Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Enyemaka Maka Ndị Ntorobịa nke Oge A

Enyemaka Maka Ndị Ntorobịa nke Oge A

Enyemaka Maka Ndị Ntorobịa nke Oge A

NDỊ ntorobịa nke oge a na-etolite n’ụwa nke pụrụ iyi ihe na-eyi egwu mgbe ụfọdụ. Ụfọdụ n’ime ha na-anọ na-ele n’anya n’enweghị ihe ọ bụla ha pụrụ ime ka nne ha na nna ha na-ekewa ma ọ bụ na-agba alụkwaghịm. Ndị ọzọ na-ahụ ka ụmụ akwụkwọ ibe ha na-adaba n’ịṅụ ọgwụ ike nakwa n’ime mpụ. Ọtụtụ na-enweta nrụgide nke inwe mmekọahụ site n’aka ndị ọgbọ ha, ma ndị nke nwoke ma ndị nke nwanyị. Ihe fọkwara nke nta ka ọ bụrụ ndị ntorobịa nile na-enwe oge ha na-ada mbà n’obi, oge owu na-ama ha, na oge ọ na-adị ha ka à ghọtahiere ha.

Olee ihe dị ndị ntorobịa mkpa iji nwee ike ịnagide ihe ịma aka ndị ha na-enwe? “Ọ dị ụmụaka mkpa inwe ụkpụrụ omume siri ike,” ka Dr. Robert Shaw na-ede, “ụdị ụkpụrụ nke ga-enyere ha aka ịhọrọ ezigbo ndị enyi, ime ezi mkpebi, na inwe ọmịiko n’ebe ndị ọzọ nọ.” Bible bụ ebe e si enweta ụkpụrụ omume kasị mma, n’ihi na ihe dị n’ime ya bụ echiche Onye Okike. Ọ̀ dị onye pụrụ ịka Jehova Chineke mara ihe dị anyị mkpa iji nagide oge ọjọọ a anyị bi na ya?

Nduzi A Pụrụ Ịgbaso Agbaso, nke Bakwara Uru

Ụkpụrụ ndị dị na Bible bụ ndị a pụrụ ịgbaso agbaso, ha bakwara uru. Ha bara nnọọ uru nye ndị nne na nna na ndị ọzọ toruworo ogo mmadụ, bụ́ ndị chọrọ inyere ndị ntorobịa aka inwe ihe ịga nke ọma n’itoru ogo mmadụ.

Dị ka ihe atụ, Bible kwetara n’ezie na “uche gbagọrọ agbagọ bụ ihe e kekọtaworo n’obi nwata,” ma ọ bụ, dị ka Today’s English Version si sụgharịa ya, “site n’ọmụmụ, ụmụaka na-eme ihe iberibe, ha adịghịkwa akpachapụ anya.” (Ilu 22:15) Ụfọdụ ndị ntorobịa na-etoju etoju n’anya, ma ha enwebeghị ahụmahụ. N’ihi ya, ha pụrụ inwe obi erughị ala, ọchịchọ, na nchegbu ndị e ji ama oge ntorobịa. (2 Timoti 2:22) Olee otú a pụrụ isi nyere ndị ntorobịa a aka?

Bible na-agba ume ka ndị nne na nna na ụmụ ha na-ekwurịta okwu mgbe nile. Ọ na-agba nne na nna ume, sị: “Ị ga-ekwukwa okwu banyere [ụkpụrụ Chineke] mgbe ị na-anọdụ n’ụlọ gị, na mgbe ị na-eje ije n’ụzọ, na mgbe ị na-edina ala, na mgbe ị na-ebili ọtọ.” (Deuterọnọmi 6:6, 7) Mkparịta ụka dị otú ahụ nwere uru abụọ ọ bara. Nke mbụ, ọ na-akụziri ụmụaka ụzọ Chineke. (Aịsaịa 48:17, 18) Nke abụọ, ọ na-eme ka ndị nne na nna na ụmụ ha na-ekwurịta okwu mgbe nile. Nke a dị oké mkpa karịsịa n’oge ụmụaka ka na-etolite etolite, bụ́ oge ha pụrụ ịdị na-eme ihere ma na-anọ nanị ha.

N’eziokwu, owu na-ama ihe ka ọtụtụ ná ndị ntorobịa mgbe ụfọdụ. Otú ọ dị, owu na-ama ụfọdụ ruo ogologo oge. Otu akwụkwọ na-ekwu banyere ndị ntorobịa kwuru, sị: “Ndị ntorobịa a na-ekwu na ọ na-esiri ha ike imete enyi n’ụlọ akwụkwọ, na ha enweghị ndị ha na ha na-ekwurịta okwu, na owu na-ama ha, na ọ na-esiri ha ike ime ka ụmụaka ndị ọzọ nwee mmasị n’ebe ha nọ, nakwa na ọ na-adị ha ka ọ dịghị onye ha pụrụ ịgakwuru mgbe ha chọrọ enyemaka.” *

Ndị nne na nna na ndị toruworo ogo mmadụ, bụ́ ndị ọnọdụ ndị ntorobịa na-emetụ n’obi, pụrụ imete ha enyi ma nyere ha aka ịnagide ihe isi ike ha. N’ụzọ dị aṅaa? “Nanị ụzọ e si achọpụta ihe na-enye ndị ntorobịa nsogbu n’obi bụ site n’ịjụ ha banyere ya,” ka onyeisi ndị edemede nke otu magazin nke na-ekwu banyere ndị ntorobịa, dere. O doro anya na ọ chọrọ oge na ndidi iji nyere ndị ntorobịa aka ikwupụta ihe na-enye ha nsogbu n’obi. Ma uru dị na ya ruru mgbalị e mere maka ya.—Ilu 20:5.

Mkpa Ọ Dị Inye Iwu Ndị Ezi Uche Dị na Ha

E wezụga nkwurịta okwu, ọ dị ndị na-eto eto mkpa—n’ime obi ha, ha chọkwara—ka a na-enye ha iwu ndị ezi uche dị na ha. Bible na-ekwu na “nwata nke a na-ahapụ n’onwe ya na-eme ka ihere mee nne ya.” (Ilu 29:15) Ndị ọkachamara kweere na enyeghị iwu doro anya pụrụ ịbụ isi ihe mere ndị ntorobịa ji akpa aghara. Shaw, bụ́ onye e hotara ihe o kwuru na mbụ, na-ekwu, sị: “Ọ bụrụ na a na-agbachi nwatakịrị nkịtị mgbe nile n’enweghị mgbe ọ na-anụ ‘emela’ ma ọ bụ n’enweghị iwu a na-enye ya, ọ dịghị mgbe ọ ga-enwe ohere ịma na ndị ọzọ bụkwa mmadụ, na ha nwekwara mmetụta, ihe ndị na-akpa ha, na mkpebi nke ha. Ọ bụrụ na a zụghị nwa ahụ nke ọma inwe ọmịiko, ọ gaghị enwe ike ịhụ ndị ọzọ n’anya.”

Dr. Stanton Samenow, bụ́ onye rụrụ ọrụ ịgbazi ndị ntorobịa nọ ná nsogbu ruo ọtụtụ afọ, dekwara ihe yiri nke ahụ. O dere, sị: “Ụfọdụ ndị nne na nna kweere na e kwesịrị ịhapụ ụmụaka ka ha mewe ihe masịrị ha. Ha na-eji amaghị ihe ekwere na inye ụmụ ha iwu ma ọ bụ ịchọ ihe n’aka ha ga-eme ka ụmụ ha buru ibu ha na-ekwesịghị ibu ma mee ka ha ghara ịnụ ụtọ oge ha na-eto eto. Ma iwu ha na-adịghị enye ụmụ ha pụrụ ịkpata nsogbu dị njọ. Ndị nne na nna a adịghị aghọta na ọ ga-esiri nwatakịrị a na-azụghị nke ọma ike ịghọ onye na-achịkwa onwe ya nke ọma.”

Nke a ọ̀ pụtaziri na o kwesịrị ka ndị nne na nna na-ejikpa ụmụ ha ahụ́? Ọ dịghị ma ọlị. Inye ụmụaka iwu bụ nanị otu akụkụ nke inye ha ezigbo ọzụzụ. Ọ bụrụ na iwu siri ike a na-enye ha agabiga ókè, ọ pụrụ ịkpata ọgba aghara n’ime ezinụlọ. Bible na-ekwu, sị: “Unu ndị bụ́ nna, unu adịla na-akpasu ụmụ unu iwe, ka ha wee ghara ịda mbà n’obi.”—Ndị Kọlọsi 3:21; Ndị Efesọs 6:4.

N’ihi ya, site n’oge ruo n’oge, ọ dị ndị nne na nna mkpa ịdị na-atụleghachi ụdị ntụziaka na ịdọ aka ná ntị ha na-enye ụmụ ha, karịsịa ka ụmụ ha na-etoju ma na-eme ihe n’ụzọ na-egosi na ha etoruwela ogo mmadụ. Ikekwe, a pụrụ ịgbanwe iwu ụfọdụ mgbe a hụrụ na nwa ahụ akpawala àgwà ka dimkpa.—Ndị Filipaị 4:5.

Ịmaliteghachi Nkwurịta Okwu

Dị ka e kwuru n’isiokwu bú nke a ụzọ, Bible buru amụma na, tupu Chineke emee ihe iji kpochapụ ihe ọjọọ n’ụwa, ụwa ga-anọ ‘n’oge pụrụ iche nke siri ike obibi.’ Ihe àmà na-egosi na anyị na-ebi n’oge ahụ kpọmkwem—“ụbọchị ikpeazụ” nke usoro ihe a na-adịghị asọpụrụ Chineke. Dị ka ọ dị n’ebe ndị okenye nọ, ndị ntorobịa aghaghị ịgbasi mbọ ike ịnọgide na-adị ndụ n’ụwa nke e ji mmadụ ndị “hụrụ onwe ha n’anya, . . . ndị na-enweghị obi mmadụ, . . . ndị na-enweghị njide onwe onye,” mara.—2 Timoti 3:1-5. *

Ndị nne na nna bụ́ ndị na-eche na ha na ụmụ ha ndị nọ n’oge uto adịkwaghị ekwurịta okwu, pụrụ ime ihe iji maliteghachi nkwurịta okwu, na-akparịta otu ihe n’otu oge. N’ụzọ kwesịrị ịja mma, ọtụtụ ndị nne na nna na-agbalịsi nnọọ ike inwe mmetụta dị mma ná ndụ ụmụ ha na ime ka ọnụnọ ha na ụmụ ha nọ baara ụmụ ha uru.

Bible bụ ngwá ọrụ kasị baa uru n’akụkụ a. O nyeworo ọtụtụ ndị nne na nna aka ịrụzu ọrụ ha, nyekwara ọtụtụ ndị ntorobịa aka izere ọdachi. (Deuterọnọmi 6:6-9; Abụ Ọma 119:9) Ebe ọ bụ na Bible si n’aka Onye Okike, bụ́ Jehova Chineke, anyị pụrụ inwe obi ike na enyemaka ndị ntorobịa nke oge a ga-enweta na ya bụ nke kasị mma. *

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 Akwụkwọ ahụ kwukwara na, n’adịghị ka ndị ntorobịa owu na-ama mgbe ụfọdụ, ndị nke owu na-ama ruo ogologo oge na-anọrọ onwe ha mgbe nile ruo oge dị anya. Ha ‘kweere na ihe mere ha na-ejighị nwee ndị enyi bụ n’ihi ọrụ ha gbara, na ọ dịghị ihe ha pụrụ ime banyere ya, na ọ ga-adịgidekwa otú ahụ’ nakwa na ọnọdụ ahụ “apụghị ma ọ bụ agaghị agbanwe.”

^ par. 16 Lee isi 11 nke akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

^ par. 18 Ndịàmà Jehova ahụtawo akwụkwọ ahụ dabeere na Bible bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè dị ka ezigbo ihe enyemaka. Nke ọ bụla n’ime isiakwụkwọ 39 ya tụlere ajụjụ na-akpali echiche. Ụfọdụ n’ime isiokwu ndị dị na ya bụ: “Olee Otú M Pụrụ Isi Nweta Ezi Ndị Enyi?” “Olee Otú M Pụrụ Isi Nagide Nrụgide Ndị Ọgbọ?” “Olee Otú M Pụrụ Isi Mee Ka Owu Na-ama M Laa?” “Àdị M Njikere Iyi Oge?” “Gịnị Mere A Ga-eji Jụ Ọgwụ Ọjọọ?” “Olee Banyere Mmekọahụ Tupu Alụmdi na Nwunye?”

[Foto dị na peeji nke 10]

Kọsara onye meworo okenye nke hụrụ gị n’anya nchegbu gị