Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ugwu Nọ n’Ihe Ize Ndụ

Ugwu Nọ n’Ihe Ize Ndụ

Ugwu Nọ n’Ihe Ize Ndụ

“Onye ọ bụla pụrụ irite uru site n’ịhụ na ebe ndị bụ́ ugwu n’ụwa nọgidere na-emepụta ihe ruo ọtụtụ ọgbọ na-abịanụ.”—KOFI ANNAN, BỤ́ ODEAKWỤKWỌ UKWU NKE ÒTÙ MBA NDỊ DỊ N’OTU.

MGBE ọ bụla mmadụ chetara ugwu, ihe na-agbata ya n’uche na-abụ ịdị ukwuu, ịkwụ chịm, na ịdị ike. Gịnịzi pụrụ itinye ugwu n’ihe ize ndụ? Ọ pụrụ isiri ụfọdụ ndị ike ikweta na ugwu ndị dị n’ụwa pụrụ ịnọ n’ihe ize ndụ. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na ha nọ n’ihe ize ndụ. Ndị na-echekwa ihe ndị e kere eke hotara ihe ụfọdụ kpọmkwem bụ́ ndị ji nwayọọ nwayọọ na-ebibi ihe ndị dị ndụ nọ n’ugwu. Nsogbu ndị a adịghị obere, ha anọwokwa na-aka njọ. Tụlee ụfọdụ n’ime ihe ndị na-etinye ugwu n’ihe ize ndụ.

ỌRỤ MMEPE OBODO. Ihe dị ka pasent iri abụọ na ise nke ugwu ndị dị n’ụwa nọ n’ihe ize ndụ n’ihi ụzọ a ga-arụ, akụ̀ a ga-egwu, paịpụ a ga-eli, ihe mgbochi a ga-arụ, na ọrụ mmepe ndị ọzọ e mere atụmatụ ịrụ n’ime afọ 30 na-abịanụ. Ịrụ ụzọ n’ugwu pụrụ ịkpata mbuze, ụzọ ndị ahụ na-emekwa ka ndị na-egbu osisi, bụ́ ndị pụrụ ibibikwu ugwu n’ụzọ ka njọ, hụ ebe ha ga-esi bata. Kwa afọ, akụ̀ a na-egwupụta n’ala na-eru ihe dị ka puku nde tọn iri, n’ugwu ka e sikwa egwupụta ihe ka ukwuu n’ime ha. Ihe mkpofu ndị na-esi n’akụ̀ ndị a apụta ma a nụchaa ha na-akadị nke ahụ. *

OKPOMỌKỤ A NA-ENWE N’ỤWA. “Afọ itoolu a kasị nwee okpomọkụ n’ụwa manyere n’afọ ndị dịrị malite na 1990,” ka ụlọ ọrụ Worldwatch Institute na-ekwu. Okpomọkụ kasịkwa emetụta ógbè ndị e nwere ugwu. Mmiri ndị kpụkọrọ akpụkọ n’ugwu anọwo na-agbaze, snow ndị dị n’ọnụ ọnụ ugwu na-ebelatakwa ebelata. Dịkwa ka ụfọdụ ndị ọkà mmụta sayensị si kwuo, nke a ga-emetụta ọdọ mmiri ma mee ka e nwee mbuze ndị dị egwu. Ọtụtụ ọdọ mmiri ice ndị dị n’Ugwu Himalaya na-achọzi ịsọpu asọpu ma kpata ajọ idei mmiri, nke bụ́ ihe merelarị ugboro ugboro n’ime iri afọ ole na ole gara aga.

ỌRỤ UBI Ọ KỌTA O RIE. Otú ọnụ ọgụgụ ụmụ mmadụ si na-amụba na-emezi ka ha na-akọ ubi n’ala ndị na-adịghị eme nri. Dị ka otu nnyocha e mere gosiri, ka ọ dị ugbu a, a na-akọ ihe ma na-akpa anụ n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọkara nke ugwu nile dị n’Africa—ugwu a na-akọ ihe na ha dị pasent 10, nke a na-akpa anụ na ha adịrị pasent 34. Ọtụtụ mgbe, uru a na-erite n’ubi ndị a na-epe nnọọ mpe, ebe ọ bụ na ugwu ndị ahụ adịghị mma ịkọ ihe. * Ehi ịtakpọsị ahịhịa ndị dị n’ala na-egbukwa ahịhịa ndị ahụ ngwa ngwa. Otu nnyocha e mere na nso nso a gosiri na ọ bụ nanị pasent 3 nke ala ndị dị n’ugwu dị mma ịkọ ihe.

AGHA. Agha obodo a lụrụ aghara aghara na nso nso a bibiri ọtụtụ ugwu. Ndị na-alụso gọọmenti ọgụ na-ejikarị ugwu emere ebe ha na-anọ eze mgbọ. Otu akụkọ òtù Mba Ndị Dị n’Otu wepụtara kwuru na “agha ụmụ mmadụ lụrụla” emetụtawo pasent iri isii na asaa nke ugwu ndị dị n’Africa. Ọzọkwa, ụfọdụ ugwu aghọwo ebe a na-anọ emepụta ọgwụ ike, bụ́ nke na-akpatakarị ọgụ egbe na mma ma na-ebibikwa ugwu ndị ahụ.

Ọ̀ Dị Mkpa Imekwu Ihe Banyere Ya?

Ihe ọjọọ ndị si ná mbibi ụmụ mmadụ na-ebibi ugwu apụta eruwelarị ụmụ mmadụ ahụ́. Idei mmiri, mbuze, na ụkọ mmiri bụ nanị ụfọdụ n’ime ihe ndị na-egosi na ala adịghị mma. Ndị ọchịchị amalitela ileba anya na ya. A na-adọchi osisi ọhịa ndị e gbuturu egbutu, e tiwokwa iwu ka a kwụsị igbu osisi n’ebe ụfọdụ. Mba dị iche iche ewepụtawo ogige ntụrụndụ iji chebe osisi ndị mara mma na anụmanụ ndị fọrọ obere ka e gbukpọọ ha.

Otú ọ dị, a na-enwekwa nsogbu ọbụna n’ogige ndị a e chebere echebe. (Lee igbe bụ́ “Ebe Ụfọdụ E Chebere Ihe Ndị E Kere Eke.”) Ọ̀tụ̀tụ̀ dị egwu e ji na-egbukpọ ụdị anụmanụ na osisi dịgasị iche iche bụ ihe àmà na-egosi na a naghị emeri n’ọgụ a na-alụ iji chebe ebe ndị a dị n’ugwu. Ndị ọkachamara maara ihe bụ nsogbu, ma e mebeghị ihe ọ bụla katara ahụ́ iji chekwaa ọhịa ndị a na-akpabeghị aka ọjọọ. E. O. Wilson, bụ́ onye a ma ama dị ka ọkà n’ịmụ banyere ihe ndị dị ndụ, kwuru, sị: “Ihe ọmụma anyị nwere dị ka ndị ọkà mmụta sayensị na-eme ka obi sie m ike, ma mbibi a na-ebibi ebe ndị bụ́ isi a na-echekwa ụmụ anụmanụ na osisi, na-egbu mmụọ m.”

Mgbukpọ a na-egbukpọ ụmụ anụmanụ na osisi ọ̀ dị ihe o mere n’ezie? Dị ka ọtụtụ ndị na-amụ banyere ihe ndị dị ndụ si kwuo, ihe a kpọrọ mmadụ na-erite uru dị ukwuu n’ichekwa ihe ndị dị ndụ n’ụwa. Otu ahịhịa ha ji eme ihe atụ bụ́ rosy periwinkle nke dị n’ugwu Madagascar, bụ́ ebe e nwere imirikiti ihe ndị dị ndụ. E siwo n’ahịhịa a nweta ọgwụ e ji agwọ ọrịa leukemia. Tụkwasị na nke ahụ, ruo ọtụtụ afọ, e siwokwa n’osisi cinchona, bụ́ nke a na-ahụ n’Ugwu Andes, nweta quinine na ọgwụ ndị ọzọ e ji agwọ ịba. Ọtụtụ osisi ndị ọzọ dị n’ugwu enyewo aka zọpụta ndụ ọtụtụ nde mmadụ. N’eziokwu, ụfọdụ n’ime osisi ndị a dị n’ugwu na-emekwa nke ọma n’ala ndị na-abụghị ugwu. Otú ọ dị, ihe bụ́ nsogbu bụ na n’ihi ọ̀tụ̀tụ̀ dị egwu ụmụ mmadụ ji na-egbukpọ osisi na ahịhịa ndị dị n’ugwu, ha pụrụ n’amaghị ama, igbukpọsị ndị nke a na-achọpụtabeghị ihe ha pụrụ ịgwọ nakwa ndị nke pụrụ inye ezigbo ihe n’ahụ́.

À pụrụ n’ụzọ ụfọdụ ibelata ọ̀tụ̀tụ̀ dị egwu e ji na-ebibi ugwu n’oge a? À pụrụ imezi ihe ndị e mebiworo? Ugwu ọ̀ ga-anọgide na-abụ ebe mara mma na ebe obibi nke ụmụ anụmanụ na osisi dịgasị iche iche?

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Ná nkezi, ihe mkpofu a na-enweta n’imepụta nanị otu mgbaaka ọlaedo na-eru tọn atọ.

^ par. 6 N’aka nke ọzọ, n’ime ọtụtụ narị afọ gara aga, ndị bi n’ugwu amụtawo ịkọ ugbo n’ugwu n’emebighị ihe ndị dị na ha emebi.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 17]

Anụmanụ Ndị Na-ebi n’Ugwu

Ọdụm ugwu, bụ́kwa nke a na-akpọ puma, bụ n’ugwu ka a na-ahụkarị ya—karịsịa n’Ugwu Rocky nakwa n’Ugwu Andes. Dịkwa ka ọtụtụ anụ ukwu ndị ọzọ na-eri ibe ha, ha ejirila nke nta nke nta gaa biri n’ebe ndị mmadụ na-adịghị eru, n’ihi egwu ụmụ mmadụ na-eyi ha.

Ebe a na-ahụ panda na-acha uhie uhie bụ nanị n’ugwu ndị mejupụtara Ugwu Himalaya (ọbụna n’ebe mgbada nke Ugwu Everest). Ma, n’agbanyeghị na ebe panda ndị a bi dịpụrụ nnọọ adịpụ, ọ bụụrụ ha ọgụ na mgba ịnọgide na-adị ndụ n’ihi mbibi a na-ebibi ọhịa achara ha si enweta nri.

[Ebe E Si Nweta Foto]

Cortesía del Zoo de la Casa de Campo, Madrid

Anụ ọhịa bea na-acha nchara nchara nwere oge a na-ahụ ya n’ihe ka ukwuu n’ala ndị dị na Europe, Eshia, nakwa n’Ebe Ugwu America. Ka ọ dị ugbu a na Europe, nanị ebe a na-ahụ ya bụ n’ugwu ole na ole dịpụrụ adịpụ, ọ bụ ezie na ọ ka hie nne n’Ugwu Rocky nke Canada, tinyekwara Alaska na Siberia. N’ime otu narị afọ gara aga, ọnụ ọgụgụ ya na United States ejiriwo pasent 99 belata.

Ugo na-acha edo edo bụ eze nnụnụ ndị na-efegharị n’ugwu ndị dị n’Ebe Ugwu Ụwa. Ọ dị mwute ikwu na, na Europe, a gụwa ha óké na nne, ha erughịzi puku ise n’ihi na ha bụbu ‘nnụnụ a kpọrọ asị ma na-akpagbu.’

‘Ndụ panda ukwu dabeere n’ụzọ ihe atọ dị oké mkpa,’ ka Tang Xiyang, bụ́ onye China nke na-amụ banyere ihe ndị e kere eke, kwuru. Ihe atọ ndị a bụ “ugwu dị nnọọ elu na ndagwurugwu miri nnọọ emi, ọhịa achara, na iyi na-asọ asọ.” Dị ka otu nnyocha e mere gosiri, panda e nwere n’ime ọhịa erughịzi 1,600.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 18, 19]

Ebe Ụfọdụ E Chebere Ihe Ndị E Kere Eke

Ogige Ntụrụndụ Yosemite (California, U.S.A.) bụ n’afọ 1890 ka e guzobere ya. Nke a bụ n’ihi mbọ John Muir bụ́ ọkà n’ịmụ banyere ihe ndị e kere eke gbara. Nde mmadụ anọ na-aga eleta ebe ahụ kwa afọ n’ihi mma dị egwu ọ mara. Otú ọ dị, ọ bụụrụ ndị na-elekọta ogige ahụ ọgụ na mgba ịhụ na ha chekwara ogige ahụ ma n’otu mgbe ahụ, na-arụ ihe ndị ga-eme ka ndị bịara ileta ebe ahụ nụ ụtọ nleta ha.

Ogige Ntụrụndụ Podocarpus (Ecuador) dị n’otu akụkụ nke ọhịa dị n’Ugwu Andes bụ́ nke urukpuru na-akwụkarị na ya. E nwere ụdị anụmanụ na osisi dịgasị iche iche n’ogige a—ihe karịrị ụdị nnụnụ 600 na ihe dị ka ụdị osisi 4,000, dịgasị iche iche. Ọ bụ ebe a ka a chọpụtara quinine, bụ́ ọgwụ zọpụtaworo ndụ ọtụtụ mmadụ. Dịkwa ka ọ dị n’ọtụtụ ogige ndị ọzọ, a na-egbu osisi na ụmụ anụmanụ na ya aghara aghara.

Ugwu Kilimanjaro (Tanzania) so na nke kasịnụ n’ime ugwu ndị na-agbọpụ ọkụ n’ụwa, bụrụkwa ugwu kasị elu n’Africa. Enyí na-akpa nri n’ebe mgbada ya, ebe ahịhịa ndị pụrụ iche, dị ka lobelia ukwu na groundsel ukwu na-eto n’ebe mgbago ya. Igbu anụ na ya n’ụzọ iwu na-akwadoghị, igbukpọsị osisi ya, na ehi ịtakpọsị ahịhịa ya, bụ ihe ndị kasị akpa ya aka ọjọọ.

Ogige Ntụrụndụ Teide (Canary Islands) na-echebe ọmarịcha osisi ndị na-achọ ugwu ahụ na-agbọpụ ọkụ, nke ogige a dị na ya, mma. Ọtụtụ mgbe, ọnọdụ a na-enwe n’agwaetiti ndị ugwu na-agbọpụ ọkụ mejupụtara anaghị adị osisi na ụmụ anụmanụ mma n’ahụ́. Ọnọdụ a na-emekwa ka osisi na ụmụ anụmanụ ndị e si esi weta nwee ike imekpa ndị nke dị ebe ahụ ahụ́.

Ogige Ntụrụndụ Pyrenees na nke Ordesa (France na Spen) na-echekwa ọmarịcha ugwu ndị dị ebe ahụ, tinyere ụmụ anụmanụ na osisi ndị dị na ha. Dịkwa ka ọ dị n’ebe ugwu ndị ọzọ dị na Europe dị, a na-ebibi Ugwu Pyrenees n’ihi ọrụrụ a na-arụ ọtụtụ ebe a na-agba ọsọ snow na ihe ndị ọzọ ga-akpali ndị mmadụ ịga leta ebe ahụ. Nkwụsị a kwụsịrị ịgbaso ụzọ ochie e si arụ ọrụ ugbo na ya etinyewokwa ya n’ọnọdụ ọjọọ.

Ogige Ntụrụndụ Sǒraksan bụ ogige kasị ewu ewu na Republic of Korea. Ọmarịcha nkume granite ndị dị n’ọnụ ọnụ ugwu ya na oké ọhịa ndị dịkwa n’ugwu ahụ na-eme ka ogige ahụ bụrụ sọ mma n’oge mgbụsị akwụkwọ. Ma, otú o si ewu ewu na-eme ka ụfọdụ ụzọ ọhịa ya na-ekwo ekwo ná ngwụsị izu otú ụzọ ndị dị n’obodo ukwu si ekwo ekwo.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 20]

Osisi na Ahịhịa Ndị Na-eto n’Ugwu

Tower of jewels. Fụlawa a na-adị ebube n’anya na-aharu ka ogo mmadụ n’ime izu ole na ole ndị mbụ nke oge opupu ihe ubi. Ebe a pụrụ ịhụ ya bụ nanị n’ugwu abụọ dị na Canary Islands, n’ebe ịdị elu ya ruru mita 1,800. Ọtụtụ ahịhịa ndị na-eto n’ugwu, dị nnọọ ụkọ otú ahụ.

Carline thistle na-eto n’Ugwu Alps nakwa n’Ugwu Pyrenees. Ọdịdị ya yiri nke anyanwụ na-eme ka ugwu ndị ọ dị na ha na-egbuke egbuke ma ọkọchị lawa, fụlawa ya bụkwa nri ụmụ ahụhụ.

Iris nke Bekee. A na-adọ ụdị ụfọdụ nke fụlawa ọhịa a mara mma n’ogige ntụrụndụ iji chọọ ya mma. Ọtụtụ fụlawa ndị e jizi achọ ụlọ mma bụ n’ugwu ka e si nweta ha.

Houseleek ugwu bụ otu n’ime ọtụtụ ahịhịa ugwu ndị na-arapara n’ebe ndị gheere oghe n’ahụ́ nkume. Ebe o si bụ n’ugwu ndị dị n’ebe ndịda Europe. A na-akpọkwa ya ahịhịa na-adịru ebighị ebi n’ihi na ọ naghị anwụ ngwa ngwa.

Bromeliad. Ụdị ya dịgasị iche iche na-eme nke ọma n’ọhịa urukpuru na-akwụkarị na ha n’Ebe Okpomọkụ Ụwa. Ha na-eto n’ebe ịdị elu ya ruru mita 4,500.

Iris nke Algeria na-eto n’Ugwu Er Rif nakwa n’Ugwu Atlas, bụ́ ndị dịcha n’Ebe Ugwu Africa. Ebe ndị a bụ ebe e wepụtara maka ichekwa osisi na ahịhịa ndị dị n’ógbè Mediterenian.

[Foto dị na peeji nke 16]

Ebe a na-egwu ọla kọpa na ọlaedo na nso Ugwu Maoke, Indonesia

[Ebe E Si Nweta Foto]

© Rob Huibers/Panos Pictures

[Foto dị na peeji nke 18]

Rosy periwinkle