Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ichete Mmiri Ozuzo n’Oge Ochie Nakwa n’Oge A

Ichete Mmiri Ozuzo n’Oge Ochie Nakwa n’Oge A

Ichete Mmiri Ozuzo n’Oge Ochie Nakwa n’Oge A

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! N’INDIA

RUO ọtụtụ puku afọ, ọ bụ otu mmiri ahụ ka e jiworo na-eme ihe. Nke a kwere omume n’ihi usoro sitere n’okike nke anwụ ịmịkọrọ mmiri dị n’ala na n’oké osimiri, e mesịa, ya aghọọ urukpuru, bịazie zoo ka mmiri. Ụzọ a e si echekwa mmiri na-eme ka e nwee mmiri na-ezuru nnọọ onye ọ bụla nọ n’ụwa. Gịnịzi mere ụkọ mmiri ji akpa ihe a kpọrọ mmadụ ezé? Olee ụzọ ndị a pụrụ isi dozie nsogbu ahụ? Iji zaa ajụjụ ndị a, ka anyị leba anya n’ụzọ e si na-ahụ maka ụkọ mmiri n’India.

Ebe ihe karịrị otu ijeri mmadụ bi n’India, ụkọ mmiri a na-enwe ná mba ahụ abụghị ihe e ji ọnụ ekwu. Ebee ka India si enweta mmiri? N’ebe mgbago mgbago ya, a na-enweta mmiri n’oge opupu ihe ubi site na snow ndị gbazere n’Ugwu Himalaya. Ma, ihe ka ọtụtụ n’obodo ndị dị n’India na-adabere ná mmiri ozuzo iji nweta mmiri na-edere ha ala, nke na-agbajuru ha olulu mmiri na ọdọ mmiri, nakwa nke na-eme ka osimiri ndị juru ná mba ahụ too. Udu mmiri India anaghị aga otú o kwesịrị isi na-aga. A kọwawokwa ya dị ka “otu n’ime ihe ndị kasị dị mgbagwoju anya n’ụzọ na-agba ara,” nke bụ́ ‘ihe ijuanya na o sigburu onwe ya n’ike ikwu otú ọ ga-esi ewere ọnọdụ n’agbanyeghị ọganihu nile e nweworo na nkà na ụzụ, site n’ígwè ọrụ satellite ruo na kọmputa ndị bụ́ ọkpọka.’

Oge udu mmiri dị otú kwesịrịnụ na-ewe ọnwa atọ ma ọ bụ anọ. Ma, kama mmiri iji nwayọọ nwayọọ na-ezo n’oge ahụ nile, ihe ka ọtụtụ ná mmiri ozuzo ahụ na-asụ asụ n’ime mkpirikpi oge. N’ihi ya, mmiri na-etoju ọdọ mmiri ma malite ịkwafu. Osimiri na-etoju gafee ókè, na-eme ka e nwee idei mmiri n’ọhịa nakwa n’ụlọ. Ebe ọ bụ na ụlọ ọrụ ọgbara ọhụrụ na ọrụ mmepe obodo ndị a na-arụ emeela ka e gbukpọọ ọhịa dị iche iche, a nakebeghị enwe osisi ndị mkpọrọgwụ ha ga-ejide mmiri ndị a zoro ezo ma mee ka ha jiri nwayọọ nwayọọ dee ala. N’ihi ya, oké mmiri ozuzo ndị a na-eburu ájá ndị dị n’elu ala, na-akpata mbuze. Ájá na-ejupụta n’ọdọ mmiri dị iche iche, na-eme ka ha ghara imi emi. Nke a na-eme ka mmiri na-adị na ha ghara ibu ibu. N’ihi ya, ihe ka ukwuu ná mmiri ahụ dị oké ọnụ ahịa zoronụ na-efu.

E mesịa, udu mmiri alaa. N’ọnwa ndị fọdụrụnụ n’afọ, anwụ na-acha kwa ụbọchị, na-eme ka e nwee oké okpomọkụ! Ọ naghị ete aka anwụ amịkọrọ mmiri dị n’ala, ala ubi akpọọ nkụ ma malite ịgbawa. Osimiri ndị na-ekwo ekwo aghọzie obere iyi na-asọ n’ebe sara mbara nke bụ́ ájá ájá. Mmiri ndị si na nkume agbapụta ataa. E gwubawakwuo olulu mmiri egwuba ka e wee nwee ike igwute mmiri. Mmiri dị n’ime ala atalatakwa. Mgbe mmiri na-adịchaghịzi ezo, oké ọkọchị na-amalite, ihe ndị a kụrụ n’ubi achanwụọ, ehi anwụọ, ndị bi n’ime obodo akwagakwa n’obodo mepere emepe, na-eme ka ụkọ mmiri a na-enwe n’obodo ukwu ka njọ.

Ma, ọ bụghị otú a ka ọ dịwara kemgbe ụwa. N’oge ochie, ndị nọ n’ebe nile n’India chọpụtara na ọ dịghị mma ịdabere nanị n’osimiri nakwa n’ọdọ mmiri, bụ́ ndị ga-ata ma udu mmiri laa. Ha chepụtara ụzọ ha ga-esi na-echete mmiri n’ebe o zoro, na-eji ya eme ihe ha chọrọ ime ozugbo ahụ, ma na-echekwa ya iji ya mee ihe mgbe mmiri ga-akwụsị izo.

Mkpa Ọ Dị Ichete Mmiri Ozuzo Taa

Mmadụ ga-eche na, n’ihi nkà na ụzụ ọgbara ọhụrụ na owuwu a na-ewu nnukwu ọdọ mmiri na ọwara mmiri ndị a na-enweta mmiri a na-agba n’ubi—bụ́ ndị juru eju n’India—na a gaghị enwecha mmasị n’iji ụzọ mgbe ochie echekwa mmiri, ma ọ bụrụkwarị na a ga-enwedị ya enwe. E kwuwerị, a kwụsịrị iji ihe ka ọtụtụ n’ụzọ ndị ahụ eme ihe mgbe ndị mmadụ bịara nwee ike itinye pọmpụ mmiri n’ụlọ ha ma ọ bụ n’obodo ha. Ma, e nwere ihe mere a ga-eji lebara ya anya. Nnukwu ọrụ ndị a nọworo na-arụ n’ime afọ 50 gara aga iji hụ na e nwere mmiri enwebeghị ike ime ka ụkọ mmiri kwụsị. Nke a bụ n’ihi mmụba ndị mmadụ na-amụba nakwa n’ihi mgbanwe obodo sizi n’ịbụ nke e ji ọrụ ubi mara na-aghọ nke e ji ụlọ ọrụ mmepụta ihe mara. E chekwabeghị mmiri otú ọ ga-ezu iji na-egbo mkpa mmiri nke mba ahụ.

Ugbu a, ndị na-ahụ maka gburugburu ebe obibi na ndị ọchịchị ọ na-emetụ n’obi ahụla mkpa ọ dị ịgba ndị mmadụ ume iji aka ha na-echekwa mmiri. A na-agba ndị mmadụ ume ichete mmiri n’ebe obibi ha, n’ụlọ ọrụ ha, n’ụlọ akwụkwọ, nakwa n’ebe ọ bụla a pụrụ ichekwa mmiri n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị nta. N’ezie, ọtụtụ obodo ukwu na steeti emeela ka ọ bụrụ iwu na ụlọ ọhụrụ ọ bụla a ga-arụ ga-enwerịrị ihe e ji echete mmiri!

Ọtụtụ nde lita mmiri na-ezo n’ebe ọ na-adịghị abanye n’ihe e ji echekwa mmiri, kama nke ahụ, anwụ na-amịkọrọ ya ma ọ bụ ya asọba n’oké osimiri. Ma, a bịa n’ichete mmiri—nke bụ́ ichete ya n’ebe ọ bụla o zoro—ọ bụ ndị mmadụ n’otu n’otu na-echete ya. N’adịghịkwa ka mmiri dị n’ọdọ mmiri nakwa n’ọwara mmiri, bụ́ nke a na-aghaghị ịkwụrụ ụgwọ, nke ga-esikwara ndị ogbenye ike ịzụta, mmiri nke a bụ n’efu!

Ibute Ụzọ

Ya mere, ọtụtụ ndị ọnọdụ a na-emetụ n’obi n’India na-etinyezi aka n’ichekwa mmiri. E mewo ka a mara ụfọdụ n’ime ha n’ụwa nile site n’inye ha ihe nrite, dị ka e mere Rajendra Singh, bụ́ onye e nyere ihe nrite ahụ dị ùgwù bụ́ Ihe Nrite Magsaysay n’afọ 2001, n’ihi òkè o keere n’ọrụ imepe ime obodo. Singh si n’aka otu ụlọ ọrụ na-abụghị nke gọọment, bụ́ nke o guzobere, tụteghachi Osimiri Aravari ahụ fọrọ obere ka ọ taa, bụ́ nke dị na steeti Rajasthan. Nke a baara steeti ahụ uru dị ukwuu, bụ́ ebe pasent 8 nke ndị bi ná mba ahụ bi nakwa ebe 1 pasent nke mmiri dị ná mba ahụ dị. Ruo ihe karịrị afọ 15, ndị ọrụ Singh dọrọ ọtụtụ osisi ma rụọ tank mmiri dị puku atọ na narị ise—tank e ji echete mmiri nke ndị obodo ahụ na-akpọ johad—bụ́ nke mere ka ndị bi n’obodo nta ndị a nwee ọganihu. Ndị ọzọ rụrụ ọrụ ichekwa mmiri, ma ọtụtụ mmadụ ahụghị ọrụ ha rụrụ. Ha nwetakwara afọ ojuju n’ihi na ha maara na ha na-enyere ndị mmadụ aka.

Ndị na-arụ n’ụlọ ọrụ mmepụta ihe na-ahụ uru dị n’ichete mmiri ozuzo iji mee ka mmiri pọmpụ na-ezuru ha. N’otu ụlọ ọrụ mmepụta ihe dị ná mpụga obodo Bangalore, nke dị n’ebe ndịda India, e nwere ụzọ dị mfe, nke na-efughị oké ego e si na-echete mmiri ozuzo. Mmiri ozuzo, bụ́ nke na-awụsa n’okporo ụzọ ma na-ala n’iyi, ka e meziri ka ọ na-abanye n’otu tank pụrụ ibu puku lita mmiri iri anọ na abụọ. Kwa ụbọchị n’oge udu mmiri, ha na-azà puku lita mmiri isii e chetere echeta ma jiri ya na-asa ihe ndị e ji esi nri na ihe ndị ọzọ n’ụlọ nri nke ụlọ ọrụ ahụ. E sighị ná mmiri pọmpụ ekute mmiri e ji eme ihe ndị a.

‘Nke a bụ otu ngaji mmiri a wụnyere n’osimiri,’ ka ị pụrụ ikwu. Ma, weregodị ya na i nwere ihe ndekọ ego n’ụlọ akụ̀ bụ́ nke ị na-etinye ego na ya otu ugboro n’afọ. Ya abụrụ na ị ga na-adọrọ ego na ya iji na-egbo mkpa ndị ị na-enwe n’ụbọchị, ma nke nta nke nta, gị ana-adọrọ ego karịrị nke ị na-etinye. Otu ụbọchị, ị ga-eji ụlọ akụ̀ ahụ ụgwọ. Otú ọ dị, ọ bụrụ na n’ọnwa ụfọdụ n’afọ, ị na-arụ ọrụ na-enye gị ego karịrị ego i ji egbo mkpa dịịrị gị n’ụbọchị, ego ahụ ị na-etinye n’ụlọ akụ̀ ga-enwe ike ịmụba. Ugbu a, buru nke a n’uche mgbe ị na-eleba anya n’ichekwa mmiri. Ọ bụrụ na gị na ọtụtụ nde ndị ọzọ agbaa mbọ ịhụ na unu na-echekwa obere mmiri, gịnị ka unu ga-enweta? Mmiri agaghị akọ n’ite mmiri unu, mmiri ndị dị n’ime ala na ndị nke dị n’okpuru oké nkume ga na-amụba, unu ga-ahụkwa ebe unu ga na-ekute mmiri ma mmiri kwụsị izo. Cheta na mmiri e nwere ebughị ibu; mmiri kọọ, ọ dịghị ebe ị ga-enweta ya, ma ya fọdụzie ikwuwe okwu iji ụgwọ mmiri.

Ihe Ngwọta Na-adịgide Adịgide

Mbara ala anyị nwere ihe ga-ezuru nnọọ ndị nile bi na ya. Ma, n’ime ọtụtụ narị afọ gafeworonụ, anyaukwu na elepụghị anya n’ihu nke mmadụ emewo ka ọnọdụ ibi ndụ nke ọtụtụ nde ndị bi n’ụwa jọgbuo onwe ya. N’agbanyeghị mbọ ndị nwere ezi obi na-agba, o doro anya na ike ụmụ mmadụ erughị n’idozicha nsogbu nile metụtara gburugburu ebe obibi nke a na-enwe n’ụwa. Ọ bụ ihe na-enye obi ụtọ na Onye Okike nke ụwa kwere nkwa “ibibi ndị na-ebibi ụwa” na ime ka usoro sitere n’okike nke mmiri si erugharị na-aga otú kwesịrịnụ, ka mmiri wee nwee ike isi ‘n’ọzara na-agbawapụta, mmiri iyi kwa n’ala ihe na-adịghị.’ N’ezie, “mirage ga-aghọkwa ọdọ mmiri, ala mmiri na-adịghị ga-aghọkwa isi iyi jupụtara na mmiri.” Lee ka nke ahụ ga-esi bụrụ ụzọ na-enye ume ọhụrụ a ga-esi chete mmiri ozuzo!—Mkpughe 11:18; Aịsaịa 35:6, 7.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 31]

Ịtụteghachi Ụzọ Mgbe Ochie E Si Echete Mmiri Ozuzo

MMIRI GBAMGBAM: Nke a dị mfe, ọ dịghịkwa eri oké ego. Gbamgbam ndị mmiri pụrụ isi na ha na-asọda na-eme ka mmiri zokwasịrị na ha nwee ike ịsọba n’ihe a kwụnyere na ya iji na-echete mmiri bụ́ nke a na-akwụnye paịpụ n’isi ya ka mmiri ahụ wee na-abanye n’ime drọm a rụrụ maka ya. A na-eji nzà e ji waya mee, ájá, ajịrịja nkume, na icheku ọkụ aza mmiri ahụ ka o wee dị ọcha. A na-agbanyezi ya n’ime tank e liri n’ala ma ọ bụ nke a dọbara n’elu. A na-akwụchi tank ahụ ka ikuku, ìhè anyanwụ, na ụmụ irighiri ihe ghara ịbanye na ya; e tinye ya alọm, ọ ga-eme ka ihe ndị yiri ụrọ ghara ịdịcha na ya; e tinye ya ihe ndị Bekee na-akpọ bleaching powder, ọ ga-egbu nje ndị dị na ya. A pụrụ ịgba mmiri a n’ubi, jiri ya gaa mposi, jirikwa ya saa ákwà. A zakwuo ya, a pụrụ ịṅụ ya aṅụ. Tank ahụ ju, a pụrụ ịwụnye mmiri nke fọdụrụnụ n’olulu iji mee ka mmiri dị n’ime ala gbagotekwuo. Nke a bụ ụzọ a kasị mara amara e si echekwa mmiri n’obodo mepere emepe.

NAULA: Nke a bụ ọdọ mmiri e nwetara site n’iji nkume gboo mmiri iyi. A na-adụ osisi ndị na-eche ndo n’akụkụ ya iji mee ka anwụ ghara ịmịkọrọ mmiri ahụ. A na-etinyekwa ọgwụ mkpá akwụkwọ n’ọdọ mmiri ahụ iji mee ka mmiri ya dị ọcha.

TANKI NA-AZA MMIRI, RAPAT: Nke a bụ obere tank e liri n’ala uzuzu ma ọ bụ nke nkume iji na-echekwa mmiri ozuzo. A na-eji ụfọdụ n’ime mmiri banyere na ya eme ihe. Ma, ndị nke fọdụrụnụ na-abanye n’ime ala, bụ́ nke na-eme ka mmiri dị n’ime ala gbagote.

BHANDARA: Nke a bụ tank e liri n’ala mmiri iyi ka mmiri na-abanye na ya ma si ebe ahụ na-abanyekwa na tank ndị e ji echekwa mmiri e ji eme ihe n’obodo ukwu.

QANAT: Nke a bụ olulu ndị e gwuru n’ugwu iji na-echete mmiri ozuzo. Ike ndọda na-eme ka mmiri banyere n’olulu ndị a nwee ike isi n’ọwara mmiri e gwuru n’okpuru ala sọrọ banye n’olulu ndị a chọrọ iji chekwaa ya, bụ́ ndị na-adị n’ebe dị nnọọ anya.

TANK NDỊ MMIRI NA-ESI N’OTU ABANYE N’ỌZỌ: Nke a bụ tank ndị ọ na-abụ ha ju n’ọnụ, mmiri ha esi n’ọwara mmiri na-asọbanye na tank ndị ọzọ e liri n’ebe ndịda ha. E ji tank ndị a echete mmiri ozuzo ndị sọọrọ banye n’ọwara mmiri ndị ahụ.

[Ebe E Si Nweta Foto]

Site n’ikike nke: S. Vishwanath, Rainwater Club, Bangalore, India

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 29]

Foto UN/DPI nke Evan Schneider sere

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 30]

Foto UN/DPI nke Evan Schneider sere