Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Site n’Ide Ya Ede Ruo n’Imepụta Ya

Site n’Ide Ya Ede Ruo n’Imepụta Ya

Site n’Ide Ya Ede Ruo n’Imepụta Ya

N’IME iri afọ ole na ole gara aga, Hollywood, bụ́ ụlọ ọrụ na-emepụta fim n’America, anọwo na-emepụta imirikiti fim ndị kara aka ma na-aga ahịa. Nke a enwewo mmetụta dị ukwuu n’ụwa nile, ebe ọ bụ na ọtụtụ fim ndị e mepụtara n’America na-eru mba ndị ọzọ nanị n’ime izu ole na ole—mgbe ụfọdụ, ọ na-erudị n’ime ụbọchị ole na ole—e gosiri ya nke mbụ ya na United States. Ọbụna ụfọdụ fim apụtawo n’otu ụbọchị n’ụwa nile. Dan Fellman, bụ́ onyeisi ngalaba ire fim n’ụlọ ọrụ Warner Brothers Pictures kwuru, sị: “Ahịa fim bụ ahịa na-aga aga n’ụwa nile. N’ihi ya, mgbe anyị na-eme fim, anyị na-ele ya anya dị ka ihe a ga-ere n’ụwa nile.” Dị ka ọ na-adịtụbeghị mbụ, ihe na-eme na Hollywood ugbu a na-emetụta ụlọ ọrụ ndị na-eme ihe ntụrụndụ n’ebe nile n’ụwa. *

Ma, inweta uru na fim anaghị adị mfe otú ị pụrụ iche. N’ọtụtụ fim, a ghaghị imefu ihe karịrị 100 nde dollar iji mepụta ma ree ya. Ma ọ̀ ga-aga ahịa, ma ọ gaghị aga ahịa dabeere n’otú ọha mmadụ si hụ ya. “Ị gatụghị ama ihe ọhaneze gaje iwere dị ka ihe na-akpali mmasị ma ọ bụ ihe dị ụtọ,” ka David Cook, bụ́ prọfesọ na-akụzi banyere fim na Mahadum Emory, kwuru. Ya mere, olee otú ndị na-emepụta fim si ahụ na ha nwere ihe ịga nke ọma? Iji zaa ajụjụ a, ọ dị mkpa ka anyị burugodị ụzọ ghọtatụ otú e si emepụta fim. *

Tupu E Sewe Vidio —Ime Nkwadebe

Ihe a na-eme tupu e sewe vidio na-abụkarị ihe ndị na-akasị ewe oge nakwa otu n’ime ihe ndị kasị mkpa ma a bịa n’imepụta fim. Dị ka ọ dị ná nnukwu ọrụ ọ bụla, ime nkwadebe bụ isi sekpụ ntị na ya. Ihe a na-atụ anya ya bụ na ego ọ bụla e mefuru tupu e sewe vidio ga-eme ka ego a ga-emefu n’oge a na-ese vidio belata nke ukwuu.

A bịa n’imepụta fim, ihe mbụ a na-eme bụ ichepụta akụkọ, nke pụrụ ịbụ akụkọ a rọrọ arọ ma ọ bụ akụkọ dabeere n’ihe mere eme. Odeakụkọ na-ede akụkọ ahụ ede. A pụrụ idezigharị ya ọtụtụ ugboro tupu e nweta nke ikpeazụ ya—nke a ga-eji mee ihe. Nke ahụ a ga-eji mee ihe na-ebu ihe ndị a ga-ekwu na fim ahụ nakwa nkọwa dị nkenke banyere ihe ndị a ga-eme na ya. Ọ na-ebukwa ntụziaka a ga-agbaso wee see vidio ahụ, dị ka ebe a ga-eche kamera ihu na otú a ga-esi si n’otu ihe nkiri banye n’ọzọ.

Otú ọ dị, ọ bụ n’oge a e desịrị ya ka a na-ewegara ya onye na-emepụta fim iji mara ma ọ̀ ga-azụrụ ya. * Olee ụdị akụkọ onye na-emepụta fim pụrụ inwe mmasị na ya? Fim ndị a na-emepụta n’oge okpomọkụ na-abụkarị maka ndị ntorobịa. N’ihi ya, onye na-emepụta fim pụrụ inwe mmasị n’akụkọ ga-amasị ndị ntorobịa.

Ọ pụdịrị inwe mmasị karị n’akụkọ ga-amasị ma okenye ma nwata. Dị ka ihe atụ, o doro anya na fim nke dabeere n’akụkọ banyere otu dike a kọrọ banyere ya n’otu akwụkwọ na-akpa ọchị, ga-amasị ụmụaka ndị nụtụrụla banyere dike ahụ. Ihe ịrụ ụka adịghịkwa ya na ndị mụrụ ha ga-eso ha gaa kirie ya. Ma, olee otú ndị na-emepụta fim si adọta mmasị ụmụaka na ndị ntorobịa? Ụzọ bụ́ isi ha si eme ya bụ site “n’iwebata ihe ndị ga-eme ka o nuwe ha enu n’ahụ́,” ka Liza Mundy dere n’akwụkwọ bụ́ The Washington Post Magazine. Iwebata okwu rụrụ arụ, oké ihe ike, na ọtụtụ ihe ndị metụtara mmekọahụ na fim bụ otu ụzọ isi “mee ka ọ gaa nnọọ ahịa, ebe ọ bụ na ma okenye ma nwata ga-enwe mmasị na ya.”

Ọ bụrụ na ọ dị onye na-emepụta fim ka akụkọ ahụ e wetaara ya ọ̀ ga-aga ahịa, ọ pụrụ ịzụrụ ya ma gbalịa ịchọta onye a ma ama na-eduzi fim nakwa nwoke ma ọ bụ nwanyị aha ya na-ede ude na fim, ka ha bịa mee fim ahụ. Ọ bụrụ na aha onye a ma ama n’iduzi fim na nke onye bụ́ aka ochie n’ime fim dị na fim ahụ, ọ ga-eme ka ọtụtụ mmadụ nwee mmasị ikiri ya mgbe ọ ga-apụta. Ọbụnakwa n’oge a a na-ebidobeghị ise vidio, aha ndị a ma ama pụrụ ịdọta mmasị ndị o ji ego achụ nta ego, bụ́ ndị a chọrọ ka e wee nweta ego a ga-eji mee fim ahụ.

Ihe ọzọ a na-eme tupu e sewe vidio bụ ise ihe osise. Ihe a na-ese na-abụ usoro a ga-esi mee fim ahụ, karịsịa akụkụ ndị metụtara ihe ndị dị ka ihe ike. Ihe osise ndị a na-enyere onye na-ese vidio aka, na-eme ka oge ọ gaara emefu n’ise vidio belata. Dị ka Frank Darabont, bụ́ onye na-eduzi ma na-ede fim si kwuo, “ọ dịghị ihe jọgburu onwe ya karịa mmadụ iguzo na-egbu oge nile ọ ga-eji see vidio n’ụbọchị, ka ọ na-anwa ịchọpụta ebe kamera ga-eche ihu.”

A ghaghị ime ọtụtụ mkpebi ndị ọzọ dị mkpa tupu e sewe vidio. Dị ka ihe atụ, olee ebe ndị a ga-anọ see vidio ahụ? À ga-emere ya njem? Olee otú a ga-esi rụọ ma hazie ime ụlọ a ga-anọ mee fim ahụ? Ọ̀ ga-adị mkpa iji ejiji pụrụ iche? Ònye ga-ahụ maka ọkụ ndị a ga-eji mee ka ìhè dị? Ònye ga-ahụ maka ite ndị ga-eme fim ahụ ihe ntecha? Ònye ga-edozi ntutu isi ha? Gịnị banyere ụda olu na ụda ndị ọzọ, tinyere ihe ndị na-eju anya a ga-ahụ na fim ahụ? Olee ndị ga-eme akụkụ ndị dị ize ndụ? Ihe ndị a bụ nanị ụfọdụ n’ime ọtụtụ ihe ndị e kwesịrị ịtụle tupu e bido ise vidio. I lee aha ndị a na-edepụta ná mmechi fim e mefuru ezigbo ego wee mee, ị pụrụ ịchọpụta na ọtụtụ narị mmadụ ị na-ahụghị na fim ahụ nyere aka n’imepụta ya! “Ọ na-ewe ọnụ ọgụgụ mmadụ dị nnọọ ukwuu iji mepụta fim toro ogologo,” ka otu nwoke nke nyeworo aka n’imepụta ọtụtụ fim kwuru.

Ise Vidio

Ise vidio bụ ihe na-ewe oge dị ukwuu, ihe na-agwụ ike, na ihe na-eri ezigbo ego. N’ezie, ọtụtụ puku naira pụrụ ifu n’ihi obere oge e gburu. Mgbe ụfọdụ, a na-eburu ndị na-eme fim, ndị na-enyere ha aka, na ngwá ọrụ ndị e ji eme fim gaa n’ebe ndị dị nnọọ anya n’ụwa. Ma, ebe ọ sọkwara sị nọrọ see vidio, ego a na-emefu n’ụbọchị ọ bụla e sere vidio abụghị ihe e ji ọnụ ekwu.

Ndị na-ahụ maka ọkụ, ndị na-edozi isi, na ndị na-ahụ maka ntecha, so ná ndị mbụ na-abịa n’ebe a na-anọ ese vidio. Ụbọchị ọ bụla a ga-ese vidio, a pụrụ iji ọtụtụ awa jikere ndị na-eme fim tupu e bido ise ha vidio. E mesịa nke ahụ, e bidozie ise vidio, bụ́ nke na-ewe oge dị ukwuu.

Onye na-eduzi fim na-eji nlezianya eleba anya n’otú e si na-ese ihe nkiri nke ọ bụla. Ọbụna akụkụ dịtụ mfe pụrụ iwe ụbọchị dum iji see ya. A na-eji otu kamera ese ihe ka ọtụtụ n’ihe ndị a na-egosi n’otu fim. N’ihi ya, a na-adọba otu kamera ahụ n’akụkụ dịgasị iche iche ma see akụkụ nke ọ bụla ugboro ugboro. Ọzọkwa, ọ pụrụ ịdị mkpa ka e see otu ihe e mere na fim ugboro ugboro iji nweta nke kasị mma ma ọ bụ iji sezie ebe a na-esetaghị nke ọma. Ọ bụrụ akụkụ ndị nke toro ogologo, ọ pụrụ ịdị mkpa ise ya ugboro 50 ma ọ bụ karịa! E mesịa—nke na-abụkarị ná ngwụsị ụbọchị ọ bụla e sere vidio—onye na-eduzi fim na-enyocha vidio nile ahụ e sere ma kpebie ndị nke e kwesịrị iji mee ihe. N’ikpeazụ, ọ pụrụ iwe ọtụtụ izu ma ọ bụ ọbụna ọtụtụ ọnwa iji see vidio maka otu fim.

Mgbe E sesịrị Vidio—Ijikọta Ha Ọnụ

Mgbe e sesịrị vidio, a na-ejikọta ihe nkiri nile ahụ e sere iji mee ka ọ bụrụ otu fim. Nke mbụ, a na-eme ka ihe ndị e kwuru kwekọọ n’otú ọnụ ndị kwuru ha si na-emegharị. E mesịa, e jikọtazie ihe nkiri nile ahụ ọnụ ka ọ dịrị n’ụdị fim a na-ahazibeghị ahazi.

Ọ bụ n’oge a ka a na-etinyekwa ụda ndị pụrụ iche na ihe ụfọdụ na-eju anya a na-ahụ na fim. Ihe ndị a na-eju anya bụ otu n’ime ihe ndị kasị esi ike ma a bịa n’imepụta fim. Mgbe ụfọdụ, ọ bụ kọmputa ka a na-eji etinye ha. E tinyesịa ha, ha na-adị ịtụnanya ma yie ihe mere eme n’ezie.

Ọ bụkwa n’oge a ka a na-etinye egwú na ya. Egwú anọgidewokwa na-aghọ ihe dị oké mkpa na fim ndị a na-eme n’oge a. “Ụlọ ọrụ ndị na-emepụta fim na-achọzi egwú ndị ọhụrụ ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ—ọ bụghị nanị nke ga-ewe nanị minit iri abụọ ma ọ bụ nke a ga-akpọ n’ebe ole na ole mgbe a chọrọ igosi ihe dị mkpa, kama ọ na-abụkarị nke ga-ewe ihe karịrị otu awa,” ka Edwin Black dere n’akwụkwọ bụ́ Film Score Monthly.

Mgbe ụfọdụ, a na-akpọ mmadụ ole na ole ma gosi ha fim a ka hazichara ọhụrụ, iji mara otú ha si hụ ya. Ha pụrụ ịbụ ndị enyi nke onye duziri fim ahụ ma ọ bụ ndị ọrụ ibe ya, bụ́ ndị na-esoghị mee fim ahụ. Dabere n’ihe ha kwuru, onye duziri fim ahụ pụrụ isegharị ebe ụfọdụ na fim ahụ ma ọ bụkwanụ wepụ ebe ndị ahụ. N’ọnọdụ ụfọdụ, a gbanwewo ihe nile e mere ná ngwụsị fim n’ihi na ọ tọghị ndị e gosiri ya, iji mara otú ha si hụ ya, ụtọ.

N’ikpeazụ, fim ahụ na-apụta. Ọ bụ n’oge a ka a na-ama ma ọ̀ ga-aga ahịa ma ọ bụ na ọ gaghị aga ahịa. Ma, ọ bụghị nanị uru ego ka a na-azọ. Mmadụ ime ọtụtụ fim na-agaghị ahịa pụrụ ime ka ọ gharazie inweta ọrụ, nke a pụkwara imebi aha onye duziri fim ndị ahụ. Ka John Boorman, bụ́ onye na-eduzi fim na-echeta oge ọ malitere ọrụ fim, o kwuru, sị: “Ahụla m ọtụtụ n’ime ndị ọrụ ibe m ka ha dara mgbe ha mepụtasịrị fim ndị na-agaghị ahịa. Otu ihe jọgburu onwe ya n’ọrụ imepụta fim bụ na, ọ bụrụ na ị kpataghịrị ndị were gị n’ọrụ ego, ha achụọ gị.”

N’ezie, mgbe ndị mmadụ nọ na-ekiri posta fim a mapawara n’ebe a na-ekiri fim, ha adịghị eche banyere ọrụ ndị mere fim ahụ. O yikarịrị ka isi ihe ha na-eche ọ̀ bụ: ‘Fim a ọ̀ ga-atọ m ụtọ? Ò ruru ihe m ga-akwụrụ ego ole a iji banye kirie ya? Fim a ọ̀ ga-awụ m akpata oyi n’ahụ́ ma ọ bụ kpasuo m iwe? Ọ̀ dị mma ụmụ m ikiri ya?’ Olee otú ị pụrụ isi zaa ajụjụ ndị ahụ mgbe ị na-ekpebi fim ị ga-ekiri?

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 Anita Elberse, bụ́ prọfesọ n’ụlọ akwụkwọ Harvard Business School, kwuru na “n’agbanyeghị na ego ndị America na-erete na fim ugbu a ná mba ndị ọzọ na-ebukarị ibu karịa nke ha na-erete n’ụlọ, otú fim si gaa ahịa n’America ka nọgidere bụrụ isi ihe na-ekpebi otú ọ ga-esi gaa ahịa ná mba ndị ọzọ.”

^ par. 3 Ọ bụ ezie na otú e si mepụta otu fim pụrụ ịdị iche n’otú e si mepụta fim ọzọ, ihe ọmụma anyị na-enye n’isiokwu a bụ otu n’ime ụzọ ndị a pụrụ isi mepụta ya.

^ par. 7 Mgbe ụfọdụ, a na-eji ọnụ kọọrọ onye na-emepụta fim akụkọ a chọrọ iji mee fim, kama ide ya ede. Ọ bụrụ na akụkọ ahụ masịrị ya, ọ pụrụ ịzụrụ ikike nke iji ya mee fim ma jirizie aka ya dee ya edee.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]

“Ị gatụghị ama ihe ọhaneze gaje iwere dị ka ihe na-akpali mmasị ma ọ bụ ihe dị ụtọ.”—David Cook, bụ́ prọfesọ na-akụzi banyere fim

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 6, 7]

ỤZỌ NDỊ E SI EME KA FIM GAA AHỊA

Fim ahụ apụtala. O ruwo ka ọtụtụ nde mmadụ kirie ya. Ọ̀ ga-aga ahịa? Tụlee ụzọ ole na ole ndị na-emepụta fim si agbalị ire fim ha ma mee ka ọ gaa ahịa.

IJI ỌNỤ AKPỌSA YA: Otu n’ime ụzọ ndị kasị aga aga e si eme ka ndị mmadụ tụwa anya fim bụ site n’iji ọnụ kpọsaa ya. Ọtụtụ mgbe, a na-amalite ya ọtụtụ ọnwa tupu fim ahụ apụta. Ikekwe, a mara ọkwa na a na-aga imepụta akụkụ nke abụọ nke otu fim kara aka e mepụtarala akụkụ nke mbụ ya. Ndị mmadụ pụrụ ịnọ na-eche, sị, Ndị ahụ mere akụkụ nke mbụ hà ga-eso mee nke a? Ọ̀ ga-adị ụtọ (ma ọ bụ ghara ịdị ụtọ) ka nke mbụ ya?

Mgbe ụfọdụ, ihe na-akpata iji ọnụ kpọsaa fim na-abụ ihe e mere na fim, bụ́ nke kpatara arụmụka—ọ pụrụ ịbụ ihe metụtara mmekọahụ nke e gosiri na fim e mere maka ọhaneze. Ndị mmadụ pụrụ ịnọ na-eche, sị, Ihe ahụ e gosiri ọ̀ dị njọ nke otú ahụ n’ezie? Fim ahụ ọ̀ “gbara ihe a na-ezo ezo” n’anwụ? Ka ndị mmadụ na-arụrịta ụka banyere fim ahụ, ndị mepụtara ya na-abụ ndị a kpọsaara ngwá ahịa ha n’efu. Mgbe ụfọdụ, ụka ndị mmadụ na-arụ banyere ihe e gosiri na fim na-eme ka ọtụtụ mmadụ gaa kirie ya ozugbo ọ pụtara.

USORO MGBASA OZI: Ụzọ a kasị mara amara e si akpọsa fim bụ site n’imepụta posta ya, ide banyere ya n’akwụkwọ akụkọ, ịkpọsa ya na TV, igosi ihe ụfọdụ e mere na ya ná mmalite fim, na ịgba ndị mere ya ajụjụ ọnụ. Ugbu a, Intanet bụ ngwá ọrụ bụ́ isi e ji akpọsa fim.

IREKỌTA YA NA IHE NDỊ ỌZỌ: Ngwa ahịa ndị bu aha fim ọhụrụ n’ahụ́ ha pụrụ ime ka ndị mmadụ mara banyere fim ahụ. Dị ka ihe atụ, iji mee ka otu fim nke dabeere n’akụkọ na-akpa ọchị banyere otu dike gaa ahịa, e rekọtara ya na efere nri ụmụaka, iko, ọla, uwe, ihe e ji etinye mkpịsị ugodi, elekere, mpanaka, ihe dị ka bọọdụ ludo, na ọtụtụ ihe ndị ọzọ, bụ́ ndị e dere aha fim ahụ n’ahụ́ ha. “Dị ka ọ na-adịkarị, a na-ere pasent 40 nke ngwa ahịa ndị bu aha fim n’ahụ́ ha ọbụna tupu fim ahụ apụta,” ka Joe Sisto dere n’akwụkwọ nke Òtù Ndị Ọkàiwu America, bụ́ nke na-ekwu banyere ntụrụndụ.

VIDIO A NA-EKIRI N’ỤLỌ: Fim na-agaghị ahịa n’ebe a na-ekiri fim pụrụ ịga ahịa ma e mepụta ya n’ụdị a ga na-ekiri ya n’ụlọ. Bruce Nash, bụ́ onye na-eme nchọpụta banyere ego a na-enweta na fim, kwuru na “ọ bụ na fim ndị e mepụtara n’ụdị a ga na-ekiri n’ụlọ ka e si enweta pasent 40 ruo 50 nke ego a na-enweta na fim.”

IGOSI NDỊ FIM BỤ MAKA HA: Ndị na-emepụta fim amụtawo iji usoro nke igosi ndị fim bụ maka ha eme ihe n’ụzọ ga-eme ka ahịa ha gaa agaa. Dị ka ihe atụ, a pụrụ ilezi anya webata ihe ụfọdụ na fim iji mee ka e were ya dị ka fim kara aka, na-eme ka o yie fim ndị okenye. N’aka nke ọzọ, iwepụ nnọọ ihe na fim pụrụ ime ka a ghara iwere ya dị ka fim ndị okenye, ma mee ka ndị ntorobịa nwee mmasị na ya. Liza Mundy dere n’akwụkwọ bụ́ The Washington Post Magazine na igosi na fim bụ maka ndị ntorobịa “aghọọla ụzọ e si akpọsa fim: Ụlọ ọrụ ndị na-emepụta fim na-eji ya agwa ndị ntorobịa—na ụmụaka ndị ọ na-agụ agụụ ịghọ ndị ntorobịa—na fim ahụ nwere ihe ndị na-adọrọ adọrọ.” Mundy na-ede na ngosi a na-egosi ndị fim bụ maka ha na-akpata “nsogbu n’etiti ndị mụrụ ụmụ na ụmụ ha. Ọ na-adọ ndị mụrụ ụmụ aka ná ntị ma, n’otu mgbe ahụ, na-arata ụmụaka.”

[Foto ndị dị na peeji nke 8, 9]

OTÚ E SI EMEPỤTA FIM

AKWỤKWỌ E DERE AKỤKỌ A NA-EME FIM YA

IHE OSISE NKE IHE NDỊ A GA-EME NA FIM

EBE A NA-EYINYE UWE

EBE A NA-ETE IHE N’IHU

EBE A NA-ESE VIDIO

EBE A NA-ESE IHE GA-EJU ANYA

EBE A NA-ETINYE EGWÚ NA TEEPU

EBE A NA-ETINYE ỤDA NA YA

IHE NA-EJU ANYA E JI KỌMPUTA TINYE

EBE A NA-AHAZI FIM