Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Okpukpe Katọlik A Gwakọtara Ọdịnala Africa

Okpukpe Katọlik A Gwakọtara Ọdịnala Africa

Okpukpe Katọlik A Gwakọtara Ọdịnala Africa

Site n’aka onye edemede Teta! na Brazil

NA Salvador, bụ́ isi obodo Steeti Bahia, nke dị na Brazil, ihe e ji ama afọ ọhụrụ bụ ememe katara ahụ́. Ọtụtụ narị ndị inyom na-akwụ n’ihu n’ìgwè mmadụ kwụ n’ahịrị na-aga na chọọchị Katọlik nke Bonfim, bụ́ ebe ha na-eji mmiri na-esi ísì ụtọ saa steepụ chọọchị ahụ. A na-eme ememe a n’aha Òòshà Ńlá, bụ́ chi okike n’Africa.

Ihe ruru otu nde mmadụ na-abịa ekiri ememe a. Ka ụda ịgba Africa na-ada ebe nile, ha na-esonye n’oriri na-akpọtụ akpọtụ a na-eme n’okporo ámá, bụ́ nke na-esochizi.

Ememe a e mewere kemgbe afọ 250 gara aga bụ ezigbo ihe atụ nke ngwakọta okpukpe, bụ́ nke e ji mara okpukpe Katọlik ndị Brazil. A na-ekwu na, n’otu ụzọ ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ, ihe karịrị nde iri asaa nke ndị Brazil nọ na Candomblé, Umbanda, Shàngó, nakwa n’okpukpe ọdịnala ndị ọzọ nke ndị isi ojii Brazil. Ma, n’otu mgbe ahụ, ihe ka ọtụtụ n’ime ha sị na ha bụ ndị Katọlik.

Olee otú ngwakọta okpukpe a si malite? Olee otú Chọọchị Katọlik si ele ya anya? Ngwakọta okpukpe ọ̀ bụ ihe a ga-akwado ka ọ̀ bụ ihe a ga-ezere?

‘Ihe Ga-eme Ka Ndị Mmadụ Bata n’Ezi Okpukpe’

Ọnụ ọgụgụ a na-enye dịgasị iche iche, ma o yiri ka e buuru ihe karịrị nde ndị Africa isii si Yoruba, Bantu, na agbụrụ ndị ọzọ gaa Brazil dị ka ndị ohu n’agbata afọ 1540 na 1888, bụ́ mgbe a kwụsịrị ahịa ohu. N’ihi ya, ngwakọta a gwakọtara nkwenkwe ndị ọgọ mmụọ Africa na okpukpe Katọlik na Brazil bụ ihe e ketara n’aka ndị ohu.

Ka Chọọchị Katọlik siri ọnwụ na ha ga-atọghatarịrị ndị ohu nile, ha bịara kwadoo ka e webata ihe ụfọdụ e ji mara okpukpe ọdịnala Africa n’ime okpukpe Katọlik. Dị ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Roger Bastide si kwuo, ndị Jesuit na-eje ozi ala ọzọ kweere na, dị ka e si arata ụmụaka, e kwesịrị iji iti egwu, ịgba egwu, tinyere echichi na ọkwá ukwu, bụ́ ihe ndị na-amasị ndị Africa, rabata ha n’okpukpe Katọlik. Bastide na-ekwu, sị: “E kwesịghị ịmanye ha ịhapụcha omenala obodo ha, kama e kwesịrị inyocha ha ma jiri ndị nke a nabatara rata ha iji mee ka ha bata n’ezi okpukpe.”

N’ọtụtụ okpukpe ọdịnala ndị Africa, dị ka ndị nke a raara nye “Senti” Benedict na Virgin of the Rosary ndị Katọlik, e mere ka ọtụtụ ọdịnala Africa ghọọ nke “Ndị Kraịst.” Otu ugbo n’afọ, n’ụbọchị oriri nke “Senti” Benedict, ndị nọ n’okpukpe ọdịnala ndị a na-esi n’etiti onwe ha ahọpụta eze na lọọlọ, bụ́ nke e nwetara n’omenala Africa nke bụ́ eze pụọ eze anọchie.

“Ndị Nsọ” Ka Ọ̀ Bụ Òrìshà?

Nkwenkwe bụ́ na e nwere ọtụtụ ndị na-arịọchitere mmadụ arịrịọ n’ihu Chineke bụ ihe a ma ama n’okpukpe Katọlik nakwa n’okpukpe ọdịnala Africa. Dị ka ihe atụ, ndị Yoruba kweere n’òrìshà. E weere na ha bụ ndị dike na ndị eze bụ́zi mmụọ, bụ́ ndị na-achịkwa ikike ndị sitere n’okike ma nọrọ dị ka ndị ogbugbo n’etiti mmadụ na chi ukwu ha, bụ́ Ọlọrụn. N’ụzọ yiri nke ahụ, ndị Roman Katọlik kweere na “ndị nsọ” na-arịọchitere mmadụ arịrịọ n’ihu Chukwu. Ha na-akpọkukwa “ndị nsọ” ụfọdụ maka nchebe n’ihe ụfọdụ ha na-eme.

Kama ịhapụ ife òrìshà ha, ọtụtụ ndị ohu nọgidere nnọọ na-efe ha, ma mee ka à ga-asị na ọ bụ “ndị nsọ” na-eme ihe e ji mara òrìshà ahụ ka ha na-efe. N’ihi ya, chi agha ndị Yoruba, bụ́ Ogun, bịaziri ghọọrọ ha “ndị nsọ” Katọlik bụ́ Anthony na George, ndị bụ́cha ndị agha na ndị dike nke Krisendọm.

N’ụzọ yiri nke ahụ, Yemọja, bụ́ nne òrìshà nile, bụrụkwa mmụọ mmiri, kwekọrọ n’ọtụtụ onyinyo nke Meri Nwanyị Na-amaghị Nwoke. E weere na Onyenwe Bonfim, bụ́ “onye nsọ” kasị ewu ewu na Salvador, na Òòshà Ńlá, bụ́ òrìshà kasị ukwuu n’ala Yoruba, bụ otu. A ka na-ahụ njikọ a n’ememe ahụ a na-eme kwa afọ nke bụ́ ịsa steepụ chọọchị Bonfim. *

“Ndị obodo a ji obi ha nile kwenyesie ike n’ebe Jizọs, ndị nsọ Katọlik, na òrìshà nọ,” ka otu onyeisi chọọchị Katọlik nke si Salvador kwuru. Onye Brazil bụ́ ọkà n’ihe metụtara omenala obodo kwukwara, sị: “Ọtụtụ na-ekpe okpukpe abụọ n’otu mgbe. Ha si Mas Chọọchị Katọlik pụta, ha agawa ozugbo n’ebe ndị òtù candomblé [nke Africa] na-ezukọ.”

Ngwakọta a a na-agwakọta okpukpe Katọlik na ọdịnala Africa na-akpata esemokwu. Lucas Moreira, onye bụ́bu onyeisi oche nke Òtù Ndị Bishọp Chọọchị Katọlik nke Brazil, kwuru, sị: “Onye ọ bụla kwesịrị ikpewe okpukpe nke ya, n’agwakọtaghị okpukpe.” Ma, onye bishọp Katọlik ọzọ kwuru, sị: “Ngwakọta okpukpe bụ ihe na-eme eme nke karịrị chọọchị ike.”

A ga-ama mbe abụọ nke bụ́ óké. Ụfọdụ ndị isi chọọchị na-eguzogide ihe ha weere dị ka ịgọ mmụọ na ikpere arụsị, ebe ndị ọzọ na-ekwusi okwu ike ka e webata ihe oyiyi ndị Africa na egwú ha n’ememe Chọọchị Katọlik.

Gịnị Ka Jizọs Ga-ekwu?

Jizọs Kraịst, bụ́ Onye guzobere Iso Ụzọ Kraịst, kwusaara ndị na-ekpe okpukpe dịgasị iche iche na ndị si agbụrụ dịgasị iche iche ozi ọma. Ma, ọ tara ụkwa jaa ezé mgbe o kwuru, sị: “Ndị na-efe ezi ofufe ga-efe Nna m n’ime mmụọ na n’eziokwu, n’ihi na, n’ezie, Nna m na-achọ ka ndị dị otú ahụ fee ya ofufe.” (Jọn 4:23) Ọzọkwa, Jizọs kọwara na Nna ya, bụ́ Jehova Chineke, na-eji Okwu Ya, bụ́ Bible, ekpughe eziokwu ahụ.—Jọn 17:17.

Jizọs nyere ụmụazụ ya ntụziaka izi ‘ndị nke mba nile ka ha debe ihe nile o nyere n’iwu.’ (Matiu 28:19, 20) Ọ dịtụghị mgbe ọ tụrụ aro ka ha gbanwee ihe ọ kụziiri ha iji rata ndị na-agbaso ọdịnala na nkwenkwe dị iche. N’oge ndịozi, ụfọdụ nwara iwebata echiche na omenala nke okpukpe ọzọ. Ma, a katọrọ ha. “Sinụ n’etiti ha pụọ, kewapụkwanụ onwe unu,” ka Pọl onyeozi dere, “[Chineke] ga-anabatakwa unu.”—2 Ndị Kọrint 6:17.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 14 Dị ka Dicionário de Cultos Afro-Brasileiros (Akwụkwọ Ọkọwa Okwu nke Okpukpe Ndị Isi Ojii Brazil) si kwuo, ememe ịsa steepụ chọọchị Bonfim yiri nnọọ ememe ndị Yoruba. Akwụkwọ ọzọ kwukwara na ihe a na-akpọ ememe a bụ ememe mmiri Òòshà Ńlá, nke ihe a na-eme na ya bụ ịsa àwè (nnukwu ite) nke Òòshá Ńlá.

[Foto ndị dị na peeji nke 20]

Ụmụ nwanyị isi ojii Brazil, bụ́ ndị isi chọọchị, ka ha na-asa steepụ chọọchị ahụ

Ka ìgwè mmadụ gbakọrọ na steepụ chọọchị Bonfim, nke dị na Brazil

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

N’elu: De: A Tarde—Wilson da Rocha Besnosik; n’okpuru: De: A Tarde—Antônio Queirós