Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ànyị Kwesịrị Iji Aha Chineke Eme Ihe?

Ànyị Kwesịrị Iji Aha Chineke Eme Ihe?

Ànyị Kwesịrị Iji Aha Chineke Eme Ihe?

N’AFỌ 1902, akwụkwọ bụ́ The Presbyterian and Reformed Review dere banyere mbipụta e bipụtara Bible bụ́ American Standard version nke 1901, nke bụ́ nsụgharị Bible e nwetara site n’idezigharị nsụgharị King James Version nke afọ 1611. N’isiokwu ya, akwụkwọ ahụ kwuru banyere izi ezi nke iji aha Chineke, bụ́ Jehova, mee ihe n’ime Bible Bekee ahụ, sị:

“Anyị apụghị ịghọta ihe mere a ga-eji nwee echiche dịgasị iche n’ihe banyere ma ò ziri ezi ime nke a. Ihe a bụ ezigbo aha Onyenwe anyị, bụ́ aha Ọ họrọworo ka ndị Ya jiri mara ya: o yiri anyị ka ihe ndị e mebiworo site n’iji utu aha Ya dochie ya, ọ̀ karịrị akarị. Nke bụ́ eziokwu bụ na a na-arụ ụka banyere otú e si akpọ aha ahụ n’ezie, ọ dịghịkwa onye na-ekwu na ‘Jehova’ bụ otú e si akpọ ya n’ezie. Ma, onye Bekee weere na ịkpọ ya Jehova bụ ihe kwesịrị ekwesị; ọ ga-abụkwa ịgbasobiga iwu ókè ịsị ka e jiri Yahwé ma ọ bụ ụzọ ndị ọzọ ndị ọkachamara na-ede akwụkwọ si akpọ ya ugbu a, bụ́ ndị na-ezichaghịkwa ezi, dochie anya ya. Anyị na-eche na ọ ga-abara onye Bekee na-agụ Agba Ochie uru dị ukwuu ịhụ ebe e ji aha ahụ bụ́ ‘Jehova’ mee ihe nke ọma na nke mbụ ya ná nsụgharị ọ ma ama, ma mụta ihe nile ‘Jehova’ bụụrụ ndị Ya na ihe nile O mewooro ha.”

Ọtụtụ nsụgharị Bible Bekee ndị ọzọ ji “Jehova” ma ọ bụ ụdị ọ bụla ọzọ nke aha Chineke, mee ihe. N’otu aka ahụ, a na-ahụkwa ezigbo aha Chineke n’ọtụtụ nsụgharị Bible ndị ọzọ na-abụghị nke Bekee. Ị pụrụ ịhụ ụfọdụ n’ime ha na peeji a. Chineke gwara Mozis banyere aha ya, bụ́ Jehova, sị: “Nke a bụ aha m ruo mgbe ebighị ebi, nke a bụkwa ihe ncheta m ruo ọgbọ nile.” Ya mere, obi abụọ adịghị ya na o ziri ezi iji aha Chineke eme ihe taa!—Ọpụpụ 3:13-15.

[Foto ndị dị na peeji nke 31]

Abụ Ọma 83:18 dị ka e si dee ya n’asụsụ dị iche iche

Tsonga

Union Shona

Vietnamese

Spanish

Hindi

Tagalog

Bekee