Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ndị A Na-akpọ ‘Chi’”

“Ndị A Na-akpọ ‘Chi’”

“Ndị A Na-akpọ ‘Chi’”

MGBE Pọl onyeozi gwọrọ otu nwoke dara ngwụrọ na Listra, ndị obodo ahụ ji oké olu kwuo, sị: “Ndị bụ chi adịrịwo ka ụmụ mmadụ, ha agbadakwutewokwa anyị!” Ha wee kpọọ Pọl, Hamis, kpọọkwa Banabas ya na ya so, Zus. (Ọrụ 14:8-14) N’Efesọs, Dimitriọs, bụ́ onye na-akpụ ọlaọcha dọrọ ndị mmadụ aka ná ntị na ọ bụrụ na a hapụ Pọl ka ọ nọgide na-eme nkwusa, na “a ga-ewere ụlọ nsọ nke nnukwu chi nwanyị bụ́ Atemis dị ka ihe efu.”—Ọrụ 19:24-28.

Ndị biri na narị afọ mbụ—dịkwa ka ọtụtụ mmadụ taa—fere “ndị a na-akpọ ‘chi,’ ma ọ̀ bụ n’eluigwe ma ọ bụ n’ụwa.” N’ezie, Pọl kwuru, sị: “E nwere ọtụtụ ‘chi’ na ọtụtụ ‘ndị nwenụ’.” Ma, ọ kọwakwara, sị: “Nye anyị e nwere n’ezie otu Chineke bụ́ Nna, . . . e nwekwara otu Onyenwe anyị, bụ́ Jizọs Kraịst.”—1 Ndị Kọrint 8:5, 6.

À Kpọkwuru Jizọs Chineke?

Ọ bụ ezie na ọ dịtụbeghị mgbe Jizọs kwuru na ya bụ Chineke, dị ka onye ọchịchị Jehova họpụtara, e ji okwu ndị bụ́ “Chineke Nke bụ́ Dike” nakwa “Onyeisi Udo,” kọwaa ya n’amụma Aịzaịa. Amụma ahụ kwukwara, sị: “Ọ dịghị ọgwụgwụ ọ bụla ịba ụba nke ịbụ onyeisi Ya na udo Ya ga-agwụ.” (Aịsaịa 9:6, 7) N’ihi ya, dị ka “Onyeisi”—ọkpara nke Eze Ukwu ahụ, bụ́ Jehova—Jizọs ga-abụ Onye ọchịchị nke Alaeze eluigwe nke “Chineke Nke pụrụ ime ihe nile.”—Ọpụpụ 6:3.

Otú ọ dị, mmadụ pụrụ ịjụ, sị, ‘Olee otú Jizọs si bụrụ “Chineke Nke bụ́ Dike?” Jọn onyeozi ó kwughị na Jizọs n’onwe ya bụ Chineke?’ Na Bible Nsọ nke Union Version, Jọn 1:1 na-agụ, sị: “Na mbụ ka Okwu ahụ dịrị, Okwu ahụ na Chineke dịkwara, Okwu ahụ bụrụkwa Chineke.” Ụfọdụ mmadụ na-arụ ụka na nke a pụtara na “Okwu ahụ,” bụ́ onye a mụrụ n’ụwa dị ka nwa ọhụrụ bụ́ Jizọs, bụ Chineke nke Pụrụ Ime Ihe Nile n’onwe ya. Nke ahụ ọ̀ bụ eziokwu?

Ọ bụrụ na a kọwara na ihe amaokwu a na-ekwu bụ na Jizọs n’onwe ya bụ Chineke nke Pụrụ Ime Ihe Nile, ọ ga-emegide okwu bu ya ụzọ, nke bụ́ na “Okwu ahụ na Chineke dịkwara.” Onye ya na onye ọzọ nọ apụghị ịbụ onye ahụ ya na ya nọ. N’ihi ya, ọtụtụ nsụgharị Bible gosiri ọdịiche dị n’etiti ha, na-eme ka o doo anya na Okwu ahụ abụghị Chineke nke Pụrụ Ime Ihe Nile. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ nsụgharị Bible kwuru ihe ndị na-esonụ: “Okwu ahụ bụkwa Chi,” “chi ka Okwu ahụ bụkwa,” na “Okwu ahụ bụkwa onye dị nsọ.” *

Amaokwu Bible ndị e dere n’asụsụ Grik otú e si dee Jọn 1:1, ji okwu bụ́ “chi” mee ihe. Dị ka ihe atụ, mgbe ìgwè mmadụ gbakọtaranụ nụrụ olu Herọd Agrịpa nke Mbụ, ha tiri mkpu, sị: ‘Ọ bụ chi na-ekwu.’ Mgbe Pọl na-anwụghịkwa n’agwọ tara ya, ndị mmadụ kwuru, sị: “Ọ bụ chi.” (Ọrụ 12:22; 28:3-6) O kwekọrọ n’ụtọ asụsụ Grik nakwa n’ozizi Bible ịkpọ Okwu ahụ “chi,” kama ịkpọ ya Chineke.—Jọn 1:1.

Tụlee otú Jọn si kọwaa “Okwu ahụ” n’isi mbụ nke akwụkwọ Oziọma ya. O dere, sị: “Okwu ahụ ghọrọ anụ ahụ́ ma bie n’etiti anyị, anyị hụkwara ebube ya, bụ́ ụdị ebube nke ọkpara a mụrụ nanị ya [ọ bụghị Chineke] nwetara n’aka nna ya.” N’ihi ya, “Okwu ahụ,” bụ́ onye ghọrọ anụ ahụ́, biri n’ụwa dị ka nwoke bụ́ Jizọs, ndị mmadụ hụkwara ya anya. Ya mere, Jizọs apụghị ịbụ Chineke nke Pụrụ Ime Ihe Nile, bụ́ onye Jọn kwuru banyere ya, sị: “Ọ dịghị onye hụworo Chineke n’oge ọ bụla.”—Jọn 1:14, 18.

Ma, mmadụ pụrụ ịjụ, sị: ‘Gịnịkwanụ mere Tọmọs ji tie, sị, “Onyenwe m na Chineke m!” mgbe ọ hụrụ Jizọs ahụ e si n’ọnwụ kpọlite?’ Dị ka e kwuru na mbụ, Jizọs bụ chi n’echiche bụ́ na ọ dị nsọ, ma ọ bụghị Nna ahụ. Oge na-adịghị anya tupu mgbe ahụ, Jizọs gwara Meri Magdalin, sị: “Ana m arịgokwuru Nna m na Nna unu nakwa Chineke m na Chineke unu.” Chetakwa ihe mere Jọn ji dee Oziọma ya. N’amaokwu nke atọ na-esote amaokwu Tọmọs nọ kwuo okwu ahụ, Jọn kọwara na ya dere ihe ndị a ka ndị mmadụ “wee kwere na Jizọs bụ Kraịst ahụ, Ọkpara Chineke”—ọ bụghị na ọ bụ Chineke.—Jọn 20:17, 28, 31.

Ònye Bụ “Chi nke Oge A”?

N’ezie, e nwere ọtụtụ chi. Dị ka anyị hụworo, a kpọtụrụ ụfọdụ n’ime ha aha n’ime Bible. Ma, ndị hụrụ ike Jehova kpara ogologo oge gara aga ji oké olu kwuo, sị: “Jehova, Ya onwe ya bụ Chineke; Jehova, Ya onwe ya bụ Chineke!” (1 Ndị Eze 18:39) Otú ọ dị, ọ dị chi ọzọ dịkwa ike. Bible na-ekwu, sị: “Chi nke oge a mere ka anya nke uche nke ndị na-ekweghị ekwe kpuo ìsì.”—2 Ndị Kọrint 4:4, Bible Nsọ nke Union Version.

N’abalị bọtara ụbọchị e gburu Jizọs, Jizọs dọrọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị ugboro atọ banyere chi a, na-akpọ ya “onye na-achị ụwa a.” Jizọs kwuru na “a ga-achụpụ” onye ọchịchị a, ma ọ bụ chi a, dị ike. (Jọn 12:31; 14:30; 16:11) Ònye bụ chi a, gịnịkwa bụ ụwa nke ọ bụ onye ọchịchị ya?

Ọ dịghị onye ọzọ ọ bụ ma ọ́ bụghị mmụọ ozi ahụ nupụrụ isi, bụ́ Setan Ekwensu. Olee otú anyị si mara? Bible na-akọwa na mgbe Setan nwara Jizọs ọnwụnwa, Setan gosiri ya “alaeze nile nke ụwa na ebube ha, wee sị ya: ‘Ihe ndị a nile ka m ga-enye gị ma ọ bụrụ na ị daa n’ala kpọọ isiala nye m.’” (Matiu 4:8, 9) Nke a agaraghị abụ ọnwụnwa ma ọlị ma a sị na ihe Setan na-enye Jizọs abụghị nke Setan. N’ezie, Jọn onyeozi kwuru, sị: “Ụwa dum dị n’ike aka nke ajọ onye ahụ.”—1 Jọn 5:19.

Chetakwa na Jizọs kwere nkwa, sị: “A ga-achụpụ onye na-achị ụwa a.” (Jọn 12:31) N’eziokwu, a ga-ebibi ụwa a, ma ọ bụ usoro ihe a, tinyere onye na-achị ya, dị ka Jọn onyeozi buru n’amụma mgbe o kwuru, sị: “Ụwa na-agabiga.” Ma, Jọn kwukwara, sị: “Onye na-eme uche Chineke na-anọgide ruo mgbe ebighị.” (1 Jọn 2:17) Ugbu a, ka anyị tụlee ihe ndị dị ebube nanị ezi Chineke ahụ na-ezube ime na ụzọ anyị pụrụ isi rite uru na ha.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Lee nsụgharị Bible ndị a: The New Testament, nke James L. Tomanek dere; The Emphatic Diaglott, interlinear reading, nke Benjamin Wilson dere; The Bible—An American Translation, nke J.M.P. Smith na E. J. Goodspeed dere.

[Foto dị na peeji nke 20, 21]

Ndị Listra chọrọ ịkpọ Pọl na Banabas chi

[Foto dị na peeji nke 20, 21]

Jisọs gwara Meri Magdalin, sị: ‘Ana m arịgokwuru Chineke m na Chineke unu’