Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Ihe Nkiri Pụrụ Itinye n’Ihe Ize Ndụ

Ndị Ihe Nkiri Pụrụ Itinye n’Ihe Ize Ndụ

Ndị Ihe Nkiri Pụrụ Itinye n’Ihe Ize Ndụ

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA FINLAND

IKIRI fim, telivishọn, vidio, DVD, igwu egwuregwu kọmputa, na ịchọ ihe n’Intanet abụghịziri ọtụtụ ụmụaka ihe ọhụrụ. Akụkọ Òtù Na-ahụ Maka Ihazi Fim na Finland bipụtara na nso nso a na-ekwu na, “dị ka ihe ndekọ ụfọdụ e nwere gosiri, oge ụmụaka na-eji ekiri telivishọn, vidio, na Intanet ji ihe dị ka site n’okpukpu iri abụọ ruo iri atọ karịa oge ha na ndị ezinụlọ ha ji anọkọ.” * N’ụzọ dị mwute, nke a na-eme ka ụmụaka bụrụ ndị a gbara n’anwụ nye ọtụtụ ihe ndị pụrụ itinye ha n’ihe ize ndụ.

Ná mba ụfọdụ, ndị ọchịchị na-agbalị ichebe ụmụaka site n’ikwu afọ ole mmadụ ga-eru tupu o kirie ihe nkiri ụfọdụ na site n’ikegasị ihe nkiri gaa n’ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị mma ma ọ bụ ịdị njọ ha. Ma dị ka akụkọ ahụ si kwuo, ụmụaka na ndị mụrụ ha adịkebeghị aghọta ihe ụzọ ndị ahụ e kegasịrị ha pụtara, ma ọ bụkwanụ ha adịghị ewere ya dị ka ihe dị mkpa. Tụkwasị na nke a, a maara ọtụtụ ebe a na-eme ihe nkiri na ebe a na-agbazite vidio ama dị ka ndị na-eleghara afọ ole e kwuru na a ga-eru tupu e kiriwe ihe nkiri ụfọdụ anya. E wezụga nke a, a dịghịdị ekwu otú fim ụfọdụ na ihe ụfọdụ a na-egosi na TV dịruru ná mma ma ọ bụ ná njọ.

Otu n’ime ndị nkụzi a gbara ajụjụ ọnụ kwuru, sị: “O yiri ka ụmụ akwụkwọ adịkarịghị ewere ihe nkiri dị ka nke e mere ihe ike na ya ma ọ bụrụ na e mepụghị mmadụ ọbara na ya.” Ọtụtụ vidio na egwuregwu kọmputa—na ọbụnadị ihe osise na-atọ ọchị ndị e mere karịsịa maka ụmụaka—nwechara ihe ndị pụrụ itinye ndị na-ekiri ya n’ihe ize ndụ.

Akụkọ ahụ kwuru na ọ bụ ezinụlọ ọ bụla ka “ọ dị n’aka ikwu ụdị fim na ihe nkiri telivishọn ụmụaka ga-ekiri.” O ji ajụjụ ndị a na-akpali echiche mechie: “Anyị onwe anyị toruworo ogo mmadụ, ànyị nwere ọchịchọ na ike nke ichebe ụmụaka pụọ ná mmetụta ọjọọ nke usoro mgbasa ozi? Ànyị nwere ihe anyị ga-eji echebe ha?”

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Akụkọ ahụ nke isiokwu ya bụ “Ịkpa Ókè n’Afọ Ndụ Maka Ikiri Ihe Nkiri Nakwa Ichebe Ụmụaka” dabeere ná nnyocha e ji ụmụ akwụkwọ 340 nọ n’ụlọ akwụkwọ praịmarị, tinyere ndị mụrụ ha na ndị nkụzi ha, mee.