Ikiri Ụwa
Ikiri Ụwa
Ọ̀ Bụ Mahadum Kasị Ochie n’Ụwa?
Ìgwè ndị Poland na ndị Ijipt bụ́ ndị ọkà banyere ihe mgbe ochie achọpụtawo ebe mahadum Alexandria, Ijipt, nke oge ochie dị. Dị ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Los Angeles Times si kwuo, ndị ọkà mmụta ahụ hụrụ ụlọ nzukọ 13 a na-anọ amụ ihe—ndị há nhata. Ha nile pụkwara ịba puku ụmụ akwụkwọ ise. Akwụkwọ akụkọ ahụ kwuru na n’ụlọ nzukọ ndị a, “e nwere ebe ndị dị ka steepụ a na-anọdụ ala n’akụkụ ya atọ, mgbe ụfọdụ ha na ibe ha na-emetụ n’ebe isi isi ha ma mee ka ha yie mkpụrụ akwụkwọ bụ́ ‘U.’” N’etiti ya, e nwere oche dị nnọọ elu, ikekwe ọ bụ oche a rụrụ maka onye nkụzi. “Nke a bụ nke mbụ ya a chọtatụrụla ọtụtụ ụlọ nzukọ ọmụmụ ihe n’ala Gris na Rom, n’ógbè Mediterenian dum,” ka ọkà n’ihe banyere ihe mgbe ochie bụ́ Zahi Hawass kwuru, bụ́ onyeisi nke Kansụl Ukwu nke Ijipt nke Na-ahụ Maka Ihe Mgbe Ochie. Hawass kọwara na ọ bụ “ma eleghị anya, mahadum kasị ochie n’ụwa.”
Ice Cream E Ji Galik Eme?
Ọ dịla anya e kwuwere okwu ọma banyere galik n’ihi otú o si agwọ ọrịa. Ugbu a, mahadum bụ́ Mariano Marcos State University nke dị n’ebe ugwu Philippines ejirila galik na-eme ice cream maka “ahụ́ ike,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Philippine Star na-akọ. A na-atụ anya na ice cream ọhụrụ a pụrụ ịbara ndị nwere nsogbu ndị a na-ekwu na galik na-agwọ uru. Ụfọdụ n’ime nsogbu ndị a bụ azụ̀zụ̀, ahụ́ ọkụ, ọbara mgbali elu, nsogbu iku ume, ụta ngwere, onye agwọ tara, ọrịa ezé, ụkwara nta, ụkwara tịkọ tịkọ, ọnyá, na ọbụna isi nkwọcha. N’ihi ihe ndị a nile, ọ̀ dị onye chọrọ ice cream e ji galik mee?
Ógbè Arctic—E Nwere Oge Ala Ndị Dịdebere Ya Bụ Ala Okpomọkụ
Otu ìgwè ndị ọkà mmụta sayensị si mba dị iche iche, bụ́ ndị nọworo na-egwu ala n’ala Oké Osimiri Arctic, n’agbata Siberia na Greenland, na-ekwu na e nwere oge ala ndị dịdebere ya bụ ala okpomọkụ. Ìgwè ndị ọkà mmụta sayensị ahụ ji ngwá nkà na ụzụ atọ bụ́ ọkpọka, bụ́ ndị e ji agbawa nkume ice, mee ihe n’oge ha na-eme nchọpụta ahụ. Ha nwetakwara ihe ndị ha ji mee nnyocha n’ime ala, n’ebe fọrọ nke nta ka o ruo mita 400 site n’ala oké osimiri ahụ. Anụ mmiri na ahịhịa mmiri ndị nwụrụla eri ọtụtụ narị afọ gara aga, bụ́ ndị ha gwutere n’ala oké osimiri ahụ, na-egosi na ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ nke oké osimiri ahụ nwere oge ọ dị ihe dị ka 20 degree Celsius, kama ịdị -1.5 degree Celsius, bụ́ nke ọ dị ugbu a. Dị ka Prọfesọ Jan Backman nke Mahadum Stockholm, bụ́ onye ụlọ ọrụ BBC News hotara okwu ya, si kwuo, “a ga-atụleghachi ihe a kọrọ banyere otú Ógbè Arctic dị n’oge gboo, dabere n’ihe ndị ọkà mmụta sayensị gwupụtara n’ala oké osimiri ahụ ná nchọpụta a ha gara.”
Bọọdụ Kọmputa Abatala n’Ụlọ Akwụkwọ
N’ihe karịrị klas 21,000 e nwere n’ụlọ akwụkwọ praịmarị ndị dị na Mexico, e jirila bọọdụ e jikọtara ya na kọmputa dochie anya ugbo ojii, chọọkụ, na nchicha, bụ́ ndị e ji na-eme ihe n’ụlọ akwụkwọ kemgbe ụwa, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ El Universal nke Mexico City na-akọ. Ka ọ dị ugbu a, ọ bụ ndị nọ na klas nke ise na nke isii n’ụlọ akwụkwọ praịmarị ji bọọdụ a, bụ́ nke fọrọ obere ka o ruo mita abụọ n’ogologo nakwa otu mita n’obosara, eme ihe. E nwere akwụkwọ asaa e tinyere na kọmputa bụ́ ndị e ji akụzi akụkọ ihe mere eme, sayensị, mgbakọ na mwepụ, ọdịdị mbara ala, na ihe ọmụmụ ndị ọzọ. A pụkwara igosi vidio na bọọdụ ahụ. N’ihi ya, ụmụ akwụkwọ nọ na klas nke otu onye nkụzi “ahụla pyramid nke Tikal na Palenque, ha ahụwokwa ọdịnala ndị Maya, ma gee egwu [ha].” Olee uru dị na ya? “Ụmụaka na-ege ntị nke ọma karị, na-amụta ihe, ma na-ekere òkè n’ihe ọmụmụ ndị ahụ karị,” ka onye nkụzi ahụ kwuru.
Otu Nde Mmadụ Na-egbu Onwe Ha Kwa Afọ
Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọkara nke ndị nile nwụrụ ọnwụ ike n’ụwa nile bụ ndị ji aka ha gbuo onwe ha. Ihe ruru otu nde mmadụ na-egbu onwe ha kwa afọ. Nke a karịrị ọnụ ọgụgụ ndị nwụrụ n’agha na ndị e gburu egbu n’afọ 2001. N’ime otu onye gburu onwe ya, e nwere ihe dị n’agbata mmadụ 10 na mmadụ 20 bụ́ ndị chọrọ igbu onwe ha ma ha egbughịzi onwe ha. Ọ bụ Òtù Ahụ́ Ike Ụwa (WHO), nke isi ụlọ ọrụ ya dị na Geneva, Switzerland, nyere ọnụ ọgụgụ a. Òtù WHO mere ka ọ pụta ìhè na mgbe ọ bụla mmadụ gburu onwe ya, “a na-enwe ọtụtụ ndị òtù ezinụlọ na ndị enyi ọnwụ onye ahụ kpataara obi mgbawa, nsogbu akụ̀ na ụba, na nsogbu ná mmekọrịta ha na mmadụ ibe ha.” Òtù ahụ kwuru na ihe ndị na-eme ka mmadụ ghara igbu onwe ya bụ “mmadụ iji onwe ya kpọrọ ihe,” mmadụ ịbụ onye ezinụlọ ya na ndị enyi ya na-akwado, mmadụ inwe mmekọrịta kwụ chịm, na mmadụ iji okpukpe ya ma ọ bụ ihe ime mmụọ kpọrọ ihe.
Ịdọ Aka ná Ntị Banyere Ájá Ifufe Na-ebu
Iji ụgbọala jip aga n’ọzara “emewo ka ájá ifufe na-ebu n’ụwa mụbaa okpukpu iri, na-emebikwa gburugburu ebe obibi ma na-akpatara ụmụ mmadụ ọrịa,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Times nke London na-ekwu. Ụgbọala ndị a na-emebi ala ọzara, bụ́ nke na-esighị ike, na-eme ka ikuku nwee ike iburu ájá ndị dị na ya. “Ọnụ ọgụgụ ụgbọala ndị a, bụ́ ndị na-agba n’ọzara ugbu a, karịrị nnọọ akarị,” ka Prọfesọ Andrew Goudie, nke Mahadum Oxford kwuru. “N’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, ndị na-akpa anụ, bụ́ ndị na-ejibu kamel aga, na-ejizi ụgbọala jip akpa anụ ha.” Goudie na-adọ aka ná ntị na ọ bụghị nanị na ụgbọala ndị a na-ekpoli ájá ma ha na-agba n’ọzara, “ọgwụ ahịhịa na ọgwụ ahụhụ ndị dị n’ala a na-akọ ugbo nakwa n’ebe e nweburu ọdọ mmiri, na-eso ájá ndị a ikuku na-eburu apụ.” Ikuku ọgwụ ndị a dị na ha anaghị adị mma n’ahụ́, ụmụ nje ndị pụrụ ịkpata ọrịa na-adịkwa na ha. Ndị na-ahụ maka gburugburu ebe obibi na-enwe nchegbu na ebe ụfọdụ n’Africa pụrụ inwe nsogbu yiri nke ikuku ájá ahụ e nwere n’afọ ndị 1930 na United States, nke ihe kpatara ya bụ oké ọkọchị na ịkọ ihe n’ala gabiga ókè, bụ́kwa nke bibiri ala ahịhịa ndị dị ná mba ahụ.
Ndị Na-arị Ugwu Na-akwụ Ụgwọ Akpachapụghị Anya
Kwa afọ, ọtụtụ narị mmadụ na-anwụ ka ha na-arị ugwu. Ihe na-egbu ụfọdụ bụ oké nkume ịdakwasị ha ma ọ bụkwanụ ọrịa ha na-atụghị anya ya, dị ka ọrịa obi. Ma, dị ka akwụkwọ akụkọ ndị Germany bụ́ Leipziger Volkszeitung si kwuo, otu n’ime ihe ndị kasị egbu ndị mmadụ n’ugwu bụ akpachapụghị anya. Ọ bụghị nanị ndị na-eto eto na ndị na-enweghị ahụmahụ na-enwe nsogbu ahụ. Dị ka Miggi Biner, bụ́ ọga kpata kpata nke Òtù Na-ahụ Maka Ịrị Ugwu na Zermatt, Switzerland si kwuo, “ma ndị nwere ahụmahụ ma ndị na-enweghị—ọtụtụ mgbe, ihe na-akpata ya na-abụ mmadụ ịtụkwasị onwe ya obi gabiga ókè ma ọ bụ egeghị ntị nke ọma banyere ọnọdụ ihu igwe na ihe ndị ọzọ.” Obi na-esi ụfọdụ ndị ji ekwe ntị arị ugwu ike n’ụzọ na-enweghị isi na ụgbọelu helikọpta ga-abịa buru ha ozugbo ma ha nwee nsogbu.
Ajọ Ebili Mmiri A Na-atụghị Anya Ya
A na-ekwu na, ná nkezi, nnukwu ụgbọ mmiri abụọ na-ekpu n’ebe ụfọdụ n’ụwa kwa izu. Ọbụna nnukwu ụgbọ mmiri ndị na-ebu mmanụ na ndị na-ebu ngwa ahịa bụ́ ndị na-eru ihe karịrị mita 200 n’ogologo, ekpuwokwa n’oké osimiri. E kweere na ọ bụ ajọ ebili mmiri kpatara ọtụtụ n’ime ọdachi ndị a. Ọ dịla anya e bidoro ile akụkọ banyere ebili mmiri ndị ogo ha dị elu, bụ́ ndị pụrụ ikpu nnukwu ụgbọ mmiri, anya dị ka akụkọ ifo nke ndị ọkwọ ụgbọ mmiri. Otú ọ dị, otu nnyocha Njikọ nke Mba Ndị Dị na Europe mere emeela ka e kwetawa akụkọ ndị ahụ. E ji ígwè satellite see oké osimiri iji seta ajọ ebili mmiri. Dị ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Süddeutsche Zeitung si kwuo, onyeisi ndị nchọpụta ahụ, bụ́ Wolfgang Rosenthal, na-ekwu, sị: “O dowo anyị anya na ajọ ebili mmiri na-eme ugboro ugboro karịa ka e chere.” N’ime izu atọ, ha chọpụtara, ọ dịkarịa ala, ajọ ebili mmiri iri. Ebili mmiri dị otú ahụ na-akwụ ọtọ, ọ pụrụ ịdị elu ruo mita 40, ọ pụkwara ịgbawa ụgbọ, na-emebi ihe dị ukwuu na ya ma ọ bụ ọbụna mee ka o kpuo. Ọ bụ ụgbọ mmiri ole na ole pụrụ iguzogide ya. “Ugbu a, anyị aghaghị ịchọpụta ma à pụrụ ịmata mgbe ebili mmiri ndị a ga-eme tupu ha emee,” ka Rosenthal na-ekwu.