Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“À Pụrụ Ime Ka Ndị Mkpọrọ Gbanwee?”

“À Pụrụ Ime Ka Ndị Mkpọrọ Gbanwee?”

“À Pụrụ Ime Ka Ndị Mkpọrọ Gbanwee?”

Nke ahụ bụ ajụjụ gbara n’ihu Teta! nke May 8, 2001. Ọtụtụ ndị gụrụ Teta! ahụ gosiri ekele ha nwere maka usoro isiokwu a, bụ́ nke gụnyere akụkọ banyere ọrụ izi ihe dabeere na Bible nke Ndịàmà Jehova na-arụ n’ụlọ mkpọrọ gọọmenti etiti dị n’Atlanta, Georgia, U.S.A. Okwu ndị na-esonụ bụ ụfọdụ n’ime ihe ndị e dere n’ọtụtụ akwụkwọ ozi a natara.

▪ “Ruo afọ asatọ m nọrọ mkpọrọ, achọpụtara m na ihe gara nke ọma n’ezie bụ ọrụ izi ihe dabeere na Bible nke Ndịàmà Jehova na-arụ n’ụlọ mkpọrọ. Mgbe m nọ mkpọrọ n’ụlọ mkpọrọ dị n’Atlanta, enwere m ihe ùgwù nke iso mmadụ ise n’ime ndị ahụ e gosiri n’isiokwu dị na magazin unu, rụkọọ ọrụ. Enwere m nnọọ ekele n’ihi ịhụnanya ha gosiri m na nkwado ha nyere m. Ana m ekele ụmụnna ndị dị otú a, bụ́ ndị gosiworo anyị bụ́ ndị meworo ihe ọjọọ ma na-agbalịzi idozi ụzọ anyị iji ghọọ ezigbo mmadụ, ịhụnanya.”—R. J.

▪ “Ka ọ dị ugbu a, anọ m n’ogige ebe a na-agbazi ndị mkpọrọ. Ụmụnna anyị ndị na-amụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị nso malitere usoro izi ihe magburu onwe ya n’ogige a. N’ihi ya, e mewo onye a tụkọrọ mụ na ya mkpọrọ baptizim, mụ onwe m kwa, ọ bụ ezie na m bụbu onye a chụpụrụ n’ọgbakọ Ndị Kraịst, a nabatawo m ugbu a. A na-eduziri ọtụtụ ndị ọzọ ọmụmụ Bible. Ọ bụ ihe na-agba ume ịmara na anyị na-ekere òkè n’ọrụ izi ihe a na-arụ n’ụwa nile. Lee ihe magburu onwe ya ọ bụ ijere Jehova ozi, n’agbanyeghị ebe anyị nọ!”—J. M.

▪ “N’afọ 1970, a tụrụ m mkpọrọ n’ihi mpụ m na-emeghị. Anọrọ m mkpọrọ ruo afọ iri na anọ. Mgbe m nọ n’ụlọ mkpọrọ, mụ na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ Bible. Otú ha si eme ihe n’eziokwu na mmasị ha nwere n’ebe anyị nọ masịrị m nke ukwuu. Mgbe a tọhapụrụ m, mụ na ha nọgidekwara na-amụ Bible, e mekwara m baptizim n’oge na-adịghị anya a tọhapụsịrị m. Mgbe ụfọdụ, ahụhụ m tara n’ihi ikpe mkpegbu ahụ e kpere m ka na-ewe m iwe ma na-akụda m mmụọ. Ma ana m echetara onwe m na n’isi nso, Jehova ga-eme ka ikpe mkpegbu na nhụjuanya kwụsị kpamkpam. Ndị mkpọrọ pụrụ ịgbanwe ma ha gbasoo ntụziaka dị na Bible. Ha pụkwara inwe ekele maka mgbalị ụmụnna anyị na-arụsị ọrụ ike na-eme, bụ́ ndị na-ewepụta oge ha iji nyere ha aka. Ana m enwe ekele maka ya n’ezie!”—R. S.

▪ “Mgbe m gara mkpọrọ, ana m ese ụtaba, na-aṅụ ọgwụ ike, na-ekwu okwu rụrụ arụ, ọ dịghịkwa ndị isi ọ bụla m na-akwanyere ùgwù. Anọkwa m n’òtù ọjọọ. Tụkwasị n’ihe ndị a nile, a chụpụkwara m n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Ugbu a, anabatawo m, ana m enwekwa ezigbo ọganihu. N’ihi eziokwu ahụ, ọ dị m ka m nwerela onwe m!”—I. G.