Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere Ndị Mmadụ Ji Atụtụ Aka?

Gịnị Mere Ndị Mmadụ Ji Atụtụ Aka?

Gịnị Mere Ndị Mmadụ Ji Atụtụ Aka?

“Anaghị m ewere ya na ọ bụ ohi, ana m ewere ya dị ka ihe mmadụ nwe ịba n’aka onye ọ kasị dị mkpa.”—OTU ỤKỌCHUKWU NKE CHỌỌCHỊ ENGLAND.

Ọ BỤRỤ na akụkọ ọdịbendị ahụ a na-akọ banyere Robin Hood bụ eziokwu, nwoke ahụ chere na izu ohi adịghị njọ. Akụkọ ọdịbendị ndị England kọrọ na ọ na-ezu ndị ọgaranya ohi ma na-enye ya ndị ogbenye. Ụkọchukwu ahụ e hotara ihe o kwuru n’elu kwenyekwara na ịda ogbenye bụ ezigbo ihe mere a ga-eji na-ezu ohi. O kwuru banyere ndị aka ntụtụ, sị: “Ana m emetere ha nnọọ ebere. N’ezie, ọ dị m ka ihe ha na-eme ò ziere ha.” Ọ na-atụ aro na ndị nwere nnukwu ụlọ ahịa kwesịrị ịdị na-eme, otu ugboro n’afọ ha ahapụ ndị ogbenye ka ha bịa were ihe ọ bụla a kpọsara, n’akwụghị ụgwọ.

Otú ọ dị, ọtụtụ mmadụ na-atụtụ aka n’ihi ihe ndị ọzọ na-abụghị ịda ogbenye. Na Japan, ndị uwe ojii jidere mmadụ abụọ n’ime ndị uwe ojii ibe ha maka ntụtụaka. Na United States, e jidere otu onye so ná ndị isi nke otu ụlọ ọrụ na-ahụ maka nri, bụ́ nke a gbakọrọ aka nwee, ka ọ na-ezu ngwá ahịa nke ụlọ ọrụ ahụ. Ndị ntorobịa ji ego n’akpa ha na-ezukarị ihe ọ na-adịghị ihe ha ji ha eme. Gịnị mere ndị dị otú ahụ ji eme aka ntụtụ?

‘Ọ Na-eme Obi Ụtọ’

Obi ụtọ. Ụjọ. Ikike. Dị ka ọ dị ụmụ agbọghọ abụọ ahụ a kọrọ banyere ha n’isiokwu bu ụzọ, mmetụta ndị a na-ezu ụfọdụ ndị na-atụtụ aka ahụ́. Agụụ mmetụta ndị a na-agụ ha na-emekwa ka ha nọgide na-ezu ohi. Mgbe otu nwanyị zusịrị ohi na nke mbụ ya, o kwuru, sị: “Ọ tọrọ m nnọọ ụtọ. E jideghị m, nke a mekwara ka obi dị m ụtọ!” Mgbe o zugidere ohi ruo oge ụfọdụ, o mesịrị kwuo banyere mmetụta ọ na-enwe, sị: “Onwe m bịara mewe m ihere—ma obi nọkwa na-atọ m ụtọ. Ọ bịara dị m nnọọ ka m so biri. Izu ohi n’ejideghị m mere ka ọ dị m nnọọ ka m nwere ikike.”

Otu nwa okorobịa aha ya bụ Hector na-ekwu na, ruo ọtụtụ ọnwa ọ kwụsịchara ime aka ntụtụ, ọ nọ na-agụ ya agụụ izu ohi ọzọ. * “Anọgidere m na-enwe agụụ ya dị ka à ga-asị na ọ bụ ihe ririla m ahụ́. Ọ na-abụ m nọrọ n’ụlọ ahịa hụ redio a kpọsara n’isi windo, obi m agwawa m, sị, ‘Iwere ya ga-adị nnọọ mfe. Apụrụ m iwere ya n’enweghị onye ga-ejide m.’”

Ụfọdụ n’ime ndị na-atụtụ aka n’ihi obi ụtọ ọ na-enye ha adịghị ihe ha ji ihe ndị ahụ ha na-ezuru eme. Otu akwụkwọ akụkọ a na-ebipụta n’India na-ekwu, sị: “Ndị ọkà n’ịmụ banyere akparamàgwà mmadụ na-ekwu na obi ụtọ a na-enweta n’ime ihe a sị onye emela bụ ya na-akpali ndị a ime ya. . . . Ụfọdụ na-eweghachidị ihe ahụ ha zutere.”

Ihe Ndị Ọzọ Mere Ha Ji Eme Ya

Ọtụtụ iri nde mmadụ dara mbà n’obi. Mgbe ụfọdụ, ndị dara mbà n’obi na-eme ka a mara na ha dara mbà n’obi site n’ịkpa àgwà ọjọọ—dị ka ịtụtụ aka.

Otu nwatakịrị nwanyị dị afọ 14 si n’ezinụlọ dị n’udo ma nwee akụ̀ na ụba. N’agbanyeghị ọnọdụ ọma ọ nọ na ya, nwa agbọghọ ahụ bịara nwewa mmetụta nke enweghị olileanya. “Mmetụta a ekweghị aha m aka,” ka o kwuru. Ọ malitere ịṅụ ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya na ọgwụ ike. E mesịa, e jide ya otu ụbọchị ka ọ na-atụtụ aka. Mgbe nke ahụ gasịrị, ọ nwara igbu onwe ya ugboro abụọ.

Ọ bụrụ na onye na-eto eto nke e ji àgwà ọma mara amalite ime aka ntụtụ, ndị mụrụ ya pụrụ ime nchọpụta iji mara ma ọ̀ dara mbà n’obi. Dr. Richard MacKenzie, bụ́ ọkachamara n’ahụ́ ike nke ndị nọ n’oge uto, kwuru, sị: “Ekweere m na mgbe ọ bụla nwa gị malitere ịkpa ụdị àgwà ọ bụla ọ na-adịbughị akpa, i kwesịrị iwere ya na ọ pụrụ ịbụ na ọ dara mbà n’obi, ruo mgbe a chọpụtara na ọ bụghị ya.”

Ụfọdụ ndị na-eto eto na-eme aka ntụtụ n’ihi nrụgide ndị ọgbọ—ohi dị otú ahụ pụrụ ịbụ ihe o furu ha iji mete ndị ọgbọ ha enyi. Ndị ọzọ pụrụ ime aka ntụtụ iji chụọ ike ọgwụgwụ. Ndị bụ́ aka ochie n’ịtụtụ aka na-eji ya akpata ihe ha riri. Ihe ọ sọrọ ya bụrụ ya mere ndị mmadụ ji atụtụ aka, ha na-ezu ngwá ahịa ruru ọtụtụ nde naira n’ụlọ ahịa ndị mmadụ kwa ụbọchị. Ọ bụ mmadụ ga-akwụ ụgwọ ihe ndị a ha na-ezu.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 A gbanwewo ụfọdụ aha ndị dị n’usoro isiokwu a.

[Igbe dị na peeji nke 17]

NSOGBU UCHE NKE NA-AKPALI MMADỤ IZU OHI

Maria kwuru, sị, “Ọ bụ kemgbe m dị afọ iri na ụma ka m malitere ime aka ntụtụ. Agụụ ịtụtụ aka bịara na-akawanye m njọ n’ahụ́ ruo mgbe m bịara zuwe ihe ọnụ ahịa ha ruru narị dollar ise kwa ụbọchị.

“Ọ bụghị obi m izu ohi, ma agụụ ya na-ejisi m ike. Achọrọ m ịkwụsị ya n’ezie.” Ebe agụụ ọ na-enwe izu ohi na-esiri ya nnọọ ike nchịkwata, ọ na-adị Maria ka o nwere nsogbu uche nke na-akpali ya izu ohi.

Ndị nwere nsogbu a na-anọgide na-enwe agụụ izu ohi, n’abụghị na ha ejighị ego ịzụ ihe ahụ azụ. Nke a abụghị obere nsogbu. O yiri ka ihe na-akpata ya ọ̀ bụ nsogbu uche nke gbanyerela mkpọrọgwụ n’ahụ́ onye ahụ.

Ụfọdụ na-ewere ya na ndị na-ezukarị ohi nwere nsogbu a. Ma ndị dọkịta kweere na ndị nwere nsogbu a n’ezie adịghị ọtụtụ. Dị ka Òtù Na-ahụ Maka Ọrịa Uche n’America si kwuo, ọ bụ ihe na-erughị pasent 5 nke ndị na-atụtụ aka nwere nsogbu a. N’ihi ya, mmadụ kwesịrị ilezi anya tupu ya ana-ewere onye na-emekarị aka ntụtụ dị ka onye nwere nsogbu a. A pụrụ inwe ihe ndị ọzọ mere mmadụ ji ezu ohi.

[Foto dị na peeji nke 17]

Ndị nne na nna na-ahụ n’anya na-achọ ịghọta ihe mere nwa ha ji eme aka ntụtụ