Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ugwu Ihe Mere Ha Ji Dị Anyị Mkpa

Ugwu Ihe Mere Ha Ji Dị Anyị Mkpa

Ugwu Ihe Mere Ha Ji Dị Anyị Mkpa

“Rịgoro n’ugwu ka ị nụ ihe ọma ndị ha pụrụ ịgwa gị. Udo nke ihe e kere eke ga-eru gị ahụ́ dị ka ìhè anyanwụ si eru osisi ahụ́. Ikuku ndụ ga-ekusa gị, oké ifufe egosikwa gị ike ya. Nchegbu gị ga-aha gị aka dị ka akwụkwọ osisi si aha osisi aka n’oge ọkọchị.” —JOHN MUIR, ONYE AMERICA NA-EDE AKWỤKWỌ NKE BỤ́KWA ỌKÀ N’ỊMỤ BANYERE IHE NDỊ E KERE EKE.

DỊ KA John Muir chọpụtara ihe karịrị otu narị afọ gara aga, ugwu pụrụ inwe mmetụta n’ahụ́ anyị. Ịdị ukwuu ha na-awụ anyị ibobo n’ahụ́, anụmanụ ndị dị na ha na-atọ anyị ụtọ nkiri, otú ha si dị jụụ na-emekwa ka ahụ́ ruo anyị ala. Ọtụtụ nde mmadụ na-aga eleta ugwu kwa afọ iji kirie ịma mma ha na iji nwee obi aṅụrị. “Kemgbe ụwa, ugwu anọwo na-abụrụ ọha mmadụ na mba dị iche iche ihe ịtụnanya na ihe na-akpali echiche,” ka Klaus Toepfer, bụ́ ọga kpata kpata nke Ngalaba Mba Ndị Dị n’Otu nke Na-ahụ Maka Gburugburu Ebe Obibi, kwuru.

Ma, ọnọdụ ugwu nọ na ya adịghị mma. Ruo ọtụtụ narị afọ, ọnụnọ ha nọ ụmụ mmadụ n’ebe dị anya emewo n’ụzọ dị ukwuu ka ndị mmadụ ghara iji ihe ndị dị na ha eme ihe aghara aghara. Ma, ha nọzi n’ihe ize ndụ. “N’ihi ọrụ ugbo, mmepe obodo, na ihe ndị ọzọ, ụfọdụ n’ime oké ọhịa ndị fọdụrụnụ [bụ́ ndị dị n’ugwu], na-apụ n’anya n’ike n’ike,” ka akụkọ òtù Mba Ndị Dị n’Otu wepụtara na nso nso a kwuru.

Akụkụ dị ukwuu nke ala e nwere n’ụwa bụ ugwu ugwu. Ọkara nke ndị bi n’ụwa na-adabere na ya iji na-enweta ihe ha ji ebi ndụ. Ọtụtụ nde mmadụ bikwa n’ugwu. Ugwu bara uru ndị ọzọ karịrị nanị ịbụ ebe mara mma nkiri ma dịkwa jụụ. Ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime uru ndị ha na-abara ihe a kpọrọ mmadụ.

Ihe Mere Ugwu Ji Dị Mkpa

ISI MMIRI. Ebe osimiri ndị kasị ukwuu n’ụwa nakwa ihe ka ọtụtụ n’ọdọ mmiri anyị si bụ n’ugwu. N’Ebe Ugwu America, ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na mmiri nile na-asọbanye ná nnukwu Osimiri Colorado na Osimiri Rio Grande, si n’Ugwu Rocky. Ihe dị ka ọkara nke ndị nọ n’ụwa bi n’ebe ndịda nakwa n’ebe ọwụwa anyanwụ Eshia. Iji nọgide na-adị ndụ, ihe ka ọtụtụ n’ime ha na-adabere ná mmiri na-ezo n’ógbè ndị dị n’ugwu ndị mejupụtara Ugwu Himalaya, nke Karakoram, nke Pamirs, na nke Tibet.

“Ugwu, bụ́ isi mmiri nke ụwa, dị mkpa nye ihe nile dị ndụ n’ụwa, dịrịkwa mkpa nye ọdịmma nke ndị mmadụ n’ebe nile,” ka Toepfer kọwara. O kwukwara, sị: “Ihe na-eme n’ọnụ ọnụ ugwu na-emetụta ihe ndị dị ndụ n’ala dị larịị, ná mmiri iyi, nakwa ọbụna n’oké osimiri.” N’ọtụtụ ebe, ugwu na-echekwa snow ndị dara n’oge oyi, jiri nke nta nke nta na-ekesa mmiri snow ndị ahụ dị ka igirigi n’oge opupu ihe ubi nakwa n’oge okpomọkụ. N’ebe ndị ala kpọrọ nkụ n’ụwa, mmiri a na-agba n’ubi na-abụkarị mmiri si na snow gbazere agbaze n’elu ugwu ndị dị anya. Ọtụtụ ugwu nwere oké ọhịa ndị na-amịkọrọ mmiri ozuzo dị ka ògbó, na-eme ka mmiri ndị ahụ jiri nwayọọ na-asọba n’osimiri, kama iji ike sọdaa ma kpata ajọ idei mmiri.

EBE OBIBI ỤMỤ ANỤMANỤ NA EBE E NWERE ỌTỤTỤ IHE NDỊ DỊ NDỤ. Otú ebe ọtụtụ ugwu dị si dị anya, tinyere otú ala ha si bụrụ nke na-adịchaghị eme nri, emewo ka ndị mmadụ ghara imebi ha otú ha gaara esi emebi ha ma a sị na ha adịghị otú ahụ. N’ihi ya, ugwu aghọwo ebe obibi nke ụmụ anụmanụ na ebe e nwere ụdị osisi dịgasị iche iche, ndị ọ pụrụ ịbụ na ha adịghịzi n’ala dị larịị. Dị ka ihe atụ, n’Ogige Ntụrụndụ Kinabalu nke dị na Malaysia, ebe bụ́ ugwu ugwu nke na-aharughị ka New York City, ụdị osisi na ahịhịa dịgasị iche iche e nwere na ya dị 4,500—ihe karịrị otu ụzọ n’ụzọ anọ nke ụdị osisi na ahịhịa nile dị na United States dum. Panda ukwu nke China, udele nke Andes, na agụ owuru na-ebi na snow a na-ahụ n’ebe etiti Eshia, na-ebicha n’ọhịa ndị dị n’ugwu. Otú ahụ ka ọ dịkwa ọtụtụ ụmụ anụmanụ ndị ọzọ a na-achọ igbukpọ.

Dị ka magazin bụ́ National Geographic si kwuo, ụfọdụ ndị ọkà n’ịmụ banyere ihe ndị dị ndụ kwuru na “ihe karịrị otu ụzọ n’ụzọ atọ nke osisi na ahịhịa ndị a maara na ha na-eto n’ala nakwa nke anụmanụ ndị a maara dị ka anụ ala, bi n’ihe na-erughị pasent abụọ nke mbara ala anyị.” Ihe ka ọtụtụ n’ime ha nọkọtara ọnụ n’ebe ndị mmadụ na-akpabeghị aka ọjọọ bụ́ ebe ndị ọkà mmụta sayensị weere dị ka e jechaa ọ gwụ n’ihe metụtara ụmụ anụmanụ na osisi. N’ebe ndị a—ndị ọtụtụ n’ime ha bụ ugwu—e nwere ụdị anụmanụ na osisi dịgasị iche iche bụ́ ndị anyị nile riteworo uru na ha. Ụfọdụ n’ime akụ́kụ́ ndị kasị mkpa e ji mere nri n’ụwa bụ n’ọhịa ndị dị n’ugwu ka e si nweta ha, ha ka dịkwa n’ebe ndị ahụ—ọka si n’ugwu ndị dị na Mexico, poteto na tomato si n’Ugwu Andes nke Peru, ọka wiit sikwa n’Ugwu Caucasus. Ndị a bụ nanị ole na ole n’ime ha.

EBE NTỤRỤNDỤ NA EBE MARA MMA. Ugwu na-echekwakwu mma ihe ndị e kere eke. Na ha, e nwere mmiri ndị dị ịtụnanya na-asụda n’ike n’ike, ọdọ mmiri ndị mara ama, na ihe ka ukwuu n’ebe ndị a na-agba nkiri n’ụwa. Ọ bụghị ihe ijuanya na otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ebe ndị e chebere echebe n’ụwa dị n’ugwu. Ha aghọwokwa ebe ndị mmadụ na-enwe mmasị ịga maka ntụrụndụ.

Ọtụtụ nde ndị si n’ebe nile n’ụwa na-aga ọbụna n’ogige ntụrụndụ ndị dịpụrụ nnọọ adịpụ. Ndị mmadụ na-esi n’ebe ndị dị nnọọ anya n’ụwa aga n’Ogige Ntụrụndụ Denali nke dị n’Alaska iji kirie Ugwu McKinley, bụ́ ugwu kasị elu n’Ebe Ugwu America. Ọtụtụ na-aga ná Nnukwu Ndagwurugwu Rift iji kirie nnukwu Ugwu Kilimanjaro na Ugwu Meru ma ọ bụ iji kirie imirikiti ụmụ anụmanụ ndị bi n’agbata ugwu ndị a dị ịtụnanya. Ọtụtụ obodo ndị dị n’ugwu na-erite uru n’ọbịbịa ọtụtụ mmadụ na-abịa eleta ugwu ndị a, ọ bụ ezie na ileta ugwu ndị a aghara aghara pụrụ itinye ụmụ anụmanụ na osisi ndị dị na ha n’ihe ize ndụ.

Ihe Ọmụma A Kwakọbara n’Ugwu

N’ime ọtụtụ narị afọ gara aga, ndị bi n’ugwu amụtawo otú e si ebi n’ọnọdụ ndị tara akpụ. Ha atụwo ugwu atụ ma mee ka ha yie steepụ iji kọọ ugbo na ha. A ka na-akọkwa ugbo n’ebe ndị a kemgbe ihe karịrị puku afọ abụọ gara aga. Ha azụwo anụ ọhịa ndị pụrụ ibi n’ugwu, dị ka anụ ndị yiri camel na ehi, ka ha ghọzie anụ ụlọ. Ihe ọmụma ndị bi n’ugwu kwakọbaworo kemgbe ụwa pụkwara ịba uru dị ukwuu n’ichebe ugwu, bụ́ nke ndụ anyị nile dabeere na ya.

“Ọ bụ ụmụ amaala bụ nanị ndị pụrụ ichebe nnukwu ọhịa ndị a na-akpachabeghị aka ọjọọ ụmụ anụmanụ bi na ha, bụ́ ndị dị n’ebe dịpụrụ adịpụ ná mpaghara ụwa ọ bụla,” ka Alan Thein Durning nke na-arụ n’ụlọ ọrụ Worldwatch Institute kọwara. “Ihe ọmụma ha nwere banyere ụmụ anụmanụ na ebe ndị ha bi . . . haruru ka nke e dere n’akwụkwọ ndị ọkà mmụta sayensị nke oge a.” Ọ dị mkpa ichebe ndị a bi n’ugwu dị nnọọ ka o si dị mkpa ichebe ihe ndị ọzọ dị n’ugwu.

Ngalaba Mba Ndị Dị n’Otu nke Na-ahụ Maka Gburugburu Ebe Obibi wepụtara afọ 2002 dị ka Afọ Ugwu nke Mba Nile. Iji mee ka o doo anya na ugwu so akwado ndụ ụmụ mmadụ, ndị haziri ihe omume ahụ chepụtara okwu bụ́, “Anyị Nile Bụ Ndị Ugwu.” Ebumnobi ha bụ imekwu ka ndị mmadụ mara nsogbu ugwu ndị dị n’ụwa na-enwe ma chọọ ihe ndị a ga-eme iji chebe ha.

Nchegbu a a na-enwe banyere ugwu dabara nnọọ adaba. “Ọtụtụ mgbe, a na-ewere ugwu dị ka ebe e si enweta akụ̀ ndị sitere n’okike, ma a dịchaghị elebara ọnọdụ nke ndị bi na ha nakwa ihe ndị ọzọ dị ndụ na ha anya,” ka onye kwuru okwu bụ́ isi ná Nzukọ Mba Nile Maka Ugwu bụ́ nke e nwere na Bishkek, Kyrgyzstan, n’afọ 2002, kwuru.

Olee ụfọdụ n’ime nsogbu ugwu ndị dị n’ụwa na mmadụ ndị bi na ha na-enwe? Olee otú nsogbu ndị a si emetụta anyị nile?