Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ekpebisiri M Ike Iru Ihe Mgbaru Ọsọ M

Ekpebisiri M Ike Iru Ihe Mgbaru Ọsọ M

Ekpebisiri M Ike Iru Ihe Mgbaru Ọsọ M

DỊ KA MARTHA CHAVEZ SERNA SI KỌỌ

Otu ụbọchị mgbe m dị afọ 16, atụbọrọ m ka m nọ na-arụ ọrụ n’ụlọ. Mgbe m nwetara onwe m, anọzi m n’elu àkwà. N’ihi amaghị ihe na-eme m na oké isi na-awa m, apụghị m ịhụ ụzọ ma ọ bụ ịnụ ihe ọ bụla ruo ọtụtụ minit. Ụjọ jidere m. Gịnị na-eme m?

NDỊ mụrụ m, bụ́ ndị nọ ná nchegbu, kpọgara m na nke onye dọkịta, bụ́ onye depụtaara m ọgwụ na-enye vitamin. O kwuru na ihe mere m ji nwee ihe ọdịdọ ahụ bụ n’ihi ehighị ụra n’oge. Ọnwa ole na ole ka nke ahụ gasịrị, ihe ọdịdọ ahụ dọkwara m ọzọ, mesịa dọọkwa m nke ugboro atọ. Anyị gakwuuru dọkịta ọzọ, bụ́ onye chere na m nwere nsogbu n’akwara ozi m, ma nye m ọgwụ na-akụjụ ahụ́.

Ma, ihe ọdịdọ ahụ bịaziri na-eme m ugboro ugboro. Ọtụtụ mgbe, ana m atụbọ daa ma merụọ ahụ́. Mgbe ụfọdụ, ezé m na-atagide ire m nakwa ime ọnụ m. Mgbe ọ bụla m nwetaghachiri onwe m, m na-enwe oké isi ọwụwa, agbọ ana-enukwa m. Ahụ́ nile na-egbu m mgbu, ọtụtụ mgbe kwa, anaghị m enwe ike icheta ihe ndị mere tupu ihe ọdịdọ ahụ adọwa m. Iji nweta onwe m, ọ na-adịkarị mkpa na m ga-edina n’ụlọ ruo otu ụbọchị ma ọ bụ abụọ. N’agbanyeghị ihe ndị a, ekweere m na nsogbu a agaghị adịte aka—na n’oge na-adịghị anya, ahụ́ ga-adị m mma.

Otú O Si Metụta Ihe Mgbaru Ọsọ M

Mgbe m ka dịkwu obere, ezinụlọ anyị malitere iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible. Ndị na-akụziri anyị ihe bụ mmadụ abụọ bụ́ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche, ma ọ bụ ndị ozi oge nile, bụ́ ndị na-eji ọtụtụ awa n’ọnwa ọ bụla akụziri ndị ọzọ eziokwu Bible. Apụrụ m ịhụ na ozi ndị ọsụ ụzọ a na-eje na-enye ha ọṅụ. Ka m na-agwa ndị nkụzi anyị na ụmụ akwụkwọ ibe m banyere nkwa ndị e kwere n’ime Bible, amalitere m inwetakwa ụdị ọṅụ ahụ.

N’oge na-adịghị anya, ọtụtụ n’ime ndị n’ezinụlọ anyị bịara ghọọ Ndịàmà Jehova. Lee nnọọ oké ọṅụ m na-enwe n’ije ozi ọma! Ka m na-erule afọ asaa, esetịpụla m ihe mgbaru ọsọ nke ịbụ ọsụ ụzọ pụrụ iche. Mgbe m dị afọ 16, e mere m baptizim, nke bụ́ otu ihe gbara ọkpụrụkpụ ga-eme ka m ruo ihe mgbaru ọsọ m. Mgbe ahụ ka ihe ọdịdọ ahụ malitere.

Ozi Ọsụ Ụzọ

N’agbanyeghị na m na-arịa ọrịa, obi ka siri m ike na m ka pụrụ ịbụ onye ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova. Ma ebe ọ bụ na ihe ọdịdọ ahụ na-adọru m ugboro abụọ n’izu, ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ anyị chere na ekwesịghị m iburu nnukwu ibu ọrụ dị otú ahụ. O wutere m ma kụdaa mmụọ m. Ma ka oge na-aga, otu di na nwunye na-arụ ọrụ n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Mexico bịara n’ọgbakọ anyị. Ha nụrụ na m chọrọ ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ ma gbaa m nnọọ ume. Ha mere ka m kwenye na ọrịa m ekwesịghị igbochi m ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ.

N’ihi ya, na September 1, 1988, anatara m akwụkwọ e ji họpụta m ịbụ onye ọsụ ụzọ oge nile n’obodo m bụ́ San Andrés Chiautla, Mexico. Ana m eji ọtụtụ awa ezi ozi ọma kwa ọnwa. Mgbe m na-apụghị ịga ozi ọma n’ihi ihe ọdịdọ ahụ, ana m edegara ndị bi n’ókèala anyị akwụkwọ ozi ndị dabeere n’Akwụkwọ Nsọ ma si otú ahụ gbaa ha ume ịdị na-amụ Bible.

A Chọpụta Ihe Na-arịa M

N’oge a, ndị mụrụ m, n’agbanyeghị oké ego o furu ha, kpọọrọ m gaa na nke dọkịta bụ́ ọkachamara n’ihe banyere akwara ozi. Dọkịta a chọpụtara na ọ bụ àkwụ́kwụ̀ na-arịa m. N’ihi ọgwụ e nyere m mgbe ahụ, ahụ́ bịara dịtụ m mma ruo ihe dị ka afọ anọ. Ka ọ dịgodị, o kwere ka m gaa Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọsụ Ụzọ, bụ́ ebe m natara agbamume mere ka m nwekwuo ọchịchọ ije ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu maka ndị nkwusa.

Ndị mụrụ m maara otú o si agụ m agụụ ijekwu ozi karịa otú m na-eje. Ebe ọ bụkwanụ na ọrịa m adajụtụla, ha kwere ka m gaa Zitácuaro, bụ́ nke dị na Steeti Michoacán, ebe dị ihe dị ka narị kilomita abụọ site n’ụlọ anyị. Mkpakọrịta mụ na ndị ọsụ ụzọ ndị ọzọ nọ ebe ahụ nwere nyeere m aka ijikwu ozi oge nile kpọrọ ihe ọbụna karị.

Otú ọ dị, ka m nọsịrị afọ abụọ na Zitácuaro, ihe ọdịdọ ahụ maliteghachiri. Eji m iwe na mwute laghachi n’ụlọ ndị mụrụ m. Ọ dịkwa mkpa na dọkịta ga-elebara m anya. Agakwuuru m ọkachamara n’ihe banyere akwara ozi bụ́ onye chọpụtara na ọgwụ m na-aṅụ na-egbu imeju m. Ebe ọ bụ na anyị apụghịzi ịkwụ ụgwọ ọgwụ ọkachamara ahụ na-enye m, anyị malitere ịchọ ebe ọzọ a ga-anọ gwọwa m. Ọnọdụ m nọ na-akawanye njọ, n’ihi ya kwa, akwụsịrị m ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ. Ihe ọdịdọ ọ bụla mere m bụụrụ m ihe ndọghachi azụ. Ma mgbe m gụrụ Abụ Ọma ma kpegara Jehova ekpere, ana m enweta nkasi obi na ike ya.—Abụ Ọma 94:17-19.

Eruo M Ihe Mgbaru Ọsọ M

N’oge ihe ọdịdọ ahụ kasị m njọ, ọ na-adọ m ugboro abụọ n’ụbọchị. E mesịa, a bịara nwee mgbanwe dị ịrịba ama. Otu dọkịta nyere m ụdị ọgwụgwọ e mere maka ndị àkwụ́kwụ̀. Amalitekwara m inweta onwe m ruo ogologo oge karịa otú m na-enwetabu. N’ihi ya, na September 1, 1995, amaliteghachiri m ọrụ ọsụ ụzọ. Ahụ́ bịara dị m nnọọ mma, n’ihi ya, ka àkwụ́kwụ̀ na-adọghị m ruo afọ abụọ, etinyere m akwụkwọ ịmalite ije ozi dị ka ọsụ ụzọ pụrụ iche. Nke ahụ ga-apụta itinyekwu oge n’ozi na ije ozi ebe ọ bụla a chọrọ m. Chegodị echiche otú obi dị m mgbe m natara akwụkwọ e ji họpụta m dị ka ọsụ ụzọ pụrụ iche! Eruru m ihe mgbaru ọsọ ahụ m setịpụrụ mgbe m bụ nwata.

N’April 1, 2001, amalitere m ọrụ ọhụrụ m n’otu ógbè bụ́ ugwu ugwu nke ndị mmadụ ka kwatara ọhụrụ na ya, bụ́ nke dị na Steeti Hidalgo. Ugbu a, ana m eje ozi n’otu obodo nta dị na Steeti Guanajuato. Ana m akpachapụ anya ịhụ na m na-aṅụ ọgwụ m ma na-ezu ike nke ọma. Ana m akpachapụ anya n’ụdị nri m na-eri, karịsịa ma a bịa n’ihe ndị nwere abụba, kọfị, na nri ndị a gbara ná mkpọ. Ana m agbalịkwa izere ihe ọ bụla ga-eme ka m wee iwe ma ọ bụ chee oké echiche. Eritewo m uru site n’ịgbasochi ihe ndị a m na-eme anya. N’oge a m na-eje ozi dị ka ọsụ ụzọ pụrụ iche, ọ bụ nanị otu ugbo ka ihe ọdịdọ dọtụrụla m.

Ebe ọ bụ na m alụghị di, enweghịkwa m ibu ọrụ ezinụlọ, obi dị m ụtọ ịnọgide na-eje ozi dị ka ọsụ ụzọ pụrụ iche. Ana m enweta nkasi obi site n’icheta na ‘Jehova abụghị onye ajọ omume ichefu ọrụ anyị na ịhụnanya anyị gosiri maka aha ya.’ Lee ka ịhụnanya ya haruru, n’ihi na ihe ọ na-achọ n’aka anyị abụghị ihe anyị na-apụghị inye ya! Ịnakwere eziokwu a enyeworo m aka iche echiche n’ụzọ dị mma, n’ihi na ọ bụrụ na ọrịa emee ka m kwụsịkwa ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ, amaara m na Jehova ka ga-enwe obi ụtọ n’ozi m ji mkpụrụ obi dum na-eje.—Ndị Hibru 6:10; Ndị Kọlọsi 3:23.

Obi abụọ adịghị ya na ịkọrọ ndị ọzọ ihe m kweere kwa ụbọchị na-ewusikwu m ike. Ọ na-emekwa ka ngọzi ndị Chineke zubere iweta n’ọdịnihu bụrụ ihe obi m kasị adị na ya. Nkwa Bible na-ekwe bụ na n’ime ụwa ọhụrụ, ọrịa agaghị adị, “iru újú ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ [ga-agabigawo].”—Mkpughe 21:3, 4; Aịsaịa 33:24; 2 Pita 3:13.

[Foto ndị dị na peeji nke 26]

Mgbe m dị ihe dị ka afọ 7 (n’elu); mgbe m dị ihe dị ka afọ 16, obere oge ka e mesịrị m baptizim

[Foto dị na peeji nke 27]

Ka mụ na otu enyi m na-ekwusa ozi ọma