Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ònye Bụ “Nanị Ezi Chineke Ahụ”?

Ònye Bụ “Nanị Ezi Chineke Ahụ”?

Ònye Bụ “Nanị Ezi Chineke Ahụ”?

JIZỌS kpegaara Chineke, bụ́ onye ọ kpọrọ Nna ya, ekpere ọtụtụ mgbe, ọ kụzikwara ndị ọzọ ime otú ahụ. (Matiu 6:9-11; Luk 11:1, 2) N’ekpere ya na ndịozi ya so kpee—nke ha kpere awa ole na ole tupu e gbuo ya—Jizọs rịọrọ, sị: “Nna, awa ahụ abịawo; mee ka ọkpara gị dị ebube, ka ọkpara gị wee mee ka ị dị ebube. Nke a pụtara ndụ ebighị ebi, ha inweta ihe ọmụma banyere gị, bụ́ nanị ezi Chineke ahụ, nakwa banyere onye ahụ i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.”—Jọn 17:1, 3.

Rịba ama na Jizọs kpegaara Onye ọ kpọrọ “nanị ezi Chineke ahụ,” ekpere. O gosikwara na Chineke ka ya ukwuu mgbe ọ gara n’ihu ikwu, sị: “Ya mere ugbu a, Nna, jiri ebube m nwere n’akụkụ gị tupu ụwa amalite ịdị mee ka m dị ebube n’akụkụ gị.” (Jọn 17:5) Ebe ọ bụ na Jizọs kpegaara Chineke ekpere, na-arịọ ka ya nọrọ n’akụkụ Ya, olee otú Jizọs ga-esikwa bụrụ, n’otu mgbe ahụ, “nanị ezi Chineke ahụ”? Ka anyị lebanụ anya n’okwu a.

Ọnọdụ Jizọs n’Eluigwe

E gburu Jizọs awa ole na ole ka o kpesịrị ekpere ahụ. Ma ọ nọghị ogologo oge n’ili—nanị site n’ehihie Friday ruo n’ụtụtụ Sunday. (Matiu 27:57–28:6) Pita onyeozi kwuru, sị: “Jizọs a ka Chineke kpọlitere n’ọnwụ, bụ́ eziokwu nke anyị nile bụ ndị àmà ya.” (Ọrụ 2:31, 32) Ò kwere omume na Jizọs kpọlitere onwe ya n’ọnwụ? Mbanụ, dị ka Bible si kwuo, ndị nwụrụ anwụ “adịghị ama ihe ọ bụla.” (Eklisiastis 9:5) Ọ bụ Nna eluigwe nke Jizọs, bụ́ “nanị ezi Chineke ahụ,” kpọlitere Ọkpara ya n’ọnwụ.—Ọrụ 2:32; 10:40.

Obere oge a kpọlitesịrị Jizọs n’ọnwụ, ndị okpukpe, bụ́ ndị na-akpagbu ndị na-eso ụzọ ya, gburu Stivin, bụ́ otu n’ime ndị na-eso ụzọ ya. Ka ha na-achọ ịtụgbu ya ná nkume, e mere ka Stivin hụ ọhụụ. O kwuru, sị: “Lee! Ana m ahụ eluigwe ka e meghere ya nakwa Nwa nke mmadụ ka ọ na-eguzo n’aka nri Chineke.” (Ọrụ 7:56) N’ụzọ dị otú a, Stivin hụrụ Jizọs, bụ́ “nwa nke mmadụ” n’eluigwe ka ọ nọ n’ọnọdụ na-egosi na ọ na-akwado Chineke—“n’aka nri Chineke”—ọbụna dị ka ọ nọworo ‘n’akụkụ Chineke’ tupu ya abịa n’ụwa.—Jọn 17:5.

Mgbe e gbusịrị Stivin, Jizọs mere ka Sọl bụ́ onye e ji aha Rom ya, bụ́ Pọl, mara nke ọma, hụ ya anya n’ụzọ ọrụ ebube. (Ọrụ 9:3-6) Mgbe Pọl nọ n’Atens nke Gris, o kwuru banyere “Chineke nke mere ụwa na ihe nile dị n’ime ya.” Ọ sịrị na Chineke a, nke bụ́ “nanị ezi Chineke ahụ,” ‘ga-ekpe elu ụwa mmadụ bi ikpe n’ezi omume site n’aka otu nwoke onye ọ họpụtaworo, o nyewokwa mmadụ nile ihe mmesi obi ike ebe ọ bụ na o siwo ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite ya.’ (Ọrụ 17:24, 31) N’ebe a, Pọl onyeozi kọwara Jizọs dị ka “otu nwoke”—ee, onye dị ala karịa Chineke—onye Chineke mere ka ọ maliteghachi ndụ n’eluigwe.

Jọn onyeozi kọwakwara na Chineke ka Jizọs ukwuu. Jọn kwuru na ya dere akwụkwọ Oziọma ya ka ndị na-agụ ya wee kwere na “Jizọs bụ Kraịst ahụ, Ọkpara Chineke”—ọ bụghị na ọ bụ Chineke. (Jọn 20:31) Jọn hụkwara eluigwe n’ọhụụ, bụ́ nke ọ nọ hụ “nwa atụrụ ahụ,” onye ọ kpọrọ Jizọs n’Oziọma ya. (Jọn 1:29) Nwa atụrụ ahụ na ndị ọzọ dị 144,000, bụ́ ndị Jọn kwuru na ‘a zụtara [ma ọ bụ kpọlite n’ọnwụ] n’ụwa,’ guzo. Jọn na-akọwakwa na e dekwasịrị “aha [Nwa atụrụ ahụ] na aha Nna ya, n’egedege ihu ha.”—Mkpughe 14:1, 3.

Ọ̀ pụrụ ikwe omume na “Nwa atụrụ ahụ,” na “Nna ya” bụ otu onye? O doro anya na ọ pụghị ikwe omume. Bible akọwaghị ha dị ka otu onye. Aha ha abụghịdị otu.

Aha Nwa Atụrụ ahụ na nke Nna Ya

Dị ka anyị hụworo, aha a gụrụ Ọkpara Chineke, bụ́ Nwa Atụrụ ahụ, bụ Jizọs. (Luk 1:30-32) Gịnịkwanụ bụ aha Nna ya? Aha ya dị ọtụtụ puku ebe n’ime Bible. Dị ka ihe atụ, Abụ Ọma 83:18 na-ekwu, sị: “Gị onwe gị, Onye aha Gị bụ Jehova, nanị Gị, bụ Onye kachasị ihe nile elu n’elu ụwa nile.” Ọ dị mwute na n’ọtụtụ nsụgharị Bible, e jirila okwu bụ́ “ONYENWE ANYỊ” na “CHINEKE,” bụ́ ndị ha na-edekarị ná mkpụrụ akwụkwọ ukwu, dochie aha Chineke, bụ́ Jehova. Okwu ndị ahụ e dere ná mkpụrụ akwụkwọ ukwu bụ iji mee ka a mara na ọ bụ Jehova ka a na-ekwu banyere ya, na ọ bụghị ndị ọzọ a na-akpọ chi ma ọ bụ onyenwenụ. * Ma, n’ọtụtụ nsụgharị Bible, e weghachiwo Aha Nsọ ahụ n’ebe ndị o kwesịrị ịdị.

Nsụgharị American Standard Version (1901) nke Bekee, bụ ihe atụ a ma ama nke nsụgharị Bible weghachiworo aha Chineke, bụ́ Jehova, n’ebe ndị o kwesịrị ịdị. N’okwu mbido ya, e dere, sị: “Mgbe ndị [sụgharịrị Bible a] jisịrị nlezianya tụlee ya, ha bịara jiri otu olu kwere na nkwenkwe ụgha ndị Juu, bụ́ nke weere Aha Nsọ ahụ dị ka ihe dị oké nsọ ịkpọ ya akpọ, ekwesizighị ịdịgide ná nsụgharị Bekee ma ọ bụ ná nsụgharị ọ bụla ọzọ nke Agba Ochie, ebe ihe ọma mere na ọ dịghịzi n’ọtụtụ Bible ndị ọzọ ndị ozi ala ọzọ nke oge a sụgharịrị.” *

Atọ n’Ime Otu—Ọ̀ Bụ Ozizi Onye?

Gịnịkwanụ banyere ozizi ahụ bụ́ na Jehova na Jizọs bụ otu Chineke, dị ka ozizi Atọ n’Ime Otu si kwuo? Ná mbipụta ya nke April-June 1999, magazin bụ́ The Living Pulpit kọwara Atọ n’Ime Otu n’ụzọ dị otú a, sị: “E nwere otu Chineke na Nna, otu Onyenwe Anyị Jizọs Kraịst, na otu Mmụọ Nsọ, ‘ndị’ atọ . . . bụ́ nnọọ otu onye . . . ; ha atọ bụcha Chineke, nwee otu ọdịdị, ma ha dịcha iche iche, ihe e ji ama nke ọ bụla bụ àgwà ya.” *

Ebee ka ozizi Atọ n’Ime Otu a dị mgbagwoju anya si malite? Magazin bụ́ Christian Century, ná mbipụta ya nke May 20-27, 1998, hotara ihe otu pastọ kwuru, bụ́ onye kwetara na Atọ n’Ime Otu “bụ ozizi si n’aka chọọchị, ọ bụghị ozizi si n’aka Jizọs.” Ọ bụ ezie na Atọ n’Ime Otu abụghị ozizi si n’aka Jizọs, ò kwekọrọ n’ihe Jizọs kụziri?

Nna ahụ—Ọ Ka Ọkpara ahụ Ukwuu

Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ikpe ekpere, sị: “Nna anyị Nke bi n’eluigwe, Ka e doo aha Gị nsọ.” N’ime Bible, a kọwara Nna anyị nke eluigwe, onye aha ya bụ Jehova, dị ka onye ka Ọkpara ya ukwuu. Dị ka ihe atụ, Jehova dị “site na mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi.” Ma, Bible na-ekwu na Jizọs bụ “onye e buru ụzọ mụọ n’ihe nile e kere eke.” Jizọs n’onwe ya kụziri na Jehova ka ya ukwuu mgbe o kwuru, sị: “Nna m ka Mụ onwe m ukwuu.” (Matiu 6:9; Abụ Ọma 90:1, 2; Ndị Kọlọsị 1:15; Jọn 14:28, Bible Nsọ nke Union Version) N’agbanyeghị ihe ndị a, ozizi Atọ n’Ime Otu na-ekwu na Nna ahụ na Ọkpara ahụ bụ “Chineke ha nhata.”

Ekpere ndị Jizọs kpere, dị ka nke o kpere tupu e gbuo ya, mekwara ka o doo anya na Nna ahụ ka Ọkpara ya ukwuu, nakwa na Nna ahụ na ọkpara ya abụghị otu onye. Jizọs kpere, sị: “Nna, ọ bụrụ na ị chọọ, wepụ iko a [nke bụ́ ọnwụ ihere] n’ebe m nọ. Ka o sina dị, ka uche gị mee, ọ bụghị nke m.” (Luk 22:42) Ọ bụrụ na Chineke na Jizọs bụ “nnọọ otu onye,” dị ka ozizi Atọ n’Ime Otu si kwuo, olee otú uche Jizọs pụrụ isi yie ka ọ̀ dị iche n’uche Nna ya?—Ndị Hibru 5:7, 8; 9:24.

Ọzọkwa, ọ bụrụ na Jehova na Jizọs bụ otu onye, olee otú otu n’ime ha pụrụ isi mara ihe onye nke ọzọ na-amaghị? Dị ka ihe atụ, Jizọs kwuru banyere oge a ga-ekpe ụwa a ikpe, sị: “Ọ dịghị onye maara banyere ụbọchị ahụ ma ọ bụ awa ahụ, ndị mmụọ ozi nọ n’eluigwe amaghị, Ọkpara ahụ amaghịkwa, kama nanị Nna m maara.”—Mak 13:32.

Atọ n’Ime Otu na Chọọchị

Ozizi Atọ n’Ime Otu abụghị ozizi si n’aka Jizọs ma ọ bụ n’aka Ndị Kraịst nke oge mbụ. Dị ka e kwuru na mbụ, ọ bụ “ozizi si n’aka chọọchị.” Ná mbipụta ya nke 1999 nke kwuru banyere Atọ n’Ime Otu, magazin bụ́ The Living Pulpit kwuru, sị: “Mgbe ụfọdụ, ọ na-eyi ka onye ọ bụla ọ̀ na-ewere na ozizi atọ n’ime otu bụ nnọọ ozizi Ndị Kraịst,” ma, o kwukwara na ọ bụghị “ozizi Bible.”

Akwụkwọ bụ́ New Catholic Encyclopedia (1967) kwuru ọtụtụ ihe banyere Atọ n’Ime Otu ma kweta, sị: “Mgbe a tụlesịrị ihe nile, ozizi Atọ n’Ime Otu bụ ná ngwụsị narị afọ nke anọ ka ọ malitere. . . . Ozizi ‘Chukwu atọ dị n’ime otu Chukwu’ agbanyesighị mkpọrọgwụ ike tupu ngwụsị narị afọ nke anọ, Ndị Kraịst anabatachaghịkwa ya n’ezie ná ndụ ha nakwa n’okpukpe ha tupu mgbe ahụ.”

Martin Werner, bụ́ prọfesọ na Mahadum nke Bern, Switzerland, kwuru, sị: “N’Agba Ọhụrụ, ebe ọ bụla e kwutere banyere mmekọrịta dị n’etiti Jizọs na Chineke, bụ́ Nna ya, ma à na-ekwu banyere ọbịbịa Jizọs bịara n’ụwa dị ka mmadụ ma à na-ekwu banyere ọnọdụ ya dị ka Mezaịa, a na-aghọta ya nnọọ na Chineke ka ya ukwuu.” N’ụzọ doro anya, ihe Jizọs na Ndị Kraịst oge mbụ kweere dị nnọọ iche n’ozizi Atọ n’Ime Otu a na-ezi na chọọchị taa. Ọ bụrụ otú ahụ, oleekwanụ ebe ozizi a si malite?

Mmalite nke Atọ n’Ime Otu

Bible na-ekwu banyere ọtụtụ chi na ọtụtụ chi nwanyị ndị mmadụ fere ofufe, gụnyere Ashtọret, Milkọm, Kemọsh, na Molek. (1 Ndị Eze 11:1, 2, 5, 7) Ọbụna ọtụtụ ndị Izrel oge ochie nwere oge ha kweere na Bel bụ ezi Chineke ahụ. N’ihi ya, onye amụma Jehova bụ́ Ịlaịja mara ha aka, sị: “Ọ bụrụ na Jehova bụ Chineke, jesoonụ Ya; ọ bụrụ Bel, jesoonụ ya.”—1 Ndị Eze 18:21.

Tupu a mụọ Jizọs, ife chi atọ e jikọrọ ọnụ nke ndị ọgọ mmụọ, bụkwa ihe a ma ama. Ọkọ akụkọ ihe mere eme, bụ́ Will Durant, kwuru na “ọ bụ n’Ijipt ka echiche nke atọ n’ime otu dị nsọ malitere.” N’akwụkwọ bụ́ Encyclopædia of Religion and Ethics, James Hastings dere, sị: “Dị ka ihe atụ, n’okpukpe ndị India, e nwere chi atọ n’ime otu bụ́ Brahmā, Siva, na Viṣṇu; n’okpukpe ndị Ijipt kwa, e nwere chi atọ n’ime otu bụ́ Osiris, Isis, na Horus.”

Ya mere, e nwere ọtụtụ chi. Ndị Kraịst nke oge mbụ hà kwetara na e nwere ọtụtụ chi? Hà lere Jizọs anya dị ka Chineke nke Pụrụ Ime Ihe Nile?

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 11 Dị ka ihe atụ, lee Abụ Ọma 110:1 ná nsụgharị King James. Ma Jizọs ma Pita hotara amaokwu a.—Matiu 22:42-45; Ọrụ 2:34-36.

^ par. 12 Lee isiokwu bụ́ “Ànyị Kwesịrị Iji Aha Chineke Eme Ihe?” bụ́ nke dị na peeji nke 31 nke magazin a.

^ par. 14 Ụkpụrụ Okwukwe nke Athanasius, bụ́ nke a tụpụtara na narị afọ ole na ole mgbe Jizọs nwụsịrị, kọwara Atọ n’Ime Otu n’ụzọ dị otú a, sị: “Nna ahụ bụ Chineke: Ọkpara ahụ bụ Chineke: Mmụọ Nsọ bụkwa Chineke. Ma, ha abụghị Chineke atọ: kama ha bụ otu Chineke.”

[Foto dị na peeji nke 19]

IJIPT

Chi atọ n’ime otu bụ́ Osiris, Isis, na Horus, narị afọ nke abụọ T.O.A.

[Foto dị na peeji nke 19]

PALMYRA, SIRIA

Chi atọ n’ime otu bụ́ chi ọnwa, Onyenwe Eluigwe, na chi anyanwụ, ihe dị ka narị afọ mbụ O.A.

[Foto dị na peeji nke 19]

INDIA

Chi Atọ n’Ime Otu nke ndị Hindu ihe dị ka narị afọ nke asaa O.A.

[Foto dị na peeji nke 19]

NORWAY

Atọ n’Ime Otu (Nna, Ọkpara, na Mmụọ Nsọ), ihe dị ka narị afọ nke 13 O.A.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 19]

Foto abụọ mbụ ma e si n’elu gụwa: Musée du Louvre, Paris