Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú M Pụrụ Isi Na-achịkwa Mmetụta M?

Olee Otú M Pụrụ Isi Na-achịkwa Mmetụta M?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Olee Otú M Pụrụ Isi Na-achịkwa Mmetụta M?

“Ana m ewesa ndị mụrụ m iwe ma na-ekwu ihe m na-achọghị ikwu. Ana m apụrụ ha ruo mgbe obi dajụrụ m.”—Kate, ọ dị afọ 13.

“Obi erughị ala bụ ihe kasị enye m nsogbu. Ọ na-adị m mgbe ụfọdụ ka m na-anwụ n’ime.” —Ivan, ọ dị afọ 19.

M METỤTA na-esi ike. Ọ na-emetụta ụzọ i si eche echiche ma na-eme omume. Ọ pụrụ ịkpali gị ime ma ihe ọma ma ihe ọjọọ. Mgbe ụfọdụ, ọ pụdịrị ịdị gị ka ọ̀ karịrị gị akarị n’ahụ́. Jacob, bụ́ onye dị afọ iri abụọ kwuru, sị, “Ọ naghị adị m ka m na-emete ihe. Ọtụtụ mgbe, anaghị m emete ihe otú m tụrụ anya ya. Mgbe ụfọdụ, nanị ihe m na-eme bụ ibe ákwá, ma ọ bụkwanụ iwe ejide m ruo n’ókè nke na m na-ewesa ya ndị mụ na ha nọ. Ọ na-esiri m ike ịchịkwa mmetụta m.”

Otu n’ime ihe ndị ga-eme ka mmadụ bụrụ onye tozuru etozu, nke ji ihe akpọrọ ihe, bụ ya ịmụta ịchịkwa mmetụta ya. Ụfọdụ ndị ọkachamara na-eche ugbu a na mmadụ ịchịkwali mmetụta ya ma soro ndị ọzọ na-emekọ ihe, bara uru karịa mmadụ inwe ụbụrụ na-aghọ nkọ. Nke ọ sọrọ ya bụrụ ya ka baa uru, Bible weere mmadụ ịchịkwa mmetụta ya dị ka ihe dị oké mkpa. Dị ka ihe atụ, Ilu 25:28 na-ekwu, sị: “Obodo e tikpọrọ etikpọ nke mgbidi na-adịghị ka onye ọ bụla nke na-adịghị egbochi mmụọ ya bụ.” Gịnị na-eme o ji esi nnọọ ike mmadụ ịchịkwa mmetụta ya?

Ihe Ịma Aka Nye Ndị Ntorobịa

Ọ na-abụrụ ndị nọ n’afọ ndụ dịgasị iche iche na ndị a zụlitere n’ụzọ dịgasị iche iche ọgụ na mgba ịchịkwa mmetụta ha. Ma, nke a pụrụ ịta akpụ karịsịa mgbe mmadụ si n’oge uto ya na-abanye n’ịbụ okenye. Akwụkwọ bụ́ Changing Bodies, Changing Lives, nke Ruth Bell dere, kwuru, sị: “Ihe ka ọtụtụ ná ndị na-eto eto na-enwe mmetụta dịgasị iche iche. N’otu oge, ha akpawa àgwà ka ndị isi na-adịghị mma, oge ọzọ obi adị ha mma, oge ọzọ ụjọ atụwa ha, oge ọzọ ha agaghị ama otú obi dị ha adị. Mmetụta ọtụtụ mmadụ na-enwe banyere otu ihe n’otu oge na-adịgasị nnọọ iche. . . . I nwere ike inwe mmetụta ụfọdụ ugbu a, n’ime minit ọzọ, mmetụta ị ga-enwe adị nnọọ iche.”

Dị ka onye na-eto eto, i nwebeghịkwa ezi uche ma ọ bụ ahụmahụ. (Ilu 1:4) N’ihi ya, oge mbụ ị hụrụ onwe gị n’ụdị ọnọdụ ị na-anọtụbeghị ma nwee ihe ịma aka ọhụrụ, ọ bụ nnọọ ihe dị otú o kwesịrị na obi agaghị erucha gị ala, ikekwe ọ ga-erikwa gị ọnụ. Ọ dabara nnọọ adaba na Onye Okike gị na-aghọta nke ọma mmetụta ị na-enwe. Ọ maara ọbụna “iche uche” gị nile. (Abụ Ọma 139:23) N’Okwu ya, o setịpụwo ụkpụrụ ụfọdụ ndị pụrụ inye aka.

Ihe Na-enye Aka n’Ịchịkwa Mmetụta

Otu ihe ga-enyere gị aka ịchịkwa mmetụta gị bụ ịmụta ịchịkwa ihe ị na-eche n’echiche. Echiche ọjọọ pụrụ ịnapụ gị ike ị ga-eji mee ihe. (Ilu 24:10) Ma, olee otú ị pụrụ isi mụta iche echiche ziri ezi ma si otú a bụrụ onye e nyeere aka ịchịkwa mmetụta ya?

Otu ụzọ bụ site n’ịghara ịdị na-eche echiche ọjọọ ndị na-eme ka ị daa mbà n’obi ma ọ bụ nwee obi erughị ala. Site n’ịgbaso ndụmọdụ Bible bụ́ ilekwasị anya n’ihe ọ bụla nke “kwesịrị nchebara echiche” na nke bụ́ “ezi omume,” ị pụrụ iji echiche ọma dochie nke ọjọọ. (Ndị Filipaị 4:8) E nwere ike ọ gaghị adị mfe omume, ma i tinye mgbalị, ị ga-emeli ya.

Tụlee banyere nwa agbọghọ aha ya bụ Jasmine. Ọ kwara arịrị n’otu oge, sị, “Ọ na-adị m nnọọ ka ihe ndị na-eche m ihu hà karịrị m akarị n’ahụ́. Ọrụ ọhụrụ, ibu ọrụ ọhụrụ. Ọ na-agwụcha m ike. Ọ na-esiri m ike ịṅụ mmiri tọgbọ iko.” Ọ bụghị ihe ijuanya na onye na-eto eto na-enwe mmetụta dị otú a mgbe ụfọdụ. Ọ pụkwara ime ka obi ghara iru ya ala, ka ọ ghara ịma ihe ọ ga-eme. Bible na-akọrọ anyị banyere nwa okorobịa aha ya bụ Timoti, bụ́ onye ruru nnọọ eru ịrụ ọrụ e nyere ya. N’agbanyeghị nke ahụ, o yiri ka ọ̀ dị mgbe ọ dị ya ka o rughị eru ịrụ ọrụ ahụ.—1 Timoti 4:11-16; 2 Timoti 1:6, 7.

O yiri ka mgbe obi na-adịghị eru gị ala ọ̀ bụ mgbe i nwere ọrụ ọhụrụ ma ọ bụ ọrụ na-edoghị gị anya ị ga-arụ. Ị pụrụ ịgwa onwe gị, sị, ‘Agaghị m arụli ọrụ a ma ọlị.’ Ma, ị pụrụ ime ka mmetụta dị otú ahụ nke ịbụ onye na-erughị eru ịrụ ọrụ ahụ kwụsị site n’ịghara ile ọrụ ahụ anya n’ụzọ na-adịghị mma. Tinye uche n’ịmụta otú e si arụ ya nke ọma. Jụọ ajụjụ, ma gbasoo ntụziaka e nyere.—Ilu 1:5, 7.

Ka aka na-esikwu gị ike n’ọrụ, otú ahụ ka obi ga na-esikwu gị ike na ya. Anọla na-eche banyere ebe ndị ị na-emetaghị nke ọma, ekwela ka ha mee ka ị daa mbà ma gbochie gị itinyekwu mgbalị n’imeziwanye ihe. N’otu oge, mgbe a katọrọ Pọl onyeozi, ọ zaghachiri, sị: “Ọ bụrụgodị na abụghị m ọkà n’ikwu okwu, n’ezie adịghị m otú ahụ n’ihe ọmụma.” (2 Ndị Kọrint 10:10; 11:6) N’otu aka ahụ, ị pụrụ ime ka obi sikwuo gị ike site n’ikweta na e nwere ebe ndị ị na-eme nke ọma nakwa site n’ijekwuru Chineke maka enyemaka iji mezie ebe ndị ị na-adịghị eme nke ọma. N’ezie, Chineke pụrụ inyere gị aka dị ka o nyeere ndị mmadụ n’oge gara aga.—Ọpụpụ 4:10.

Ụzọ ọzọ ị pụrụ isi na-achịkwa mmetụta gị bụ site n’isetịpụ ihe mgbaru ọsọ ndị dị mma, bụ́ ndị ị ga-eruli, nakwa site n’ịma ebe ike gị ruru. Zerekwa iji onwe gị na-atụnyere ndị ọzọ n’ụzọ na-enweghị isi. Ná Ndị Galeshia 6:4, Bible nyere ezigbo ndụmọdụ mgbe o kwuru, sị: “Ka onye ọ bụla na-anwapụta ihe ọrụ nke ya bụ, mgbe ahụkwa ọ ga-eme ka o nwee aṅụrị n’ihe banyere nanị onwe ya, ọ bụghịkwa n’iji onwe ya tụnyere onye nke ọzọ.”

Ime Ka Iwe Dajụọ

Ịchịkwa iwe pụrụ ịbụ ihe ịma aka ọzọ siri ike. Dị ka ọ dị n’ebe Kate, bụ́ onye a kpọtụrụ aha ná mmalite nọ, iwe na-eme ka ọtụtụ ndị na-eto eto kwuo ihe ndị na-akpasu iwe ma ọ bụ na-emebi ihe.

N’eziokwu, iwe iwe mgbe ụfọdụ adịghị njọ. Ma, cheta ogbu mmadụ mbụ, bụ́ Ken. Mgbe o were “iwe dị ọkụ nke ukwuu,” Chineke dọrọ ya aka ná ntị na iwe dị otú ahụ pụrụ iduga ya n’ime mmehie dị oké njọ. Ọ gwara Ken, sị: “O kwesịrị ka gị onwe gị chịa [mmehie].” (Jenesis 4:5-7) Ken anaraghị ndụmọdụ a sitere n’aka Chineke, ma site n’enyemaka Chineke, ị pụrụ ịchịkwa iwe gị ma zere ime mmehie!

Ọzọkwa, ọ pụtara na ị ga na-achịkwa ihe ndị ị na-eche n’echiche. N’Ilu 19:11, Bible na-ekwu, sị: “Ezi uche mmadụ na-eme ka ọ ghara iwe iwe ọsọ ọsọ; ọ bụkwa ịma mma ya ịgabiga njehie.” Mgbe mmadụ mere ihe were gị iwe, gbalịa ịghọta ihe mere o ji kpaa ụdị àgwà ahụ. Ọ̀ kpachaara anya chọọ ịkpasu gị iwe? Ọ̀ pụrụ ịbụ na o mere ya n’ihi na o cheghị echiche nke ọma ma ọ bụkwanụ n’ihi amaghị ihe? Mgbe ị na-anabata amaghị eme nke ndị ọzọ, ị na-egosipụta ụdị ebere Chineke, ọ pụkwara inye aka mee ka iwe gị dajụọ.

Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na iwe ị na-ewe kwesịrị ekwesị? Akwụkwọ Nsọ na-ekwu, sị: “Weenụ iwe, ma unu emehiekwala.” (Ndị Efesọs 4:26) Ọ dịrị mkpa, gị na onye ahụ kwurịta ya. (Matiu 5:23, 24) Ikekwe, ihe kasị mma ime bụ ileghara ihe ahụ merenụ anya—hapụ iwe iwe ma dịrị ndụ gị gawa.

Ọ dị mma ịmara na ndị enyi gị pụrụ inwe mmetụta n’otú i si achịkwa iwe gị. N’ihi ya, Bible na-enye nduzi a, sị: “Gị na onye iwe abụla enyi; ị gaghị esokwa onye ọnụma baa n’ụlọ: ka i wee ghara ịmụta ụzọ ya nile, wee wetara mkpụrụ obi gị ọnyà.”—Ilu 22:24, 25.

Ịnọ gburugburu ndị na-agbalị ịchịkwa iwe ha pụrụ inyere gị aka ịmụta inwe njide onwe onye. N’ọgbakọ Ndịàmà Jehova, e nwere ọtụtụ ndị dị otú ahụ tozuru etozu, ọtụtụ n’ime ha tọrọ gị ma nwee ahụmahụ karịa gị. Gbalịa mata ụfọdụ n’ime ha. Chọpụta otú ha si na-anagide nsogbu. Ha pụkwara inye gị “ezi ndụmọdụ” mgbe ihe na-esiri gị ike. (Ilu 24:6) Jacob, bụ́ onye e hotara ihe o kwuru na mbụ kwuru, sị: “Enyi tozuru okè nke pụrụ ichetara m ihe Okwu Chineke kwuru bụụrụ m enyi na-enweghị atụ. Mgbe m chetara na Jehova hụrụ m n’anya n’agbanyeghị obi erughị ala m na-enwe, ana m enwe ike ịchịkwa mmetụta m ma nwee ahụ́ iru ala.”

Ihe Ndị Ọzọ Dị Mma I Kwesịrị Ime

Otu akwụkwọ a ma ama nke na-ekwu banyere mmega ahụ́ kwuru, sị: “Ọtụtụ nnyocha e mere egosiwo na, n’ihi mmiri ọgwụ ahụ́ gị, otú i si emegharị ahụ́ na-emetụta otú obi na-adị gị. Ókè mmiri ọgwụ na ikuku oxygen dị n’ahụ́ gị haruru na-agbanwe, na-adabere n’otú i si megharịa ahụ́.” Obi abụọ adịghị ya, mmega ahụ́ bara uru. Bible na-agwa anyị, sị: “Ọzụzụ nke ahụ́ bara uru nke nta.” (1 Timoti 4:8) Ọ ga-adị mma ma ị malite ịdị na-emega ahụ́ mgbe nile ruo n’ókè kwesịrị ekwesị. Ọ pụrụ ime ka obi na-eru gị ala. Iri ezigbo nri mgbe nile pụkwara ịba uru.

Tụleekwa ụdị egwú ị na-ege na ntụrụndụ ndị ị na-enwe. Otu nnyocha e mere bụ́ nke e bipụtara n’akwụkwọ bụ́ The Harvard Mental Health Letter kwuru, sị: “Ikiri ebe a na-eme ihe ike . . . yiri ka ọ̀ na-akpali mmadụ iwe iwe na inwe ọchịchọ ime ihe ike ike. . . . Ndị na-ekiri ihe ike a na-eme na vidio na-echekarị echiche ime ihe ike, ha na-enwetụkwa ọbara mgbali elu.” N’ihi ya, na-eme mkpebi ndị amamihe dị na ha ma a bịa n’ụdị ihe ị na-ege na ihe ị na-ekiri.—Abụ Ọma 1:1-3; 1 Ndị Kọrint 15:33.

E meekwa elu mee ala, ụzọ kasị mma isi mụta ịchịkwa mmetụta gị bụ site n’ịmalite iso Onye Okike gị na-enwe mmekọrịta chiri anya. Ọ na-akpọ onye ọ bụla n’ime anyị iji ekpere na-agwa ya okwu, ịkọrọ ya mmetụta na echiche anyị. “Unu enwela nchegbu banyere ihe ọ bụla,” ka Pọl onyeozi gbara ume ya. “Meenụ ka Chineke mara ihe unu na-arịọ; udo nke Chineke nke karịrị echiche nile ga-echekwa obi unu na ike iche echiche unu nche.” Ee, ị pụrụ inweta ike iji nagide ọnọdụ ọ bụla ná ndụ. Pọl onyeozi kwukwara, sị: “Maka ihe nile enwere m ume site n’onye ahụ nke na-enye m ike.”—Ndị Filipaị 4:6, 7, 13.

Otu nwatakịrị nwanyị aha ya bụ Malika kwuru, sị: “Amụtawo m ikpe ekpere n’esepụghị aka. Ịmara na Jehova na-eche banyere m enyeworo m aka inwe ahụ́ iru ala ma na-achịkwakwu mmetụta m.” Site n’enyemaka Chineke, gị onwe gị pụrụ ịmụta ịchịkwa mmetụta gị.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 13]

Otu ihe ga-enyere gị aka ịchịkwa mmetụta gị bụ ịmụta ịchịkwa ihe ị na-eche n’echiche

[Foto dị na peeji nke 14]

Iso ndị meworo okenye na-akpakọrịta pụrụ ime ka ị mụta otú ị ga-esi na-achịkwa mmetụta gị