Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ebe Obibi Dị Ọcha Òkè Anyị Nile Na-ekere na Ya

Ebe Obibi Dị Ọcha Òkè Anyị Nile Na-ekere na Ya

Ebe Obibi Dị Ọcha Òkè Anyị Nile Na-ekere na Ya

Site n’aka onye edemede Teta! na Mexico

LEE ihe ọṅụ ọ bụ ibi n’ebe dị ọcha, a na-emetọghị emetọ! Ma, n’ihi otú ikpo ahịhịa sizi ejupụta ebe nile n’obodo ndị mepere emepe, ọ na-esiwanyere anyị ike idebe ebe obibi anyị ọcha na ime ka ọ dị mma n’anya.

Gọọmenti ime obodo na-agbalịsi ike idebe okporo ụzọ ọcha site n’ime ndokwa maka ikpofu ahịhịa. Ma, n’agbanyeghị nke ahụ, a na-enwe ikpo ahịhịa n’ebe ụfọdụ ọ na-adịghị mma n’anya nakwa n’ebe ọ pụrụ ịkpatara ọhaneze ọrịa. Inwe ikpo ahịhịa ebe nile pụrụ ime ka òké, ọchịcha, na ụmụ ahụhụ ndị ọzọ pụrụ ịkpata ọrịa mụbaa. Ọ̀ dị ihe ọ bụla ị pụrụ ime banyere ọnọdụ a? Ee, ihe ị ga-eme bụ idebe ụlọ gị na gburugburu ya ọcha.

Inwe Echiche Ziri Ezi

Ụfọdụ mmadụ na-eche na ụlọ ndị ogbenye ma ọ bụ gburugburu ya apụghị ịdị ọcha. Ma, nke a abụchaghị eziokwu. N’ezie, enweghị ego pụrụ ime ka o sikwuoro anyị ike idebe ebe obibi anyị ọcha. Ma, dị ka otu ilu ndị Spen si kwuo, “ịda ogbenye na ịdị ọcha anaghị ese okwu.” N’aka nke ọzọ, mmadụ inwe ezigbo ego adịghị eme ka e jide n’aka na ọ ga-edebe ebe obibi ya ọcha.

Idebe ime ụlọ na èzí ọcha na-adabere n’inwe echiche ziri ezi bụ́ nke ga-akpali anyị ime ya. N’eziokwu, idebe ụlọ ọcha dabeere nnọọ na mmadụ nile nọ n’ezinụlọ inwe echiche ziri ezi. N’ihi ya, ọ dị mma ịtụle ihe anyị nile pụrụ ime iji mee ka ebe obibi anyị, nakwa gburugburu ya na-adị ọcha.

Usoro A Ga Na-eji Edebe Ụlọ Ọcha Mgbe Nile

O yiri ka ọrụ nne na-arụ n’ụlọ anaghị agwụ agwụ. Ewezụga isi nri na ịkwadebe ụmụ ya ịga akwụkwọ, nne na-arụkwa ọrụ idebe ụlọ na gburugburu ya ọcha. Ị̀ chọpụtawo na ọ bụ nne na-ewepụ uwe ndị ruru inyi ma ọ bụ arịa ndị ụmụ ya ghasara n’ime ụlọ ha? Ime ndokwa doro anya banyere ụzọ mmadụ nile nọ n’ezinụlọ ga-esi na-edebe ụlọ ọcha pụrụ inye aka belata ọrụ nne na-arụ n’ụlọ.

Ụfọdụ ndị nwunye na-ekpebi na e nwere ihe ndị dị n’ụlọ bụ́ ndị ọ dị mkpa ilebara anya ma na-edebe ọcha kwa ụbọchị, nwee ndị a pụrụ ịdị na-edebe ọcha otu ugboro n’izu, nweekwa ndị a pụrụ ịdị na-edebe ọcha otu ugboro n’ọnwa. N’ezie, e nwere ụfọdụ ihe a pụrụ ime ndokwa ka a na-edebe ọcha otu ugboro n’afọ. Dị ka ihe atụ, n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova nke dị ná mba ọ bụla, bụ́ nke a na-akpọ Betel, e mere ndokwa ịdị na-edebe ebe a na-edebe ákwà na ụmụ ihe ndị ọzọ ọcha nke ọma otu ugboro n’afọ. Nke ahụ bụ oge a na-eji atụfusị ihe ndị na-abaghịzi uru ma mee ka ebe ahụ dị mma n’anya. E nwekwara ndokwa e mere maka idebe ahụ́ ụlọ ọcha mgbe nile.

E nwere ebe ndị dị oké mkpa ka a na-edebe ọcha n’ụlọ maka ahụ́ ike, dị ka ebe a na-anọ asa ahụ́ na ụlọ mposi. Ọ bụ ezie na e kwesịrị ịdị na-asa ha kwa ụbọchị, ma ịdị na-asachasi ha ike, ikekwe otu ugbo n’izu, ga-eme ka nje ghara iju na ha. Ụfọdụ na-eche na ọ dịghị ihe ga-eme ka ihe ghara igbu ihe a na-anyụba nsị́ na ya n’ụlọ mposi water system, nakwa na ọ gaghị ekwe omume ịsapụ ya. Ma, e nwere ezinụlọ ndị na-edebe nke ha ọcha nke ọma, na-eme ka ha na-acha gbaaa. Nanị ihe ọ chọrọ bụ ịdị na-asa ya mgbe nile na iji ihe ndị e mepụtara e ji asa ya eme ihe.

Ọ dịkwa mkpa ịdị na-edebe kichin ọcha nke ọma. Ọ bụ ezie na kwa ụbọchị, ị na-asa efere ma na-ehicha stov na elu tebụl ị na-anọ esi nri, ọ dịkwa mkpa ka ị na-ehicha azụ kọbọd, azụ friji, na ebe ndị ọzọ nke ọma site n’oge ruo n’oge—ikekwe otu ugbo n’ọnwa ma ọ dịkarịa ala. Ihicha ebe a na-edebe nri ma ọ bụ kọbọd ugboro ugboro ga-eme ka ọchịcha na ụmụ ahụhụ ndị ọzọ dị ize ndụ ghara iji ha mere ebe obibi.

Ihe Ezinụlọ Na-agbakọ Aka Eme

Ụfọdụ ndị nne na nna enyewo ụmụ ha iwu na ọzụzụ nke na tupu ha agaa akwụkwọ n’ụtụtụ, ha na-edozi ihe ndina ha nke ọma, debe uwe ha ndị ruru unỵí ebe ha kwesịrị ịdị, ma hazie ngwongwo ha otú ọ ga-adị mma n’anya. Ụkpụrụ dị mma onye ọ bụla kwesịrị ịgbaso bụ nke a, “Ihe ọ bụla kwesịrị inwe ọnọdụ, e kwesịkwara idebe ihe ọ bụla n’ọnọdụ ya.”

Ọzọkwa, a pụrụ ikenye ụfọdụ ndị nọ n’ezinụlọ ọrụ ụfọdụ dị n’ụlọ ma ọ bụ kenye ha ebe ha ga na-edebe ọcha n’ụlọ. Dị ka ihe atụ, ọ̀ bụ onye bụ́ nna na-ahụ na ihe ndị dị n’ebe a na-adọba ụgbọala dị n’ọnọdụ ha ma na-edebe ya ọcha nke ọma, ọ dịkarịa ala otu ugboro n’afọ? Otu n’ime ụmụ ya ọ̀ pụrụ inyere ya aka ime nke a? Ònye ka ọ bụ ọrụ ya ịbọchasị ahịhịa ndị dị n’ihu ụlọ ma ọ bụ ịsụchasị ahịhịa ndị dị gburugburu ụlọ? Ugboro ole ka a ga na-eme nke a iji hụ na ihu ụlọ unu na-adị mma n’anya? Ùnu nwere ebe a na-akwasa ngwongwo n’ụlọ, bụ́ nke ọ dị mkpa ka a na-enyocha mgbe nile iji na-ebupụ ngwongwo ndị na-abaghị uru ma na-eme ka ọ dị ọcha? Ọ bụrụ na unu nwere ya, ònye ga-edebe ya ọcha? Ụfọdụ ndị nne na nna na-ekenye ụmụ ha ọrụ ndị dị otú ahụ, na-eme onye a rụọ nke a taa, n’oge ọzọ onye ọzọ arụọ ya.

Ya mere, guzobe usoro dị mma unu ga na-agbaso iji na-edebe ebe obibi unu ọcha mgbe nile. Ma ị̀ na-eji aka gị edebe ebe obibi gị ọcha, ma ọ̀ bụ gị na ndị ezinụlọ gị na-eme ya, ma ọ bụkwanụ na ị na-ego mmadụ ọrụ imere gị ya, ọ dị mkpa ka i nwee usoro doro anya ị ga na-agbaso iji na-edebe ebe obibi gị ọcha. Otu nne nke na-edebe ebe obibi ya ọcha nke ọma gwara anyị otú onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ ya si enye aka n’idebe ụlọ ha ọcha, sị: “Mụ na ụmụ m nwanyị atọ na-eke ọrụ dị n’ụlọ eke. Ọrụ Norma Adriana bụ idebe palọ, ọnụ ụlọ abụọ a na-anọ ehi ụra, veranda, na mbara èzí ọcha. Ana Joaquina nwe idebe kichin ọcha. Mụ onwe m nwe ịsa ákwà na ime ihe ndị ọzọ, ebe María del Carmen nwe ịsa efere.”

Ime Ka Mbara Èzí Dị Mma n’Anya

Gịnịkwanụ banyere mbara èzí? Ma ì bi n’ụlọ ndị oké ozu ma ì bi n’obere ụlọ, ọ dị mkpa ịdị na-edebe mbara èzí ya ọcha mgbe nile ma na-edozi ya edozi. Dị ka ihe atụ, ọ pụrụ ịbụ na otu n’ime inchis nke ọnụ ụzọ ámá dị n’ogige ụlọ unu agbakapụla. Ị ma otú ọnụ ụzọ ámá ahụ ga-adịru njọ n’anya ma ọ bụrụ na a rụzighị ya ruo mgbe ọ ga-agbakapụsị. A pụrụ ikwu otu ihe ahụ banyere ikpo ahịhịa a hapụrụ n’ihu ụlọ ma ọ bụ n’akụkụ ụlọ. Ọzọkwa, mgbe ụfọdụ, a na-atụsasị kom kom, ngwá ọrụ, na ihe ndị ọzọ n’èzí n’ụzọ na-adịghị mma n’anya. Ihe ndị a pụrụ ịghọrọ òké na ụmụ ahụhụ dị iche iche ebe obibi.

Ụfọdụ ezinụlọ ekpebiwo na otu ugboro n’ụbọchị ma ọ bụ otu ugboro n’izu, dị ka mkpa si dị, ha ga na-aza ma na-edebe mbara èzí ha ọcha, gụnyere akụkụ ụlọ ha na ọbụna ihu ụlọ ha. Ọ bụ eziokwu na n’ebe ụfọdụ, gọọmenti nwere nnọọ ezigbo ndokwa e ji edebe gburugburu ebe obibi ọcha, ma a bịa n’ebe ndị ọzọ, e nweghị ndokwa dị otú ahụ. Obi abụọ adịghị ya na ọ bụrụ na anyị nile na-ekere òkè n’idebe ebe obibi anyị ọcha, ọ ga-adị nnọọ mma n’anya karị ma mekwuo ka anyị na-enwe ezi ahụ́ ike.

Ọ bụghị nanị na ụfọdụ ezinụlọ nwere usoro ha na-agbaso iji na-arụ ọrụ ndị ha nwere n’ụlọ, bụ́ ndị e kwuru banyere ha n’elu, kamakwa, ha na-edepụta ya edepụta ma mapawa ya ebe mmadụ nile pụrụ ịhụ ya ma na-agbaso ya. Nke a pụrụ ịba nnọọ uru. N’eziokwu, anyị ekwuchaghị ihe nile i kwesịrị ịmara banyere idebe ihe ọcha. Dị ka ihe atụ, ọ dị gị mkpa ikpebi ụdị kemikal e ji edebe ihe ọcha bụ́ nke kasị kwesị ekwesị iji na-eme ihe n’ógbè i bi. Ọ dịkwa gị mkpa ikpebi ụdị ngwá ọrụ ị pụrụ ịzụta iji na-edebe ihe ọcha, dabere n’ókè akpa gị hà.

Obi abụọ adịghị ya na aro ole na ole a a tụrụ ga-eme ka mmadụ nile nọ n’ezinụlọ gị mara mkpa ọ dị ịnọgide na-edebe ebe obibi unu na gburugburu ya ọcha. Chetakwa na ihe ga-ekpebi ma ùnu ga na-edebe ụlọ unu na gburugburu ya ọcha bụ echiche ziri ezi unu nwere, ọ bụghị ego ole unu nwere.

[Igbe dị na peeji nke 20, 21]

Usoro Dị Mma Iji Na-edebe Ebe Obibi Ọcha

N’oghere ahụ fọdụrụnụ, denye ihe ndị ọzọ ị ga na-eme iji na-edebe ebe obibi gị ọcha

Ihe ịrịba ama dị mkpa: Ịgwakọta kemikal ndị e ji edebe ihe ọcha pụrụ ịdị nnọọ ize ndụ, nke ka nke ịgwakọta bleach na ammonia

Kwa Ụbọchị

❏ Ọnụ ụlọ ihi ụra: Na-edozi ihe ndina gị, na-edebekwa ihe nile dị na ya n’ọnọdụ ha

❏ Kichin: Na-asa efere na ebe a na-asa efere. Hụ na ngwongwo adịghị eju n’elu tebụl a na-anọ esi nri. Zaa ma ọ bụ jiri mmiri hichaa ala kichin ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa

❏ Ụlọ ịsa ahụ́ na ụlọ mposi: Na-asa ebe ndị ahụ nke ọma. Na-edebe ihe ndị dị na ha n’ọnọdụ ha

❏ Palọ na ọnụ ụlọ ndị ọzọ: Na-edebe ihe ndị dị na ha n’ọnọdụ ha. Na-ehicha oche ehicha. Zaa ma ọ bụ jiri mmiri hichaa ala ha ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa

❏ Ụlọ ahụ dum: Na-ekpofu ahịhịa ndị dị na ha

Kwa Izu

❏ Ọnụ ụlọ ihi ụra: Na-agbanwe ákwà ị na-atụ n’ihe ndina. Zaa ma ọ bụ jiri mmiri hichaa ala ya ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa. Tichasịa oche dị na ya

❏ Kichin: Saa stov, elu tebụl a na-anọ esi nri, na ebe a na-anọ asa ihe. Jiri mmiri hichaa ala ya

❏ Ụlọ ịsa ahụ́ na mposi: Saa ahụ́ ájá ya na ihe nile dị na ya. Jiri ọgwụ nje saa ụlọ mposi na ihe ndị ọzọ dị na ya. Gbanwee ákwà e ji ehicha aka. Zaa ma ọ bụ jiri mmiri hichaa ala ya

Kwa Ọnwa

❏ Ụlọ ịsa ahụ́: Saa ahụ́ ájá ya nile nke ọma

❏ Ụlọ ahụ dum: Hichaa ọnụ ụzọ ya nile. Hichaa oche nke ọma

❏ Ubi fụlawa, mbara èzí, ebe a na-adọba ụgbọala: Zaa ma debe ha ọcha ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa. Ekwela ka ahịhịa ma ọ bụ ihe ndị na-abaghịzi uru jupụta na ha

Kwa Ọnwa Isii

❏ Ọnụ ụlọ ihi ụra: Debe ákwà a na-atụ n’ihe ndina ọcha dị ka ntụziaka nke ndị mere ya si dị

❏ Kichin: Wepụsịa ihe ndị dị na friji ma hichaa ya nke ọma

❏ Ụlọ ịsa ahụ́ na ụlọ mposi: Debe ha ọcha nke ọma. Tụfuo ihe ndị na-adịghịzi mkpa ma ọ bụ ihe ndị na-abaghịzi uru dị na ya

❏ Ụlọ ahụ dum: Hichaa oriọna, fan, na bọlb ọkụ eletrik. Hichaa ọnụ ụzọ. Saa windo ya nile

Kwa Afọ

❏ Ọnụ ụlọ ihi ụra: Wepụtasịa ihe ndị dị n’ebe a na-ekowe ákwà ma debe ya ọcha nke ọma. Tụfuo ihe ndị na-abaghịzi uru dị na ya. Saa blanket e ji ehi ụra. Tichasịa matarasị nke ọma. Debe pilo ọcha dị ka ntụziaka nke ndị mere ya si dị

❏ Kichin: Wepụtasịa ihe ndị dị na shelf, kọbọd, na drọwa ma hichaa ebe ndị a nke ọma. Kpofuo ihe ndị na-abaghịzi uru dị na ha. Bupụsịa ngwá ndị e ji esi nri iji nwee ike ihichasị elu ha ma ọ bụ ala ebe ha dị nke ọma

❏ Ụlọ ahụ dum: Saa ahụ́ ájá ya nile. Debe oche na ákwà mgbochi nile ọcha dị ka ntụziaka nke ndị mere ha si dị

❏ Ebe a na-adọba ụgbọala ma ọ bụ ebe a na-akwasa ngwongwo: Zaa ha nke ọma. Hazie ihe ndị dị na ha nke ọma ma ọ bụ kpofuo ihe ndị na-abaghịzi uru dị na ha

[Foto ndị dị na peeji nke 22]

“Ihe ọ bụla kwesịrị inwe ọnọdụ, e kwesịkwara idebe ihe ọ bụla n’ọnọdụ ya”

[Foto ndị dị na peeji nke 22]

Ọ pụrụ ịbara gị uru inye ndị ọzọ ihe ndị ị na-ejighịzi eme ihe