Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Fim Pụtara n’Oge Ezumike A?

Olee Fim Pụtara n’Oge Ezumike A?

Olee Fim Pụtara n’Oge Ezumike A?

GỊNỊ ka ị na-enwe mmasị ime n’oge ezumike? Ndị na-emepụta fim na-atụ anya ka ọtụtụ nde mmadụ jiri oge dị ukwuu kirie fim. E nwere, ma ọ dịkarịa ala, ebe 35,000 a na-anọ ekiri fim na United States nanị. N’afọ ndị na-adịbeghịkwa anya, ọ bụ n’oge okpomọkụ ka e nwetara ihe dị ka pasent 40 nke uru ego e nwetara ná mba ahụ site na tiketi ndị a gbara iji kirie fim. * “Oge okpomọkụ na-adị ndị na-eme fim otú oge Krismas na-adị ndị na-ere ahịa,” ka Heidi Parker, bụ́ onye so ede magazin bụ́ Movieline, kwuru.

Ọ bụghị otú ahụ ka ọ dị n’oge mbụ. Ebe ndị a na-ekiri fim na United States adịbughị ekwo ekwo n’oge okpomọkụ. Nke a mekwara ka ọtụtụ ndị na-eme fim na-akwụsịlata ma ọ bụ na-akwụsị ọrụ kpam kpam n’oge ahụ. Ma, ka ọ na-erule ihe dị ka afọ 1975, a bịara nwee ntụoyi n’ebe ndị a na-anọ ekiri fim. Nke a mere ka ọtụtụ nde mmadụ na-aga n’ebe ndị ahụ iji zere okpomọkụ. Ndị na-eme fim bịara chọpụta na, ebe ọ bụ na ụmụaka na-emechi akwụkwọ n’oge ahụ, nke a pụrụ ime ka ahịa ha gaa agaa. N’oge na-adịghị anya, a bịara malite imepụta fim ndị kara aka a na-ekiri n’oge okpomọkụ. Nke a mere ka otú e si emepụta fim ma na-ere ya gbanwee, dị ka anyị ga-ahụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 Na United States, oge ahịa fim ji aga aga na-abụ site na May ruo September, bụ́ oge a na-enwe okpomọkụ ná mba ahụ.