Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ikiri Ụwa

Ikiri Ụwa

Ikiri Ụwa

A Hụ Agụ Iyi Ọcha

‘N’oge ndị na-elekọta ọhịa dị n’Ogige Ntụrụndụ Bhitarkanika, nke dị n’Orissa, nọ na-agụ agụ iyi ọnụ, bụ́ ihe ha na-eme kwa afọ, ha hụrụ agụ iyi 15 na-acha ọcha, bụ́ ụdị agụ iyi dị nnọọ ụkọ,’ ka akwụkwọ akụkọ ndị India bụ́ The Hindu kwuru. Agụ iyi ọcha dị nnọọ ụkọ, ‘a dịghịkwa ahụ ha n’ebe ọ bụla ọzọ n’ụwa.’ N’ihi otú e si na-egbu agụ iyi aghara aghara n’ụzọ iwu na-akwadoghị, ọ bịara fọ obere ka e gbuchapụ agụ iyi ndị na-anọ na mmiri nnu n’ógbè ahụ n’afọ ndị 1970. Ma, gọọmenti steeti ahụ na òtù Mba Ndị Dị n’Otu jikọrọ aka rụọ ebe a na-azụ agụ iyi n’ogige ntụrụndụ ahụ. Ọtụtụ osisi mangrove, mmiri iyi ndị a na-emetọghị emetọ, ezigbo nri a na-ebute n’ụba, na nkwụsị ụmụ mmadụ kwụsịlatara inye nsogbu, emewo ka e nwee ihe ịga nke ọma n’ịzụ agụ iyi n’ebe ahụ. Dị ka akwụkwọ akụkọ ahụ si kwuo, ugbu a, ụdị agụ iyi ojii e nwere n’ogige ahụ dị 1,500, e nwekwara agụ iyi ọcha ndị ahụ dị ụkọ.

Siga, Ịda Ogbenye, na Ọrịa

“Òtù Ahụ́ Ike Ụwa na-adọ aka ná ntị na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ pasent 84 nke ndị na-ese siga bi ná mba ndị dara ogbenye. Ná mba ndị a, e nweela ọnọdụ ọjọọ nke ise siga ịkpata ịda ogbenye, ịda ogbenye akpatakwa ise siga,” ka akwụkwọ akụkọ ndị Spen bụ́ Diario Medico na-ekwu. Ọzọkwa, ná mba ọ bụla, “ndị kacha ese siga ma kachara enwe nsogbu ndị metụtara ise siga bụ ndị ọ na-enwetụghị ka ọ há ha.” Ọ bụ ezie na ise siga ebelatala n’ihe ka ukwuu ná mba ndị mepere emepe, n’ụwa nile, ọ ghọwo “ihe nke anọ kasị akpata ọrịa,” ka akwụkwọ akụkọ ahụ kọrọ. Na Spen, bụ́ ebe mmadụ ole a na-ekwu na ha na-anwụ n’ihi ise siga kwa afọ rurula 60,000, ise siga aghọwo “ihe bụ́ isi na-akpata ọrịa, nkwarụ, na ọnwụ a pụrụ izere ezere.”

Atụrụ Na-ama Ihu

“Anyị achọpụtawo na atụrụ pụrụ ịma, ọ dịkarịa ala, ihu atụrụ iri ise na ihu mmadụ iri,” ka ọkà n’ihe banyere akwara ozi bụ́ Keith Kendrick dere na magazin bụ́ New Scientist. Kendrick na ndị ọrụ ibe ya chọpụtara na mgbe atụrụ ndị ahụ hụrụ ihu iri isii ahụ ruo izu ole na ole, ha matara ha nile “ruo, ọ dịkarịa ala, afọ abụọ.” Ọ bụghị nanị na atụrụ ndị ahụ matara ihu ha, kamakwa, dị ka ụmụ mmadụ si eme, ha bịakwara nwee ike “iji otú ihu dị ha matatụ otú obi dị ha.” Akwụkwọ akụkọ ahụ kọrọ na atụrụ ‘pụrụ ịmata onye obi dị mma na onye iwe na-ewe, ha pụkwara ịchọpụta mgbe ihu atụrụ ụjọ na-atụ gbanwere. Ha na-akakwa enwe mmasị n’ihu onye na-amụmụ ọnụ ọchị karịa n’ihu onye na-ewe iwe.’ Ndị nchọpụta ahụ chọpụtakwara na “atụrụ pụrụ iwere ihu onye na-azụ ha otú ha si were ihu atụrụ ndị ọzọ ha na ha nọ n’otu ìgwè, bụ́ ndị ha maara nke ọma.” Kendrick kwuru, sị: “Atụrụ na-ewere mmadụ ndị nwere omume enyi dị ka atụrụ a na-akwanyere ùgwù. Nke a na-egosi na atụrụ na-enwe nkekọ chiri anya n’ebe onye na-azụ ha nọ.”

Mmetọ Carbon Dioxide Na-emetọ Ikuku n’Australia

“N’ime mba nile na-emepụta ihe, Australia kasị emepụta gas carbon dioxide,” ka ụlọ ọrụ bụ́ The Australia Institute kwuru. E kewe carbon dioxide na gas ọjọọ ndị ọzọ Australia mepụtara n’afọ 2001 eke, otu onye nọ n’Australia ga-eketa tọn 27.2. Otu akụkọ ụlọ ọrụ ahụ wepụtara kwuru na ihe kpatara nke a ji dị elu n’Australia bụ n’ihi na mba ahụ si na coal enweta ike eletrik, jirikwa ya akwọ ụgbọ, tinyekwara aluminum a na-emepụta ná mba ahụ. Mba ndị na-esote ya n’imepụta carbon dioxide na-emebi ikuku bụ Canada (tọn 22 maka otu onye) na United States (tọn 21.4 maka otu onye). Nke mbụ n’ime mba ndị a kọrọ na ha emebichaghị ikuku n’afọ 2001 bụ Latvia. E kewe carbon dioxide ha mepụtara eke, otu onye ná mba ahụ ga-eketa tọn 0.95. N’agbanyeghị na ndị bi n’Australia ebughị ibu, carbon dioxide a na-emepụta na ya “karịrị nke mba ukwu ndị dị na Europe, dị ka France na Ịtali, na-emepụta (ndị bi na nke ọ bụla n’ime ha ji okpukpu atọ karịa ndị bi n’Australia),” ka akụkọ ahụ kwuru.

Abụ Nnụnụ Nightingale na Ụzụ Ụgbọala

“Mgbe ụzụ lara elu, nnụnụ nightingale na-ewelitekwu olu ma ha bụwa abụ,” ka akwụkwọ akụkọ ndị Germany bụ́ Berliner Zeitung kwuru. Ná nnyocha Henrik Brumm nke Ngalaba A Na-amụ Banyere Ihe Ndị Dị Ndụ na Mahadum Free nke dị na Berlin mere, ọ chọpụtara na ọ̀tụ̀tụ̀ ụda olu abụ nnụnụ ndị a, bụ́ nke ha na-abụ iji gwa ibe ha ka ha ghara irute nso na iji rata ndị nke nne, ji decibel 14 laa elu, dabere n’ókè a na-emeru ụzụ n’ebe ha nọ na-abụ abụ. “Nke a eyighị [ka] ò buru ibu,” ka Brumm na-ekwu, “ma ọ na-egosi na ha welitekwuru olu ha okpukpu ise, nke pụtara na ike nnụnụ ndị a tinyekwuru n’akpa ume ha aghaghị ịmụba okpukpu ise.” N’ebe dị jụụ, ọ̀tụ̀tụ̀ ụda olu abụ ha na-abụ decibel 75. Ma n’ebe ụgbọala na-ekwo ekwo, ọ̀tụ̀tụ̀ ụda olu abụ ha na-abụ decibel 89. Akwụkwọ ahụ na-ekwu na “ihe tụrụ ndị nchọpụta ahụ n’anya karịsịa bụ na o yiri ka nnụnụ ndị a hà na-eme mgbanwe kwa ụbọchị iji kwekọọ n’ọnọdụ ọhụrụ e nwere. Ná ngwụsị izu ọ bụla, bụ́ mgbe ụgbọala na-adịkarịghị agba n’ụzọ, nnụnụ ndị a na-ewetulata olu ha karịa n’etiti izu.”

Mpụ A Na-eme n’Ụlọ Akwụkwọ Ndị Dị na Poland

“Ohi e zuru n’ụlọ akwụkwọ ndị dị na [Poland n’afọ 2003] dị 20,000,” ka magazin a na-ebipụta na Poland bụ́ Zwierciadło kọrọ. Ọ kọkwara na “pasent 80 nke ụmụ akwụkwọ [Poland] adịghị enwe mmasị ịga akwụkwọ n’ihi na owu na-ama ha, ọ na-esikwara ha ike iso ndị nkụzi na ụmụ akwụkwọ ibe ha na-akpakọrịta.” N’ihi gịnị ka e ji nwee ọtụtụ nsogbu a? ‘Ọnọdụ ụlọ akwụkwọ nọ na ya na-egosi otú ihe si kwụrụ n’obodo,’ ka Wojciech Eichelberger, bụ́ onye na-ahụ banyere ọnọdụ uche, na-ekwu. ‘Ọ bụ anyị mere ka e nwee ọnọdụ ndị a na-emetụta mmekọrịta mmadụ na ibe ya bụ nke ụlọ akwụkwọ nọ n’ime ya.’ Eichelberger na-atụ aro na, iji merie nsogbu ahụ, ndị nne na nna kwesịrị ịdị na-ewepụta oge iji soro ụmụ ha nọkọọ, si otú ahụ na-eme ka ụmụ ha mara na ha weere ha dị ka ndị dị mkpa.

Nsogbu A Na-enwe Banyere Ọdịdị Ahụ́

“Ndị na-eto eto—karịsịa ụmụ nwanyị—na-enwezi nchegbu banyere ọdịdị ahụ́ ha n’oge ha ka dị obere, nke a pụkwara ịkpatara ha ajọ nsogbu ahụ́ ike,” ka akwụkwọ akụkọ ndị Canada bụ́ Globe and Mail kwuru. A gbara ụmụaka nwanyị dị afọ 10 ruo 14 ajụjụ ọnụ banyere otú ha si eri nri, ihe karịkwara 2,200 zara ajụjụ a jụrụ ha. Akwụkwọ akụkọ ahụ na-akọ, sị: “Ọ bụ ihe na-erughị pasent 7 n’ime ha buru ibu, ma ihe karịrị pasent 31 kọwara onwe ha dị ka ndị ‘buru oké ibu,’ ebe pasent 29 kwuru na ha na-erizi nri obere.” Gịnị mere ụmụaka nwanyị ahụ́ dị mma ji achọ ifelata? Dị ka akwụkwọ akụkọ ahụ si kwuo, ndị ụta ka dịrị maka ya bụ ụmụ agbọghọ e ji egosi ejiji bụ́ ndị na-eri obere nri mgbe nile ma na-achị ndị buru ibu ọchị. “Usoro mgbasa ozi sokwa n’isi ihe na-akpụzi àgwà ndị ntorobịa, site n’ịnọgide na-egosi ndị dị nnọọ gịrịgịrị dị ka ndị nlereanya,” ka Globe na-ekwu. Dr. Gail McVey, bụ́ ọkà mmụta sayensị na-eme nnyocha n’ụlọ ọgwụ Toronto Hospital for Sick Children, mere ka ọ pụta ìhè na ọ dị mkpa ka ụmụaka, ndị nne na nna, na ndị nkụzi ghọta na “ibu ibu dị mma ma dị mkpa nye ụmụaka ndị na-etolite etolite.”