Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Nne Ndị Na-emeri Ihe Isi Ike Ndị Ahụ

Ndị Nne Ndị Na-emeri Ihe Isi Ike Ndị Ahụ

Ndị Nne Ndị Na-emeri Ihe Isi Ike Ndị Ahụ

IHE isi ike kasịnụ ọtụtụ ndị nne na-enwe taa bụ ịrụ ọrụ ego iji na-enye aka n’igbo mkpa ego nke ezinụlọ ha. Ọzọkwa, n’ihi otu ihe ma ọ bụ ihe ọzọ, ụfọdụ n’ime ha na-azụkwa ụmụ ha n’enweghị onye na-enyere ha aka.

Margarita bụ nne nọ na Mexico nke nanị ya na-azụ ụmụ abụọ. “Ọ dịtụghịrị m mfe inye ha ọzụzụ banyere omume ọma na ihe ime mmụọ,” ka o kwuru. “N’otu oge, nwa m nwoke na-eto eto ṅụrọtụrụ anya ka o si oriri lọta. Adọrọ m ya aka ná ntị na o mee ya ọzọ, ọ gaghị abata n’ụlọ a. Ya mere, n’oge ọzọ o mere ya, eji m iwe kpọchipụ ya ụzọ. Ekelere m Chineke na o meghị ya ọzọ.”

Oge na-adịghị anya ka nke ahụ gasịrị, Margarita malitere ịmụ Bible. Nke a nyeere ya aka ịkụnye ụkpụrụ omume ọma n’obi ụmụ ya. Ugbu a, ha abụọ bụ ndị ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova.

Mgbe Di Gara Mba Ofesi

Ọtụtụ ndị nna bụ́ ndị bi ná mba ndị na-emepechaghị emepe na-akwaga ná mba ndị ka mepee emepe ịga chọọ ọrụ, na-ahapụrụ nwunye ha ụmụ ha ka ha zụwa. Laxmi, bụ́ nne bi na Nepal, kwuru, sị: “Di m nọ mba ofesi kemgbe afọ asaa. Ụmụ m na-erubere nna ha isi karịa m. A sị na ọ nọ ya mgbe nile idu ndú, ihe gaara adịkwuru m mfe.”

N’agbanyeghị ihe isi ike ndị ahụ, Laxmi na-enwe ihe ịga nke ọma. Ebe ọ na-agụghị oké akwụkwọ, o mere ndokwa ka ndị gụrụ akwụkwọ nyewere ụmụ ya ndị nke totụworo eto aka n’ihe omume ụlọ akwụkwọ ha. Otú ọ dị, o lekwasịrị nnọọ anya n’inye ọzụzụ ime mmụọ site n’iduziri ha ọmụmụ Bible kwa izu. Ọ na-eduzi ihe mmụta dịịrị ụbọchị kwa ụbọchị ma na-akpọ ha agachi nzukọ Ndị Kraịst anya.

Ndị Nne Na-agụghị Oké Akwụkwọ

Ná mba ụfọdụ, ihe isi ike ọzọ a na-enwe bụ na ọtụtụ ụmụ nwanyị amaghị akwụkwọ. Aurelia bụ nne ji ụmụ isii nke nọ na Mexico. Ka ọ na-akọwa ọghọm dị n’ịbụ nne na-amaghị akwụkwọ, o kwuru, sị: “Mama m na-ekwukarị na e keghị ụmụ nwanyị ịga akwụkwọ. N’ihi ya, amụtaghị m ịgụ na ide ihe, apụghịkwa m inyere ụmụ m aka n’ihe omume ụlọ akwụkwọ e nyere ha mee n’ụlọ. Nke a na-ewute m. Ma, ebe ọ bụ na achọghị m ka ha taa ahụhụ m tara, agbasiri m mbọ ike ịhụ na ha gara akwụkwọ.”

Ọ bụrụgodị na nne agụghị oké akwụkwọ, nke ọ gụrụ agụ baara ya uru dị ukwuu. Ihe a ndị mmadụ na-ekwu bụ eziokwu: “I nye ụmụ nwanyị ọzụzụ, i nyela ndị ga-akụziri ụmụ nwoke ihe ọzụzụ.” Bishnu, bụ́ nne ji ụmụ nwoke atọ nke nọ na Nepal, bụbu itibọrịbọ. Ma, ọchịchọ o nwere ịmụta eziokwu Bible na ịkụziri ha ụmụ ya mere ka ọ gbalịsie ike ịmụta ịgụ na ide ihe. Ọ gbara mbọ ịhụ na ụmụ ya na-eme ihe omume ụlọ akwụkwọ e nyere ha mee n’ụlọ. Ọ na-agakwa n’ụlọ akwụkwọ ha mgbe nile iji soro ndị nkụzi ha kwurịta banyere ihe omume ụlọ akwụkwọ ha.

A bịa n’ọzụzụ e nyere ha banyere omume ọma na ihe ime mmụọ, nwa Bishnu bụ́ Silash kọwara, sị: “Ihe kasị masị m ná mgbalị mama anyị mere ịkụziri anyị ihe bụ na anyị mehie ihe, ọ na-eji ihe atụ Bible agbazi anyị. Ụzọ a o si zie anyị ihe rụpụtara ihe, o nyekwaara m aka ịnabata ndụmọdụ ya.” Bishnu zụlitere ụmụ ya nke ọma, ha atọ bụcha ụmụ okorobịa na-atụ egwu Chineke.

Antonia, bụ́ nne nọ na Mexico nke na-azụ ụmụ abụọ kwuru, sị: “Ọ bụ nanị ụlọ akwụkwọ praịmarị ka m gara. Anyị bi n’otu obodo nta dịpụrụ adịpụ, ụlọ akwụkwọ sekọndrị nke kasị nso tere nnọọ aka site n’ebe anyị bi. Ma, achọrọ m ka ụmụ m gụọ akwụkwọ karịa m. N’ihi ya, ewepụtara m ezigbo oge iji soro ha na-anọ. Akụziiri m ha otú e si agụ A B CH na otú e si agụ ọnụ ọgụgụ. Nwa m nwanyị na-asụpeli aha ya ma na-ede ya ede tupu ya abanye ụlọ akwụkwọ. Nwa m nwoke ma agụ ihe nke ọma n’oge ọ banyere ụlọ akwụkwọ ọta akara.”

Mgbe a jụrụ Antonia ihe o mere iji hụ na ha mụtara omume ọma na ihe ime mmụọ, ọ kọwara, sị: “Ana m akọrọ ha akụkọ Bible. Tupu nwa m nwanyị amụta ikwu okwu, ọ pụrụ ịkọwa ndị dị n’akụkọ Bible site n’ịtụ ha aka. Nwa m nwoke gụrụ Bible mbụ ya n’ihu ọha ná nzukọ Ndị Kraịst n’oge ọ dị afọ anọ.” Ọtụtụ ndị nne na-agụghị oké akwụkwọ na-emeri ihe ịma aka nke ịhụ na ụmụ ha abụghị iti.

Iguzogide Omenala Ndị Na-emebi Ihe

Otu omenala e ji mara ndị Tzotzil nke Mexico bụ ike ụmụ ha di mgbe ha dị afọ iri na abụọ ma ọ bụ iri na atọ. Ọtụtụ mgbe, ndị na-alụ ha na-abụ ndị tọgburu ha atọgbu bụ́ ndị na-achọ nwanyị nke abụọ ma ọ bụ nke atọ ha ga-alụ. Ọ bụrụ na nwoke ahụ enweghịzi mmasị n’ahụ́ nwa ahụ, ọ pụrụ ịkpọlata ya ma nara ego ọ kwụrụ n’isi ya. Omenala a bịara imetụta Petrona mgbe ọ bụ nwata. Otú ahụ ka e si kee nne ya di, ya amụta otu nwa, a gbaa ya alụkwaghịm—ihe a nile mere tupu ya eruo afọ iri na atọ! Nwa mbụ ya ahụ nwụrụ, e kekwara nne Petrona di ugboro abụọ ọzọ mgbe nke ahụ gasịrị. Ná ngụkọta, ọ mụrụ ụmụ asatọ.

Petrona achọghị ibi ụdị ndụ ahụ, ọ kọwakwara otú o si nwee ike izere ya, sị: “Mgbe m pụtara ụlọ akwụkwọ praịmarị, agwara m mama m na achọghị m ịlụ di, na m chọrọ ịgakwu akwụkwọ. Mama m agwa m na ọ dịghị ihe ya pụrụ ime banyere ya, na m gaa gwa papa m.”

Papa m gwara m, sị, “Ana m aga ịchọtara gị di. Ị ma asụ Spanish. Ị ma agụ ihe. Gịnị ọzọ ka ị na-achọ? Ọ bụrụ na ị chọrọ ịgakwu akwụkwọ, ọ bụ gị ga-akwụrụ onwe gị ụgwọ akwụkwọ.”

“Ya mere, emere m otú ahụ,” ka Petrona kọwara. “Abịara m na-eji eri achọ ákwà mma iji na-enweta ego m ji azụ onwe m n’ụlọ akwụkwọ.” Otú ahụ ka o si zere ịbụ onye e kere di mgbe ọ bụ nwata. Mgbe Petrona toro, nne ya malitere ịmụ Bible, nke a nyekwara ya obi ike ịkụnye ụkpụrụ ndị dabeere na Bible n’obi ụmụ ya nwanyị ndị nke Petrona tọrọ. N’ihi ahụmahụ nne ya nwere, ọ bịara nwee ike ime ka ha mara ihe ndị dị njọ omenala nke ike ụmụntakịrị nwanyị di na-akpata.

Omenala ọzọ e nwere n’ọtụtụ ebe bụ na ọ bụ nanị nna ka ọ dịịrị ịdọ ụmụ ya ndị nwoke aka ná ntị n’ime ezinụlọ. Petrona kọwara, sị: “A na-akụziri ụmụ nwanyị Tzotzil na ụmụ nwoke ka ha ukwuu. Ụmụ nwoke na-adị nnọọ aka ike. Ụmụaka ndị nwoke na-eṅomi nna ha, ha na-agwakwa nne ha, sị: ‘Ị gaghị agwa m ihe m ga-eme. Ọ bụrụ na papa m agwaghị m ya, agaghị m eme ya.’ N’ihi ya, ndị nne apụghị ịkụziri ụmụ ha nwoke ihe. Ma ugbu a mama m maara Bible, o nwewo ihe ịga nke ọma n’ịkụziri ụmụnne m ndị nwoke ihe. Ha bu Ndị Efesọs 6:1, 2 n’isi: ‘Ndị bụ́ ụmụ, na-eruberenụ ndị mụrụ unu isi. . . . Sọpụrụ nna gị na nne gị.’”

Mary, bụ́ nne nke nọ Nigeria, kwukwara, sị: “N’ebe m nọ too, ọ bụ omenala na nne ekwesịghị ịkụziri ụmụ ya ndị nwoke ihe ma ọ bụ dọọ ha aka ná ntị. Site n’ịgbaso ihe atụ Bible banyere Lọịs na Yunis—nne Timoti na nne nne ya—ekpebisiri m ike na omenala obodo agaghị egbochi m ịkụziri ụmụ m ihe.”—2 Timoti 1:5.

Omenala ọzọkwa a na-emekarị ná mba ụfọdụ bụ ibi ụmụ nwanyị úgwù. Mgbe a na-ebi úgwù a, a na-ebepụ obere ihe ma ọ bụ nnukwu ihe n’akụkụ ahụ́ ha ji bụrụ nwanyị. Onye mere ka ụmụ ụwa mara banyere omenala a bụ Waris Dirie, bụ́ onye a ma ama e ji egosi ejiji, bụrụkwa onye nnọchianya pụrụ iche nke Ngalaba Òtù Mba Ndị Dị n’Otu nke Na-ahụ Maka Ụba Mmadụ. Dị ka omenala ndị Somalia si dị, nne ya biri ya úgwù mgbe ọ dị obere. Dị ka otu akụkọ si kọọ, ihe nọ n’agbata nde asatọ na nde iri nke ụmụ nwanyị nọ n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa nakwa n’Africa, ma ndị torola eto ma ụmụaka, ka pụrụ ịbụ ndị a ga-ebi úgwù. Ọbụna na United States, a na-ekwu na a ka pụrụ ibi ihe ruru ụmụaka nwanyị 10,000 úgwù.

Olee ihe mere e ji ebi ha úgwù? Ụfọdụ na-eche na akụkụ ahụ́ e ji bụrụ nwanyị rụrụ arụ nakwa na ha na-eme ka nwanyị ghara ịdị ọcha ma si otú ahụ ghara ịdị mma ọlụlụ. Ọzọkwa, a na-ele ibepụ akụkụ ahụ́ ndị a anya dị ka ihe ga-eme ka e jide n’aka na nwanyị agaghị ama nwoke tupu ọ lụọ di nakwa na ọ gaghị abụ ọnọ na di achọ di. Ọ bụrụ na nne ajụ ime omenala a, di ya na ndị obodo ha pụrụ iwesa ya ezigbo iwe.

Otú ọ dị, ọtụtụ ndị nne aghọtawo na ọ dịghị ezigbo ihe metụtara okpukpe, mgbochi ọrịa, ma ọ bụ ịdị ọcha, bụ́ nke mere a ga-eji kwadoo ka a na-eme ụmụ nwanyị ihe a na-afụ ụfụ. Otu akwụkwọ e bipụtara na Nigeria bụ́ Repudiating Repugnant Customs na-egosi na ọtụtụ ndị nne agbasiwo mbọ ike ịhụ na e bighị ụmụ ha nwanyị úgwù.

N’ezie, ndị nne nọ n’ụwa nile anọwo na-enwe ihe ịga nke ọma n’ichebe ụmụ ha nakwa n’inye ha ọzụzụ, n’agbanyeghị ọtụtụ ihe isi ike ha na-enwe. È ji mgbalị ha akpọrọ ihe n’ezie?

[Igbe/Foto dị na peeji nke 5]

“Ọtụtụ nnyocha ndị e mere egosiwo na ọ dịghị atụmatụ mmepe ọ bụla gara nke ọma nke ụmụ nwanyị na-anọghị n’isi ya. Mgbe ha so bụrụ isi sekpụ ntị na ya, a pụrụ ịhụ uru ya ozugbo: ahụ́ na-aka adị ezinụlọ mma, ha na-akakwa eriju afọ; ego ha na-akpata, nke ha na-echekwa, na nke ha na-etinye n’ahịa ha na-ehikwu nne. Otú ọ dị n’ezinụlọ bụkwa otú ọ ga-adị n’obodo, ọ bụkwa otú ọ ga-emesị dị ná mba nile.”—Kofi Annan, bụ́ Odeakwụkwọ Ukwu nke Òtù UN, March 8, 2003.

[Ebe E Si Nweta Foto]

Foto UN/DPI nke Milton Grant sere

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 8]

Ọ Chụrụ Ihe Ụfọdụ n’Àjà Maka Anyị

Juliano, bụ́ nwa okorobịa nọ na Brazil kwuru, sị: “Mgbe m dị afọ ise, mama m na-arụ ọrụ a na-akwụ ya ezigbo ego. Ma mgbe ọ mụrụ nwanne m nwanyị, o kpebiri ịhapụ ọrụ ahụ iji lekọta anyị anya. Ndị ndụmọdụ nke ụlọ ọrụ ha gbara ya ume ka ọ ghara ịhapụ ọrụ ahụ. Ha gwara ya na mgbe ụmụ ya lụrụ di na nwunye pụọ, na ihe nile o meere ha ga-efu ọhịa—na ọ na-etinye oge na ike ya n’ihe ga-aghọ ya ahịa. Ma, ha ekwughị eziokwu; agatụghị m echefu ịhụnanya mama m gosiri anyị.”

[Foto]

Nne Juliano, ebe ya na ụmụ ya nọ; n’aka ekpe: Oge Juliano dị afọ ise

[Foto ndị dị na peeji nke 6]

Bishnu mụtara ịgụ na ide ihe ma nyeziere ụmụ ya nwoke aka ịbụ ndị gụrụ akwụkwọ nke ọma

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Ka obere nwa Antonia na-agụ Bible ná nzukọ Ndị Kraịst

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Petrona bụ onye ọrụ afọ ofufo n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Mexico. Nne ya, bụ́ onye mesịrị ghọọ Onyeàmà, na-akụziri ụmụ ya ndị nke Petrona tọrọ ihe

[Foto dị na peeji nke 8]

Waris Dirie bụ onye a ma ama na-ekwusi okwu ike megide ibi ụmụ nwanyị úgwù

[Ebe E Si Nweta Foto]

Foto si n’aka Sean Gallup/ Getty Images