Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nzukọ Kasị Mkpa n’Afọ—A Na-akpọ Gị Ka Ị Bịa!

Nzukọ Kasị Mkpa n’Afọ—A Na-akpọ Gị Ka Ị Bịa!

Nzukọ Kasị Mkpa n’Afọ—A Na-akpọ Gị Ka Ị Bịa!

Na Thursday, March 24, 2005, a ga-eme otu ememe nke na-ekwesịghị ịkwa gị. Ọ bụ ụbọchị ihe karịrị nde Ndịàmà Jehova isii na ọtụtụ nde ndị enyi ha gburugburu ụwa ga-ezukọ n’ebe dị iche iche, iji cheta nri anyasị ikpeazụ Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya riri. Dị ka Jizọs si nye ntụziaka, a ga-ebugharị achịcha na-ekoghị eko na mmanya na-acha ọbara ọbara ná nzukọ nke ọ bụla. A ga-akọwakwa ihe ememe a pụtara.—Mak 14:22-24.

Ọtụtụ mmadụ na-akpọ ememe a ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị. Ndịàmà Jehova na-akpọ ya Ememe Ncheta ọnwụ Kraịst. Ọ bụ ezigbo ihe nke na-echetara anyị àjà Jizọs Kraịst chụrụ maka ihe a kpọrọ mmadụ na-emehie emehie mgbe ọ nwụrụ. (Jọn 3:16; 1 Jọn 2:2) Mgbe Jizọs richara nri ikpeazụ ya, e jidere ya, e mesịakwa kpọgide ya n’elu osisi dị ka onye omekome nkịtị.—Jọn 19:17, 18.

Ndịàmà Jehova ji obi ụtọ na-akpọ gị ka ị bịa nzukọ a pụrụ iche, bụ́ nzukọ kasị mkpa ha na-enwe n’afọ. Biko, gaa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị n’obodo gị iji mata kpọmkwem oge na ebe a ga-anọ eme ememe a.