Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mmadụ Ịchọ Onye Ọ Ga-alụ n’Intanet Ọ̀ Pụrụ Ịdị Ize Ndụ n’Ezie?

Mmadụ Ịchọ Onye Ọ Ga-alụ n’Intanet Ọ̀ Pụrụ Ịdị Ize Ndụ n’Ezie?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Mmadụ Ịchọ Onye Ọ Ga-alụ n’Intanet Ọ̀ Pụrụ Ịdị Ize Ndụ n’Ezie?

“N’Intanet, ị pụghị n’ezie ịma onye gị na ya na-ederịta ozi.”—Dan, bụ́ onye dị afọ 17. *

“Ndị mmadụ pụrụ ịgha ụgha n’Intanet. Ọ dị mfe mmadụ ikwu na ya bụ ihe ọ na-abụghị.”—George, bụ́ onye dị afọ 26.

Ị CHỌ di ma ọ bụ nwunye n’Intanet anọgidewo na-aghọ ihe na-ewu ewu n’ụwa nile. Dị ka isiokwu bụ ụzọ n’usoro isiokwu a si kwuo, ndị mmadụ na-eji ọsọ ekwe nkwa ọlụlụ n’Intanet, ma mgbe ha hụrụ onwe ha ihu na ihu, egwú adagharịa. * Ma, enwere ihe na-akpata nchegbu na ya karịa ihe agaghị ka e si chee ya. Isi otú a achọ onye ị ga-alụ pụrụ itinye gị n’oké ihe ize ndụ—ma ọ́ bụghị n’ụzọ nkịtị, ọ bụrụ n’ụzọ mmetụta uche, ma ọ bụ n’ụzọ ime mmụọ.

Olee otú kọmputa dị n’ime ụlọ gị—bụ́ ihe yiri nnọọ ka ọ pụghị itinye mmadụ ná nsogbu—pụrụ isi tinye gị n’ihe ize ndụ? Ụfọdụ n’ime ihe ize ndụ dị na ya metụtara otu ụkpụrụ dị mkpa dị na Bible. Pọl onyeozi dere, sị: “Anyị na-achọ ịdị na-eme ihe n’eziokwu n’ihe nile.” (Ndị Hibru 13:18) Ihe a na-ekwu ebe a abụghị na iji Intanet eme ihe bụ mmadụ emeghị ihe n’eziokwu ma ọ bụkwanụ na mmadụ iji Intanet eme ihe ga-eme ka ọ bụrụ onye na-adịghị eme ihe n’eziokwu. Otú ọ dị, anyị aghaghị ikweta na ndị ọzọ adịkebeghị eme ihe n’eziokwu nakwa na, dị ka e kwuru ná mmalite isiokwu a, Intanet yiri ka ọ̀ na-eme ka ụdị aghụghọ ụfọdụ bụrụ ihe dịkwu mfe na ihe sikwuru ike nchọpụta. A bịakwa n’ikwu okwu ọlụlụ, emeghị ihe n’eziokwu na-abụ ihe dị nnọọ ize ndụ.

Dị ka ihe atụ, rịba ama ụdị emeghị ihe n’eziokwu a kọwara n’amaokwu Bible a: “Mụ na mmadụ efu anọkọghị; mụ na ndị ihu abụọ [“ndị na-ezochi ihe ha bụ,” NW] adịghị abakọkwa.” (Abụ Ọma 26:4) Gịnị ka e bu n’uche mgbe e kwuru “ndị na-ezochi ihe ha bụ”? Dị ka otu akwụkwọ si kwuo, a pụrụ iji okwu a mee ihe banyere “ndị na-ezochiri ndị ọzọ nzube ma ọ bụ atụmatụ ha, ma ọ bụkwanụ ndị na-ezochi ihe bụ́ àgwà na nzube ha.” Olee otú ndị mmadụ si aghọ aghụghọ dị otú ahụ n’Intanet? Oleekwa ihe ize ndụ nke a bụụrụ ndị na-achọ onye ha ga-alụ?

Nkịta Ọhịa Ndị Na-eyi Ihe Mgbokwasị Atụrụ

Ụjọ bịara otu nna aha ya bụ Michael mgbe ọ nụrụ n’otu nzukọ ọmụmụ ihe na ọtụtụ ụmụaka adịghị ege ntị n’iwu ndị mụrụ ha na-enye ka ha ghara ịga n’ebe ndị dị ize ndụ n’Intanet. O kwuru, sị, “Ihe kadị wụọ m akpata oyi n’ahụ́ bụ ịchọpụta na ọbụna ndị na-edina ụmụaka pụrụ iji Intanet rata obere ụmụaka iso ha nwee mmekọahụ rụrụ arụ.” Mgbe ndị na-eto eto ji Intanet emete enyi, ha pụrụ ịnọ n’ihe ize ndụ karịa nnọọ ka ha chere.

N’eziokwu, e nweela akụkọ banyere ndị okenye na-eme ka hà bụ ndị na-eto eto, ka ha na-awagharị n’Intanet na-achọ ndị na-eto eto ha ga-arata ka ha na ha nwee mmekọahụ. Dị ka otu nnyocha e mere gosiri, “a gwala otu onye n’ime ụmụaka ise na-eji Intanet eme ihe ka ha bịa nwee mmekọahụ.” Otu akwụkwọ akụkọ kwukwara na e sila n’Intanet gwa 1 onye n’ime ụmụaka 33 nọ n’agbata afọ 10 na afọ 17 okwu “n’ụzọ gabigara ókè” iji mee ka ha kwere inwe mmekọahụ.

Ụfọdụ ndị na-eto eto achọpụtala, n’ụzọ juru ha anya, na “onye ntorobịa” ahụ ha na ya na-ebido ikwu okwu ọlụlụ n’Intanet bụ onye merela okenye nke nọ mkpọrọ. Ndị ọzọ na-eto eto esorola ndị na-arata mmadụ iso ha nwee mmekọahụ na-akpakọrịta n’amaghị ama. Ndị ọjọọ a na-ebu ụzọ rie obi onye ha na-achọ iji mere anụ oriri site n’iso ya na-akparịta ụka dị ka enyi n’Intanet, iji mee ka ọ tụkwasị ha obi. Ma, ka oge na-aga, ha na-achọ ka ha na onye ahụ hụ ihu na ihu ka ha wee nwee ike imezu ọchịchọ ha rụrụ arụ. N’ụzọ dị mwute, e tiwo ndị na-eto eto ihe, dina ha n’ike, ọbụnakwa gbuo ha n’ihi ya.

N’eziokwu, ndị ajọ mmadụ “na-ezochi ihe ha bụ” iji chọta ndị ha ga-eji mere anụ oriri n’Intanet. Ndị dị otú ahụ, bụ́ ndị ji ndị ọzọ emere anụ oriri, pụrụ ichetara gị ihe atụ Jizọs banyere ndị amụma ụgha, bụ́ ndị “na-eyi ihe mgbokwasị atụrụ abịakwute unu” ma n’eziokwu ha bụ “nkịta ọhịa agụụ ji.” (Matiu 7:15) Mmadụ iso onye ọ na-amaghị na-enwe mkparịta ụka n’Intanet pụrụ ime ka ọ fọ nke nta ka ọ ghara ikwe omume ịchọpụta aghụghọ dị otú ahụ. George, bụ́ onye e hotara ihe o kwuru na mbụ kwuru, sị, “Mgbe gị na mmadụ na-ekwurịta okwu ihu na ihu, ihu ya na ụda olu ya pụrụ ịgwa gị ihe ụfọdụ banyere onye ahụ. Ma n’Intanet, ị pụghị ịhụ ihe ndị ahụ. Ọ dị mfe ịghọgbu gị.”

N’ezie, amamihe dị na ndụmọdụ Bible bụ́: “Onye nwere ezi uche ahụwo ihe ọjọọ, wee zobe onwe ya: ma ndị na-enweghị uche agabigawo, e wee rie ha nha.” (Ilu 22:3) N’eziokwu, ọ bụghị onye ọ bụla i zutere n’Intanet bụ anụ ndọgbu. Ma, ọ dịkwa ụzọ ndị ọzọ ndị mmadụ si ‘ezochi ihe ha bụ.’

Ihe Ize Ndụ Ndị Dị n’Aghụghọ na Izochi Ihe

Ọ bụghị ihe ijuanya na otu ihe ndị na-achọ onye ha ga-alụ n’Intanet na-emekarị bụ ikwu ihe na-abụghị eziokwu banyere onwe ha ma ọ bụ ime ka à ga-asị na ha nwere àgwà ndị dị mma ma na-ezochitụ ma ọ bụ na-ezochicha omume ọjọọ ndị ha nwere. Ọzọkwa, akwụkwọ akụkọ bụ́ The Washington Post kwuru na otu onye edemede kwuru, sị: “Mmadụ ịchọ onye ọ ga-alụ n’Intanet pụrụ ịdị njọ n’ihi na a na-aghọgbu ndị mmadụ na ya.” O kwukwara, sị: “Ndị mmadụ na-ekwukarị na ha bụ nwanyị ebe ha bụ nwoke. . . . Ha na-ezochi ihe ndị metụtara ọnọdụ akụ̀ na ụba ha, . . . agbụrụ ha, mpụ ha merela, ọrịa uche ha rịatụrụla, na di ma ọ bụ nwunye ha lụrụla mbụ, ruo mgbe ha bamiri ime ná mmekọrịta ahụ.” Iji dọọ ndị ọzọ aka ná ntị, ọtụtụ mmadụ akọọla ahụmahụ ndị dị mwute ha nwere nke ịbụ ndị ndị ha na ha na-ekwu okwu ọlụlụ n’Intanet rafuru.

Ndị mmadụ hà pụrụ ịgha ụgha banyere ihe ndị dị mkpa ka ọnọdụ ime mmụọ ha? Ọ dị mwute ikwu na ha na-eme ya—ụfọdụ na-ekwu na ha bụ ezi Ndị Kraịst mgbe ha na-abụghị. N’ihi gịnị ka ha ji aghọ aghụghọ a nile? Ọzọkwa, otu ihe kpatara ya bụ na Intanet na-eme ka ọ dịrị ha mfe ime ya. Otu nwa okorobịa nọ na Ireland nke aha ya bụ Sean, kwetara, sị: “Ọ dị nnọọ mfe mmadụ ime ka à ga-asị na ọ bụ ihe ọ na-abụghị mgbe ọ na-ede ozi n’Intanet.”

Ọtụtụ mmadụ na-ewere aghụghọ a nile dị ka ihe na-adịghị ihe ọ bụ, na-ekwu na mmadụ ịghatụ ụgha mgbe ya na mmadụ na-ekwu okwu ọlụlụ, bụ ihe dị otú kwesịrịnụ. Chetakwa na Chineke kpọrọ ịgha ụgha asị. (Ilu 6:16-19) Ọ dịkwa ezi ihe mere o ji kpọọ ya asị. Ọ bụ ụgha kpatara ihe ka ukwuu ná nsogbu na nhụsianya e nwere n’ụwa taa. (Jọn 8:44) Emeghị ihe n’eziokwu bụ ihe kasị njọ mmadụ pụrụ ịdabere na ya wee malite adịm ná mma ọ bụla, nke ka nke, adịm ná mma e bu n’obi na ọ ga-eduga ná njikọ ga-adịru ogologo ndụ nile. Nke ka njọ bụ na emeghị ihe n’eziokwu na-etinye mmadụ n’ihe ize ndụ ime mmụọ; ọ na-emebi mmekọrịta nke onye ụgha ahụ na Jehova Chineke.

Ọ dị mwute ikwu na ụfọdụ ndị na-eto eto adabala n’ụdị ọzọ nke emeghị ihe n’eziokwu. Ha na-amalite iso ndị ọzọ na-eme enyi n’Intanet ma na-ezoro ya ndị mụrụ ha. Dị ka ihe atụ, nne na nna nke otu nwata nwoke dị afọ iri na ụma kụjara otu ụbọchị mgbe otu nwa agbọghọ na-abụghị Onye Kraịst ibe ha si ebe dị ihe karịrị kilomita 1, 500 bịa n’ụlọ ha na mberede. Nwa ha nwoke na nwa agbọghọ ahụ esiwo n’Intanet na-eme enyi kemgbe ọnwa isii ma ndị mụrụ nwata nwoke ahụ amaghị ihe ọ bụla banyere nwa agbọghọ ahụ tupu ruo mgbe ahụ!

Ndị mụrụ ya jụrụ, sị, “Olee otú ụdị ihe a si mee?” Ha bịara na-eche, sị, ‘Olee otú nwa anyị nwoke pụrụ isi hụwa onye ọ na-ahụtụbeghị ihu na ihu n’anya.’ Nke bụ eziokwu bụ na nwa ha nwoke anọwo na-aghọgbu ha—e kwuwe ya n’ụzọ ọzọ, ọ nọ na-ezochi ihe ọ bụ n’ezie. Ị́ gaghị ekweta na ụdị aghụghọ ahụ abụghị ezigbo ntọala maka ikwu okwu ọlụlụ?

Ịhọrọ Ịnọ Ihu na Ihu Kwuwe Okwu Ọlụlụ Kama Isi n’Intanet Na-ekwu Ya

Mmadụ pụrụ ịbanye n’ihe ize ndụ ndị ọzọ site n’ịchọ onye ọ ga-alụ n’Intanet. N’ọnọdụ ụfọdụ, ị pụrụ iwere onye gị na ya na-akpa n’Intanet dị ka onye dị mkpa karịa ndị nke ị na-ahụ kwa ụbọchị. Nke a ga-eme ka idebe ndị ezinụlọ gị, ndị enyi gị, na ibu ọrụ ndị i nwere n’ọnọdụ nke abụọ. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Monika, bụ́ onye nọ n’Austria, na-ekwu, sị: “Amalitere m ileghara ndị mụ na ha dị ná mma anya n’ihi na ana m eji ihe ka ukwuu n’oge m edegara ndị enyi m n’Intanet ozi.” Mgbe ọ ghọtara nsogbu a, ọ kwụsịrị ime enyi n’Intanet.

N’eziokwu, ọtụtụ mmadụ na-eji Intanet eme ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Iji E-mail ezirịta ozi pụrụ ịbụ ụzọ dị nnọọ mma gị na ndị enyi gị na ndị ị hụrụ n’anya ga-esi na-ekwurịta okwu. Ị ga-ekweta n’ezie na ọ dịghị ihe dị nnọọ ka mmadụ na mmadụ ikwurịta okwu ihu na ihu. Ọ bụrụ na ị ‘gafewo ntoju ntorobịa’—oge agụụ mmekọahụ na-akasị njọ—ma nwee mmasị ịlụ di ma ọ bụ nwunye, otu n’ime mkpebi ndị kasị mkpa ị ga-eme ná ndụ na-eche gị ihu. (1 Ndị Kọrint 7:36) Gbasie mbọ ike ịhụ na i mere mkpebi ezi uche dị na ya.

Bible na-adọ aka ná ntị, sị: “Onye na-enweghị uche na-ekwere okwu nile ọ bụla: ma onye nwere ezi uche na-aghọta ijeụkwụ ya.” (Ilu 14:15) Kama ikwere ihe nile onye ị na-ahụtụbeghị anya na-edere gị, gbaa mbọ ịghọta ijeụkwụ gị nke ọma. Ime ndokwa ka gị na mmadụ hụ ihu na ihu wee mewe enyi bụ nnọọ ihe amamihe ka dịrị na ya. Chọpụta ma ihe ọ̀ ga-adabara unu abụọ, karịsịa ma a bịa n’ihe mgbaru ọsọ na ụkpụrụ ime mmụọ unu. Adịm ná mma dị otú ahụ pụrụ iduga n’alụmdi na nwunye na-enye obi ụtọ n’ezie.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 A gbanwewo ụfọdụ n’ime aha ndị ahụ.

^ par. 5 Lee isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . ‘Èkwesịrị M Ịchọ Onye M Ga-alụ n’Intanet?’” na Teta! nke May 8, 2005.

[Foto ndị dị na peeji nke 12]

Ị̀ maara onye na-edetara gị ozi n’Intanet?

[Foto dị na peeji nke 14]

Ọ dịghị ihe dị ka mmadụ abụọ ịhụ ihu na ihu mgbe ha na-ekwu okwu ọlụlụ