Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ̀ Dị Mkpa n’Ezie Ka Ị Na-emega Ahụ́?

Ọ̀ Dị Mkpa n’Ezie Ka Ị Na-emega Ahụ́?

Ọ̀ Dị Mkpa n’Ezie Ka Ị Na-emega Ahụ́?

“Na-emega ahụ́ ugboro abụọ n’izu iji gbasie ike. Na-emega ahụ́ ruo minit 30 kwa ụbọchị. Aṅụla ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya ka i wee ghara ibute ọrịa cancer. Na-aṅụ ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya ka o wee ghara ịdịrị gị mfe ibute ọrịa obi. Ọ̀ dịtụla gị ka ezi ndụmọdụ a na-enye ọ̀ karịrị akarị? E kwuo otu ihe n’akwụkwọ akụkọ taa, echi e kwuo ihe dị nnọọ iche. . . . Gịnị mere olu ndị ọkà mmụta sayensị ji agba iche iche? Gịnị mere o ji abụ e kwuo na kọfị na-adị mma n’ahụ́ taa, echi e kwuo na ọ naghị adị mma n’ahụ́?” —Barbara A. Brehm, Ed.D., bụ́ prọfesọ n’ihe ọmụmụ banyere mmega ahụ́ na egwuregwu.

O LU ndị ọkachamara n’ihe banyere ahụ́ ike na-agbakarị iche iche ma a bịa n’ihe banyere nri na-edozi ahụ́ na ihe bụ́ na mmadụ gbasiri ike. Mee nke a, emela nke a a na-anụ mgbe nile adịghị ekwe ọtụtụ mmadụ mara nke ha ga-eso eso iji na-enwe ezi ahụ́ ike. Ma, a bịa ná mkpa ọ dị ịdị na-emega ahụ́ nke ọma, o yiri ka ndị ọkà mmụta sayensị nile hà nwere otu olu—ị chọọ ka ahụ́ dịkwuo gị mma, ị ghaghị ịdị na-emega ahụ́ mgbe nile!

Emegaghị ahụ́ nke ọma aghọọla ezigbo nsogbu n’oge a, karịsịa ná mba ndị mepere emepe. N’oge ochie, ọtụtụ ndị nọ ná mba ndị dị otú ahụ rụrụ ọrụ ike ndị e ji ọkpụkpụ aka arụ, ọrụ ndị dị ka ọrụ ubi, ịchụ nta, ma ọ bụ iwu ụlọ. N’eziokwu, ọrụ ike ndị nna nna anyị hà rụrụ nanị iji hụ ihe ha riri nyere ha nnọọ nsogbu n’ahụ́, meedị ka afọ ndụ ha belata. Dị ka akwụkwọ bụ́ Encyclopædia Britannica si kwuo, “na Gris nakwa na Rom oge ochie, ná nkezi, afọ ole otu onye na-adị tupu ya anwụọ na-abụ ihe dị ka afọ 28.” N’ụzọ dị iche, ka ọ na-erule ngwụsị narị afọ nke 20, afọ ole otu onye na-adị ná mba ndị mepere emepe tupu ya anwụọ bụ ihe dị ka afọ 74. Gịnị mere e ji nwee mgbanwe dị otú ahụ?

Nkà na Ụzụ—Ọ̀ Bara Uru Ka Ọ̀ Na-emebi Ihe?

Ndị nọ ndụ ugbu a na-enwe ezi ahụ́ ike ma na-adịte ndụ aka karịa ndị biri ndụ ọtụtụ narị afọ gara aga. Ihe so mee ka ọ dị otú ahụ bụ mgbanwe e nwere na nkà na ụzụ. Ihe ndị a rụpụtara n’oge a emewo ka ụzọ anyị si eme ihe gbanwee, ọtụtụ ọrụ ike adịtụwokwa mfe ọrụrụ. Ndị dọkịta enwewo ọganihu dị ukwuu n’ịlụso ọrịa ọgụ, na-eme ka ihe ka ọtụtụ nwekwuo ezi ahụ́ ike. Ma, agwọ nọ n’akịrịka.

Ọ bụ ezie na nkà na ụzụ nke oge a emewo ka ndị mmadụ na-enwe ezi ahụ́ ike, ka oge na-aga, o mewokwa ka ọtụtụ mmadụ na-anọkarị otu ebe. N’akụkọ Òtù Na-ahụ Maka Obi n’America bipụtara n’oge na-adịbeghị anya, nke isiokwu ya bụ Ihe Ndekọ Mba Nile Banyere Ọrịa Obi na nke Akwara, ha kọwara na “mgbanwe a na-enwe n’ọnọdụ akụ̀ na ụba, mmepe obodo, mmepụta ihe, na njikọ e jikọrọ ụwa ọnụ, na-eme ka a na-ebi ụdị ndụ nke na-eme ka ọtụtụ mmadụ na-arịa ọrịa obi.” Akụkọ ahụ hotara “emegaghị ahụ́ na erighị ezigbo nri” dị ka isi ihe so akpata ọrịa a.

N’ọtụtụ mba n’ime afọ 50 ka gara nnọọ aga, ọsụsọ na-adị agba nwoke dị ike ọrụ ka o ji ịnyịnya na ọgụ na-akọ ugbo ya, e mesịa ya agbara ígwè gaa n’ụlọ akụ̀ dị n’ime obodo, n’oge uhuruchi, ya arụzie ihe ndị mebirinụ n’ụlọ ya. Ma, ụdị ndụ ụmụ ụmụ ya na-ebi dị nnọọ iche. Onye ọrụ nke oge a pụrụ ịnọdụ ala n’ihu kọmputa ruo oge ka ukwuu n’ụbọchị, kwọrọ ụgbọala ya gaa ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ebe ọ bụla ọ chọrọ ịga, ma jiri oge uhuruchi kirie TV.

Dị ka otu nnyocha e mere gosiri, ndị na-egbu osisi na Sweden, bụ́ ndị ọsụsọ na-agba nke ukwuu n’oge mbụ ma ha na-egbutu ma na-ebupụ osisi, na-anọzi na-ele n’anya ka ígwè ọrụ ndị bụ́ ọkpọka na-arụ ihe ka ukwuu n’ọrụ ike ndị ahụ. N’oge gara aga, ọ bụ shọvel na ngwú ka e ji arụ ma na-edozi ọtụtụ n’ime ụzọ ndị dị n’ụwa. Ma ugbu a, ọbụna ná mba ndị ka na-emepe emepe, ọ bụ katapila na ngwá nkà na ụzụ ndị ọzọ bụ́ ọkpọka ka e ji egwu ala ma na-ekpopụ ájá.

N’ebe ụfọdụ na China, kama iji ígwè eme njem, ọ bụzi ọgba tum tum ụkwụ atọ ka ọtụtụ mmadụ na-enwe mmasị iji eme njem. Na United States, bụ́ ebe pasent 25 nke njem nile a na-eme na-adịghị eru otu maịlụ, ụgbọala ka a na-eji aga pasent 75 nke ebe ndị a na-eteghị aka.

Nkà na ụzụ nke oge a emewo ka e nwee ụmụaka ndị na-anọkarị otu ebe. Otu nnyocha e mere gosiri na ka egwuregwu vidio bịara “na-atọkwu ụtọ, ndị a na-egosi na ha ana-eyikwu ndị dị adị n’ezie, ụmụaka . . . bịaziri na-amụba oge ha na-eji egwu ya.” E kwuwo ihe ndị yiri nke ahụ banyere ikiri TV na ụzọ ndị ọzọ ụmụaka si atụrụ ndụ bụ́ ndị na-achọ na ha ga na-anọ otu ebe.

Ihe Ize Ndụ Ndị Dị n’Ịnọkarị Otu Ebe

Otú ọtụtụ mmadụ si kwụsịzie iji ọkpụkpụ aka ha arụ ọrụ akpatawo ọtụtụ ọrịa anụ ahụ́, nke uche, na nke mmetụta uche. Dị ka ihe atụ, otu ụlọ ọrụ dị na Britain, nke na-ahụ maka ahụ́ ike, kwuru n’oge na-adịbeghị anya, sị: “Ụmụaka ndị na-adịghị emega ahụ́ nọ n’ọnọdụ nke ịbụ ndị onwe ha na-agachaghị na-eju afọ, ndị ga na-enwekarị nchegbu na nchekasị. O yikwara nnọọ ka ụmụaka ndị a hà ga na-ese siga ma na-eji ọgwụ ike eme ihe karịa ụmụaka ndị na-emega ahụ́. Ndị ọrụ na-adịghị emega ahụ́ na-agha ọrụ karịa ndị nke na-emega ahụ́. Mgbe ha katawara ahụ́, ndị na-adịghị emega ahụ́ anaghị enwe ume na ike ha ga-eji na-eme ihe ndị dịịrị ha n’ụbọchị. N’ihi ya, ọtụtụ n’ime ha anaghị enwe ike imere onwe ha ihe, isi adịghịkwa akpakọ ha ọnụ ka ndị nke na-emega ahụ́.”

Cora Craig, bụ́ ọga kpata kpata nke Ụlọ Ọrụ Canada nke Na-eme Nnyocha Banyere Ahụ́ Ike na Otú E Si Ebi Ndụ, kọwara na “ndị Canada anaghịzi emega ahụ́ otú ha sibu emega ma ha na-arụ ọrụ. . . N’ozuzu, ha akwụsịlatawo ịrụ ọrụ a na-emega ahụ́ na ya.” Akwụkwọ akụkọ bụ́ Globe and Mail nke Canada na-akọ, sị: “Ihe dị ka pasent 48 nke ndị Canada buru ibu, gụnyere pasent 15 buru oké ibu.” Akwụkwọ akụkọ ahụ kwukwara na, na Canada, pasent 59 nke ndị toworo eto na-anọkarị otu ebe. Dr. Matti Uusitupa, nke Mahadum Kuopio, nke dị na Finland, dọrọ aka ná ntị na “ọtụtụ mmadụ n’ụwa nile na-arịawanye Ụdị nke Abụọ nke ọrịa shuga n’ihi ibu oké ibu na ịnọkarị otu ebe.”

Na Hong Kong, nnyocha e mere n’oge na-adịbeghị anya gosiri na ihe mere ihe dị ka pasent 20 nke ndị nile dị site afọ 35 gbagowe ji anwụ pụrụ ịbụ n’ihi na ha adịghị emega ahụ́. Nnyocha ahụ, bụ́ nke Prọfesọ Tai-Hing Lam nke Mahadum Hong Kong nọ n’isi ya, bụ́kwa nke e bipụtara n’afọ 2004 n’Annals of Epidemiology, kwuru na “ihe ize ndụ [ndị China bi na Hong Kong] na-enwe n’ihi emegaghị ahụ́ karịrị nke [ha] na-enwe n’ihi ise siga.” Ndị nchọpụta na-ekwu na ‘ọtụtụ n’ime ndị China ndị ọzọ ga-anọ n’ihe ize ndụ n’ihi otu ihe ahụ.’

Nchegbu a a na-enwe ò kwesịrị ekwesị? Emegaghị ahụ́ ọ̀ pụrụ ịkpatara anyị ọrịa, ọbụna karịa otú ise siga ga-esi akpata? E kweere n’ebe nile na e jiri ndị na-adịghị emega ahụ́ tụnyere ndị na-emega ahụ́, ndị na-adịghị emega ahụ́ na-aka enwe ọbara mgbali elu, na-aka arịa ọrịa strok, ọrịa obi, ụdị ọrịa cancer ụfọdụ, na ọrịa ọkpụkpụ. Ha na-akakwa anọ n’ọnọdụ nke ibu oké ibu. *

Magazin bụ́ The Wall Street Journal kọrọ, sị: “Ná mpaghara ụwa ọ bụla, gụnyere ọbụna mba ọtụtụ mmadụ na-adịghị eri nri na-edozi ahụ́, ọnụ ọgụgụ ndị buru ibu ma ọ bụ ndị buru oké ibu anọgidewo na-amụba n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị egwu. Olee isi ihe na-akpata ya? Ọ bụkwa otu iri nri ndị na-enye nnọọ calorie na ịnọkarị otu ebe bụ́ nke merela ka ọtụtụ mmadụ buo ibu na United States.” Dr. Stephan Rössner, bụ́ prọfesọ na-ahụ maka ahụ́ ike n’ụlọ ọrụ Karolinska Institute nke dị na Stockholm, Sweden, kwetara ma kwuokwa, sị: “Ọ dịghị mba ọ bụ n’ụwa nke ọnụ ọgụgụ ndị buru oké ibu na ya na-adịghị amụba amụba.”

Nsogbu Zuru Ụwa Ọnụ

N’ụzọ doro anya, ka ahụ́ wee na-adị anyị mma, ọ dị anyị mkpa ịdị na-emega ahụ́ nke ọma mgbe nile. Ma, n’agbanyeghị ọkwa nile a na-ama banyere ihe ize ndụ dị n’emegaghị ahụ́, ọtụtụ ndị bi n’ụwa ka nọgidere bụrụ ndị na-adịchaghị emega ahụ́. Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Obi kweere na ihe nọ n’agbata pasent 60 na pasent 85 nke ndị bi n’ụwa “adịghị emega ahụ́ otú ga-eme ka ahụ́ dị ha mma, nke ka nke ụmụ agbọghọ na ndị nne nwanyị.” Òtù ahụ kwukwara na “ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ụzọ abụọ n’ụzọ atọ nke ụmụaka adịghị emega ahụ́ otú ga-eme ka ahụ́ dị ha mma.” Na United States, ihe dị ka pasent 40 nke ndị torurula ogo mmadụ na-anọkarị otu ebe, ihe dịkwa ka ọkara nke ndị nọ n’agbata afọ 12 na afọ 21 adịghị eme ihe ndị siri ike mgbe nile.

N’otu nnyocha e mere ná mba 15 dị na Europe banyere ọnụnọ ọtụtụ mmadụ na-anọkarị otu ebe, a chọpụtara na ọnụ ọgụgụ ndị na-adịghị emega ahụ́ si na pasent 43, bụ́ nke e nwetara na Sweden, ruo pasent 87, bụ́ nke e nwetara na Portugal. Na São Paulo, Brazil, ihe dị ka pasent 70 nke ndị bi ná mba ahụ na-anọkarị otu ebe. Òtù Ahụ́ Ike Ụwa (WHO) na-akọ na “ihe ndị a chọpụtara ná nnyocha ndị e mere banyere ahụ́ ike gburugburu ụwa bụ nnọọ otu ihe ahụ.” N’ihi ya, o kwesịghị iju anyị anya na ihe dị ka nde mmadụ abụọ na-anwụ kwa afọ n’ihi ọrịa ndị emegaghị ahụ́ kpatara.

Ndị dọkịta n’ụwa nile na-ele ọnọdụ a anya dị ka nke na-adịghị enye ọnụ okwu. N’ihi ya, ụlọ ọrụ gọọmenti dị iche iche gburugburu ụwa amalitewo ihe omume ndị e bu n’uche iji mee ka ọhaneze mara uru ndị dị n’imega ahụ́ nke ọma. Australia, Japan, na United States na-enwe olileanya na tupu afọ 2010, ọnụ ọgụgụ ụmụ amaala ha ndị ga-amalite imega ahụ́ ga-eji pasent 10 mụbaa. Scotland na-agba mbọ ịhụ na ọkara nke ndị okenye bi na ya ga-amalite imega ahụ́ tupu afọ 2020. Otu akụkọ òtù WHO dere kọwara na “mba ndị ọzọ bụ́ ndị kwuru na ha amalitela ime ka ụmụ amaala ha mara uru dị n’imega ahụ́ bụ Mexico, Brazil, Jamaica, New Zealand, Finland, Russian Federation, Morocco, Vietnam, South Africa, na Slovenia.”

N’agbanyeghị mgbalị gọọmenti na ụlọ ọrụ ahụ́ ike na-eme, e meekwa elu mee ala, ọ bụ onye ọ bụla n’ime anyị ka ọ dị n’aka ilebara ahụ́ ya anya. Jụọ onwe gị, sị, ‘M̀ na-emegharị ahụ́ nke ọma? M̀ na-emega ahụ́ otú ahụ́ m chọrọ? Ọ bụrụ na adịghị m eme otú ahụ, gịnị ka m pụrụ ime iji kwụsị ịdị na-anọkarị otu ebe?’ Isiokwu na-esonụ ga-egosi gị otú ị ga-esi na-emegakwu ahụ́.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 16 Emegaghị ahụ́ pụrụ ime nnọọ ka mmadụ kara nọrọ n’ọnọdụ nke ibute ọrịa ụfọdụ na-egbu mmadụ. Dị ka ihe atụ, dị ka Òtù Na-ahụ Maka Obi n’America si kwuo, mmadụ emegaghị ahụ́ “na-eme ka ohere o nwere ịrịa ọrịa obi jiri okpukpu abụọ mụbaa, na-emekwa ka ohere o nwere inwe ọbara mgbalị elu jiri pasent 30 mụbaa. Ọ na-emekwa ka ohere o nwere ịnwụ n’ihi ọrịa metụtara obi na akwara na ọrịa strok jiri okpukpu abụọ mụbaa.”

[Igbe dị na peeji nke 4]

Ihe Emegaghị Ahụ́ Na-efu

Ọtụtụ ụlọ ọrụ gọọmenti na òtù ahụ́ ike na-enwe nchegbu dị ukwuu banyere ego emegaghị ahụ́ na-efu ọhaneze.

Australia – Ego ole a na-emefu ná mba a kwa afọ n’ihi emegaghị ahụ́ bụ ihe dị ka nde dollar 377.

Canada – Dị ka Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Obi si kwuo, nanị n’ime otu afọ, Canada mefuru ihe karịrị ijeri dollar 2 n’ịgwọ ọrịa ndị “e weere na ọ bụ emegaghị ahụ́ kpatara ha.”

United States – N’afọ 2000, United States mefuru nnukwu ego dị ijeri dollar 76 n’ịgwọ ọrịa ndị emegaghị ahụ́ kpatara.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 5]

Mmega Ahụ́ Dị Ụmụaka Mkpa

Nnyocha ndị e mere n’oge na-adịbeghị anya gosiri na ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu nke ụmụaka adịghị emega ahụ́ mgbe nile. Ọnụ ọgụgụ ụmụ nwanyị na-adịghị emega ahụ́ karịrị nke ụmụ nwoke. O yiri ka ọ na-abụ ụmụaka na-etolite, ha ana-akwụsịlata imega ahụ́. Ihe ndị na-esonụ so n’ọtụtụ uru ụmụaka na-erite site n’imega ahụ́ mgbe nile:

● Ọ na-eme ka ọkpụkpụ na uru ahụ́ ha sie ike, na-emekwa ka nkwonkwo ha na-arụ ọrụ nke ọma

● Ọ na-egbochi ha ibu ibu ma ọ bụ ibu oké ibu

● Ọ na-egbochi ma ọ bụ na-eme ka ha ghara inwe ọbara mgbali elu ngwa ngwa

● Ọ na-egbochi ha inwe Ụdị nke Abụọ nke ọrịa shuga

● Ọ na-eme ka onwe ha ju ha afọ, na-egbochikwa ha inwe nchekasị na nchegbu

● Ọ na-eme ka imega ahụ́ mara ha ahụ́ bụ́ nke ga-egbochi ha ịbụ ndị na-anọkarị otu ebe mgbe ha ga-etoru ogo mmadụ

[Igbe/Foto dị na peeji nke 6]

Ihe Ga-eme Ka Ahụ́ Dịkwuo Ndị Agadi Mma

E kwuwo na ka mmadụ na-eme agadi ka ọ na-anọ n’ọnọdụ ka mma irite uru n’usoro mmega ahụ́ dị mma. N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ ndị agadi adịghị ekwe emega ahụ́ n’ihi ụjọ imerụ ahụ́ ma ọ bụ nke ịda ọrịa. Nke bụ́ eziokwu bụ na ndị agadi kwesịrị ịhụ dọkịta tupu ha amalite imega ahụ́ mgbe nile. Otú ọ dị, ndị ọkachamara kweere na imega ahụ́ pụrụ ime ka ndụ ndị agadi ka mma n’ụzọ dị ịtụnanya. Ihe ndị na-esonụ bụ ụfọdụ n’ime ihe ndị o yiri ka hà ga-aka mma ma ha na-emega ahụ́ mgbe nile:

● Otú ụbụrụ ha si aghọ nkọ

● Otú ụkwụ si esi ha ike n’ala na otú ha si anagide ihe

● Otú obi si eru ha ala

● Otú ha si agbake ngwa n’ọrịa

● Otú afọ na imeju ha si arụ ọrụ

● Otú nri si agbari ha n’ahụ́

● Otú ahụ́ ha si alụso ọrịa ọgụ

● Otú ọkpụkpụ ha siruru n’ike

● Otú ike na-adịru ha