Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Èkwesịrị M Ịchọ Onye M Ga-alụ n’Intanet?”

“Èkwesịrị M Ịchọ Onye M Ga-alụ n’Intanet?”

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

“Èkwesịrị M Ịchọ Onye M Ga-alụ n’Intanet?”

“Anyị derịtaara onwe anyị ozi E-mail kwa ụbọchị. Anyị mere atụmatụ banyere ebe anyị ga-ebi na ebe anyị ga na-arụ ọrụ. Ọ bụ mụ gaara azụta mgbaaka na-egosi na anyị kwere onwe anyị nkwa ọlụlụ. O rubedịghị otu ọnwa anyị matara onwe anyị, anyị ahụbeghịkwa onwe anyị anya.” — Monika, bụ́ onye nọ n’Austria. *

Ọ NA-AGỤSI gị ike izute onye ị ga-achọ ịmata nke ọma, onye ị pụrụ ịchọ ịlụ. Ma ka ọ dị ugbu a, mgbalị nile ị na-eme ịchọta ya enwebeghị isi. Mgbalị ndị enyi gị na ndị ezinụlọ gị ji ezi obi mee ịchọtara gị onye ị ga-alụ enwebeghịkwa isi, kama nke ahụ, o butedịịrị gị ihere ma gbukwuo mmụọ gị. N’ihi ya, gị ana-eche ma ị̀ ga-aga n’Intanet maka enyemaka.

N’oge a kọmputa juru ebe nile, ịchọta onye ihe ga-adabara gị na ya pụrụ iyi ihe dị nnọọ mfe, ihe ị ga-ahụ ozugbo ị kpara aka na kọmputa. Ụfọdụ na-ekwu na nanị ihe ị ga-eme bụ ịga n’ebe e mere maka nanị ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye n’Intanet. Akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times kọrọ na, n’ime otu ọnwa na United States nanị, nde mmadụ 45 gara n’ebe e mere maka ndị na-achọ di ma ọ bụ nwunye n’Intanet. Otu ụlọ ọrụ ji Intanet achọtara ndị mmadụ onye ha ga-alụ, kwuru na ha na-enyere ihe karịrị nde mmadụ itoolu si mba 240 aka ịchọta onye ha ga-alụ.

Ihe Mere O Ji Adọrọ Mmasị

Ị̀ bụ onye ihere? Ọ̀ na-esiri gị ike ịgakwuru ndị mmadụ ma malite mkparịta ụka? Ị̀ na-atụ ụjọ ịbụ onye a ga-ajụ? Ka ọ̀ na-adị gị nnọọ ka e nweghị onye pụrụ ịlụ gị n’ebe i bi? Ọ bụrụ otú ahụ, ịchọ onye ị ga-alụ n’Intanet pụrụ ịmasị gị. Otu ihe kpatara ya bụ na ụlọ ọrụ ndị ji Intanet achọtara ndị mmadụ onye ha ga-alụ na-ekwe gị nkwa na ị ga-enweta kpọmkwem ụdị onye ị chọrọ. N’ebe a e mere maka ịchọta di ma ọ bụ nwunye n’Intanet, e nwere ebe ị ga-ahụ afọ ole mmadụ dị, mba o bi, ọdịdị ya na àgwà ya, foto ya, na aha na-abụghị ezigbo aha ya. Ebe i nwere ọtụtụ ndị ị ga-esi na ha họrọ, ọ pụrụ iyi gị ka nke a ọ̀ ka mma ma dị mfe karịa ịhụ mmadụ ihu na ihu ma kwuwe okwu ọlụlụ.

Olee nke bụ́ eziokwu? Mmadụ ịchọ onye ọ ga-alụ n’Intanet ọ̀ na-eme n’ezie ka o nwee obi ụtọ na-adịgide adịgide? Tụlegodị ihe a: N’ime afọ isii, otu ụlọ ọrụ ji Intanet achọtara ndị mmadụ di ma ọ bụ nwunye nwere nde mmadụ 11 ha nọ na-achọrọ ndị ha ga-alụ. Ma, ọ bụ nanị mmadụ 1,475 n’ime ha lụrụ ndị ahụ ha hụrụ n’Intanet. Ụlọ ọrụ ọzọ nwere ihe karịrị otu nde mmadụ ha na-enyere aka. Ma, ọ bụ nanị mmadụ 75 ka e ji n’aka na ha lụrụ ndị ahụ ha hụrụ! Gịnị mere nke a na-ejighị aga aga?

Ọ̀ Bụ Ụzọ Kasị Mma Isi Mata Mmadụ?

Otu akwụkwọ akụkọ kwuru, sị: “N’Intanet, a na-egosi onye ọ bụla dị ka onye mara mma, onye na-ekwu eziokwu, na onye ihe na-agara nke ọma.” Ma, ruo ókè há aṅaa ka ndị mmadụ na-ede ihe bụ́ eziokwu banyere onwe ha? Akwụkwọ akụkọ ọzọ si otú a kwuo ya: “E jighị eziokwu ahụ bụ́ na onye ọ bụla na-aghatụ ụgha akpọrọ ihe.” Otu nwanyị so ede otu magazin ndị ntorobịa a ma ama, mere nnyocha banyere ihe a e kwuru. Ọ gara tinye aha ya n’ebe atọ a kasị mara ama e mere maka ịchọta di ma ọ bụ nwunye n’Intanet. O gbughị oge, ọtụtụ mmadụ ezitere ya ozi. Nke a mere ka ọtụtụ ndị kwe ya nkwa ọlụlụ. Gịnị si na ya pụta? Ọ dịghị nke nwere isi! Ụmụ nwoke ndị ahụ ghachara ụgha chara acha banyere onwe ha. Ọ dọrọ aka ná ntị, sị: “Dabere n’ahụmahụ m nwere, ha nile na-agha ụgha.”

Mmadụ itinye nnu na ose n’ogo ma ọ bụ n’ibu ya pụrụ iyi obere ihe. Ụfọdụ pụrụ ịrụ ụka, sị, ‘Ọdịdị ahụ́ abụghị ihe a na-ele.’ Nke a bụ eziokwu, Bible n’onwe ya kwuru na “amara bụ ụgha, ịma mma bụkwa ihe efu.” (Ilu 31:30) Ma, mmadụ ịgha ụgha n’ihe ndị yiri ka hà dị nta ọ̀ bụ ụzọ dị mma isi malite adịm ná mma? (Luk 16:10) Ị̀ pụrụ isi aṅaa kwere ihe ndị ọzọ ọ pụrụ ịgwa gị banyere ihe ndị ka mkpa, dị ka ihe mgbaru ọsọ ya? Bible na-ekwu, sị: ‘Onye ọ bụla gwa ibe ya eziokwu.’ (Zekaraịa 8:16) N’ezie, ime ihe n’eziokwu na-atọ ntọala maka mmekọrịta pụrụ ịga nke ọma.

Otú ọ dị, a dịkarịghị enweta ihe ndị a tụrụ anya ha n’aka ndị a nọ n’Intanet kwe nkwa ọlụlụ. Magazin bụ́ Newsweek kwuru, sị: “Ndị na-achọ ndị ha ga-alụ n’Intanet pụrụ iji nlezianya họrọ okwu ndị ha ga-eji mee ihe mgbe ha na-ede ozi e-mail, na-eji okwu ndị na-eme ka ha yie nnọọ ezigbo mmadụ eme ihe. . . . Nke a na-eme ka i jiri okwu ndị dị mma zaa ha: ị ga-abịa chee na ha bụ ezigbo mmadụ na ndị nwere mmasị n’ebe ị nọ, n’ihi ya, gị emesowe ha omume ọma ma nwee mmasị n’ebe ha nọ.” Dị ka prọfesọ n’ụlọ akwụkwọ Rensselaer Polytechnic Institute nke New York, bụ́ onye na-amụ banyere mmekọrịta e si n’Intanet enwe, si kwuo, nke a pụrụ ime ka mmadụ abụọ ahụ kwe onwe ha nkwa ọlụlụ n’egbughị oge. Ma, dị ka a na-ahụkarị, nke a adịghị eme ka e nwee alụmdi na nwunye obi ụtọ. Otu nwoke dere banyere ahụmahụ o nwere n’ịchọ nwunye n’Intanet, sị: “Ọ bụ ọnyà. Ihe ị ga na-ahụ n’obi gị bụ kpọmkwem ụdị onye ị chọrọ.”

Izute Onye ahụ Ihu na Ihu

Ma, ụfọdụ pụrụ ikwere na e nwere ezigbo uru dị n’anya mmadụ abụọ ahụ na-adịghị ahụ onwe ha. Ha pụrụ iche na mmadụ ịchọ onye ọ ga-alụ n’Intanet na-enye ya ohere ilekwasị anya n’àgwà onye ahụ, kama ikwe ka ọdịdị ahụ́ ya megharịa ya anya. N’ezie, Bible gbara anyị ume ilekwasị anya n’àgwà mmadụ. (1 Pita 3:4) Ma, nsogbu bụ na, n’Intanet, ị pụghị ịhụ otú mmadụ si emegharị ahụ́ n’okwu, otú o si amụmụ ọnụ ọchị, ma ọ bụ otú ihu na-adị ya. Ị pụghị ịhụ otú o si emeso ndị ọzọ ma ọ bụ otú o si eme omume mgbe ihe siiri ya ike. Ihe ndị a bụkwa ihe ndị dị oké mkpa iji mara ma ọ̀ bụ onye ị pụrụ ịtụkwasị obi ma hụ n’anya. Gụọ otú Bible si kọwaa ịhụnanya ná 1 Ndị Kọrint 13:4, 5. Rịba ama na e ji àgwà kọwaa ya, ọ bụghị okwu nkịtị. N’ihi ya, ị ghaghị iwepụta oge mụọ mmadụ iji chọpụta ma àgwà ya na ihe ndị ọ na-ekwu hà kwekọrọ.

Mgbe nwoke na nwanyị na-amatachabeghị onwe ha, ha na-amalitekarị inye ibe ha obi ha. Ụfọdụ n’ime ha na-eji ọsọ ekwe nkwa ọlụlụ, n’agbanyeghị na ha amatachabeghị onwe ha. Otu akụkọ isiokwu ya bụ, “N’Intanet, Ịhụnanya Kpuru Ìsì n’Ezie,” kọrọ banyere mmadụ abụọ matara onwe ha n’Intanet. Ebe otu onye bi ji maịlụ 8,000 dị anya n’ebe onye nke ọzọ bi. Ka izu atọ gasịrị, ha hụrụ onwe ha ihu na ihu. “O tejuru uri anya eteju,” ka nke nwoke kwuru. “Anaghị m eme ụmụ nwanyị na-ete uri anya enyi.” Ha tisara adịm ná mma ha ozugbo ahụ. N’ọnọdụ ọzọ, mgbe mmadụ abụọ na-achọ ịlụ onwe ha zutere, ihe ha hụrụ abụtụghị ihe ha tụrụ anya ya nke na onye nke nwoke, bụ́ onye kwụụrụ nke nwanyị ụgwọ ụgbọelu uje na ụla, gara narakwa ego ọ kwụrụ maka nke ụla ya!

Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Edda na-echeta ahụmahụ o nwere n’ịchọ di n’Intanet. O kwuru, sị: “Mụ na ya adịka. Anyị nọ na-eme atụmatụ ịlụ.” Ma, mgbe ha hụrụ onwe ha ihu na ihu, adịm ná mma ha bịara gbawa mmiri. “Ọ bụghị ụdị onye m tụrụ anya ya, ọ na-atụchakarị mmadụ ma na-emekarị mkpesa. Ihe agajeghị ịdabara mụ na ya .” Otu izu ka e mesịrị, ha gbasara, nke a mekwara ka Edda nwee nnọọ nkụda mmụọ.

Mgbe mmadụ na-eme enyi n’Intanet, ọ pụrụ inye onye ọ bụ ya na ya obi ya nile ngwa ngwa. Ọ pụrụ ịkpatara ya obi mgbawa ma ọ bụrụ na mmekọrịta ahụ emesighị daba—nke bụ́kwanụ ihe nwere ike ime. Ilu 28:26 na-adọ aka ná ntị, sị, “Onye na-atụkwasị obi n’obi nke aka ya, onye ahụ bụ onye nzuzu.” N’ezie, ọ bụ ihe amamihe na-adịghị na ya ime mkpebi ndị dị mkpa dabere n’echiche efu na mmetụta ị na-enwe. N’ihi ya, ilu ahụ gara n’ihu ikwu, sị: “Ma onye na-eje ije n’amamihe, onye ahụ ka a ga-eme ka o wepụga onwe ya.”

Ihe Ize Ndụ Ndị Dị n’Iji Ọsọ Ekwe Nkwa Ọlụlụ

Iji ọsọ kwe nkwa ọlụlụ mgbe unu na-amatachabeghị onwe unu abụtụghị ihe amamihe dị na ya. E hotara onye edemede England bụ́ Shakespeare, dị ka onye kwuru, sị: “Alụmdi na nwunye e ji ọsọ banye adịkebeghị aga nke ọma.” Ndụmọdụ Bible nyere ka kwuo ya hoo haa: “Echiche nile nke onye ọ bụla nke na-eme ngwa na-eduba nanị n’ịkọ ụkọ.”—Ilu 21:5.

N’ụzọ dị mwute, ọtụtụ ndị na-achọ ndị ha ga-alụ n’Intanet achọpụtawo na nke ahụ bụ eziokwu. Mgbe Monika, bụ́ onye e hotara ihe o kwuru ná mmalite, na otu onye derịtara akwụkwọ n’Intanet ruo nanị otu ọnwa, Monika bịara chee na a zawo ekpere ya banyere inweta onye ọ ga-alụ. N’agbanyeghị na ha emeela atụmatụ ịlụ—ọbụna ruo n’ókè nke ime ndokwa ịzụta mgbaaka ga-egosi na ha ekwekọrịtala ịlụ—ha ji “oké mwute” tisaa mmekọrịta ahụ ha ji ọsọ banye na ya.

Ị pụrụ izere obi mgbawa site n’ịṅa ntị na ndụmọdụ Bible, bụ́: “Onye nwere ezi uche ahụwo ihe ọjọọ, wee zobe onwe ya: ma ndị na-enweghị uche agabigawo, e wee rie ha nha.” (Ilu 22:3) Ma, ihe ize ndụ ị pụrụ iche ihu n’ihi ịchọ onye ị ga-alụ n’Intanet abụghị nanị obi mgbawa na ihe agaghị ka i si chee ya. Isiokwu na-abịa n’ihu ga-atụle nsogbu ndị ọzọ na-esi na ya apụta.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 A gbanwewo aha ụfọdụ.

[Foto dị na peeji nke 29]

N’Intanet, ndị mmadụ na-aghakarị ụgha ma ọ bụ na-etinye nnu na ose mgbe ha na-ede banyere onwe ha

[Foto dị na peeji nke 30]

Mgbe ha jisịrị Intanet derịtara onwe ha ọtụtụ ozi ịhụnanya, ọ naghị abụkarị ihe ha tụrụ anya ya ka ha na-ahụ ma ha hụ ihu na ihu