Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Bịaruo Onye Okike Nso

Bịaruo Onye Okike Nso

Bịaruo Onye Okike Nso

Mgbe otu nwanyị si California, U.S.A. gụsịrị akwụkwọ bụ́ Bịaruo Jehova Nso, o dere, sị: “Ọ ga-amasị m ịkọrọ unu otú ịgụ na ịtụgharị uche n’akwụkwọ a siworo mee ka ndụ m na mmekọrịta mụ na Nna anyị nke eluigwe ka mma. Ugbu a ka ọ dị m ka Jehova ọ̀ bụ enyi m. Nke a bụ akwụkwọ mbụ m gụtụrụla ya akpalie m ịchị ọchị na ibe ákwá, nke ihe m gụtara na ya riri m ọnụ, mụ ekpegakwara Jehova ekpere ozugbo. Ịhụnanya m nwere n’ebe Jehova nọ karịrị nnọọ akarị nke na apụghị m ịkọwa ya, amakwaara m na akwụkwọ a so n’ihe mere o ji dị m otú a.”

Anyị nwere olileanya na gị onwe gị ga-eritekwa uru ma ị gụọ akwụkwọ a bụ́ Bịaruo Jehova Nso, nke dị peeji 320. Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inweta otu akwụkwọ a, biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị. Ọ bụrụ na ị ga-enwe mmasị ka mmadụ kpọtụrụ gị, biko dejupụta akụkụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta dị na peeji a ma zite ya n’adres e dere na ya ma ọ bụ n’adres nke kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 5 na magazin a.

□ Biko kpọtụrụnụ m iji duziere m ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.