Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Magazin Chineke Na-akwado’

‘Magazin Chineke Na-akwado’

‘Magazin Chineke Na-akwado’

OTU nwoke Ndịàmà Jehova na-eduziri ọmụmụ Bible na Nigeria gara otu nzukọ ọmụmụ ihe nke Kọmitii Africa nke Na-ahụ Maka Ndị Inyom na Ụmụaka haziri. O ji Teta! ọhụrụ abụọ gaa.

N’ụbọchị mbụ nke ọmụmụ ihe ahụ, nwoke ahụ chọpụtara na ihe ọkà okwu ha na-ekwu sitere n’otu Teta! ndị ahụ o ji bịa. Isiokwu dị n’ihu ya bụ “Ndụ Dị Ụtọ Obibi.” (October 22 , 2001, Bekee) N’ihi ya, o wepụtara nke ya ozugbo ma malite ịgụ ihe ndị ahụ ọ na-ekwu.

N’uhuruchi ụbọchị ahụ, otu ọkàiwu, bụ́ onye ga-ekwu okwu nke ya n’echi ya, hụrụ isiokwu dị n’ihu Teta! nke ọzọ nwoke ahụ a na-eduziri ọmụmụ Bible ji bịa. Isiokwu ya bụ “Enyemaka Maka Ndị Inyom A Na-eti Ihe.” Ọkàiwu ahụ natara ya nwoke ahụ. N’abalị ahụ, ọ hapụrụ ihe ndị o dere mbụ ma jiri ihe ndị dị na Teta! ahụ kwadebe okwu ọhụrụ. N’echi ya, ka ọkàiwu ahụ nọ na-ekwu okwu ya, otu nwanyị ya na nwoke ahụ a na-eduziri ọmụmụ Bible nọ n’otu oche, wepụtakwara Teta! nke ya, ma malite ịgụ ihe ndị ahụ ọ na-ekwu.

Nwoke ahụ a na-amụrụ Bible bịara nwee ike ikwu ihe ndị bara uru ná nzukọ ọmụmụ ihe ahụ n’ihi ịgụ isiokwu ndị ahụ dị na Teta! Nwoke ahụ kwuru, sị ‘O doro m anya na Chineke na-akwado magazin a.’

Ọ̀ ga-amasị gị ka a na-ewetara gị magazin a n’ụlọ gị mgbe nile? Ọ ga-adị mma ka ị gwa otu n’ime Ndịàmà Jehova ka o wetawara gị ya.