Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Isi Ike Ndị Nne Na-enwe

Ihe Isi Ike Ndị Nne Na-enwe

Ihe Isi Ike Ndị Nne Na-enwe

“Isi sekpụ ntị n’ọrụ dịịrị ụmụ mmadụ bụ ọrụ ezinụlọ. . . . Ọ bụrụ na nne arụghị ọrụ ya, a gaghị enwe ọgbọ ọzọ. E nweekwanụ enwe, ọ ga-aka mma na e nweghị.” —Theodore Roosevelt, president nke 26 nke United States.

O DORO anya na nne dị oké mkpa ná ndụ mmadụ, ma ọrụ ya karịrị nnọọ ịmụ ụmụ. Otu onye edemede kwuru banyere ọrụ ndị nne na-arụ n’ọtụtụ ebe n’ụwa taa, sị: “Ha bụ isi sekpụ ntị n’ilekọta nwatakịrị ọ bụla anya, n’inye ya ọzụzụ, n’ịhụ na o nwere ọgụgụ isi, na o nwere àgwà ọma, nakwa na obi ruru ya ala.”

Otu n’ime ọtụtụ ọrụ nne na-arụ bụ inye ụmụ ya ọzụzụ. Ọ na-abụkarị n’ọnụ nne ka nwatakịrị si amụta okwu mbụ ya na ụzọ o si ekwu okwu. Nne na-aka nna ewepụta oge kwa ụbọchị iji soro ụmụ ha nọkọọ. N’ihi ya, ọ pụrụ ịbụ ya ka akụziri ha ihe, karakwa adọ ha aka ná ntị. Ọ bụ ya mere ilu ndị Mexico bụ́ “Mmụta dị nne n’aka” ji egosi ọrụ dị mkpa ndị nne na-arụ.

Onye Okike anyị, bụ́ Jehova Chineke, na-akwanyere ndị nne ùgwù. N’ezie, otu n’ime Iwu Iri ahụ, bụ́ nke “mkpịsị aka Chineke” dere ná mbadamba nkume, gbara ụmụaka ume, sị: “Sọpụrụ nna gị na nne gị.” (Ọpụpụ 20:12; 31:18; Deuterọnọmi 9:10) Ọzọkwa, otu ilu Bible kwuru banyere “iwu nne gị.” (Ilu 1:8) Ọtụtụ mmadụ na-ekwetazi na ọ dị mkpa ịkụziri ụmụaka ihe n’ime afọ atọ mbụ ha—mgbe ihe ka ọtụtụ n’ime ha jikarị anọ n’aka nne ha.

Olee Ihe Isi Ike Ụfọdụ Ha Na-enwe?

Otu ihe na-eme ka ịkụziri ụmụaka ihe mgbe ha ka pere mpe na-esiri ọtụtụ ndị nne ike bụ n’ihi na ha na-arụ ọrụ ego iji nye aka n’igbo mkpa ezinụlọ. Nchọpụta òtù Mba Ndị Dị n’Otu mere na-egosi na, n’ọtụtụ mba ndị mepere emepe, ihe karịrị ọkara nke ndị nne ji ụmụ na-erubeghị afọ atọ na-arụ ọrụ ego.

Ọzọkwa, ndị nne na-ebukarị ibu ịzụ ụmụ nanị ha n’ihi na ndị di ha hapụrụ ha ịga chọọ ọrụ n’obodo ma ọ bụ ná mba ọzọ. Dị ka ihe atụ, a kọrọ na n’ebe ụfọdụ n’Armenia, ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ otu onye n’ime ndị ikom atọ ọ bụla akwagala mba ofesi ịchọ ọrụ. Ụmụ nwanyị ndị ọzọ na-azụ ụmụ nanị ha n’ihi na di ha hapụrụ ha ma ọ bụ na di ha anwụọla.

Ná mba ụfọdụ, ihe isi ike ọzọ ọtụtụ ndị nne na-enwe bụ na ha agaghị akwụkwọ. Ngalaba Mba Ndị Dị n’Otu nke Na-ahụ Maka Akụ̀ na Ụba na Mmekọrịta Mmadụ na Ibe Ya na-ekwu na ọ bụ ụmụ nwanyị mejupụtara ụzọ abụọ n’ụzọ atọ nke nde mmadụ 876 na-amaghị akwụkwọ n’ụwa. N’ezie, dị ka òtù UNESCO si kwuo, ihe karịrị pasent iri isii nke ụmụ nwanyị nọ n’Africa, mba Arab, nakwa n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ na Ebe Ọdịda Anyanwụ Eshia, amaghị akwụkwọ. Ọzọkwa, ọtụtụ ụmụ nwoke kweere na ụmụ nwanyị ịga akwụkwọ abaghị uru, na ọ na-emedị ka ha ghara inwe ike ịrụ ọrụ ha nke bụ́ ịmụ nwa.

Magazin bụ́ Outlook kwuru na n’otu ebe na steeti Kerala nke dị n’India, bụ́ ebe ụmụ nwanyị na-amụkarị nwa tupu ha eruo afọ 15, ọ dịghị onye na-achọ ịlụ nwanyị gụrụ akwụkwọ. N’obodo Pakistan ha na ha gbara, a na-aka elebara ụmụ nwoke anya. Ọzụzụ a na-enye ha na-eme ka ha nwee ike inweta ọrụ a ga na-akwụ ha ezigbo ego na ya, ka ha wee nwee ike ilekọta ndị mụrụ ha mgbe ha mere agadi. N’aka nke ọzọ, dị ka akwụkwọ bụ́ Women’s Education in Developing Countries si kwuo, “ndị mụrụ ụmụ adịghị emefu ego n’isi ụmụ ha nwanyị n’ihi na ha adịghị atụ anya na ha ga-enwe ike iso gboo mkpa ego nke ezinụlọ.”

E nwekwara ihe isi ike omenala obodo na-akpatara ha. Dị ka ihe atụ, ná mba ụfọdụ, a na-atụ anya ka ndị nne na-akwado omenala ndị dị ka ike obere ụmụ ha nwanyị di na ibi ụmụ nwanyị úgwù. A na-elekwa ndị nne ịkụziri ụmụ ha nwoke ihe na ịdọ ha aka ná ntị anya dị ka ihe a na-asọ nsọ. Iwu ò ji nne ịgbaso omenala ndị dị otú ahụ ma hapụrụ ndị ọzọ ọrụ ịzụ ụmụ ya ndị nwoke?

N’isiokwu ndị na-esonụ, anyị ga-ahụ otú ụfọdụ ndị nne si emeri ihe isi nke ndị ahụ. Anyị ga-agbalịkwa ịghọtakwu ọnọdụ ndị nne na ihe ịbụ nne gụnyere ma nweta echiche ziri ezi banyere ọrụ nne na-arụ n’ịkụziri ụmụ ya ihe.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 4]

“Ọrụ nne dị oké mkpa ma a bịa n’ime ka nwata bụrụ onye ụbụrụ na-aghọ nkọ na onye na-enwe ọchịchọ ịmata ihe, nakwa n’ime ka o nwee ike ịdị na-echepụta ihe.”—Nzukọ Ógbè E Nwere Banyere Ihe Ndị Ruuru Nwata, Burkina Faso, 1997.

[Foto ndị dị na peeji nke 3]

Ndị nne na-arụ ọrụ dị ukwuu n’ilekọta nwatakịrị ọ bụla anya, n’inye ya ọzụzụ, n’ịhụ na o nwere àgwà ọma, nakwa na obi ruru ya ala