Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

(A pụrụ ịchọta azịza nke ajụjụ ndị a n’akụkụ Bible ndị e zoro aka na ha, e bipụtakwara azịza ha nile na peeji nke 14. Iji nwetakwuo ihe ọmụma, lee akwụkwọ bụ́ “Insight on the Scriptures,” nke Ndịàmà Jehova bipụtara.)

1. Olee obodo ndị na-eso ụzọ Jizọs kwọ ụgbọ ha na-aga mgbe ha hụrụ Jizọs ka ọ na-aga ije n’elu oké osimiri? (Mak 6:45-49)

2. Olee aha Jizọs nyere Saịmọn nwa Jọn? (Jọn 1:42)

3. Olee ihe onye ọ bụla chọrọ ịbụ onye mbụ n’etiti ụmụnna ya na-aghaghị ịbụrụ ha? (Mak 10:44)

4. Olee obodo ndị Kaldia nke Jehova gwara Ebram ka o si na ya pụọ? (Jenesis 11:31; 12:1)

5. N’ihi gịnị ka e ji katọọ ịgba afa n’Iwu Chineke nyere Izrel? (Deuterọnọmi 18:10-13)

6. Olee ngọzi ndị Jizọs kwuru na Ndị Kraịst ga-enweta mgbe ha kpọrọ ndị ogbenye, ndị nwere nkwarụ, ndị ngwụrọ, na ndị ìsì n’oriri ha? (Luk 14:13, 14)

7. Mgbe mmadụ nwụrụ, gịnị na-eso ya ala n’iyi? (Eklisiastis 9:6)

8. Olee otú ụzọ Jehova si agụ oge si dịrị iche na nke anyị? (2 Pita 3:8)

9. Olee ihe Ndị Kraịst pụrụ ịtụ anya inweta site n’ịzụ ikike nghọta ha? (Hibru 5:14)

10. Gịnị mere Belam ji tie nne ịnyịnya ibu ya ihe? (Ọnụ Ọgụgụ 22:22-25)

11. Gịnị bụ uwe igbochi obi nke nnukwu onye nchụàjà na-eyikwasị n’elu uwe mwụda ya na-acha anụnụ anụnụ? (Ọpụpụ 28:4, 31)

12. Olee obodo nke abụọ ụmụ Izrel meriri mgbe ha wakporo Kenan? (Joshua 8:18, 19)

13. Jizọs kwuru na a bịa ná ndị inyom nile di ha nwụrụ nọ n’oge Ịlaịja, otu nanị ka e zigara Ịlaịja na nke ya, olee onye nke ọ bụ? (Luk 4:26)

14. Olee ụkpụrụ Jizọs kụziri ma a bịa n’otú anyị ga-esi na-emeso ndị kpọrọ anyị asị ihe? (Matiu 5:44)

15. Gịnị ka nne Solomọn kpaara ya n’ụbọchị ọ lụrụ nwanyị? (Abụ Nke Abụ 3:11)

16. Dị ka Solomọn si kwuo, gịnị mere o ji bụrụ na, mgbe ụfọdụ, ọ bụghị ndị nwere ụkwụ ọsọ ka ịwụ ọsọ dịịrị? (Eklisiastis 9:11)

17. Gịnị bụ aha ụmụ ndị ikom Josef abụọ, bụ́ ndị e si na ha nweta ebo abụọ nke ụmụ Izrel? (Jenesis 41:50-52)

18. Jekọb ọ̀ gwara Fero na ya abụwo onye ọbịa ruo afọ ole? (Jenesis 47:7-9)

19. Olee ihe Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya riri n’abalị bọtara ụbọchị ọ nwụrụ? (Luk 22:20)

20. Gịnị bụ aha nwoke ahụ nwere ahụ́ mkpọnwụ Pita gwọrọ, bụ́ onye na-esighị n’ihe ndina nta ya bilie ruo afọ asatọ? (Ọrụ 9:33, 34)

21. Ònye ka a kpọrọ “nne mmadụ nile nwere ndụ”? (Jenesis 3:20)

Azịza Nye Ajụjụ

1. Betseida

2. Sifas

3. Ohu ha

4. Ọọ

5. Ọ bụ otu ụdị nke ịjụ ndị mmụọ ase, bụrụkwa ihe arụ n’anya Jehova

6. Ha ga-enweta obi ụtọ, Chineke ga-akwụkwa ha ụgwọ, ebe ọ bụ na ndị ahụ agaghị enwe ike ịkwụghachi ha

7. Ịhụnanya ya, ịkpọasị ya, na ekworo ya

8. N’ebe Jehova nọ, otu puku afọ dị ka otu ụbọchị

9. Itozu okè, inwe ikike ịmata ọdịiche dị n’ihe ziri ezi na ihe ọjọọ

10. N’ihi na ịnyịnya ahụ hụrụ mmụọ ozi Chineke nọchiri ụzọ, o wee hapụ ụzọ banye n’ọhịa

11. Efọd

12. E-aị

13. Nwanyị di ya nwụrụ nke “Zarefat dị n’ala Saịdọn”

14. “Na-ahụ ndị iro unu n’anya”

15. Okpueze

16. N’ihi “mgbe na ihe ndapụta”

17. Manase na Ifrem

18. Otu narị na iri atọ

19. Nri anyasị

20. Anias

21. Iv