Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ì Kwesịrị Ịtụ Ụjọ Amagedọn?

Ì Kwesịrị Ịtụ Ụjọ Amagedọn?

Echiche nke Bible

Ì Kwesịrị Ịtụ Ụjọ Amagedọn?

G ỊNỊ bụ “Amagedọn”? N’ikwu ya n’ụzọ dị mfe, e ji okwu ahụ eme ihe banyere ọnọdụ nke ndị ọchịchị ụwa ga-anọ na ya chịkọta onwe ha ọnụ imegide Chineke na Alaeze ya bụ́ nke dị n’aka Jizọs Kraịst. N’akwụkwọ Bible bụ́ Mkpughe, Jọn onyeozi hụrụ ọhụụ nke ebe ndị ọchịchị gbakọtara iji maa Chineke aka n’ebe a kpọrọ Amagedọn n’ụzọ ihe atụ.

Okwu ahụ bụ́ “Amagedọn” pụtara nanị otu ugbo n’Akwụkwọ Nsọ, n’agbanyeghị nke ahụ, a na-ekwukarị banyere ya n’oge anyị a. A na-ejikarị okwu ahụ eme ihe mgbe a na-ekwu banyere ọdachi ukwu na nke nta, dị ka mgbe a na-ekwu banyere iji ngwá agha nuklia gbuchapụ agbụrụ nile ma ọ bụ banyere nje virus nke kọmputa. Ọtụtụ akwụkwọ ndị na-aga ahịa ejiwo oge a a kpọrọ oge ọgwụgwụ, ma ọ bụ oge ga-adị tupu Amagedọn, mere isiokwu. E reela ihe karịrị nde iri isii nke otu akwụkwọ bú isiokwu a, n’ime afọ iri gara aga.

Ụfọdụ mmadụ na-atụ ụjọ Amagedọn. Ọ na-adị ha ka ndị na-eyi ọha egwu, mba ndị na-akpasu agha, ma ọ bụ ọdachi ụmụ mmadụ na-apụghị ịchịkwa ọ̀ ga-akpata mbibi ga-ezu ụwa ọnụ, nke ga-eme ka ihe ndị dị ndụ ghara inwe ike ibi n’ụwa. Ndị ọzọ kweere na n’oge Chineke kara aka, ya onwe ya ga-eji iwe bibie ụwa anyị na ihe nile dị n’ime ya. Echiche ndị a na-eyi egwu n’ezie! Ma, olee nghọta ziri ezi e kwesịrị inwe banyere ‘agha nke oké ụbọchị nke Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile’ n’Amagedọn?—Mkpughe 16:14, 16.

À Ga-ebibi Ụwa?

Ọ bụghị mmadụ nile ka a ga-ebibi n’Amagedọn. Olee otú anyị si mara nke ahụ? Bible na-emesi anyị obi ike na “Jehova maara ụzọ e si agbapụta ndị na-asọpụrụ Chineke n’ọnwụnwa, ma na-edebe ndị ajọ omume maka ụbọchị ikpe ka e wee gbupụ ha.” (2 Pita 2:9) Ya mere, anyị pụrụ inwe obi ike na Chineke ga-achịkwa ike ya pụrụ ime ihe nile n’ụzọ zuru okè. Ọ bụ nanị ndị na-emegide ọbụbụeze ya ka ọ ga-awụsa ọnụma ya n’Amagedọn. A gaghị enwe ndị e gburu n’amaghị ama.—Abụ Ọma 2:2, 9; Jenesis 18:23, 25.

Bible na-agwa anyị na Chineke ‘ga-ebibi ndị na-ebibi ụwa.’ (Mkpughe 11:18) N’ihi ya, o doro anya na nzube Jehova Chineke abụghị ibibi ụwa anyị. Kama nke ahụ, ọ ga-ekpochapụ ndị ajọ mmadụ na-emegide ọchịchị ya. Nke a ga-eyi ihe o mere n’oge Iju Mmiri nke ụbọchị Noa.—Jenesis 6:11-14; 7:1; Matiu 24:37-39.

Ụbọchị Dị Egwu’

N’ezie, ọtụtụ amụma ndị e buru na Bible banyere mbibi ahụ na-abịanụ na-eyi egwu. Dị ka ihe atụ, Joel onye amụma kwuru banyere “ụbọchị Jehova . . . , bụ́ ụbọchị ahụ dị ukwuu dịkwa egwu.” (Joel 2:31) Ngwá agha Chineke ga-eji mee ihe na-agụnye snow, akụ́ mmiri igwe, ala ọma jijiji, ọrịa na-efe efe, oké mmiri ozuzo n’ezobiga ókè, ọkụ na brimstone, ọgba aghara na-egbu egbu, àmụ̀mà, na ihe otiti nke ahụ́ mmadụ ịta ata. * (Job 38:22, 23; Ezikiel 38:14-23; Habakuk 3:10, 11; Zekaraịa 14:12, 13) Bible kọwakwara n’ụzọ doro anya banyere oge ozu ndị e gburu egbu ga-ejupụta n’elu ụwa nile, ma ghọọ ma ọ́ bụghị nsị anụ ọ bụrụ nri ụmụ nnụnụ na ụmụ anụ ndị ọzọ. (Jeremaịa 25:33, 34; Ezikiel 39:17-20) Ụjọ ga-ejide ndị iro Chineke n’oge a na-alụ agha a.—Mkpughe 6:16, 17.

Nke a ọ̀ pụtara na ndị ji nrubeisi na-efe ezi Chineke ahụ kwesịrị ịtụwa egwu ihe ndị a na-eju anya ga-eme n’Amagedọn? Ọ dịghị ma ọlị, n’ihi na ndị ohu Chineke nọ n’ụwa agaghị etinye aka n’agha a. Ọzọkwa, Jehova ga-echebe ha. N’agbanyeghị nke ahụ, egwu ga-atụ ndị na-efe ezi ofufe mgbe ha ga-ahụ ka Chineke na-egosipụta ike ya n’ụzọ dị egwu.—Abụ Ọma 37:34; Ilu 3:25, 26.

Otú ọ dị, ọ dị mma ịmara na e nyere Jọn onyeozi ike mmụọ nsọ imesi anyị obi ike, sị: “Obi ụtọ na-adịrị onye ọ bụla nke na-edebe okwu amụma nke akwụkwọ mpịakọta nke a,” gụnyere ịdọ aka ná ntị banyere Amagedọn. (Mkpughe 1:3; 22:7) Mmadụ ọ̀ pụrụ inwe obi ụtọ site n’ịtụgharị uche banyere Amagedọn? Olee otú nke a pụrụ isi mee?

Òkù Chineke Na-akpọ Ka E Mee Ihe

Mgbe a na-aga inwe ajọ ifufe, ndị ọchịchị na-adọ ndị mmadụ aka ná ntị iji chebe ndụ ha. Iji hụ na onye ọ bụla nụrụ ịdọ aka ná ntị ahụ, a pụdịrị izipụ ndị uwe ojii ka ha jiri ígwè e ji ama ọkwa dọọ ndị mmadụ aka ná ntị ma ọ bụ e zipụ ha ka ha gaa n’ụlọ n’ụlọ. Nzube e ji eme ihe a nile abụghị iji yie ndị mmadụ egwu, kama ọ bụ iji nyere ha aka ime ihe ga-echebe ndụ ha. Ndị nwere ezi uche na-eji obi ụtọ anabata ịdọ aka ná ntị ahụ, ndị mekwara ihe banyere ya na-enwe obi ụtọ na ha mere otú ahụ.

Otú ahụ ka ọ dị banyere ozi ịdọ aka ná ntị Chineke na-ezi banyere “oké ifufe” nke Amagedọn bụ́ nke na-abịanụ. (Ilu 10:25) Jehova enyewo nkọwa zuru ezu banyere agha ya n’Okwu ya e dere ede. Nzube ya abụghị iyi ndị mmadụ egwu, kama ọ bụ ịdọ ha aka ná ntị nke ọma na inyere ha aka ichegharị ma mee mgbalị dị ukwuu iji jeere ya ozi. (Zefanaịa 2:2, 3; 2 Pita 3:9) A ga-agọzi ndị mere otú ahụ site n’ịzọpụta ha. N’ihi ya, anyị ekwesịghị ịtụ agha Chineke ahụ nke na-abịanụ egwu. Kama nke ahụ, anyị pụrụ ilepụ anya n’ọdịnihu, na-enwe obi ike na “onye ọ bụla nke ga-akpọku aha Jehova, a ga-eme ka o wepụga onwe ya.”—Joel 2:32.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 10 E kwesịrị iburu n’uche na e ji okwu “ihe atụ” dee akụkụ ụfọdụ nke Bible. (Mkpughe 1:1) N’ihi ya, anyị apụghị ikwesi olu ike mgbe anyị na-akọwa banyere ókè a ga-ejiru ihe ndị a e kwuru okwu ha n’amụma ndị a mee ihe n’ụzọ nkịtị.

[Foto dị na peeji nke 24]

Mgbe oké ifufe na-abịa, ndị ọchịchị na-adọ ndị mmadụ aka ná ntị iji chebe ndụ ha

[Foto dị na peeji nke 25]

Ozi ịdọ aka ná ntị Chineke na-ezi banyere Amagedọn bụ ka ndị mmadụ wee nwee ike ime ihe iji zọpụta ndụ ha