Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Achọrọ M Ịmatakwu Banyere Okpukpe M’

‘Achọrọ M Ịmatakwu Banyere Okpukpe M’

‘Achọrọ M Ịmatakwu Banyere Okpukpe M’

MGBE e nyere ha ihe omume n’ụlọ akwụkwọ n’ihe ọmụmụ akụkọ ihe mere eme, otu nwatakịrị nwanyị dị afọ 12, nke aha ya bụ Ciara, bụ́ onye si Florida, U.S.A., họọrọ otu isiokwu na-akpali mmasị ọ ga-ede banyere ya—mkpagbu a kpagburu Ndịàmà Jehova na Nazi Germany. “Ihe mere m ji họrọ isiokwu a bụ n’ihi na achọrọ m ịmatakwu banyere ihe ndị metụtara okpukpe m,” ka o kwuru. “Olileanya m bụ ịmata kpọmkwem ihe Ndịàmà Jehova gabigara n’oge Oké Mgbukpọ ahụ.”

Ka Ciara mesịrị nnyocha nke ọma n’isiokwu ahụ, o ji osisi rụọ otu igbe na-acha purple purple bụ́ nke dị n’ụdị pyramid. Nke a bụ ihe nnọchianya nke purple triangle a dụnyere n’uwe Ndịàmà Jehova yiri n’ogige ịta ahụhụ, iji na-amata ha. Ciara mapawara foto na ihe odide ndị kọwara ha n’akụkụ nile nke igbe ahụ. Ihe ọzọ ọ mapawara na ya bụ akwụkwọ ozi na-awụ akpata oyi n’ahụ́ ma na-ewusi okwukwe ike, nke Wolfgang Kusserow, bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova dere obere oge tupu e gbuo ya.—Lee Ụlọ Nche nke March 1, 1986, peeji nke 14.

Ihe ndị ahụ Ciara mapawara n’igbe a mere ka o doo anya na, n’adịghị ka ndị mkpọrọ ndị ọzọ, Ndịàmà nwere ohere ime nhọrọ: Ọ bụrụ na ha abịanye aka n’akwụkwọ na-egosi na ha agọnahụla okwukwe ha, a ga-atọhapụ ha. Eziokwu ahụ bụ́ na ihe ka ọtụtụ n’ime ha jụrụ ịbịanye aka n’akwụkwọ ahụ bụ ihe àmà na-egosi na Ndịàmà Jehova guzosiri ike n’ezi ihe.

Ciara kwuru na ya ritere uru site n’ịhọrọ ide banyere isiokwu a. O nyeere ya aka n’ezie ịmatakwu banyere okpukpe ya. O kwuru, sị: “N’agbanyeghị na Ndịàmà Jehova nọ na Germany n’oge ahụ ebughị ibu, ha nwere okwukwe siri ike, bụ́ ihe nyeere ha aka ịnagide mkpagbu ndị ha nwetara.”

Ọ bụrụ na ị bụ Onyeàmà Jehova na-eto eto nke na-aga akwụkwọ, è nwere ụzọ ndị gị onwe gị pụrụ isi kọọrọ ndị ọzọ banyere okpukpe gị?