Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ekwe Ntị Ọ̀ Bara Uru Ka Ọ̀ Na-emebi Ihe?

Ekwe Ntị Ọ̀ Bara Uru Ka Ọ̀ Na-emebi Ihe?

Ekwe Ntị Ọ̀ Bara Uru Ka Ọ̀ Na-emebi Ihe?

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! N’AUSTRALIA

A FỌ ole na ole gara aga, ịkpọ ekwe ntị “fon e ji agagharị agagharị” bụ ịkpọ ya aha na-ekwesịghị ya. Ị pụrụ iji ya gagharịa agagharị nanị ma ọ bụrụ na i siri nnọọ ike ma ọ bụ na ọ dị n’ụgbọala gị, n’ihi na batrị ya na-adị oké arọ. N’oge ahụ, fon a na-ebu ibu karịa paket akpụkpọ ụkwụ, ọ na-adakwa ọtụtụ narị puku naira.

Taa, ekwe ntị e nwere ruru ihe dị ka ijeri 1.35. Ihe karịrị ọkara nke ndị bi ná mba ụfọdụ nwere ya. Ihe ka ọtụtụ n’ekwe ntị ndị a pere mpe nke na a pụrụ ịkwụkwụchi ha n’aka. Mgbe ụfọdụ kwa, a na-enwetadị ya n’efu. * Akwụkwọ a na-ebipụta n’Australia bụ́ The Bulletin kọrọ, sị: “Ọnụ ọgụgụ ekwe ntị ndị mmadụ ji eme ihe fọrọ nke nta ka ọ haruo ka nke TV na kọmpụta ndị mmadụ nwere.” N’ihe karịrị mba iri abụọ, ekwe ntị dị ọtụtụ karịa fon ndị nwere eriri. Otu ọkachamara n’ihe banyere mmepụta ihe kwuru na ọ bụghị nanị na a rụrụ ekwe ntị n’ụzọ dị ịtụnanya kama na ọ bụ “ihe dị mkpa ná mmekọrịta mmadụ na ibe ya.”

Mmetụta dị aṅaa ka ekwe ntị na-enwe n’ebe ọha na eze nọ? Hà bara uru ka hà na-emebi ihe?

Uru Ndị Ọchụ Nta Ego

Otú ekwe ntị si na-aga ahịa bụụrụ ọtụtụ ndị na-achụ nta ego uru. Ndị na-arụ n’otu nnukwu ụlọ ọrụ kwuru, sị: “Ekwe ntị bụ ngwá electronic kasị aga ahịa.” N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, a ka emefu ego ugbu a n’ịzụ ekwe ntị karịa ka e mefutụrụla n’ịzụ ngwá electronic ọ bụla ọzọ.

Dị ka ihe atụ, ihe karịrị nde mmadụ iri na ise n’ime nde iri abụọ bi n’Australia nwere ekwe ntị. Ndị ahịa nke nanị otu n’ime ọtụtụ ụlọ ọrụ fon dị ná mba ahụ kpọrọ fon ruru ijeri asaa na ụma ise n’otu afọ na-adịbeghị anya. N’ụwa nile, ekwe ntị na-enye ụlọ ọrụ fon ijeri kwuru ijeri dollar kwa afọ. O sighị ike ịhụ ihe mere ụlọ ọrụ ndị katara ahụ́ ji were ekwe ntị dị ka ihe bara uru.

Iwepụta Asụsụ Ọhụrụ

Ọtụtụ n’ime ọtụtụ nde ozi e ji ekwe ntị ezipụ ma na-anata abụghị ndị e ji ọnụ ezi, kama ha bụ ndị a na-ede ede. Kama iji ọnụ zie ozi ha, ọtụtụ ndị nwere ekwe ntị—karịsịa ndị ntorobịa—na-ede ya ede n’ebe e mere maka ide ozi. Ebe a e mere maka ide ozi na-eme ka ha nwee ike ide na izigara ibe ha ozi dị mkpirikpi n’emefughị oké ego. Ebe ọ bụ na ide ozi ndị a anaghị adịcha mfe, ndị na-ede ha na-ede okwu ná mkpirikpi, na-eji ma mkpụrụ okwu ma nọmba edepụta okwu otú ha si ada ná ntị. N’agbanyeghị na ide ihe ede na-ara ahụ́ karịa ikwu ya ekwu, kwa ọnwa n’ụwa nile, a na-eji ekwe ntị ezipụ ihe dị ka ijeri ozi iri atọ e dere ede.

Olee ụdị ozi a na-ezipụ ihe a? N’otu nnyocha e mere na Britain, a chọpụtara na pasent iri anọ na abụọ nke ndị ntorobịa nọ n’agbata afọ iri na asatọ na iri abụọ na anọ na-eji ozi ndị a ha na-ede ede achụ nwoke ma ọ bụ nwanyị. Pasent iri abụọ na-eji ha agwa ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ha ka ha na ha mewe enyi, pasent iri na atọ ejiwokwa ha tisaa adịm ná mma ha na ndị ọzọ.

Ụfọdụ ndị na-enyocha ọnọdụ ọha na eze na-enwe nchegbu na ụzọ a ndị na-eto eto si asụpe okwu ma na-ahazi ahịrịokwu mgbe ha na-ede ozi ndị a, na-eme ka ha ghara ịmacha akwụkwọ. Ndị ọzọ ekweghị. Ha na-ekwu na ụzọ a e sikarị ede ihe n’ekwe ntị “na-eme ka ndị na-eto eto maliteghachi inwe mmasị n’ide ihe.” Otu onye na-ekwuchitere otu ụlọ ọrụ na-ede akwụkwọ ọkọwa okwu ndị Australia gwara ndị na-ede akwụkwọ akụkọ bụ́ Sun-Herald, sị: ‘Ọ bụghị mgbe nile ka anyị na-enwe ohere nke ịmalite ide ihe n’ụzọ ọhụrụ. Ojiji e ji ma ekwe ntị ma Intanet ede ozi pụtara na ndị na-eto eto ka ede ihe ugbu a. Ha aghaghị ịmụta ịgụ ihe ndị e dere n’ụzọ ọhụrụ a n’ụzọ na-aga were were n’ọnụ, mụtakwa ịdị nkọ n’ide ha ede.’

Ụfọdụ Nsogbu Ha Na-akpata

Ọ bụ ezie na ekwe ntị bara uru ma ná mmekọrịta mmadụ na ibe ya ma n’achụmnta ego, ọtụtụ ndị e were n’ọrụ pụrụ iwere ya mgbe ụfọdụ dị ka agbụ kama iwere ya dị ka ihe bara uru—na-eme ka ọ̀ dị ha ka e kere ha agbụ n’ọrụ ha. N’otu nnyocha e mere, a chọpụtara na ọ na-adị pasent iri asatọ nke ndị na-akpọsa ngwa ahịa na pasent iri isii nke ndị ọrụ ihe owuwu ka ndị were ha n’ọrụ ma ọ bụ ndị ha na-arụrụ ọrụ hà na-amanye ha ịrụ ọrụ mgbe nile. Nrụgide ndị mmadụ na-enwe ịza fon n’agbanyeghị ebe ha nọ ma ọ bụ ihe ha na-eme na-akpata ihe otu onye nchọpụta sị na ọ bụ “inye mmadụ nsogbu.” N’ihi ya, ndị injinia arụpụtawo ngwá ụlọ a ga-eji na-arụ ụlọ nri na ụlọ a na-anọ eme ihe nkiri. Ngwá ụlọ a pụrụ ime ka ndị nọ n’ime ụlọ e ji ya rụọ ghara izipụ ma ọ bụ nata ozi n’ekwe ntị ha.—Lee igbe bụ́ “Aro Ndị A Tụrụ Banyere Ụzọ A Ga-esi Jiri Ekwe Ntị Na-eme Ihe.”

Ọ bụghị nanị na fon a juru ebe nile na-aghanyere ndị mmadụ ájá na garị, kama ha pụdịrị ịkpatara ọha na eze nsogbu ka njọ. N’otu nnyocha e mere na Canada, a chọpụtara na mmadụ iji ekwe ntị eme ihe mgbe ọ na-akwọ ụgbọala dị ize ndụ otú ịkwọ ụgbọala mgbe mmanya na-egbu ya si dịrị. Onye prọfesọ aha ya bụ Mark Stevenson, nke Ngalaba Na-ahụ Maka Mmerụ Ahụ́ na Mahadum Western Australia, na-akọwa na onye na-akwọ ụgbọala inwe mkparịta ụka n’ekwe ntị na-ara nnọọ ahụ́ karịa ya iso onye o bu n’ụgbọala na-akparịta ụka. N’obodo ụfọdụ, ndị uwe ojii pụrụ iri onye na-akwọ ụgbọala aza fon nhá. Ma, n’agbanyeghị ihe ndị a nile, n’otu nnyocha e mere na nso nso a, a chọpụtara na otu onye n’ime mmadụ ise na-akwọ ụgbọala n’Australia na-eji ekwe ntị ezipụ ozi ha dere ede, ebe otu onye n’ime mmadụ atọ na-aza ma ọ bụ na-akpọ fon mgbe ha na-akwọ ụgbọala.

Ihe ize ndụ dị n’iji ekwe ntị eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi rukwara na njem ụgbọelu. Ọ bụ ezie na otú e si arụnye waya n’ụgbọelu ndị ọhụrụ na-eme ka ikuku ozi nke ekwe ntị ghara imetụta ha, ikuku ndị a ka na-emetụta ụfọdụ ụgbọelu ndị a ka ji eme ihe. Akwụkwọ bụ́ New Scientist kọrọ, sị: “Ná nnyocha e ji ụgbọelu abụọ mee, Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Ụgbọelu na Britain [CAA] kwuru na ikuku ozi nke ekwe ntị na-eme ka ngwá electronic ndị dị mkpa n’ụgbọelu ghara ịrụ ọrụ nke ọma.” Ka ọ na-ekwu nsogbu bụ́ isi fon ndị a na-enye, ọnụ na-ekwuchitere ụlọ ọrụ CAA kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ekwe ntị nọ n’ebe dị anya site n’ebe o si enweta ike, ikuku ozi ya ga-adị ike karịa ka ọ gaara adị ma ọ nọrọ nso. Ya mere, ka ụgbọelu na-efeli elu, ike ikuku a na-amụba, na-eme ka ngwá electronic ndị dị n’ụgbọelu ghara ịrụ ọrụ nke ọma n’oge a ha kasị dị mkpa.” N’otu nnyocha e mere n’Australia, ekwe ntị na ngwá eletronic ndị ọzọ ndị mmadụ ji, kpatara ọtụtụ nsogbu n’otu ụgbọelu bu ndị njem. Nke a bụ n’ihi na ndị njem leghaara ịdọ aka ná ntị e nyere ha anya nke bụ́ ịgbanyụ ngwa electronic ha ma ha banye n’ụgbọelu.

Ekwe Ntị na Ọrịa Cancer

A ka na-arụ ụka ma ikuku ozi nke ekwe ntị na nke ígwè satellite ya, hà pụrụ ịkpatara mmadụ ọrịa cancer. Ebe ọtụtụ narị nde mmadụ ji ekwe ntị eme ihe, ọ bụrụ na ndị o nyewere nsogbu n’ahụ́ pegodị nnọọ mpe, ọ ga-abụrụ ọha mmadụ nnukwu nsogbu ahụ́ ike. N’ihi ya, ndị ọkà mmụta sayensị emewo ọtụtụ nnyocha katara ahụ́ iji mara mmetụta ikuku ozi ekwe ntị na-enwe n’ahụ́ mmadụ. Gịnị ka ha chọpụtaworo?

Òtù a na-akpọ Independent Expert Group on Mobile Phones (IEGMP) dere otu akwụkwọ kwuru, sị: ‘Òtù a kweere na, dabere n’ihe a maara ugbu a, ọha na eze ekwesịghị ịtụwa ụjọ iji ekwe ntị na-eme ihe.’ Akwụkwọ bụ́ New Scientist kọkwara, sị: “N’agbanyeghị akụkọ ndị na-eyi egwu a nụrụ n’afọ ndị na-adịbeghị anya, ihe ka ọtụtụ ná nchọpụta ndị e merela ka ọ dị ugbu a gosiri na ọ dịghị ihe ikuku ozi ekwe ntị na-eme mmadụ n’ahụ́. Mgbe e meghachiri nnyocha ndị nke gosiri na ọ dị ihe ọ na-eme, ọ dịghị ihe a hụrụ.”

A nọwo na-emefu nde kwuru nde dollar n’ime nchọpụta n’ihi obi abụọ a na-enwe banyere ihe ekwe ntị na-eme n’ahụ́. Tupu ruo mgbe a ga-achọpụta nke bụ́ eziokwu, òtù IEGMP tụrụ aro ka i mee ihe na-esonụ: “Anọtela aka mgbe i ji [ekwe ntị] na-eme ihe. Jiri fon ndị ike ikuku ozi ha dị ala na-eme ihe. Jiri ihe a na-akwụnye ná ntị na ihe ndị ọzọ e ji anụ ụda olu na-eme ihe ma ọ bụrụhaala na ị chọpụtara na ha na-eme ka ike ikuku ozi ekwe ntị gị belata.” Òtù ahụ tụkwara aro ka a “ghara ikwe ka ụmụaka ndị na-erubeghị afọ iri na isii jiri ekwe ntị na-eme ihe” n’ihi na akwara ozi dị ha n’ahụ́ ka na-eto eto. Oge uto ha nọ na ya ga-eme ka ha “kara nọrọ n’ihe ize ndụ nke ibute ọrịa ọ bụla a na-amabeghị ma ọ̀ na-akpata.”

Ọ bụ ezie na a na-arụrụ ya ụka, ekwe ntị na-enwe mmetụta dị ukwuu ma n’achụmnta ego ma ná mmekọrịta mmadụ na ibe ya. Dị ka ọ dị n’ebe TV na kọmputa dị, ekwe ntị pụrụ ịbụ ihe ga na-achị onye nwe ya ma ọ bụ ihe onye nwe ya ga na-achị. N’ezie, ọ bụ onye ji ya eme ihe ka ọ dị n’aka ikpebi ma ọ̀ ga-abụ ihe bara uru ka ọ̀ ga-abụ ihe na-emebi ihe.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Ndị na-enweta ekwe ntị n’efu mgbe ụfọdụ bụ ndị bịanyere aka n’akwụkwọ iji kweta na ha ga-akpọgide fon ruo mgbe ha kpọtara ego ole ụlọ ọrụ fon kwuru na ha aghaghị ịkpọta n’ime oge e kwuru.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 29]

ARO NDỊ A TỤRỤ BANYERE ỤZỌ A GA-ESI JIRI EKWE NTỊ NA-EME IHE

1. Wetuo olu gị mgbe ị na-aza fon n’ebe ndị mmadụ juru. Ígwè na-eme ka a nụ ụda olu bụ́ nke dị n’ekwe ntị na-abụ ọkpọka, o yighịkwa ka ndị nọ gị nso hà ga-enwe mmasị ịnụ ihe ị na-ekwu na fon.

2. Ị nọrọ ná nzukọ okpukpe, na nke achụmnta ego, n’ebe a na-anọ ekiri vidio, n’ụlọ nri, ma ọ bụ n’ebe ndị ọzọ ọha na eze nọ, gbanyụọ fon gị agbanyụ ma ọ bụ gbanye ya n’ebe ga-eme ka ọ na-ama jijiji ma a kpọọ gị.

3. Ị chọọ ịza fon mgbe ị na-akwọ ụgbọala, ejila ya n’aka na-aza.

[Foto dị na peeji nke 28]

Kwa ọnwa n’ụwa nile, a na-eji ekwe ntị ezipụ ihe dị ka ijeri ozi iri atọ e dere ede

[Foto dị na peeji nke 30]

Mmadụ iji ekwe ntị eme ihe mgbe ọ na-akwọ ụgbọala pụrụ ịdị ize ndụ otú ịkwọ ụgbọala mgbe mmanya na-egbu ya si dịrị