Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Na-emega Ahụ́ Otú Ahụ́ Gị Chọrọ?

Ị̀ Na-emega Ahụ́ Otú Ahụ́ Gị Chọrọ?

Ị̀ Na-emega Ahụ́ Otú Ahụ́ Gị Chọrọ?

“Ọ dịghị ọgwụ e nwere ugbu a ma ọ bụ nke a ka ga-enwe n’ọdịnihu nke pụrụ ime ka mmadụ nwee ezi ahụ́ ike ka ịdị na-emega ahụ́ mgbe nile.”

N’AFỌ 1982, Dr. Walter Bortz nke Abụọ, bụ́ prọfesọ nke na-ahụ maka ọgwụ na ahụ́ ike n’otu mahadum, dere okwu ndị ahụ dị n’elu. N’ime afọ 23 gafeworonụ, ọtụtụ ndị dọkịta na òtù ahụ́ ike ehotawo okwu ndị ahụ n’akwụkwọ, na magazin, nakwa n’ebe ndị a na-edebe ihe ọmụma n’Intanet. Ihe àmà na-egosi na ndụmọdụ Dr. Bortz ka dabara adaba otú o si daba mgbe o nyere ya n’afọ 1982, a ka weere ya n’ebe nile dị ka ndụmọdụ dị mma ma baa uru. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị, ‘M̀ na-emega ahụ́ otú ahụ́ m chọrọ?’

Ụfọdụ ndị ekwuwo n’ụzọ hiere ụzọ na ọ dịghị ha mkpa ịdị na-emega ahụ́ n’ihi na ha ebughị ibu. Ndị buru oké ibu na ndị buru ibu nkịtị pụrụ irite uru dị ukwuu site n’ịdị na-emega ahụ́ mgbe nile. Ma, ọ bụrụgodị na i bughị ibu, gị ịdị na-emega ahụ́ mgbe nile yiri nnọọ ka ọ̀ ga-eme ka i nwekwuo ezi ahụ́ ike ma nye aka mee ka ị ghara ibute ọrịa ọjọọ, dị ka ụdị ọrịa cancer ụfọdụ. Ọzọkwa, nnyocha ndị e mere n’oge na-adịbeghị anya gosiri na imega ahụ́ pụrụ ime ka nchekasị kwụsịlata, ọbụnakwa gbochie ịda mbà n’obi. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọtụtụ ndị dị gịrịgịrị na-enwe nchegbu na obi erughị ala, na-arịa ọrịa obi, ọrịa shuga, na ọrịa ndị ọzọ mmadụ emegaghị ahụ́ otú ahụ́ ya chọrọ na-eme ka ọ ka njọ. N’ihi ya, ma ì buru ibu ma i bughị, ọ bụrụ na ị na-anọkarị otu ebe, ọ ga-adị mma ka ị na-emega ahụ́ mgbe nile.

Olee Ihe Bụ́ Mmadụ Ịnọkarị Otu Ebe?

Olee otú i si ama ma ị̀ na-emega ahụ́ otú ahụ́ gị chọrọ? E nwere echiche dịgasị iche ma a bịa n’ihe e were dị ka mmadụ ịnọkarị otu ebe. Ma, ọtụtụ ndị ọkachamara banyere ahụ́ ike ji otu olu kwekọrịta ná nkọwa e nyere bụ́ ndị metụtara ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ. Otu nkọwa ọtụtụ òtù ahụ́ ike na-enye bụ na ị na-anọkarị otu ebe ma ọ bụrụ na (1) ị dịghị emega ahụ́ ma ọ bụ na-arụ ọrụ ga-eme ka ọsụsọ gbaa gị ruo, ọ dịkarịa ala, minit 30, ugboro atọ n’izu, (2) ị dịghị esi otu ebe aga ebe ọzọ mgbe ị na-atụrụ ndụ, (3) ị dịkebeghị eji ụkwụ aga ihe dị ka 100 mita n’ụbọchị, (4) ị na-anọdụ ala ihe ka ukwuu n’ụbọchị, (5) ọrụ ị na-arụ bụ nke ị na-adịchaghị emega ahụ́ na ya.

Ị̀ na-emega ahụ́ otú ahụ́ gị chọrọ? Ọ bụrụ na ị dịghị emega, ị pụrụ ibido taa mewe ihe banyere ya. Ma, ị pụrụ ikwu, sị, ‘Enwetụghị m oge maka ya.’ Mgbe i tetara ụra, ike na-agwụ gị nnọọ. N’ụtụtụ, oge i nwere anaghị ezuru gị iji jikere ma gawa ọrụ. Mgbe ị rụsịrị ọrụ n’ụbọchị, ike na-agwụkwa gị nke na ị dịghị enwe ike imega ahụ́, ị na-enwekwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ ị ga-eme.

Ma ọ bụkwanụ, ma eleghị anya, i so n’ọtụtụ ndị malitere imega ahụ́ ma kwụsị mgbe i mesịrị ya ruo nanị ụbọchị ole na ole n’ihi na o siiri gị nnọọ ike, ikekwe ya ana-adị ka ị ga-ada ọrịa mgbe i megasịrị ahụ́. Ndị ọzọ na-agbara mmega ahụ́ ọsọ n’ihi na ha na-eche na, ka ha wee gbasie ike site na ya, ha aghaghị ịdị na-ebu ígwè, na-agba ọtụtụ kilomita n’ọsọ kwa ụbọchị, ma na-eme ihe ndị na-agbatị ahụ́ bụ́ ndị a na-agbasochi usoro a tụpụtara maka ha anya.—Lee igbe bụ́ “Ibu Ígwè na Ịgbatị Ahụ́.”

Tụkwasị na nke ahụ, ọ na-efu ego, tinyekwara ájá ọ ga-adị gị ka ọ na-aghanyere gị na garị. Ị chọọ ịdị na-agba mwe mwe ọsọ, ọ dị gị mkpa inwe uwe na akpụkpọ ụkwụ kwesịrị ekwesị. Ọ bụrụ na ụdị ahụ́ ị chọrọ ịdị na-emega bụ nke ga-eme ka uru ahụ́ gị na ọkpụkpụ gị sie ike, ọ dị gị mkpa inwe ígwè ị ga na-ebu ma ọ bụ ngwá ndị pụrụ iche e ji emega ahụ́. Ọ pụrụ ifu gị ezigbo ego iji banye n’òtù egwuregwu. Ịga n’ụlọ egwuregwu ga na-eri gị oge dị ukwuu. Ma, ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ihe ndị a kwesịrị igbochi gị ịdị na-emega ahụ́ ma na-erite uru ndị dị na ya.

Kowe Akpa Gị Ebe Aka Gị Ga-eru

Nke mbụ, ọ bụrụ na ị chọrọ ịmalite imega ahụ́ mgbe nile, ekowela akpa gị ebe aka gị na-agaghị eru. Malite ya nke nta nke nta, ka oge na-aga, gị ana-emetekwu ya aka. Ndị ọkà mmụta sayensị kwetara n’oge na-adịbeghị anya banyere uru dị n’iji nke nta nke nta malite imega ahụ́. Ha na-atụkwa aro ka ndị na-anọkarị otu ebe jiri nke nta nke nta na-amụba oge ha ji emega ahụ́. Dị ka ihe atụ, UC Berkeley Wellness Letter, bụ́ obere akwụkwọ akụkọ na-ekwu banyere nri na-edozi ahụ́, ahụ́ ike, na ụzọ e si anagide nchegbu, bụ́ nke Mahadum nke California bipụtara, dụrụ ọdụ, sị: “Malite site n’iji minit ole na ole na-amụba oge i ji emega ahụ́ n’ụbọchị, ma mee ka ọ gbagote ruo minit 30 ọtụtụ ụbọchị n’izu, ma ọ ga-akacha mma ma ọ bụrụ ụbọchị nile n’izu.” Akwụkwọ akụkọ ahụ kọwara na “nanị ihe ị ga-eme bụ ihe ndị ahụ ị na-eme n’ụbọchị, dị ka ịga ije na ịrịgo steepụ, ma na-emechitụkwu ya anya, na-emetetụkwu ya aka, ma ọ bụkwanụ na-emetụkwu ya ọkụ ọkụ.”

Ndị ka na-amalite amalite kwesịrị ilekwasị anya n’imechi ya anya, ọ bụghị n’imesi ya ike. Ozugbo ị bịara nwee ike ime ya ruo ogologo oge, ị pụrụ ilekwasịzi anya n’imesiwe ya ike. Ị pụrụ ime nke a site n’itinyekwu ihe n’oge i ji eme ihe ndị sitụrụ ike, dị ka ịgasi ije ike, ịgba mwe mwe ọsọ, ịrị steepụ, ma ọ bụ ịgba ígwè. E mesịa, iji tinyekwuo ihe n’ihe ndị ga-eme ka ahụ́ gbasie gị ike, ị pụdịrị ịmalite ibu ígwè na ịgbatị onwe gị. Otú ọ dị, ọtụtụ ndị ọkachamara banyere ahụ́ ike adịghịzi ekwenye n’echiche bụ́ na “a naghị agba aka ahụ nwata ezé” ma a bịa ná mmega ahụ́. Ya mere, iji hụ na ị dịchaghị emerụ ahụ́ na iji zere ike ọgwụgwụ na nkụda mmụọ bụ́ ndị na-emekarị ka mmadụ kwụsị, na-emega ahụ́ otú ọ na-agaghị enye gị nsogbu n’ahụ́.

Na-emechi Ya Anya

Ndị ọ na-adị ka ọ dịghị mgbe ha na-enwe oge maka mmega ahụ́ ga-anabata aro a tụrụ n’akwụkwọ bụ́ Wellness Letter. Ọ kọwara na “iji obere oge na-emega ahụ́ ọtụtụ ugboro n’ụbọchị bara uru. Ihe a na-ekwu bụ na iji minit 10 megaa ahụ́ ugboro atọ n’ụbọchị pụrụ ịfọ nke nta ka ọ baara gị uru otú iji minit 30 megaa ahụ́ otu ugbo ga-abara gị.” N’ihi ya, ọ dịghị gị mkpa ịdị na-emega ahụ́ n’ụzọ siri ike ruo ogologo oge iji rite ezigbo uru na ya. Akwụkwọ bụ́ The Journal of the American Medical Association kọrọ na ndị nchọpụta achọpụtawo na “iji nke nta nke nta na-amụba oge e ji emega ahụ́, nakwa imega ahụ́ n’ụzọ siri ike, na-ebelata ohere mmadụ nwere ịrịa ọrịa obi.”

Ma, iwu bụ na ị ga na-emechi ya anya. N’iburu nke ahụ n’uche, ị pụrụ ileba anya na kalenda gị ma wepụta ụbọchị na oge ị ga-eji na-emega ahụ́. Mgbe ị nọgidesịrị na-emega ahụ́ ruo izu ole na ole, ikekwe ị ga-ahụ na ọ marala gị ahụ́. Ozugbo ị malitere ịhụ uru ya n’ahụ́ gị, ọ pụrụ n’ezie ịdị gị ka oge i ji emega ahụ́ ruwe eru.

Mmega Ahụ́ Na-eme Ka Ahụ́ Sikwuo Mmadụ Ike

Ọ bụ eziokwu na ịdị na-emega ahụ́ kwa ụbọchị ruo nanị minit 30 pụrụ ime ka ahụ́ dịkwuo gị mma, dị ka aro ndị a tụrụ banyere ahụ́ ike n’oge na-adịbeghị anya gosiri, ọ ka mma itinyekwu ihe na ya. A na-atụzi aro na ka i wee ghara ịrịa ọrịa obi, i kwesịrị ịdị na-emega ahụ́ ruo minit 60 kwa ụbọchị. Ọzọkwa, ọ bụghị iwu na ị ga-emecha minit 60 ahụ n’otu mgbe n’ụbọchị. Akwụkwọ bụ́ Canadian Family Physician kọwara na “aro ndị a na-atụ n’oge a bụ ka a na-emega ahụ́ ruo minit 60 kwa ụbọchị. Iji mee ya otú ahụ́ ga-adị gị mma, o yiri ka ugboro ole i megara ahụ́ iji ruo minit 60 ahụ adịghị ihe o mere.” Akwụkwọ a kwukwara, sị: “Ọ bụ ezie na ọtụtụ nnyocha e mere gosiri na imegasi ahụ́ ike na-eme ka ọnụ ọgụgụ ndị na-anwụ n’ihi emegaghị ahụ́ belata, ihe e lekwasịrị anya na ya ugbu a bụ imega ahụ́ otú kwesịrịnụ.”

Ihe a na-ekwu bụ na e kere ahụ́ gị ka ọ na-agagharị agagharị nakwa ka a na-emega ya emega mgbe nile. Ịnọkarị otu ebe anaghị adị mma n’ahụ́. Ọ dịghịkwa vitamin, ọgwụ, nri, ma ọ bụ ụdị ịwa ahụ́ a pụrụ iji dochie mkpa ọ dị gị ịdị na-emega ahụ́ mgbe nile. Ọzọkwa, anyị aghaghị ikweta na mmega ahụ́ nke dị mma, ma ị̀ na-eme ya otú kwesịrịnụ ma ị̀ na-eme ya n’ụzọ siri ike, ma ị̀ na-eme ya obere oge obere oge ma ị̀ na-eme ya ruo ogologo oge, ọ chọrọ oge iji na-eme ya. Dị nnọọ ka i si ewepụta oge iji na-eri nri ma na-ehi ụra, ọ dị mkpa ịdị na-ewepụtakwa oge iji na-emega ahụ́ mgbe nile. Nke a na-achọ mmadụ inye onwe ya ọzụzụ na ịkpakọ onwe ya ọnụ nke ọma.

Ọ dịghị usoro mmega ahụ́ na-adịghị achọ mgbalị. Ma, ihe ndị ọ na-efu na àjà ndị a na-achụ iji na-emega ahụ́ mgbe nile adịghị ihe ha bụ ma e jiri ha tụnyere ihe ize ndụ ndị dị n’emegaghị ahụ́. Na-emega ahụ́, kwe ka ọsụsọ na-agba gị site n’oge ruo n’oge, mee ka uru ahụ́ gị na-esikwu ike—ihe ndị a pụrụ ime ka ahụ́ sikwuo gị ike, meekwa ka ị dịtekwuo ndụ aka!

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 8]

Ụdị Mmega Ahụ́ Siri Ike

Ọ bụ ezie na iji nke nta nke nta etinyekwu ihe n’oge i ji emega ahụ́ kwa ụbọchị pụrụ ime nnọọ ka ahụ́ sikwuo gị ike, ndị nchọpụta na-ekwu na imega ahụ́ n’ụzọ sikwuru ike ka adị mma n’ahụ́. Ihe ndị e dere n’okpuru bụ ụfọdụ n’ime ihe ndị ị pụrụ ime:

Ndị ọkachamara banyere ahụ́ ike na-atụ aro ka ị hụ dọkịta tupu ị na-amalite imegasi ahụ́ ike mgbe nile.

Ịgasi ije ike: Mgbe ụfọdụ a na-akpọ ya ọsọ ije, nke a bụ otu n’ime ụzọ ndị dị mfe isi na-emega ahụ́. Nanị ihe ọ chọrọ bụ inwe akpụkpọ ụkwụ dị mma e ji aga ije na ụzọ ị ga na-aga. Na-amatịkwu ụkwụ gị amatị ma na-agasikwu ike. Gbalịa ịdị na-eji otu awa aga ihe dị ka kilomita 4 ruo 9.

Ịgba mwe mwe ọsọ: Ọ bụrụ na ị na-agba mwe mwe ọsọ, ọ bụ ọsọ ka ị na-agba, kama ị naghị agbasi ya ike. A kọwawo mwe mwe ọsọ dị ka ụzọ kasị mma isi gbochie ọrịa obi. Otú ọ dị, n’ihi mmetụta ka ukwuu ọ na-enwe n’ahụ́, o yiri ka mwe mwe ọsọ ọ̀ ga-aka enye uru ahụ́ na nkwonkwo gị nsogbu. N’ihi ya, a na-echetara ndị na-agba mwe mwe ọsọ na ọ dị ha mkpa inwe akpụkpọ ụkwụ dị mma, ịdị na-agbatị onwe ha, na ịdị na-emeru ya n’ókè.

Ịgba ígwè: Ọ bụrụ na i nwere ígwè, ị pụrụ iji ya na-emega ahụ́ n’ụzọ dị mma. Ma, dị ka ọ dị n’ịga ije nakwa n’ịgba mwe mwe ọsọ, ọ bụ n’okporo ámá ka a na-agbakarị ígwè. N’ihi ya, ị ghaghị ịsa anya mmiri mgbe ị na-agba ígwè, na-akpachapụ nnọọ anya iji zere ihe ọghọm.

Igwu mmiri: Ị pụrụ imega uru ahụ́ gị nile ndị bụ́ isi site n’igwu mmiri. Ọ na-enyekwa aka eme ka nkwonkwo gị na-atụgharị nke ọma, ọ pụkwara ịrụrụ gị ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe nile ịgba mwe mwe ọsọ pụrụ ịrụrụ gị ma a bịa n’ime ka ọbara gị na-erugharị nke ọma. Ebe igwu mmiri ka adị nro n’ahụ́, a na-atụkarị aro ka ndị na-arịa ogbu na nkwonkwo, ndị na-enwe azụ mgbu, ma ọ bụ ndị buru ibu nakwa ụmụ nwanyị dị ime na-eme ya. Zere igwu mmiri nanị gị.

Ịwụli elu: N’ụdị mmega ahụ́ a, ihe a na-eme bụ ịrịkwasị n’elu obere ihe na-atụli mmadụ elu nke ndị Bekee na-akpọ trampoline ma na-awụli elu. Ndị na-akwado ụdị mmega ahụ́ a na-ekwu na ọ na-eme ka ọbara na-erugharị n’ahụ́ nke ọma, na-eme ka obi na akpa ume na-arụkwu ọrụ nke ọma, na-eme ka uru ahụ́ sikwuo ike, ka mmadụ dị garagara, nakwa ka ụkwụ sie ya ike n’ala.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 9]

Ibu Ígwè na Ịgbatị Ahụ́

Ndị ọkà mmụta sayensị kwuru n’oge na-adịbeghị anya na ka i wee na-emegaru ahụ́ otú ahụ́ gị chọrọ, i kwesịrị ịdị na-eme ihe ndị ga-eme ka ahụ́ gị gbasie ike, dị ka ibu ígwè. Ọ bụrụ na ị na-ebu ígwè otú kwesịrịnụ, ọ bụghị nanị na ọ ga-eme ka uru ahụ́ gị sikwuo ike, kama ọ ga-eme ka ọkpụkpụ gị sikwuo ike, meekwa ka abụba dị gị n’ahụ́ belata.

Ọtụtụ ndị ọkachamara banyere ahụ́ ike na-atụkwa aro ịdị na-agbatị ahụ́ iji mee ka ahụ́ gị nwee ike ịdị na-eroji eroji, meekwa ka ọbara na-erugharị nke ọma. Ịgbatị ahụ́ pụrụ ime ka nkwonkwo gị na-arụ ọrụ nke ọma.

Otú ọ dị, iji zere imerụ ahụ́, ma ibu ígwè ma ịgbatị ahụ́ kwesịrị ka a na-eme ha n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Ị pụrụ ịmata ụkpụrụ ole na ole ndị bụ́ isi ị ga-agbaso site n’ịgụ akwụkwọ ndị a pụrụ ịdabere na ha bụ́ ndị kwuru banyere ha ma ọ bụkwanụ site n’ịgakwuru dọkịta gị.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 9]

Mmega Ahụ́ na Uche

Ndị ọkà mmụta sayensị achọpụtawo na imegasi ahụ́ ike pụrụ imetụta ụfọdụ mmiri ọgwụ ụbụrụ ndị na-eme ka mmetụta mmadụ na-enwe gbanwee, mmiri ọgwụ ndị dị ka dopamine, norepinephrine, na serotonin. Nke a pụrụ ime ka a ghọta ihe mere ọtụtụ mmadụ ji ekwu na isi bịara jụọ ha oyi mgbe ha megasịrị ahụ́. Ụfọdụ nnyocha ndị e mere na-enyedị echiche na ndị na-emega ahụ́ mgbe nile eyighị ka hà ga-adaru mbà n’obi ka ndị na-anọkarị otu ebe. Ọ bụ ezie na ụfọdụ n’ime ihe ndị a a chọpụtara abụchaghị otú e si ahụ ya mgbe nile, ọtụtụ ndị dọkịta na-atụ aro na mmega ahụ́ bụ otu ụzọ e si eme ka nchegbu na nchekasị kwụsịlata.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 10]

Ihe Ndị Ị Na-eme Kwa Ụbọchị Bụ́ Ndị Pụrụ Ime Ka I Nwekwuo Ezi Ahụ́ Ike

Dị ka nnyocha ndị e mere n’oge na-adịbeghị anya gosiri, ndị na-anọkarị otu ebe pụrụ irite uru site n’ịdị na-etinyekwu ihe n’oge ha ji eme ihe ndị chọtụrụ ndọga bụ́ ndị ha na-eme kwa ụbọchị. Ị pụrụ ịnwale ụfọdụ n’ime ihe ndị na-esonụ:

● Na-arị steepụ kama iji ígwè mbugo na-agbago n’ụlọ elu ma ọ bụkwanụ jiri ígwè mbugo gbagotụ ruo ebe dị nso n’okpukpu ụlọ nke ị na-aga ma jirizie ụkwụ si na steepụ rịgoruo ebe ahụ ị na-aga.

● Ọ bụrụ na ị bara n’ụgbọ njem ọhaneze, rịtuo mgbe ị na-eruchabeghị ebe ị na-aga ma jiri ụkwụ gatọpụ nke fọrọ.

● Mgbe i ji ụgbọala nke gị na-aga, mụta ịdị na-adọba ya n’ebe dịtụ anya site n’ebe ị na-aga. N’ebe a na-adọba ụgbọala n’ụlọ elu, dọba ya n’ebe ga-eme ka ị rịa steepụ.

● Na-aga ije mgbe gị na mmadụ na-akparịta ụka. Ọ dịghị mkpa na ị ga-anọdụrịrị ala mgbe gị na ndị enyi gị ma ọ bụ ndị ezinụlọ gị na-enwe mkparịta ụka nkịtị.

● Ọ bụrụ na ị na-arụ ọrụ a na-anọdụ ala arụ, gbalịa ịdị na-eguzo ọtọ na-arụ ya mgbe ụfọdụ, na-agagharịkwa mgbe ọ bụla o kwere mee.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 10]

Ị̀ Na-aṅụ Mmiri Otú Ahụ́ Gị Chọrọ?

Aṅụghị mmiri nke ọma mgbe ị na-emega ahụ́ pụrụ inye gị nsogbu n’ahụ́. Ọ pụrụ ime ka ike gwụ gị, ka ị ghara ịdị garagara, nakwa ka i nwee ahụ́ mgbu. Ọsụsọ na-agba gị mgbe ị na-emega ahụ́ karịa mgbe ị na-adịghị emega ahụ́, nke a pụkwara ime ka ọ̀tụ̀tụ̀ ọbara gị dalata. Ọ bụrụ na ị ṅụghị mmiri iji nyeghachi ahụ́ gị mmiri ahụ si n’ọsụsọ gị pụọ, obi gị aghaghị ịrụsikwu ọrụ ike iji hụ na ọbara na-erugharị gị n’ahụ́. A na-atụ aro na, iji zere mmiri ịgwụ gị n’ahụ́, i kwesịrị ịdị na-aṅụ mmiri tupu ị malite imega ahụ́, n’oge ị na-emega ahụ́, nakwa mgbe i megasịrị ahụ́.

[Igbe dị na peeji nke 11]

Jiri Ahụ́ Gị Kpọrọ Ihe—Ọ Bụ Onyinye Si n’Aka Chineke

Bible na-agba ume iji ahụ́ anyị na onyinye nke ndụ akpọrọ ihe. Eze Devid nke Izrel oge ochie dere, sị: “E jiwo ihe dị iche iche dị egwu mee ka m bụrụ oké ọrụ.” (Abụ Ọma 139:14) Dị ka Devid, ezi Ndị Kraịst na-enwe ekele dị ukwuu maka onyinye nke ndụ. Ha na-ewere ilekọta ahụ́ ha nke ọma dị ka ibu ọrụ ha ga-eji kpọrọ ihe.

Ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga, Chineke nyere Pọl onyeozi ike mmụọ nsọ ide, sị: “Ọzụzụ nke ahụ́ bara uru nke nta; ma nsọpụrụ Chineke bara uru maka ihe nile, ebe o nwere nkwa maka ndụ dị ugbu a na nke ahụ gaje ịbịa.” (1 Timoti 4:8) Okwu Pọl na-egosi na ọ bụ ezie na mmega ahụ́ bara nnọọ uru, uru ya aharughị ka uru na-adịte aka a na-erite site n’iso Chineke na-enwe ezi mmekọrịta. N’ihi ya, ezi Ndị Kraịst na-agbalịsi ike imeru ihe n’ókè mgbe ha na-agba mbọ inweta ezi ahụ́ ike. Ha adịtụghị ekwe ka “ọzụzụ nke ahụ́” karịa ofufe ha na-efe Chineke.

Ndị Kraịst na-aghọta na ọ bụrụ na ha enwekwuo ezi ahụ́ ike, ha ga-enwe ike ịrụsikwu ọrụ ike n’igosipụta ịhụnanya ha nwere n’ebe Chineke na ndị agbata obi ha nọ. Imega ahụ́ mgbe nile, tinyere iri nri na-edozi ahụ́ na ihi ụra nke ọma, dị oké mkpa iji na-enwe ezi ahụ́ ike. Ebe ezi Ndị Kraịst ji ahụ́ ha akpọrọ ihe dị ka onyinye si n’aka Chineke, ha na-agbalịsi ike ịzụlite àgwà ndị dị mma n’akụkụ a.