Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

È Kwesịrị Iji Ihe Oyiyi Eme Ihe n’Ofufe?

È Kwesịrị Iji Ihe Oyiyi Eme Ihe n’Ofufe?

Echiche nke Bible

È Kwesịrị Iji Ihe Oyiyi Eme Ihe n’Ofufe?

N ’AUGUST 15 nke afọ ọ bụla, a na-eme otu nnukwu ememe okpukpe n’agwaetiti Tínos nke dị na Gris. Ọtụtụ puku mmadụ na-agbakọta iji nye Meri nne Jizọs na ihe oyiyi ya nsọpụrụ, bụ́ nke e kwenyere na ọ na-arụ ọrụ ebube. * Otu akwụkwọ chọọchị Ọtọdọks nke Gris ji eme ihe kọwara, sị: “Anyị ji okwukwe na ịnụ ọkụ n’obi pụrụ iche na-asọpụrụ Theotokos Kasị Nsọ, bụ́ Nne nke Onyenwe anyị, anyị na-arịọkwa ya ka o chebe anyị ma gbatara anyị ọsọ enyemaka. Anyị na-arịọ Ndị Nsọ na-arụ ọrụ ebube ka ha nyere anyị aka gboo mkpa ime mmụọ na nke anụ ahụ́ anyị . . . Anyị ji nsọpụrụ miri emi esutụ ihe oyiyi ha na ihe osise ha ndị dị nsọ ọnụ ma na-akwanyere ha ùgwù.”

Ọtụtụ ndị ọzọ na-ekwu na ha bụ Ndị Kraịst nọ n’òtù okpukpe ndị na-eji ihe oyiyi eme ihe n’ofufe. Ma, ozizi Bible ọ̀ kwadoro iji ihe oyiyi eme ihe n’ofufe?

Ndị Kraịst Oge Mbụ

Tụlee ihe mere n’afọ 50 O.A., mgbe Pọl onyeozi gara Atens, bụ́ obodo e ji iji ihe oyiyi eme ihe n’ofufe mara. Pọl kọwaara ndị Atens na Chineke “adịghị ebi n’ụlọ nsọ ndị e ji aka mee, aka ụmụ mmadụ adịghịkwa ejere ya ozi dị ka à ga-asị na o nwere ihe na-akpa ya . . . Ya mere, . . . anyị ekwesịghị iche na Chineke yiri ọlaedo ma ọ bụ ọlaọcha ma ọ bụ nkume, dị ka ihe a kpụrụ akpụ site na nkà na nchepụta nke mmadụ.”Ọrụ 17:24, 25, 29.

N’eziokwu, ịdọ aka ná ntị dị otú ahụ banyere iji arụsị eme ihe, juru eju n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, bụ́kwa nke a na-akpọ Agba Ọhụrụ. Dị ka ihe atụ, Jọn onyeozi dụrụ Ndị Kraịst ọdụ, sị: “Cheenụ onwe unu nche pụọ n’arụsị.” (1 Jọn 5:21) Pọl degaara ndị Kọrint akwụkwọ, sị: “Oleekwa nkwekọrịta ụlọ nsọ Chineke na arụsị nwere?” (2 Ndị Kọrint 6:16) Ọtụtụ Ndị Kraịst oge mbụ na-ejibu ihe oyiyi okpukpe eme ihe n’ofufe. Pọl chetaara ya Ndị Kraịst nọ na Tesalonaịka mgbe o dere, sị: ‘Unu hapụrụ arụsị unu chigharịkwuru Chineke iji bụrụ ohu ezi Chineke dị ndụ.’ (1 Ndị Tesalonaịka 1:9) O doro anya na Ndị Kraịst ahụ aghaghị inwewo echiche yiri nke Jọn na Pọl banyere ihe oyiyi okpukpe.

Otú “Ndị Kraịst” Si Webata Ihe Oyiyi n’Ofufe Ha

Akwụkwọ bụ́ Encyclopædia Britannica kwuru na “n’ime narị afọ atọ mbụ Chọọchị Ndị Kraịst malitere, . . . e nweghị ihe oyiyi ọ bụla Ndị Kraịst ji eme ihe, chọọchị ahụ jikwa ike ya nile jụ iji ya eme ihe. Dị ka ihe atụ, Clement nke Alexandria, katọrọ ihe oyiyi okpukpe (ndị ọgọ mmụọ) n’ihi na ọ na-agba ndị mmadụ ume ife ihe e kere eke kama ife Onye Okike.”

Oleezi otú iji ihe oyiyi okpukpe eme ihe si ghọọ ihe na-ewu ewu? Akwụkwọ ahụ gara n’ihu ikwu, sị: “N’ihe dị ka etiti narị afọ nke atọ, e ji nke nta nke nta malite ịnakwere na iji ihe oyiyi okpukpe eme ihe na Chọọchị Ndị Kraịst. Ma, ọgbakọ ụfọdụ kwusiri okwu ike megide iji ya eme ihe. Ọ bụ ná mmalite narị afọ nke anọ, bụ́ oge Chọọchị Ndị Kraịst ghọrọ okpukpe ọchịchị Rom, nke dị n’aka Eze Ukwu Constantine, ka a malitere iji ihe osise eme ihe na chọọchị. ọ bụkwa mgbe ahụ ka ha malitere ịgbanye mkpọrọgwụ n’ihe omume ndị a na-emekarị n’ofufe Ndị Kraịst.”

Otu ihe e ji mara ọtụtụ n’ime ndị na-ekpere arụsị, bụ́ ndị maliteziri ịkpọ onwe ha Ndị Kraịst, bụ ife ihe osise nke eze ukwu ofufe. John Taylor kọwara n’akwụkwọ ya bụ́ Icon Painting, sị: “Dị ka ofufe nke eze ukwu si dị, ndị mmadụ fere ihe osise ya ndị e sere n’ákwà ma ọ bụ n’osisi. Ụdị ofufe a bịara mee ka a malite ife ihe oyiyi okpukpe ofufe.” N’ụzọ dị otú a, e ji ife ihe osise na-egosi Jizọs, Meri, ndị mmụọ ozi, na “ndị senti” dochie anya ife ihe osise nke ndị ọgọ mmụọ. Ihe osise ndị a a malitere iji na-eme ihe na chọọchị ka a bịara jiri nke nta nke nta webatazie n’ime ụlọ ọtụtụ nde mmadụ, ma na-efe ha n’ebe ahụ.

Ife Ofufe “n’Ime Mmụọ na n’Eziokwu”

N’otu oge, Jizọs gwara ndị gere ya ntị na ndị ohu Chineke aghaghị ife Chineke “n’ime mmụọ na n’eziokwu.” (Jọn 4:24) N’ihi ya, mgbe onye nwere ezi obi chọrọ ịmata ihe ndị bụ́ eziokwu banyere iji ihe oyiyi eme ihe n’ofufe, ọ ghaghị ịga n’Okwu Chineke iji ghọta isiokwu ahụ.

Dị ka ihe atụ, n’ime Bible ka e dere okwu Jizọs a, bụ́: “Abụ m ụzọ na eziokwu na ndụ. Ọ dịghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ́ bụghị site na mụ.” (Jọn 14:6) Pọl kwuru na “e nwere otu Chineke, na otu onye ogbugbo n’etiti Chineke na mmadụ, otu onye, bụ́ Kraịst Jizọs” nakwa na ‘Kraịst na-arịọrọ anyị arịrịọ.’ (1 Timoti 2:5; Ndị Rom 8:34) Anyị na-aghọtakwu nke a mgbe anyị gụrụ na Kraịst nwere ike “ịzọpụta ndị ahụ n’ụzọ zuru ezu bụ́ ndị na-abịaru Chineke nso site na ya, n’ihi na ọ na-adị ndụ mgbe nile ịrịọ arịrịọ maka ha.” (Ndị Hibru 7:25) Ọ bụ n’aha Jizọs Kraịst ka anyị kwesịrị isi kpegara Chineke ekpere. Ọ dịghị onye ọzọ pụrụ ịnọchi anya ya, ma ya fọdụzie ihe oyiyi na-adịghị ndụ. Ihe ọmụma dị otú ahụ sitere n’Okwu Chineke pụrụ inyere onye ọ bụla na-achọ ịmata eziokwu ahụ aka ịchọta ụzọ ọ ga-esi fee ‘Nna ahụ n’ime mmụọ na n’eziokwu’ ma nweta ngọzi ndị a na-enweta site n’ụdị ofufe a ka mma. N’ezie, dị ka Jizọs kwuru, ‘Nna ahụ na-achọ ka ndị dị otú ahụ fee ya ofufe.’—Jọn 4:23.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Ụdị ihe oyiyi okpukpe a na-ekwu banyere ya n’isiokwu a na-abụkarị ihe osise ma ọ bụ akara nke ndị òtù okpukpe ụfọdụ na-enye nsọpụrụ ofufe. Dị ka ihe atụ, na Chọọchị Ọtọdọks nke Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, ụfọdụ n’ime ihe oyiyi ndị a bụ ihe osise na-egosi Kraịst; ndị ọzọ bụ ihe osise na-egosi Atọ n’Ime Otu, “ndị senti,” ndị mmụọ ozi, ma ọ bụ, dị ka nke e kwuru n’elu, Meri bụ́ nne Jizọs. Ọtụtụ nde mmadụ na-enye ụdị ihe oyiyi okpukpe a nsọpụrụ yiri nke ọtụtụ mmadụ na-enye ihe oyiyi ndị a kpụrụ akpụ e ji eme ihe n’ofufe. Ụfọdụ okpukpe ndị na-adịghị ekwu na ha bụ Ndị Kraịst nwekwara nkwenkwe yiri nke ahụ banyere ihe osise na ihe oyiyi nke chi ndị ha na-efe.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 24]

Boris Subacic/AFP/Getty Images