Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ̀ Dị Njọ Inwe Oké Ọchịchọ?

Ọ̀ Dị Njọ Inwe Oké Ọchịchọ?

Echiche nke Bible

Ọ̀ Dị Njọ Inwe Oké Ọchịchọ?

“O LEEDỊ ihe dị njọ n’ịbụ onye a ma ama, ọgaranya, na onye na-achị achị?” Ajụjụ a gbara n’isiokwu bụ́ “Ihe Isi Ike A Na-enwe n’Ịgbaso Ụkpụrụ Omume Ọma,” bụ́ nke otu òtù nke okpukpe guzobere, dere. Isiokwu ahụ zoro aka n’okwu Chineke gwara Ebreham, nke bụ́: “M ga-emekwa gị ka ị ghọọ mba ukwu, M ga-agọzikwa gị, mee ka aha gị dị ukwuu.”—Jenesis 12:2.

Ọ bụ ezie na isiokwu ahụ kwuru na “ihe anyị na-achụso ekwesịghị itinyere ndị ọzọ ájá na garị,” o hotara ihe otu onye rabaị a ma ama na narị afọ mbụ kwuru, bụ́ onye sịrị: “Ọ bụrụ na adịghị m achọ ọdịmma nke onwe m, ònye ga-achọrọ m ya?” Isiokwu ahụ mechiziri site n’ịsị: “Ọ bụrụ na anyị agbasighị mbọ ike iji nwee ihe ịga nke ọma ná ndụ, ọ dịghị onye ga-agbara anyị ya.” Oké ọchịchọ ọ̀ na-etinye ndị na-achọ ijere Chineke ozi n’ọnọdụ amaghị ihe a ga-eme? Olee otú anyị pụrụ isi nwee ihe ịga nke ọma ná ndụ? Ọ̀ dị njọ inwe oké ọchịchọ? Gịnị bụ echiche Bible banyere ya?

Ebreham Ò Nwere Oké Ọchịchọ?

Na Bible, a maara Ebreham dị ka nwoke nwere ezigbo okwukwe. (Ndị Hibru 11:8, 17) Chineke anaghị agba Ebreham ume inwe oké ọchịchọ mgbe o kwere ya nkwa na Ya ga-eme ka ọ ghọọ mba ukwu, meekwa ka aha ya dị ukwuu. Kama ihe Chineke mere bụ ikwupụta nzube ya nke bụ́ isi n’aka Ebreham gọzie ihe a kpọrọ mmadụ, nzube nke karịrị nnọọ ihe oké ọchịchọ nkịtị nke mmadụ pụrụ ime ka e nweta.—Ndị Galetia 3:14.

Ka Ebreham na-egosipụta nsọpụrụ o nwere n’ebe Chineke nọ, ọ hapụrụ ụdị ndụ ihe àmà na-egosi na ọ bụ nke dị ntụsara ahụ́, na nke ọgaranya ọ na-ebi na Ua. (Jenesis 11:31) Mgbe e mesịrị, ka udo wee dị, Ebreham ji ọchịchọ obi ya hapụ nwa nwanne ya bụ́ Lọt ka ọ họrọ akụkụ kasị mma n’ala ahụ ha gara biri na ya. (Jenesis 13:8, 9) Ọ dịtụghị ihe e kwuru na Bible nke gosiri na Ebreham nwere oké ọchịchọ. Kama, okwukwe ya, nrubeisi ya, na ịdị umeala n’obi ya bụ ihe ndị mere ka Chineke hụ ya n’anya dị ka ezigbo “enyi.”—Aịsaịa 41:8.

Echiche Dị Iche Banyere Ọkwá, Ịbụ Onye A Ma Ama, na Onye Na-achị Achị

A na-akọwa oké ọchịchọ dị ka “ịchọsi ike inwe ọkwá, ịbụ onye a ma ama, ma ọ bụ onye na-achị achị.” N’oge ochie, Eze Solomọn nwere ọkwá, bụrụ onye a ma ama, chịakwa ọchịchị, bịakwa baa nnọọ ọgaranya. (Eklisiastis 2:3-9) Ma, ọ dị mma ịmara na ọ chọsighị ha ike tupu ya enweta ha. Mgbe Solomọn nọchisịrị nna ya dị ka eze, Chineke gwara ya ka ọ rịọ ya ihe ọ bụla ọ chọrọ. Solomọn ji obi umeala rịọ Chineke ka o nye ya obi na-anụ ihe na nghọta dị mkpa iji chịa ndị nke Chineke. (1 Ndị Eze 3:5-9) Mgbe e mesịrị, ka Solomọn kọwasịrị ókè o nweruru akụ̀ na ụba na ikike, o kwuru na “ihe nile bụ ihe efu na ịchọ ijide ifufe.”—Eklisiastis 2:11.

Ọ̀ dị ihe ọ bụla Solomọn kwuru banyere ụzọ ụmụ mmadụ pụrụ isi nwee ihe ịga nke ọma ná ndụ? Ee, o nwere otú o si kwuo ya. Mgbe ọ tụlesịrị ọtụtụ ahụmahụ ndị o nwetara ná ndụ, nkwubi okwu ya bụ: “Tụọ egwu Chineke, debekwa ihe nile O nyere n’iwu; n’ihi na nke a bụ ọrụ mmadụ nile.” (Eklisiastis 12:13) Ụmụ mmadụ na-enwe ihe ịga nke ọma ná ndụ, ọ bụghị site n’inwe ọkwá, akụ̀ na ụba, ịbụ ndị a ma ama, ma ọ bụ site n’ịchị ọchịchị, kama ọ bụ site n’ime uche Chineke.

Mmadụ Ịdị Umeala n’Obi Na-eme Ka E Bulie Ya Elu

N’ezie, ọ dịghị ihe dị njọ na mmadụ ịhụ onwe ya n’anya otú kwesịrịnụ. Bible na-enye anyị iwu ịhụ ndị agbata obi anyị n’anya dị ka onwe anyị. (Matiu 22:39) Mmadụ ịchọ ntụsara ahụ́ na obi ụtọ bụ ihe e bu pụta ụwa. Ma Akwụkwọ Nsọ gbakwara anyị ume ịrụsi ọrụ ike na ịdị umeala n’obi. (Ilu 15:33; Eklisiastis 3:13; Maịka 6:8) Ndị na-eme ihe n’eziokwu ma bụrụ ndị a pụrụ ịdabere na ha, bụ́kwa ndị na-arụsị ọrụ ike, na-abụkarị ndị a ma ama, ndị na-enweta ezigbo ọrụ, na ndị a na-akwanyere ùgwù. N’ezie, ịgbaso omume a dị mma karịa irigbu ndị ọzọ iji nweta uru ma ọ bụ iso ndị ọzọ na-azọ ọkwá.

Jizọs dọrọ ndị gere ya ntị aka ná ntị megide iji aka ha na-ahọrọ ebe dị ùgwù mgbe ha bịara oriri alụmdi na nwunye. Ọ dụrụ ha ọdụ ka ha nọrọ n’ebe na-adịghị ùgwù ma chere ka onye kpọrọ ha oriri jiri aka ya gwa ha ka ha gaa nọrọ n’ebe dị ùgwù. N’ịkọwa ụkpụrụ ahụ otú ọ ga-edo anya, Jizọs kwuru, sị: “Onye na-ebuli onwe ya elu, a ga-eweda ya ala, onye na-eweda onwe ya ala, a ga-ebuli ya elu.”—Luk 14:7-11.

Ezi Ndị Kraịst Na-ezere Oké Ọchịchọ

Bible na-egosi na oké ọchịchọ bụ́ nke mpako na-akpata bụ ihe si n’ezughị okè mmadụ pụta. (Jems 4:5, 6) Jọn onyeozi dị mgbe o nwere oké ọchịchọ. Ọ chọsiri nnọọ ike inwe ọkwá nke na ya na nwanne ya nwoke jiiri nkwuwa okwu rịọ Jizọs ka o debe ha n’ọnọdụ dị nnọọ ùgwù n’Alaeze ya. (Mak 10:37) Mgbe e mesịrị, Jọn gbanwere àgwà ya. N’ezie, n’akwụkwọ ozi ya nke atọ, o ji okwu ndị siri ike katọọ Daịọtrefis, bụ́ onye o kwuru na ọ “na-achọ ịnọ n’ọkwá mbụ.” (3 Jọn 9, 10) Ndị Kraịst taa na-agbaso okwu Jizọs ma na-eweda onwe ha ala, n’otu mgbe ahụkwa, na-agbaso ihe nlereanya nke agadi nwoke bụ́ Jọn onyeozi, bụ́ onye mụtara izere àgwà ndị na-egosi oké ọchịchọ.

Otú ọ dị, nke bụ́ eziokwu bụ na mmadụ inwe nkà, ikike, ịbụ onye na-arụ ọrụ ọma, na onye na-arụsi ọrụ ike adịchaghị eme ka e jide n’aka na ọ ga-abụ onye a ma ama. Mgbe ụfọdụ, mmadụ ibe ha na-akwụghachi ha ụgwọ maka omume ndị ahụ, mgbe ụfọdụkwa, ha adịghị akwụghachi ha. (Ilu 22:29; Eklisiastis 10:7) Mgbe ụfọdụ, a pụrụ itinye ndị na-eruchaghị eru n’ọnọdụ ịchịisi, ebe a na-eleghara ndị nke ka ruo eruo anya. N’ụwa a na-ezughị okè, ndị nọ n’ọkwá dị elu na ndị na-achị ọchịchị nwere ike ha abụghị ndị kasị ruo eruo ịnọ n’ọnọdụ ndị ahụ.

Ihe metụtara oké ọchịchọ adịghị etinye ezi Ndị Kraịst n’ọnọdụ amaghị ihe a ga-eme. Akọ na uche ha e ji Bible zụọ na-enyere ha aka izere oké ọchịchọ. Ha na-agbalịsi nnọọ ike ime ike ha nile n’ọnọdụ ọ bụla iji nye Chineke otuto, ma hapụrụ Ya ihe ndị pụrụ isi na ha pụta. (1 Ndị Kọrint 10:31) Ndị Kraịst na-agbalịsi ike inwe ihe ịga nke ọma ná ndụ site n’ịtụ egwu Chineke na idebe ihe nile o nyere n’iwu.

[Foto dị na peeji nke 16, 17]

Chineke ọ̀ gbara Ebreham ume inwe oké ọchịchọ?