Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Ntorobịa Nọ ná Nsogbu

Ndị Ntorobịa Nọ ná Nsogbu

Ndị Ntorobịa Nọ ná Nsogbu

▪ Na United States, otu nwata akwụkwọ dị afọ 15 malitere gbawa ụmụ klas ya égbè, gbagbuo mmadụ 2 ma merụọ mmadụ 13 ahụ́.

▪ Na Russia, otu ìgwè ndị ntorobịa ṅụrọrọ anya ji obi ịta mmiri gbuo otu nwatakịrị nwanyị dị afọ 9 ma kụtara nna ya na nwanne nna ya isi aba okpu.

▪ Na Britain, otu nwata nwoke dị afọ 17 kụkasịrị otu nwatakịrị dị afọ 14 ahụ́ ma makasịa ya mma n’ahụ́. Ọ gwara ndị uwe ojii, sị, “Na mbụ, obi m abụghị igbu ya egbu, ma mgbe m hụrụ ọbara n’ahụ́ ya, mụ egbuzie ya.”

ANA-ANỤ akụkọ ndị na-awụ akpata oyi n’ahụ́ otú a n’ebe nile. A pụghị ile ha anya nanị dị ka ihe ọhụrụ. Otu isiokwu e bipụtara na magazin bụ́ Professional School Counseling, kwuru, sị: “Ihe ike ndị ntorobịa na-eme bụ otu nsogbu bụ́ isi e nwere n’ụwa anyị a.” Ihe ndekọ e nwere kwadoro ihe magazin ahụ kwuru.

Ụlọ Ọrụ United States nke Na-edekọ Nchọpụta E Mere Banyere Agụmakwụkwọ kwuru na ọ bụ ezie na ihe ike a na-akọ na e mere n’ụlọ akwụkwọ ebelatatụwo na United States, “n’afọ 2001, e mesoro ụmụ akwụkwọ dị afọ 12 ruo 18 ihe ike ha na-anwụghị na ha ma ọ bụ zuo ha ohi n’ụlọ akwụkwọ ruo ihe dị ka ugboro nde abụọ.” Akụkọ a na-enweta banyere mmaja a na-amaja ndị mmadụ n’ụlọ akwụkwọ na-arịwanyekwa elu.

Ma, ọ bụghị nanị ụmụ akwụkwọ ibe ha ka ndị ntorobịa na-emeso ihe ike na United States. Magazin ahụ kọkwara, sị: “N’ime afọ ise dịịrị site na 1997 ruo 2001, e mesoro ndị nkụzi mpụ ruru ihe dị ka nde 1.3 ha na-anwụghị na ha, bụ́ nke gụnyere ohi e zuru ha ugboro 817,000 na ihe ike e mesoro ha ugboro 473,000.” Ọzọkwa, “ụmụ akwụkwọ yiri egwu imerụ pasent 9 nke ndị nkụzi nile nọ n’ụlọ akwụkwọ praịmarị na sekọndrị ahụ́. Ụmụ akwụkwọ merụkwara pasent 4 n’ime ha ahụ́.”

Olee otú ihe si kwụrụ ná mba ndị ọzọ? “N’afọ 2003, China nwụchiri ndị ntorobịa 69,780 kpara aghara,” ka otu ụlọ ọrụ mgbasa ozi kwuru, “nke a ji pasent 12.7 karịa ndị ha nwụchiri n’afọ 2002.” Akụkọ ahụ kwuru na “a bịa n’aghara ndị ntorobịa kpara, pasent 70 n’ime ha bụ mpụ ndị nọ n’òtù ọjọọ mere.” Akụkọ e si Japan nweta n’afọ 2003 kwuru n’otu aka ahụ na ọ bụ ndị ntorobịa mere ọkara nke mpụ nile e mere n’ime afọ iri bu ụzọ.

Ọgwụ Ike—Ihe Na-emerụ Ndị Ntorobịa Ahụ́

Ihe ọzọ na-egosi na ndị ntorobịa nọ ná nsogbu bụ ahụ́ ọtụtụ n’ime ha na-emerụ onwe ha. Otu akụkọ si n’aka Ụlọ Ọrụ United States nke Na-ahụ Maka Iji Ọgwụ Eme Ihe n’Ụzọ Na-ezighị Ezi na-ekwu na ihe dị ka ọkara nke ndị ntorobịa nile nọ ná mba ahụ aṅụtụla ọgwụ ike tupu ha agụchaa ụlọ akwụkwọ sekọndrị. Akụkọ ahụ kwukwara, sị: “Ịṅụ mmanya na-aba n’anya ka nọgidere bụrụ ihe a na-ahụ nnọọ ebe nile n’etiti ndị ntorobịa nke oge a. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ anọ n’ime ụmụ akwụkwọ ise ọ bụla (pasent 77) aṅụwo ya (ha aṅụghị ya obere) tupu ha agụchaa ụlọ akwụkwọ sekọndrị; ihe fọkwara nke nta ka ọ bụrụ ọkara n’ime ha (pasent 46) aṅụwo ya tupu ha abanye klas nke abụọ n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị.”

Inwe Mmekọahụ Aghara Aghara

N’oge a ọrịa AIDS juru ebe nile, o doro nnọọ anya na inwe mmekọahụ aghara aghara dị ize ndụ. N’agbanyeghị nke ahụ, o yiri ka ọtụtụ ndị ntorobịa hà na-ewere mmekọahụ dị ka egwuregwu nkịtị na-adịghị emerụ ahụ́. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị ntorobịa nọ n’America na-eji mmụọ achọghị m ịma ekwu banyere “ime enyi”—nke bụ́ okwu dịtụ mma ná ntị ha ji akọwa mmekọahụ nkịtị. Ha na-ekwu banyere inwe “enyi uru dị na ya”—nke bụ́ onye ha na ha na-enwe mmekọahụ, nke na-adịghị achọ ka ha nye ya obi ha.

Onye edemede bụ́ Scott Walter kọrọ banyere oriri oké mkpọtụ ụfọdụ ndị ntorobịa nọ n’ime obodo na-enwe mgbe ndị mụrụ ha gara ọrụ. N’otu oriri dị otú ahụ, otu nwa agbọghọ kwuru na “ya gaje iso ụmụ okorobịa nile nọ ebe ahụ nwee mmekọahụ. . . . Obere ụmụaka ndị dị afọ 12 socha bịa oriri ahụ.”

Akụkọ a ọ̀ na-agbaka ntị? Ọ dịghị agbaka ndị ọkachamara nyochaworo àgwà ndị ntorobịa n’ihe banyere mmekọahụ. Dr Andrea Pennington dere, sị: “Kemgbe ihe karịrị afọ 20, anyị ahụwo na, a bịa ná nkezi, afọ ndị ntorobịa na-adị tupu ha amalite inwe mmekọahụ na-epewanye mpe. Ọ bụkwaghị ihe ọhụrụ ịhụ ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị ka ha na-amalite inwe mmekọahụ mgbe ha ka dị afọ 12.”

Nke kasị enye nsogbu n’obi bụ otu akụkọ gbara n’akwụkwọ akụkọ bụ́ USA Today. O kwuru, sị: “Ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu nke ụmụaka dị ihe dị ka afọ 13 [n’America] . . . na-enwe mmekọahụ site n’iji ọnụ na-amị akụkụ ahụ́ e ji bụrụ nwoke ma ọ bụ nwanyị. . . . Ụmụaka ndị a kwenyesiri ike na ‘nke a abụghị mmekọahụ n’ezie.’” Dị ka otu nnyocha e ji puku ụmụ agbọghọ iri mee gosiri, “pasent 80 n’ime ha kwuru na ha amaghị nwoke, ma pasent 25 ejiwo ọnụ nwee mmekọahụ. Pasent 27 kọwara ya dị ka ‘ihe ha na nwoke na-eme iji kporie ndụ.’”

E nweekwala echiche yiri nke ahụ banyere mmekọahụ ná mba ndị ọzọ. Akụkọ e si n’aka òtù UNESCO nweta na-ekwu, sị: “Ọ nọwo na-eyi ka ndị ntorobịa nọ n’Eshia hà ga-ebute nje HIV n’ihi mmekọahụ nwoke na nwanyị, ebe ọtụtụ n’ime ha na-amalite inwe mmekọahụ mgbe ha ka dị obere.” Akụkọ ahụ kwukwara, sị: “Ndị ntorobịa anọgidewo na-eleghara ‘ụkpụrụ omume ọma ndị Eshia’ anya, bụ́ nke e ji mara ndị mụrụ ha, site n’inwe mmekọahụ tupu ha alụọ di ma ọ bụ nwunye. Mgbe mgbe, ha na-esokwa ọtụtụ mmadụ nwee ya.”

È nwere ihe ndị ọzọ na-egosi na ndị ntorobịa nọ ná nsogbu? Magazin ndị Canada bụ́ Women’s Health Weekly kọrọ, sị: “Pasent 25 nke ụmụ agbọghọ nọ n’agbata afọ 16 na 19 ga-enwe oge ha ga-ada nnọọ mbà n’obi.” Otú ọ dị, ịda mbà n’obi bụ nsogbu na-akpa ma ndị nwoke ma ndị nwanyị aka ọjọọ. Dị ka U.S.News & World Report si kwuo, ihe dị ka puku ndị ntorobịa ise na-egbu onwe ha kwa afọ. Akụkọ ahụ kwuru na n’ihi ihe ụfọdụ, “ọnụ ọgụgụ ụmụntakịrị nwoke na-egbu onwe ha ji okpukpu isii karịa nke ụmụntakịrị nwanyị.”

Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ndị ntorobịa nke oge a nọ n’oké nsogbu. Olee ihe mere ha ji nọrọ na ya?

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]

STR/AFP/Getty Images