Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ugwu Ònye Ga-azọpụta Ha?

Ugwu Ònye Ga-azọpụta Ha?

Ugwu Ònye Ga-azọpụta Ha?

N’AFỌ 2002, e nwere Nzukọ Mba Nile Maka Ugwu, bụ́ nke were ụbọchị anọ, n’obodo Bishkek nke dị na Kyrgyzstan (ebe etiti Eshia). Ọ bụ nzukọ mbụ mba ụwa nwere iji kwurịta banyere ugwu. Ndị haziri nzukọ ahụ nwere olileanya na afọ 2002 ga-aka akara “mmalite nke ọgbọ ọhụrụ, ọgbọ nke ga-aghọta ezigbo uru ugwu bara.”

Ndị bịara nzukọ ahụ ji otu olu nakwere ụkpụrụ ha kpọrọ “Ụkpụrụ Bishkek Maka Ugwu,” bụ́ nke e depụtara iwu na ụkpụrụ ndị nile nwere mmasị n’ichekwa ugwu ga na-agbaso. E kwuru na nzube ya bụ “imeziwanye ọnọdụ obibi ndụ nke ndị bi n’ugwu, ichebe ihe ndị dị ndụ nọ n’ugwu, na iji akụ̀ ndị dị n’ugwu na-eme ihe n’ụzọ amamihe ka dịrị na ha.”

E nweela ọganihu ụfọdụ. Ogige ntụrụndụ ndị e nwere gburugburu ụwa na-echebe ógbè ndị mara ezigbo mma, bụ́kwa ndị e nwere anụmanụ na osisi dịgasị iche iche na ha. N’ọtụtụ ebe n’ụwa, ndị na-echekwa ihe ndị e kere eke enwetụla ihe ịga nke ọma n’igbochi mbibi a na-ebibi gburugburu ebe obibi mmadụ. Otu ihe e kwekọrịtara ná nzukọ ahụ e nwere na Bishkek bụ ikpochasị akpakara timgwom nuklia ndị e kposara n’ugwu ndị dị na Kyrgyzstan. Ihe a na-egbu egbu chọrọ imebiri pasent 20 nke ndị bi n’ebe etiti Eshia, mmiri.

Otú ọ dị, ihe isi ike a na-enwe n’ichebe ugwu ndị dị n’ụwa ka karịrị akarị. Dị ka ihe atụ, n’afọ 1995, gọọmenti Canada setịpụrụ ụkpụrụ ha kpọrọ “Ụkpụrụ E Ji Echekwa Ọhịa,” iji chebe oké ọhịa ndị fọdụrụ na British Columbia. N’agbanyeghị nke ahụ, nchọpụta e mere mgbe e mesịrị gosiri na ụlọ ọrụ ndị na-egbu osisi leghaara ụkpụrụ ahụ anya ma nọgide na-egbukpọ osisi ndị dị ọbụna n’ugwu ndị kasị dị elu. E wepụtụrụ ihe n’ụkpụrụ ahụ n’afọ 1997, ebe ọ bụ na ụlọ ọrụ ndị na-egbu osisi kwuru na o siiri ha ike ịgbaso ya.

Uru ego abụghị nanị ihe mgbochi a na-enwe n’ichebe ugwu. Ihe ikpeazụ e kwuru ná nzukọ ahụ e nwere na Bishkek gosiri na agha, ịda ogbenye, na agụụ socha eme ka a na-ebibi ugwu na ihe ndị dị na ya aghara aghara. Ugwu na ihe ndị ọzọ dị n’ụwa ga-anọgide na-ahụsi anya ruo mgbe ihe ndị mere e ji na-ebibi ọhịa bịara ná njedebe.

Nchegbu Chineke Na-enwe Maka Ihe Ndị O Kere Eke

N’agbanyeghị ọnọdụ a dị mwute, e nwere ihe mere anyị ga-eji nwee olileanya. Chineke Pụrụ Ime Ihe nile maara ihe na-eme ihe ndị o kere eke. Bible kọwara ya dị ka Onye “ebe dịchasị elu nke ugwu nile [bụ] nke Ya.” (Abụ Ọma 95:4) Ọ na-enwekwa nchegbu banyere anụ ndị bi n’ugwu. Dị ka Abụ Ọma 50:10, 11 si kwuo, Jehova kwuru, sị: “Mụ nwe anụ ọhịa ọ bụla nke oké ọhịa, ya na anụ nile n’elu otu puku ugwu. Amawo m anụ ufe ọ bụla nke ugwu nile: anụ nile nke na-enugharị n’ọhịa dịkwa n’aka m.”

Ò nwere ihe Chineke ga-eme iji zọpụta mbara ala a nke nọ ná nsogbu? Ee, o nwere! Bible kwuru na o mewo “ka otu alaeze bilie, nke a gaghị emebi emebi ruo mgbe ebighị ebi.” (Daniel 2:44) Jizọs Kraịst, bụ́ onye a họpụtara ịbụ Eze nke ọchịchị eluigwe a, nwere mmasị pụrụ iche n’ebe ụwa na mmadụ ndị bi na ya nọ. (Ilu 8:31) Ọchịchị ya ga-eme ka udo dị n’ụwa, ọ ga-eme ka ụdị nrigbu nile kwụsị, ọ ga-emezikwa ihe ndị e mebiworo n’ụwa.—Mkpughe 11:18.

Ọ bụrụ na ọ na-agụsi gị agụụ ike ịhụ ihe ngwọta dị otú ahụ, ị ga-anọgide n’ezie na-ekpe ekpere ka ‘alaeze Chineke bịa.’ (Matiu 6:9, 10) A ga-aza ekpere dị otu ahụ. N’isi nso, Alaeze Chineke ga-eme ka ikpe na-ezighị ezi kwụsị ma mezie ihe ndị e mebiri n’ụwa a. Mgbe nke a mere, n’ikwu ya n’ụzọ ihe atụ, ugwu ‘ga-eti mkpu ọṅụ.’—Abụ Ọma 98:8.