla n’ógbè ndị bụ́ mmụọ ma ọ bụ n’ụwa iji mezuo nzube Jehova. Ọ bụ ya mere ọbụ abụ ahụ ji nwee ike ikwu, sị: “Ọ bụrụ na achịrị m nku nke ụtụtụ, biri n’akụkụ dịkarịsịrị anya nke oké osimiri; ọbụna n’ebe ahụ ka aka Gị ga-eduru m, aka nri Gị ga-ejidekwa m.”—Abụ Ọma 139:9, 10.

Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke

Jehova Chineke ji obi umeala na ịhụnanya kwere ka e jiri okwu ụmụ mmadụ na-aghọta kọwaa ya onwe ya na ebe obibi ya n’ụzọ ga-eme ka a ghọta nnọọ ebe o bi na ụdị onye ọ bụ. N’ụzọ dị otú a nakwa n’ụzọ ndị ọzọ, o yiri ka à ga-asị na ọ “na-eme Onwe ya ka Ọ dị ala ilekwasị eluigwe na ilekwasị ụwa anya.” (Abụ Ọma 113:6) N’agbanyeghị nke ahụ, ụmụ mmadụ enweghị ike ịghọtazu otú Chineke dị.

Jehova dị nnọọ ebube, dịrị nnọọ ukwuu, dịkwa nnọọ ịtụnanya nke na a pụghị iji okwu ụmụ mmadụ ji eme ihe kọwaa ya nke ọma. N’ihi ya, ọ bụ ezie na Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere ebe o bi dị ka otu ebe kpọmkwem, ọ ga-atụghị ekwe ụmụ mmadụ omume ịghọtacha ógbè ndị bụ́ mmụọ ahụ o bi nke ọma.—Abụ Ọma 139:6.

Ma, ọ bụ nnọọ ihe nkasi obi ịghọta nnọọ ụdị onye Jehova bụ, na-aghọta na ọ bụghị ikike nkịtị a na-apụghị ịkọwa akọwa nke nọ ebe nile n’eluigwe na ụwa. Kama ọ bụ onye, nke bi otu ebe, nke nwere àgwà ndị e ji ịhụnanya na ịdị nro mara. Ihe ọmụma dị otú ahụ na-enye mmadụ nile ohere kasị mma—ohere nke iso Eze Pụrụ Ime Nile nke nwe eluigwe na ala bụrụ enyi ná ndụ ha nile.—Jems 4:8.