Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Kalenda Ndị Maya nke Dị Ịtụnanya

Kalenda Ndị Maya nke Dị Ịtụnanya

Kalenda Ndị Maya nke Dị Ịtụnanya

Site n’aka onye edemede Teta! na Mexico

Ndị Maya * oge ochie ejighị idekọ oge egwuri egwu. Kalenda ha na-egosi nkwenkwe ha nwere na oge ga-eru mgbe ihe ndị mere eme ga-emeghachi.

Ihe ndị ọkachamara ụfọdụ na-akpọ kalenda tzolkin (ịgụ ụbọchị), nwere ụbọchị 260 e kere ụzọ 13 e nyere nọmba. Nke ọ bụla n’ime ụzọ ole ahụ e kere ya dị ụbọchị 20, ụbọchị nke ọ bụla nwekwara aha nke ya. Kalenda tzolkin bụ ihe ndị Maya na-adabere na ya eme ememe ha dị iche iche, ha na-ejikwa ya eme ihe n’ịjụ ndị mmụọ ase.

E wezụga kalenda tzolkin ahụ e ji eme ihe n’okpukpe, ndị Maya nwekwara kalenda nkịtị, ma ọ bụ kalenda haab. Nke a bụ kalenda e ji anyanwụ agụ, bụ́ nke nwere ụbọchị 365. O nwere ọnwa 19, 18 n’ime ha nwere ụbọchị 20, ụbọchị 20; otu ọnwa enwee nanị ụbọchị ise, bụ́ nke mere ka ụbọchị nile dị na ya bụrụ 365. Kalenda a e ji anyanwụ agụ ka a na-adabere na ya arụ ọrụ ugbo ma na-eme ihe ndị ọzọ a na-eme kwa ụbọchị. Ụmụ amaala Maya jikọtara kalenda abụọ a ọnụ iji nwee ihe ndị nchọpụta kpọrọ Kalenda Na-aga Gburugburu. N’ụzọ dị otú a, ha si na kalenda tzolkin na nke haab nweta akara ụbọchị. Ọ na-ewe afọ 52 tupu ụbọchị kalenda a agwụ, a maliteghachikwa ịgụ ya ọzọ. *

Ọ dịbeghị ihe mgbe ochie a chọtara nke gosiworo ihe nile banyere kalenda ndị Maya n’ezie. Otú ndị ọkà mmụta si ghọta ihe ha ghọtara banyere kalenda ndị Maya bụ site n’ịchọpụta ihe akwụkwọ Maya ole na ole fọdụrụnụ na-ekwu nakwa site n’ịchọpụta ihe akara na ihe oyiyi e sere na nkume nakwa n’ihe ncheta ndị Maya pụtara.

Taa, ndị ọkachamara ka na-enwekwa mmasị n’inyocha kalenda ndị Maya, n’agbanyeghị ọtụtụ narị afọ ha jiworo mee nnyocha banyere ya. E nwere ihe ndị bụ́ ọkpọka dị na ya. Dị ka ihe atụ, otú ụbọchị ndị dị na ya si aga kwekọrọ kpọmkwem n’oge ọ na-ewe ụwa iji gbaa anyanwụ gburugburu, otú e si hazie ya kwekọkwaara kpọmkwem n’oge ọ na-ewe ọnwa iji gbaa ụwa gburugburu na oge ọ na-ewe ụwa iji gbaa anyanwụ gburugburu. N’ezie, ndị Maya oge ochie, bụ́ ndị gụkọrọ kpọmkwem otú oge si na-agafe, ji nnọọ nkà gbakọọ ihe a nile.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Lee isiokwu bụ́ “Ndị Maya—N’Oge Gara Aga Nakwa n’Oge A,” na Teta! (Bekee) nke September 8, 2001.

^ par. 5 E wezụga kalenda a na-aga gburugburu, ndị Maya nwekwara kalenda Na-agụ Oge Aga n’Ihu, bụ́ nke a malitere ịgụ ụbọchị ya site n’otu afọ dịịrị n’oge ochie, ma gụrụ ya na-aga n’ihu n’akwụsịghị akwụsị.

[Ihe Osise/Foto ndị dị na peeji 31]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Tzolkin Haab

6 Caban 5 Pop

Akara ụbọchị e dere n’ihe a dị n’elu a tụrụ atụ bụ 6 Caban 5 Pop, o kwekọrọ na February 6, 752 O.A.

[Ihe Osise/Foto ndị dị na peeji 31]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

0 1 5

Ndị Maya na-ejikọta akara atọ a dị n’elu iji nweta nọmba ọ bụla

0 1 2 3 4

5 6 7 8 9

10 11 12 13 14

15 16 17 18 19

Kama inwe ụbọchị 7, kalenda tzolkin nwere ụbọchị 20 nwechara aha. Akara ndị dị n’okpuru bụ ụfọdụ n’ime akara ndị e ji mara ha

Ụfọdụ akara maka ọnwa 19 ndị mejupụtara kalenda haab

[Ebe E Si Nweta Foto Ndi Dị na peeji 31]

N’elu ebe aka ekpe na foto nke e si na nke nnukwu wepụta: HIP/Art Resource, NY; ihe ndị a tụrụ atụ: An Introduction to the Study of the Maya Hieroglyphs/Sylvanus Griswold Morlay/Dover Publications