Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

(A pụrụ ịchọta azịza nke ajụjụ ndị a n’akụkụ Bible ndị e zoro aka na ha, e bipụtakwara azịza ha nile na peeji nke 17. Iji nwetakwuo ihe ọmụma, lee akwụkwọ bụ́ “Insight on the Scriptures” nke Ndịàmà Jehova bipụtara.)

1. N’oge Solomọn, olee ụgbọ butere ọlaọcha, ọdụ́, enwe, na ekwuru ụlọ n’Izrel? (1 Ndị Eze 10:22)

2. Mgbe oge ọnwụ Pọl na-eru nso, olee otú o si gosi na ya maara na ya atachiwo obi? (2 Timoti 4:7)

3. Olee nrọ Fero nke Josef kọwara na ọ pụtara na oké ụnwụ ga-ewe afọ asaa na-aga ịda? (Jenesis 41:17-24)

4. Olee ndị inyom abụọ kụziiri Timoti Akwụkwọ Nsọ? (2 Timoti 1:5)

5. Olee ụzọ a na-adịghị ahụkebe nke Absalọm si nwụọ, oleekwa otú e si lie ya? (2 Samuel 18:9, 14-17)

6. Gịnị bụ ụgwọ ọrụ nke mmehie na-akwụ? (Ndị Rom 6:23)

7. Olee okwu Jizọs kwufere ókè iji gosi otú ọ ga-esi siere ọgaranya ike ịba n’Alaeze Chineke? (Matiu 19:24)

8. Olee onye ọchịchị Rom chịrị Judia, nke hapụrụ Pọl n’agbụ n’ihi ịchọ inweta ihu ọma ndị Juu? (Ọrụ 24:27)

9. Olee otu n’ime ihe ndị a na-eme n’imepụta mmanya bụ́ nke a kọwara na Jizọs na-eme iji gosi otú ọ ga-esi egbu ndị iro Chineke? (Mkpughe 19:15)

10. Olee ụzọ e si dee Iwu Iri ahụ na mbụ, na gịnịkwa ka e dere ya? (Ọpụpụ 31:18)

11. Olee otú Pọl onyeozi chọrọ ka ndị inyom bụ́ Ndị Kraịst siri na-achọ onwe ha mma? (1 Timoti 2:9)

12. Iji kọwaa ịdị ukwuu Jehova, olee ihe Aịzaịa kwuru na Jehova pụrụ iji tụọ “mmiri nile” n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀? (Aịsaịa 40:12)

13. Gịnị ka a kpọrọ ebe obibi Adam na Iv? (Jenesis 2:15)

14. N’ime ụmụ ndị ikom Jekọb, olee abụọ ọ katọrọ ihe ike ha mere? (Jenesis 49:5-7)

15. Olee aha osimiri anọ e si n’osimiri dị n’Iden kewapụta? (Jenesis 2:11-14)

16. Gịnị ka Ndị Kraịst ruru eru n’ụzọ ime mmụọ kwesịrị ime ma ọ bụrụ na onye kwere ekwe ibe ha azọhie ụkwụ tupu ya amara banyere ya? (Ndị Galeshịa 6:1)

Azịza Nye Ajụjụ

1. Ụgbọ Tashish

2. O kwuru, sị: “Alụwo m ezi ọgụ ahụ, agbawo m ọsọ ahụ ruo n’isi, edebewo m okwukwe ahụ”

3. Ehi asaa tara ahụ́ riri ehi asaa mara abụba, oko ọka asaa hịkpọrọ ahịkpọ lodara oko ọka asaa dị mma

4. Nne ya, bụ́ Yunis, na nne ya ochie bụ́ Lọịs

5. Joab na ụmụ okorobịa ndị na-ebu ihe agha ya tigburu Absalọm ka isi ya kogidere n’elu osisi, mgbe ha gbusịrị ya, ha atụba ya n’olulu ukwu, mee ka oké obo ukwu nke nkume guzo n’elu ya

6. Ọnwụ

7. O kwuru, sị: “Ọ dịịrị kamel mfe isi n’anya agịga gafere karịa onye bara ọgaranya ịba n’alaeze Chineke”

8. Filiks

9. Ịzọ ụkwụ n’ebe nzọchapụta mmanya

10. “Mkpịsị aka Chineke” dere ha n’elu mbadamba nkume abụọ

11. Ọ chọrọ ka ha jiri “uwe a haziri nke ọma na-achọ onwe ha mma n’imeru ihe n’ókè na uche zuru okè, ọ bụghị n’ụdị dị iche iche nke ịkpa isi na ọlaedo ma ọ bụ nkume pel ma ọ bụ ejiji dị nnọọ okè ọnụ”

12. ‘Ọbụ aka Ya’

13. Ogige Iden

14. Simiọn na Livaị

15. Paịshọn, Gaịhọn, Hidekel, na Yufretis

16. Ha kwesịrị ‘ịgbalị ịgbazigharị ya na mmụọ nke ịdị nwayọọ’