Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe “Nanị Ezi Chineke ahụ” Kwere Ná Nkwa

Ihe “Nanị Ezi Chineke ahụ” Kwere Ná Nkwa

Ihe “Nanị Ezi Chineke ahụ” Kwere Ná Nkwa

JEHOVA CHINEKE tinyere di na nwunye mbụ bụ́ mmadụ na paradaịs n’elu ụwa—ogige Eden. O nyere ha ntụziaka ịmụ ụmụ na ‘ibuda ụwa n’okpuru onwe ha,’ bụ́ nke gụnyere ịgbasa ebe obibi ha bụ́ Paradaịs, ka ezinụlọ ha na-amụba. (Jenesis 1:26-28; 2:15) Ọ̀ dị mgbe nzube Chineke nke bụ́ ụmụ mmadụ ịdị ndụ n’ụwa bụ́ paradaịs, ga-emezu?

N’ezie, ọ ga-emezurịrị! Dị ka amụma Bible si kwuo, “[Jehova elodawo] ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi,” ọ “ga-ehichapụkwa anya mmiri n’ihu nile.” Mgbe e mezuru nke a, “a ga-asịkwa . . . , Lee, Chineke anyị ka Nke a bụ; anyị elewo anya Ya, Ọ ga-azọpụtakwa anyị: Nke a bụ Jehova; anyị elewo anya Ya, ka anyị tegharịa egwú ọṅụ ṅụrịakwa ná nzọpụta Ya.”—Aịsaịa 25:8, 9.

Akwụkwọ ikpeazụ nke Bible kọwara ọnọdụ a ga-enwe n’ụwa mgbe e bibisịrị ụwa a ma ọ bụ usoro ihe a Setan na-achị. Banyere “ụwa ọhụrụ” ahụ nke ihe ga-emejupụta ya bụ ụmụ mmadụ hụrụ Chineke n’anya, Bible na-ekwu, sị: “Ụlọikwuu nke Chineke na-adịnyere ihe a kpọrọ mmadụ, ya na ha ga-ebikwa, ha ga-abụkwa ndị nke ya. Chineke n’onwe ya ga-anọnyekwara ha. Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri ọ bụla n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru újú ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ.”—Mkpughe 21:1-4.

Lee nnọọ nkwa dị ebube nke ahụ bụ! Ànyị pụrụ ikwere na ha ga-emezu? Tụlee otú ọnwụ ịchụ àjà Jizọs na ọrụ ebube ndị ọ rụrụ si bụrụ ihe anyị ga-adabere na ya nwee obi ike na Chineke ga-emerịrị ihe ọ bụla O kwuru na ya ga-eme.—2 Ndị Kọrint 1:20.

Ndụ Jizọs Dị Ka Ihe Mgbapụta

Mgbe Setan mere ka Adam daba ná mmehie site n’inupụrụ Chineke isi, ụmụ Adam nile ketara mmehie ya. Bible na-ekwu, sị: “Dị nnọọ ka mmehie sitere n’otu mmadụ bata n’ụwa, ọnwụ esitekwa ná mmehie, ọnwụ ewee si otú ahụ gbasaa ruo mmadụ nile n’ihi na ha nile emehiewo.” Ma, ihe ndekọ Bible ahụ gara n’ihu ikwu, sị: “Site ná nrubeisi nke otu onye ahụ [nwoke ahụ zuru okè bụ́ Jizọs], a ga-edebe ọtụtụ mmadụ n’ọnọdụ ndị ezi omume.” (Ndị Rom 5:12, 19) Dị ka e kwuru n’isiokwu mbụ n’usoro isiokwu a, Jizọs bụ “Adam ikpeazụ”—onye “sitere n’eluigwe”—onye nyere ndụ ya ka ọ bụrụ “ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.”—1 Ndị Kọrint 15:45, 47; Matiu 20:28.

N’ihi ya, ndị nile na-egosipụta okwukwe na Jizọs pụrụ ịbụ ndị “e ji ihe mgbapụta tọhapụ” ná mmehie na ndị pụrụ inweta ndụ ebighị ebi. (Ndị Efesọs 1:7; Jọn 3:36) N’ezie, anyị pụrụ ịṅụrị ọṅụ na Jehova Chineke hụrụ ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ya dị ka Onye Nzọpụta anyị! (Luk 2:10-12; Jọn 3:16) Ịtụle ihe Jizọs meere ụmụ mmadụ na-ahụju anya na narị afọ mbụ na-eme ka anyị ghọta ihe ọdịnihu ga-adị ka ya. Ihe Jizọs mere dị ịtụnanya n’ezie!

Ihe Atụ nke Ụwa Ọhụrụ

Jizọs gwọrọ ndị ọrịa nile a kpọtaara ya. Ọ dịghị onye ọ na-agwọlighị n’ime ha, n’agbanyeghị ụdị ọrịa ha na-arịa ma ọ bụ ụdị nkwarụ ha nwere. Ọzọkwa, o ji nanị azụ na ogbe achịcha ole na ole nyejuo ọtụtụ puku mmadụ afọ n’ụzọ ọrụ ebube, o mekwara nke a ihe karịrị otu ugboro.—Matiu 14:14-22; 15:30-38.

Mgbe Jizọs mere ka otu nwoke kpuru ìsì site n’ọmụmụ hụ ụzọ, ndị agbata obi na ndị maara nwoke ahụ nabatara ọrụ ebube ahụ, ma ndị ndú okpukpe ndị Juu nwere obi abụọ. N’ihi ya, nwoke ahụ e mere ka ọ hụ ụzọ sooro ha tụgharịa uche, na-asị: “Malite n’oge ochie, a nụtụbeghị na mmadụ meghere anya onye kpuru ìsì site na mgbe a mụrụ ya. Ọ bụrụ na nwoke a esighị na Chineke, ọ pụghị ime ihe ọ bụla ma ọlị.”—Jọn 9:32, 33.

N’oge Jizọs jere ozi n’ụwa, nwa nwanne nne ya, bụ́ Jọn Onye Na-eme Baptizim, bụ́ onye nọ mkpọrọ, zigara ndị ozi ya ịga chọpụta ma akụkọ ọ na-anụ banyere Jizọs ọ̀ bụ eziokwu. Bible na-ekwu na “n’oge awa ahụ,” Jizọs “gwọrọ ọtụtụ ndị nwere ọrịa na ajọ ọrịa dị iche iche na mmụọ ọjọọ, mekwaara ọtụtụ ndị ìsì amara nke ịhụ ụzọ.” Mgbe ahụ Jizọs gwara ndị ozi ahụ, sị: “[Kọọrọnụ] Jọn ihe unu hụrụ na ihe unu nụrụ: ndị ìsì na-ahụ ụzọ, ndị ngwụrọ na-eje ije, a na-eme ka ndị ekpenta dị ọcha, ndị ntị chiri na-anụkwa ihe, a na-akpọlitekwa ndị nwụrụ anwụ.”—Luk 7:18-22.

Chegodị echiche: Ọ bụrụ na ọ dị ihe ọma mere n’oge gara aga, nke ahụ ọ́ gaghị eme ka i nwee obi ike na ọ pụrụ imeghachi? Site n’ọrụ ebube ndị ahụ Jizọs rụrụ, o gosipụtara n’ụzọ dị nta ihe ọ ga-eme n’ụzọ dị ukwuu n’oge ọ ga na-achị dị ka Eze nke Alaeze Chineke. Ọrụ ebube ya gosiri na ọ bụ Chineke zitere ya nakwa na ọ bụ Ọkpara Chineke n’ezie.

N’Alaeze Chineke, a ga-emezu n’ụzọ nkịtị, amụma ndị kwuru banyere ihe ndị magburu onwe ha. Dị ka e buru n’amụma, a ga-emeghe anya ndị ìsì, megheekwa ntị nke ndị ntị chiri, ndị ngwụrọ ga-amali dị ka ele, ọ dịghịkwa onye ga-arịa ọrịa. A ga-enwekwa udo na nchebe n’ebe nile n’ụwa. Ọbụna anụmanụ ndị dị ize ndụ ugbu a na ụmụ mmadụ ga-adị n’udo.—Aịsaịa 9:6, 7; 11:6-9; 33:24; 35:5, 6; 65:17-25.

Ọ̀ ga-amasị gị ịdị ndụ ebighị ebi n’Alaeze Chineke, mgbe a ga-enwe ọnọdụ ndị dị otú ahụ? Jizọs gosiri ihe ị na-aghaghị ime mgbe o kpegaara nna ya ekpere, sị: “Nke a pụtara ndụ ebighị ebi, ha inweta ihe ọmụma banyere gị, bụ́ nanị ezi Chineke ahụ, nakwa banyere onye ahụ i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.” (Jọn 17:3) Ekwekwala ka ihe ọ bụla gbochie gị ịnọgide na-enweta ihe ọmụma dị otú ahụ nke na-enye ndụ.

[Foto dị na peeji nke 22]

Nke a bụ nkwa Chineke maka ụwa