Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Fim Ị Ga-ekiri?

Olee Fim Ị Ga-ekiri?

Olee Fim Ị Ga-ekiri?

N’IME iri afọ ndị na-adịbeghị anya, e nweela echiche dịgasị iche iche banyere imirikiti ihe ndị metụtara mmekọahụ, ihe ike, na okwu rụrụ arụ a na-egosi na fim. Ụfọdụ na-ekwu na otu ihe metụtara mmekọahụ e gosiri na fim rụrụ arụ, ebe ndị ọzọ na-ekwu na o mere ka fim ahụ dị ụtọ. Ụfọdụ na-ekwu na ihe ike e gosiri na fim kwesịrị ekwesị, ebe ndị ọzọ na-ekwu na o kwesịghị ekwesị. Ụfọdụ na-ekwu na mkparịta ụka nke okwu rụrụ arụ juru na ya dị njọ, ebe ndị ọzọ na-ekwu na ọ dị otú o kwesịrị ịdị. Ihe otu onye kpọrọ okwu rụrụ arụ ka onye ọzọ kpọrọ nnwere onwe ikwu okwu. Ka mmadụ na-ege òtù abụọ ahụ ntị, ọ pụrụ iyi ka arụmụka ahụ ọ̀ bụ obere ihe nke ihe kpatara ya bụ amaghị ihe a ga-akpọ ihe ndị ahụ.

Ma, ihe e gosiri na fim nke kpatara arụmụka abụghị obere ihe. Ọ bụ ihe e kwesịrị ilebara anya. Ọ bụghị nanị ndị mụrụ ụmụ kwesịrị ilebara ya anya, ndị nile ji ụkpụrụ omume ọma akpọrọ ihe kwesịkwara ime otú ahụ. “Mgbe ọ bụla m gbachiri obi m nkịtị ma gaghachi n’ebe a na-ekiri fim, ọ na-adịkarị m ka m bụ nnọọ onye ọjọọ ma m si ebe ahụ pụta,” ka otu nwanyị kwara n’arịrị. “Ana m abụ onye ndị mere fim ahụ mechuru ihu nakwa onye mechuru onwe ya ihu. Ọ na-adị m nnọọ ka fim ahụ m kiriri ò rere ùgwù m.”

Isetịpụ Ụkpụrụ

Nchegbu a na-enwe banyere ihe ndị e gosiri na fim amaliteghị taa. N’oge a ka malitere imepụta fim amalite, esemokwu bilitere n’ihi ihe ndị metụtara mmekọahụ na ime mpụ e gosiri na fim. N’ikpeazụ, n’afọ ndị 1930, e tiri iwu na United States bụ́ nke kpara nnọọ ókè n’ihe a pụrụ igosi na fim.

Dị ka akwụkwọ bụ́ The New Encyclopædia Britannica si kwuo, iwu ọhụrụ a e tiri banyere ime fim “jikpara ndị na-eme fim ahụ́, na-egbochi ha igosi ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe nile dị mkpa nke onye toruru ogo mmadụ na-eme ná ndụ. Ọ machibidoro igosi ebe ‘a na-achọ inwe mmekọahụ.’ A pụghịdị igosi ihe ọ bụla ga-enyetụ echiche na di ma ọ bụ nwunye kwara iko, na e nwere mmekọahụ rụrụ arụ, na a ratara mmadụ inwe mmekọahụ, nakwa na e dinara mmadụ n’ike, ọ gwụla ma ọ̀ dị mkpa na a ga-egosirịrị ha ma taa ndị mere omume ndị ahụ ahụhụ nke ọma ná ngwụsị fim ahụ.”

A bịa n’ihe banyere ime ihe ike, a machibidoro “igosi ma ọ bụ ikwurịta banyere ngwá agha ndị e jikarị eme ihe, igosi ihe nile mgbe a na-egosi ebe e mere mpụ, igosi ebe ndị omekome gburu ndị uwe ojii, igosi ihe ọ bụla na-enye echiche obi ịta mmiri ma ọ bụ igbu ọchụ, ma ọ bụ igosi ebe e gburu mmadụ ma ọ bụ ebe mmadụ gburu onwe ya, ọ gwụla ma ọ̀ dị mkpa na a ga-egosirịrị ya. . . . Ọ dịtụghị ihe ga-eme ka e gosi mpụ ọ bụla dị ka ihe kwesịrị ekwesị.” Ná nchịkọta, iwu ahụ kwuru na “ọ dịghị fim a ga-emepụta nke ga-eme ka ụkpụrụ omume nke ndị kiriri ya dalata.”

Site n’Iti Iwu Gaa n’Igosi Ndị Fim Bụ Maka Ha

Ka ọ na-erule afọ ndị 1950, ọtụtụ ndị na-emepụta fim n’America nọ na-eleghara iwu ahụ anya, na-ewere ya dị ka ihe mgbe ochie. N’ihi ya, n’afọ 1968, a kagburu iwu ahụ ma jiri usoro nke igosi ndị fim bụ maka ha, dochie ya. * Ugbu a a na-egosi ndị fim bụ maka ha, fim pụrụ ịgba ihe ụfọdụ ọtọ, ma o kwesịrị ibu akara nke ga-abụrụ ọhaneze ihe ịdọ aka ná ntị, ka ha wee mara otú ọ bụruru nke “ndị okenye.” Dị ka Jack Valenti nke bụụrụ onyeisi nke Òtù Ndị Na-emepụta Fim n’America ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 40 si kwuo, nzube e ji eme ya bụ “iji dọọ ndị nne na nna aka ná ntị n’oge, ka ha wee nwee ike ime mkpebi nke ha banyere fim ụmụ ha kwesịrị ikiri na ndị nke ha na-ekwesịghị ikiri.”

Ugbu a a maliterela igosi ndị fim bụ maka ha, a kagburu iwu nile metụtara imepụta fim. Ihe ndị metụtara mmekọahụ, ime ihe ike, na okwu rụrụ arụ bịara jupụta na fim ndị Hollywood mere maka ọhaneze. Nnwere onwe ọhụrụ e nyere ndị na-eme fim bịara mee ka mmiri baa n’opi ụgbọgụrụ. Otú o sina dị, ebe ọ bụ na a na-egosi ndị fim bụ maka ha, ọhaneze ga-abụ ndị a dọrọ aka ná ntị. Ma, igosi ndị fim bụ maka ha ọ̀ na-eme ka ị mara ihe nile dị mkpa ịmara?

Ihe Ị Na-apụghị Ịma Site ná Ngosi A Na-egosi Ndị Fim Bụ Maka Ha

Ọ na-adị ụfọdụ ndị ka, ka oge na-aga, ụkpụrụ a na-agbaso wee na-egosi ndị fim bụ maka ha ọ̀ na-adalata adalata. Otu nnyocha ụlọ akwụkwọ aha ya bụ Harvard School of Public Health mere na-akwado echiche dị otú ahụ, n’ihi na ọ chọpụtara na otú e si egosi ihe ike na ihe ndị metụtara mmekọahụ na fim ndị e mere maka ndị ntorobịa ugbu a karịrị otú e si gosi ha n’afọ iri gara aga. Ndị mere nnyocha ahụ kwuru na, “na fim ndị e mere maka otu ndị, ihe ndị a pụrụ iwere na ha dị njọ na-adị n’ụdị n’ụdị, otú ha na-aharu pụkwara ịdịgasị iche. Ha kwukwara na “a pụghị ịdabere nanị ná ngosi e gosiri ndị fim bụ maka ha mata nke ọma banyere ihe ike, mmekọahụ, okwu ọjọọ, na ihe ndị ọzọ e gosiri na fim ndị ahụ.” *

Ndị nne na nna, bụ́ ndị na-ezipụ nnọọ ụmụ ha ịga kirie fim, nwere ike ha amaghị ihe a na-ewere taa na ọ dị mma ka ụmụaka kirie. Dị ka ihe atụ, otu onye na-atụchasị fim kọwara onye bụ́ isi sekpụ ntị n’otu fim e gosiri na United States na e mere maka ndị ntorobịa. O kwuru na ọ bụ “nwa agbọghọ dị afọ 17 nke na-eme otú o si masị ya, na-aṅụrọ anya kwa ụbọchị, na-aṅụ ọgwụ ike, na-aga oriri oké mkpọtụ, ma soro otu nwata nwoke ọ ka matara ọhụrụ na-enwe mmekọahụ ike ike.” Nke a abụghị ihe ọhụrụ na fim. N’ezie, akwụkwọ bụ́ The Washington Post Magazine kwuru na igosi ebe e ji ọnụ amị akụkụ ahụ́ e ji bụrụ nwoke ma ọ bụ nwanyị yiri ka ọ̀ bụ “ihe a na-anakwere mgbe nile” na fim ndị e gosiri na ha dị mma maka ndị dị afọ iri na ụma. N’ụzọ doro anya, ngosi e gosiri ndị fim bụ maka ha abụghị nanị ihe a ga-adabere na ya kpebie otú fim dị. È nwere ihe nduzi ka mma?

“Kpọọnụ Ihe Ọjọọ Asị”

Igosi ndị fim bụ maka ha abụghị ihe a ga-eji dochie akọ na uche e ji Bible zụọ. Ná mkpebi ha nile—gụnyere ndị nke metụtara ntụrụndụ—Ndị Kraịst na-agbalịsi ike itinye ndụmọdụ Bible dị n’Abụ Ọma 97:10 n’ọrụ, bụ́ nke na-asị: “Kpọọnụ ihe ọjọọ asị.” Onye kpọrọ ihe ọjọọ asị ga-ewere ya na ya na-eme ihe ọjọọ ma o jiri ihe Chineke kpọrọ asị mere ihe ntụrụndụ.

Ọ dị ndị nne na nna mkpa karịsịa ịkpachara anya banyere ụdị fim ha na-ekwe ka ụmụ ha kirie. Ọ ga-abụ ihe ezi uche na-adịghị na ya ikiri fim nanị n’ihi ndị e gosiri na fim ahụ bụ maka ha. Ọ pụdịrị ịbụ na fim e kwuru na ọ bụ maka ndị nọ n’afọ ndụ nwa gị nọ na ya na-akwado ụkpụrụ nke gị bụ́ nne ma ọ bụ nna na-adịghị anabata. Nke a adịtụghị atụ Ndị Kraịst n’anya, n’ihi na ụwa ejiriwo aṅụrị nakwere echiche na omume ndị na-emegide ụkpụrụ Chineke. *Ndị Efesọs 4:17, 18; 1 Jọn 2:15-17.

Nke a apụtaghị na fim nile dị njọ. Ma, ọ dị mma ịkpachara anya. Banyere nke a, Teta! nke June 8, 1997, kwuru, sị: “Onye ọ bụla kwesịrị ịtụle okwu a nke ọma ma mee mkpebi ndị ga-enye ya akọ na uche dị ọcha n’ihu Chineke na mmadụ.”—1 Ndị Kọrint 10:31-33.

Ịchọta Ntụrụndụ Kwesịrị Ekwesị

Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi na-ahọrọ fim ezinụlọ ha ga-ekiri? Tụlee okwu ndị na-esonụ ndị nne na nna nọ gburugburu ụwa kwuru. Ihe ha kwuru pụrụ inyere gị aka n’ọchịchọ ị na-achọ ime ka ezinụlọ gị na-enwe ntụrụndụ ndị dị mma.—Leekwa igbe bụ́ “Ụzọ Ndị Ọzọ E Si Atụrụ Ndụ,” bụ́ nke dị na peeji nke 14.

Juan, bụ́ onye nọ na Spen kwuru, sị: “Mụ na nwunye m na-esokarị ụmụ anyị gaa kirie fim mgbe ha ka dị obere. Ọ dịghị mgbe ha na-aga nanị ha ma ọ bụ soro nanị ndị ntorobịa ibe ha gaa. Ugbu a ha dị afọ iri na ụma, ha adịghị aga ekiri fim mgbe a na-egosi ya na nke mbụ ya; kama, anyị weere na ọ ka mma ka ha chere ruo mgbe anyị gụrụ ihe ndị e kwuru banyere fim ahụ ma ọ bụ nụ banyere ya n’ọnụ ndị anyị tụkwasịrị obi. Mgbe ahụ, anyị na-ekpebi ma ànyị ga-aga kirie ya dị ka ezinụlọ.”

Mark, bụ́ onye nọ na South Africa, na-ewepụta oge soro nwa ya nwoke dị afọ iri na ụma kwurịta banyere fim a na-egosi n’ebe a na-ekiri fim. Mark kwuru, sị: “Mụ na nwunye m na-amalite mkparịta ụka ahụ, na-ajụ ya ihe o chere banyere fim ahụ. Nke a na-eme ka anyị nwee ike ịma ihe bụ́ uche ya ma soro ya tụgharịa uche. N’ihi ya, anyị chọpụtara na anyị bịara nwee ike ịdị na-ahọrọ fim anyị nile pụrụ ikirikọ ọnụ.”

Rogerio, bụ́ onye nọ na Brazil, na-ewepụtakwa oge soro ụmụ ya kwurịta banyere fim ha chọrọ ikiri. O kwuru, sị: “Ana m agụrụ ha ihe ndị na-atụchasị fim kwuru banyere fim ahụ. Ana m eso ha gaa n’ebe a na-ere fim iji kụziere ha ụzọ ha ga-esi jiri ihe ndị e sere ná mkpo fim mara ma ọ̀ bụ fim na-ekwesịghị ekwesị.”

Matthew, bụ́ onye nọ na Britain, hụtara ya dị ka ihe bara uru iso ụmụ ya na-ekwurịta banyere fim ha chọrọ ikiri. O kwuru, sị: “Site n’oge ụmụ anyị dị obere, anyị na-eme ka ha soro anyị kparịta banyere ihe e mere na fim nke tọrọ anyị nile ụtọ. Ọ bụrụ na anyị kpebiri izere ikiri fim ụfọdụ, mụ na nwunye m na-akọwara ha ihe kpatara ya, kama nanị ịgwa ha na ha agaghị ekiri ya.”

Tụkwasị na nke ahụ, ụfọdụ ndị nne na nna ahụtawo ya dị ka ihe enyemaka ime nnyocha banyere fim n’Intanet. E nwere ọtụtụ ebe a na-edebe ihe ọmụma n’Intanet bụ́ ndị a na-ede ihe zuru ezu banyere ihe ndị e gosiri na fim. Anyị pụrụ ịga n’ebe ndị a iji ghọtakwuo ụkpụrụ fim anyị chọrọ ikiri na-akwado.

Uru Akọ na Uche A Zụrụ Azụ Bara

Bible na-ekwu banyere ndị ‘zụrụ ikike nghọta ha ịmata ọdịiche dị n’ihe ziri ezi na ihe ọjọọ.’ (Ndị Hibru 5:14) N’ihi ya, ihe mgbaru ọsọ nke ndị nne na nna kwesịrị ịbụ ịkụnye n’ime ụmụ ha, ụkpụrụ ndị ga-enyere ha aka ime mkpebi ndị amamihe dị na ha mgbe ha ga-enwere onwe ha ịhọrọ ntụrụndụ.

Ọtụtụ ndị ntorobịa nne ha na nna ha bụ Ndịàmà Jehova anatawo ọzụzụ magburu onwe ya n’aka ndị mụrụ ha. Dị ka ihe atụ, Bill na Cherie, bụ́ ndị nọ na United States, na-enwe mmasị ịkpọ ụmụ ha nwoke abụọ dịcha afọ iri na ụma aga ekiri fim. Bill na-ekwu, sị, “Mgbe anyị si ikiri fim lọta, ezinụlọ anyị na-ekwurịtakarị banyere fim ahụ—ụkpụrụ ndị ọ na-akụzi nakwa ma ụkpụrụ ndị ahụ hà kwekọrọ ná ndị anyị na-agbaso ka ọ̀ bụ na ha ekwekọghị.” N’ezie, Bill na Cherie ghọtakwara na ọ dị mkpa ịdị na-eme ezi nhọrọ. “Anyị na-agụ banyere fim ahụ tupu anyị agaa kirie ya, ihere adịghịkwa eme anyị isi n’ebe anyị na-ekiri fim pụọ ma ọ bụrụ na a na-egosi ihe na-adịghị mma bụ́ nke anyị na-atụghị anya ya,” ka Bill na-ekwu. Site n’ime ka ụmụ ha na-eso eme mkpebi ndị dị mkpa, Bill na Cherie na-ewere ya na ha na-enyere ụmụ ha aka ịzụlite ikike nke ịmata ọdịiche dị n’etiti ihe ziri ezi na ihe ọjọọ. “Ha na-eme mkpebi ndị amamihe dị na ha karị ma a bịa n’ịhọrọ fim ndị ha ga-enwe mmasị ikiri,” ka Bill na-ekwu.

Dị ka Bill na Cherie, ọtụtụ ndị nne na nna enyeworo ụmụ ha aka ịzụ ikike nghọta ha n’ihe metụtara ntụrụndụ. N’ezie, ọtụtụ n’ime fim a na-emepụta adịghị mma. N’aka nke ọzọ, mgbe ụkpụrụ Bible duziri Ndị Kraịst, ha pụrụ inwe ntụrụndụ dị mma ma na-enye ume ọhụrụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 Ọtụtụ mba gburugburu ụwa enweela usoro yiri nke ahụ nke iji akara egosi ndị e mere fim maka ha.

^ par. 12 Ọzọkwa, ihe a na-agbakwasị ụkwụ wee na-egosi ndị fim bụ maka ha pụrụ ịdị iche site n’otu mba ruo n’ọzọ. Fim e weere na o kwesịghị ndị ntorobịa n’otu mba pụrụ ịbụ nke e weere na o kwesịrị ha ná mba ọzọ.

^ par. 16 Ndị Kraịst kwesịkwara iburu n’uche na, na fim ndị e mere maka ụmụaka na ndị ntorobịa, a pụrụ igosi banyere amoosu, mgbaasị, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ metụtara ikpere arụsị.—1 Ndị Kọrint 10:21.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 12]

‘ANYỊ NA-AGBAKỌ AKA EME MKPEBI AHỤ’

“Mgbe m dị obere, mmadụ nile nọ n’ezinụlọ anyị na-eso aga ekiri sinima. Ugbu a m tolitetụrụla, ndị mụrụ m na-ekwe ka m gaa nanị m. Ma, tupu ha ekwere ka m gaa, ha na-achọ ịma aha fim ahụ na ihe e mere na ya. Ọ bụrụ na ha anụbeghị banyere fim ahụ, ha na-agụ ihe e kwuru banyere ya ma ọ bụ kirie ebe a na-ama ọkwa ya na TV. Ha na-agụkwa banyere fim ahụ n’Intanet. Ọ bụrụ na ọ dị ha ka fim ahụ adịghị mma, ha na-akọwara m ihe mere ha ji chee otú ahụ. Ha na-enyekwa m ohere ikwu uche m. Onye ọ bụla na-ekwu uche ya, anyị na-agbakọkwa aka eme mkpebi ahụ.”—Héloïse, bụ́ onye dị afọ 19, nke nọ France.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 13]

KWURỊTANỤ YA!

“Ọ bụrụ na ndị nne na nna agwa ụmụ ha ka ha ghara ime ihe ụfọdụ, ma ha agwaghị ha ihe ha ga-emewe n’ọnọdụ ya, ụmụaka ahụ pụrụ ime ihe ahụ ha chọrọ ime na nzuzo. N’ihi ya, mgbe ụmụaka kwuru na ha chọrọ ikiri fim na-adịghị mma, ụfọdụ ndị nne na nna adịghị agwa ha ozugbo ka ha ghara ikiri ya, ha adịghịkwa agwa ha kirie ya. Kama, ha na-enye ohere ka obi jụrụ onye ọ bụla. Ụbọchị ole na ole gasịa, ha na-eji obi ọcha kwurịta ya, na-ajụ nwa ahụ ihe mere o ji chee na ụdị ntụrụndụ ahụ ga-adị mma. N’ihi nkwurịta e kwurịtara ya, ndị na-eto eto na-agbanwekarị obi ha ma kwenyere ndị mụrụ ha, ọbụnadị kelee ha. Mgbe ahụ, ndị mụrụ ha pụrụ iduzi ha ịhọrọ ụdị ntụrụndụ ọzọ ha nile pụrụ inwekọ ọnụ.”—Masaaki, bụ́ onye nlekọta na-ejegharị ejegharị na Japan.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 14]

ỤZỌ NDỊ ỌZỌ E SI ATỤRỤ NDỤ

▪ “Ndị na-eto eto na-enwe ọchịchọ e bu pụta ụwa nke iso ndị ọgbọ ha na-akpakọrịta. N’ihi ya, anyị na-eme ndokwa mgbe nile ka nwa anyị nwanyị soro ndị na-akpa ezi àgwà, bụ́ ndị anya anyị ga na-eru, na-akpakọrịta. Ebe e nwere ọtụtụ ndị ntorobịa na-akpa ezi àgwà n’ọgbakọ anyị, anyị agbawo nwa anyị nwanyị ume imete ha enyi.”—Elisa, bụ́ onye nọ n’Ịtali.

▪ “Anyị ejighị ntụrụndụ ụmụ anyị egwuri egwu. Anyị na-eme ndokwa ka Ndị Kraịst ibe anyị, ma ndị okenye ma ụmụaka, bịa soro ha nwee ntụrụndụ ndị na-ewuli elu, dị ka ịga ije, ime oriri, ime mkpapụ, na nnọkọ ntụrụndụ. N’ụzọ dị otú a, ụmụ anyị adịghị ele ntụrụndụ anya dị ka ihe ha pụrụ iso nanị ndị ọgbọ ha nwee.”—John, bụ́ onye nọ na Britain.

▪ “Anyị achọpụtawo na iso Ndị Kraịst ibe anyị na-enwe nnọkọ ntụrụndụ na-aba uru. Ụmụ m na-enwekwa mmasị n’ịgba bọl. N’ihi ya, site n’oge ruo n’oge, anyị na-eme ndokwa iso ndị ọzọ gbaa bọl.”—Juan, bụ́ onye nọ na Spen.

▪ “Anyị na-agba ụmụ anyị ume ịdị na-akpọ ngwá egwú. Anyị na-enwekọkwa ọtụtụ ntụrụndụ ọnụ, dị ka ịkụ tenis, ịkụ bọl volley, ịgba ígwè, ịgụ akwụkwọ, na iso ndị enyi anyị na-enwe nnọkọ ntụrụndụ.”—Mark, bụ́ onye nọ na Britain.

▪ “Ezinụlọ anyị na-atụkọ okwe ọnụ mgbe nile, anyị na-esokwa ndị enyi anyị atụ ya. Ọzọkwa, kwa ọnwa, anyị na-agbalị ime ndokwa maka otu ihe pụrụ iche anyị ga-emekọ ọnụ. Ihe na-enye aka n’izere nsogbu bụ ndị nne na nna ịmụrụ anya.”—Danilo, bụ́ onye nọ na Philippines.

▪ “Ịga ememe na-adịkarị ụtọ karịa ịnọdụ nnọọ n’oche na-ekiri fim. Anyị na-eghewe ntị anyị oghe ịnụ banyere ebe a ga-eme ihe omume ụfọdụ n’ógbè anyị, dị ka nke igosi ọrụ nkà, nke igosi ụgbọala ndị pụtara ọhụrụ, ma ọ bụ nke ịkụ egwú. Ihe omume ndị dị otú a na-emekarị ka e nwee ohere maka mkparịta ụka. Anyị na-elezikwa anya ịghara ime ka ụmụ anyị na-enwebiga ntụrụndụ ókè. Ọ bụghị nanị na inwebiga ntụrụndụ ókè na-ewe oge, kamakwa ọ na-eme ka ihe omume ahụ gharazie ịbụ ihe ọhụrụ na ihe na-atọ ụtọ.”—Judith, bụ́ onye nọ na South Africa.

▪ “Ọ bụghị ihe nile ụmụaka ndị ọzọ na-eme dị mma nye ụmụ m, ana m agbalịkwa ime ka ha ghọta nke ahụ. N’otu mgbe ahụ, mụ na di m na-agbalị ime ndokwa ka ha na-enwe ntụrụndụ ndị dị mma. Anyị na-agbalị ịhụ na ha adịghị asị, ‘A naghị ekwe anyị pụọ apụ. Ọ dịghị ihe a na-ekwe anyị mee.’ Anyị na-agakọ n’ogige ntụrụndụ ọnụ dị ka ezinụlọ, na-emekwa ndokwa ka ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ bịa soro anyị nwee nnọkọ ntụrụndụ n’ụlọ anyị.” *—Maria, bụ́ onye nọ na Brazil.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 47 Iji nwetakwuo ihe ọmụma banyere nnọkọ ntụrụndụ, lee Ụlọ Nche nke August 15, 1992, peeji nke 15-20.

[Ebe E Si Nweta Foto]

James Hall Museum of Transport, Johannesburg, South Africa

[Foto dị na peeji nke 11]

Chọpụta ihe ndị e kwuru banyere fim TUPU i kpebie ikiri ya

[Foto dị na peeji nke 12, 13]

Ndị nne na nna, kụzierenụ ụmụ unu ka ha na-eme ezi nhọrọ