Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Isi Ihe Ise Ndị Na-enye Aka n’Ịchọta Ọrụ

Isi Ihe Ise Ndị Na-enye Aka n’Ịchọta Ọrụ

Isi Ihe Ise Ndị Na-enye Aka n’Ịchọta Ọrụ

ÒNYE na-achọta ọrụ kasị mma? Ọ̀ na-abụkarị onye kasị ruo eru inweta ya? “Ee e,” ka Brian, bụ́ ọkà n’inye ndụmọdụ maka ịchọta ọrụ, na-ekwu. “Onye na-achọtakarị ya bụ onye kasị agba mbọ ịchọta ya.” Gịnị ka ị pụrụ ime iji bụrụ onye na-agbakwu mbọ ịchọta ọrụ? Ka anyị tụlee aro ise.

Na-akpakọ Onwe Gị Ọnụ

Ọ bụrụ na a chụọla gị n’ezigbo ọrụ ị na-arụ, ma ọ bụ na i nweghị ọrụ ruo oge ụfọdụ, ọ dịịrị gị mfe ịda mbà n’obi. “Mgbe mbụ a chụrụ m n’ọrụ, enwere m olileanya ịchọta ọrụ ọzọ,” ka Katharina, bụ́ onye na-akwa ákwà na Germany, kwuru. “Ma mgbe m na-achọtalighị ọrụ ruo ọtụtụ ọnwa, abịara m daa mbà n’obi. N’ikpeazụ, ọ bịara ọbụna siere m ike ịgwa ndị enyi m banyere ya.”

Gịnị ka ị pụrụ ime iji kwụsị ịda mbà n’obi? “Ọ dị mkpa ka i nwee usoro ihe omume nke gị onwe gị ga na-agbaso dị ka à ga-asị na ị na-arụ ọrụ, bụ́ nke ga-eme ka ị mara ihe ndị ị ga-arụ n’ụbọchị,” ka akwụkwọ bụ́ Get a Job in 30 Days or Less, tụrụ aro ya. Ndị dere akwụkwọ ahụ tụrụ aro ka i “nwee ihe ndị i mere atụmatụ ịrụ kwa ụbọchị ma na-edekọ ihe ndị ị rụrụ edekọ.” Ọzọkwa, ha kwuru na “ihe mbụ ị ga-eme n’ụbọchị ọ bụla bụ ịdị na-ejikere ka à ga-asị na ị na-aga ọrụ.” N’ihi gịnị? “N’ihi na ijikere nke ọma ga-enyekwu gị obi ike ọbụnadị mgbe gị na mmadụ na-ekwurịta okwu na telifon.”

Ee, ị ghaghị iwere ịchọta ọrụ dị ka ọrụ gị, n’agbanyeghị oge ọ ga-ewe gị. Katharina, bụ́ onye a kpọtụrụ aha na mbụ, mere otú ahụ. O kwuru, sị: “Esi m n’aka ụlọ ọrụ ndị na-enye aka n’ịchọta ọrụ nweta adres na nọmba fon nke ụlọ ọrụ ndị pụrụ iwe m n’ọrụ. Edegaara m ụlọ ọrụ ndị kpọsara n’akwụkwọ akụkọ na ha chọrọ ndị ọrụ, akwụkwọ. Agara m n’akwụkwọ a na-edepụta nọmba fon nweta aha ụlọ ọrụ ndị pụrụ inwe ọrụ ndị ha na-emebeghị ka ọhaneze mara, ma kpọtụrụ ha. Edepụtakwara m akwụkwọ na-egosi iru eru m ma zigara ya ụlọ ọrụ ndị ahụ.” Katharina chọtara ezigbo ọrụ mgbe ọ gbasisịrị mbọ ike ịchọta ọrụ.

Na-achọ Ọrụ n’Ụlọ Ọrụ Ndị Na-ekwughị na Ha Chọrọ Ndị Ọrụ

Onye ọ́kụ̀ azụ nke ụgbụ ya kasị saa mbara yiri ka ọ̀ bụ ya ga-akasị egbute azụ. N’otu aka ahụ kwa, ịma otú ị ga-esi mee ka “ụgbụ” gị sakwuo mbara ga-eme ka i nwekwuo ohere inweta ọrụ. Ọ bụrụ na ọ bụ nanị ụlọ ọrụ ndị kpọsara n’akwụkwọ akụkọ ma ọ bụ n’Intanet na ha na-achọ ndị ọrụ ka ị na-achọ ọrụ na nke ha, ihe ka ọtụtụ n’ohere ọrụ ndị e nwere pụrụ ifunahụ gị. Ọtụtụ ụlọ ọrụ adịghị akpọsa ọrụ ndị ha nwere. Olee otú ị ga-esi chọọ ọrụ n’ụlọ ọrụ ndị ahụ na-ekwughị na ha chọrọ ndị ọrụ?

Tụkwasị n’ịkpọtụrụ ụlọ ọrụ ndị kpọsara na ha chọrọ ndị ọrụ, ihe ọzọ ị na-aghaghị ime dị ka Katharina mere bụ ịdị na-ewepụta oge kwa izu iji na-akpọtụrụ ụlọ ọrụ ndị i chere pụrụ inwe ọrụ ndị ị ga-arụli. Echerela ruo mgbe ha kwuru na ha na-achọ ndị ọrụ. Ọ bụrụ na manịja ekwuo na ọrụ adịbeghị, jụọ ya ma ọ̀ maara ụlọ ọrụ ọzọ ị pụrụ ịkpọtụrụ nakwa onye i kwesịrị ịgakwuru kpọmkwem n’ụlọ ọrụ ahụ. Ọ bụrụ na ọ gwa gị ụlọ ọrụ ị ga-akpọtụrụ, gbalịa kpọtụrụ ha ma gwa ha aha onye gwara gị ka ị bịa ebe ahụ.

Tony, bụ́ onye a kpọtụrụ aha n’isiokwu bu ụzọ, si otú a chọta ọrụ. Ọ na-ekwu, sị: “Akpọtụụrụ m ụlọ ọrụ dị iche iche, n’agbanyeghị na ha ekwughị na ha na-achọ ndị ọrụ. Otu ụlọ ọrụ gwara m na ọrụ adịbeghị, ma na m gbalịa bịaghachi n’ime ọnwa atọ. Emere m otú ahụ, ma nweta ọrụ.”

Primrose, bụ́ nne nanị ya na-azụ ụmụ na South Africa, mere ihe yiri nke ahụ. O kwuru, sị: “Mgbe m na-anara ọzụzụ maka ilekọta ndị nwere ihe ọghọm, ahụrụ m ụlọ a na-arụ ọhụrụ n’ebe chere ihu n’ebe ahụ m na-anara ọzụzụ, ma chọpụta na a gaje iji ya mere ebe a na-elekọta ndị agadi. Agbalịrị m ugboro ugboro ime ka mụ na onyeisi ogige ahụ hụ. N’ikpeazụ, ọ gwara m na ọrụ adịbeghị. Ma anọgidere m na-abịa iji mara ma m ga-enweta ọrụ ebe ahụ, ọ bụrụgodị ọrụ afọ ofufo. N’ikpeazụ, ha nyere m ọrụ m ga-arụ ruo nwa oge. Etinyere m obi m n’ọrụ ọ bụla ha nyere m. N’ihi ya, enwetakwuru m ihe ọmụma ma ghọzie onye ọrụ nke ụlọ ọrụ ahụ.”

Ị pụkwara ịgwa ndị enyi gị, ndị ezinụlọ gị, na ndị ọzọ gị na ha dị ná mma ka ha nyere gị aka chọọrọ gị ọrụ n’ụlọ ọrụ ndị na-ekwubeghị na ha na-achọ ndị ọrụ. Otú ahụ ka Jacobus, bụ́ onye ọrụ na-ahụ maka nchebe na South Africa, si chọta ọrụ. O kwuru, sị: “Mgbe ụlọ ọrụ m na-arụrụ ọrụ mechiri, emere m ka ndị enyi m na ndị ezinụlọ m mara na m na-achọ ọrụ. Otu ụbọchị, otu enyi m nụpeere ihe mmadụ abụọ na-akparịta ka ọ kwụ n’ahịrị na-achọ ịkwụ ụgwọ n’otu nnukwu ụlọ ahịa. Ná mkparịta ụka ahụ, otu nwanyị nọ na-ajụ ibe ya ma ọ̀ dị onye ọ maara na-achọ ọrụ. Enyi m ahụ tinyere ọnụ n’okwu ahụ ma gwa ya banyere m. Agara m hụ nwanyị ahụ ma nweta ọrụ.”

Na-adị Njikere Ime Mgbanwe

Iji nwekwuo ohere inweta ọrụ, ị ghaghị ịdị na-eme mgbanwe. Jaime, bụ́ onye a kpọtụrụ aha n’isiokwu bu ụzọ, kwuru, sị: “O yikarịghị ka ụdị ọrụ ị ga-enweta ọ̀ ga-enwezu ihe nile ị tụrụ anya ya. Ọ dị gị mkpa ịmụta inwe afọ ojuju n’ọrụ n’enwezughị ihe nile ị tụrụ anya ya.”

Ịdị njikere ime mgbanwe nwere ike ịpụta na ị ga-akwụsị ile ụdị ọrụ ụfọdụ anya ọjọọ. Tụlee ihe banyere Ericka, bụ́ onye bi na Mexico. Ọ bụ ezie na ọ natara ọzụzụ dị ka odeakwụkwọ ukwu, na mbụ, o siiri ya ike inweta ụdị ọrụ ọ chọrọ. “Amụtara m ịnakwere ọrụ ọ bụla kwesịrị ekwesị m hụrụ,” ka o kwuru. “Ereere m mmadụ ahịa ruo oge ụfọdụ. Erekwara m taco [keeki e tinyere anụ] n’okporo ámá ma hichaara ndị mmadụ ụlọ ha. N’ikpeazụ, enwetara m ụdị ọrụ ahụ m mụrụ.”

Mgbe a chụrụ Mary, bụ́ onye a kpọtụrụ aha n’isiokwu bu ụzọ, n’ọrụ odeakwụkwọ, ọ hụkwara mkpa ọ dị ime mgbanwe. Ọ kọwara, sị: “Agbaghị m isi akwara na ọ bụ ụdị ọrụ ahụ m rụburu ka m ga-achọtarịrị. Etinyere m akwụkwọ maka ọrụ ọ bụla m hụrụ, ọ bụrụgodị na ọ bụ ọrụ ụfọdụ ndị pụrụ ileda anya. N’ihi ya, abịara m nwee ike inweta ọrụ m ji na-azụ ụmụ m abụọ.”

Dee Akwụkwọ Dị Mma nke Na-egosi Iru Eru Gị

Ọ bụ iwu na ndị na-etinye akwụkwọ ka e were ha n’ọrụ n’ọkwá dị elu aghaghị ide ma kesaa akwụkwọ na-egosi iru eru ha. Ma, ụdị ọrụ ọ sọkwara gị na-achọ, ịkwadebe akwụkwọ na-egosi iru eru gị nke ọma pụrụ inyere gị aka nke ukwuu. “Akwụkwọ na-egosi iru eru mmadụ na-eme ka ndị pụrụ iwe gị n’ọrụ mara, ọ bụghị nanị onye ị bụ, kama ihe ị rụpụtaworo na ihe mere ha ji kwesị iwe gị n’ọrụ,” ka Nigel, bụ́ ọkà n’inye ndị na-achọ ọrụ ndụmọdụ, nke nọ n’Australia, kwuru.

Olee otú ị pụrụ isi dee akwụkwọ a? Ị ga-ede aha gị n’ozuzu ya, adres gị, nọmba fon gị, nakwa adres e-mail gị. Dee ebumnobi gị. Dee ebe ị gụruru akwụkwọ, na-eme ka ọzụzụ ọ bụla e nyere gị banyere ọrụ ahụ ị na-achọ, pụta ìhè. Dee banyere ọrụ ị rụtụrụla. Ihe ị ga-ede abụghị nanị ihe ị rụrụ kamakwa, ihe mgbaru ọsọ ndị i ruru na uru ọ baara ndị ị rụbuuru ọrụ. Deekwa ihe ụfọdụ banyere ọrụ ị rụburu, bụ́ ndị mere i ji ruo eru ịrụ ọrụ a ị na-achọ ugbu a. Dee banyere àgwà gị, ihe ndị na-amasị gị, na ihe ndị na-atọ gị ụtọ ime. Ebe ọ bụ na mkpa ụlọ ọrụ dị iche iche abụghị otu, ị pụrụ ịdị na-agbanwe ihe ndị i dere n’akwụkwọ ahụ mgbe ị na-achọ ọrụ n’ụlọ ọrụ nke ọ bụla.

Ì kwesịrị iweta akwụkwọ a ma ọ bụrụ na nke ahụ bụ ọrụ mbụ ị na-achọ? Eenụ! A pụrụ inwe ọtụtụ ihe ị rụtụrụla, bụ́ ndị e nwere ike iwere dị ka ahụmahụ i nwere n’ọrụ. Dị ka ihe atụ, ọ̀ dị ọrụ ndị ị na-enwe mmasị ịrụ, dị ka ịkwa nkà ma ọ bụ ikekwe ịrụzi ụgbọala? Ị pụrụ idepụta ha. Ọ̀ dịwo ọrụ afọ ofufo ị rụtụrụla? Depụta ụdị nke ị rụrụla na ihe mgbaru ọsọ ndị i rurula.—Lee igbe bụ́ “Ihe Atụ nke Akwụkwọ Na-egosi Iru Eru Mmadụ Maka Ndị A Na-ewetụbeghị n’Ọrụ.”

Mgbe ndị ị na-achọ ọrụ na nke ha na-akpọghị gị maka ajụjụ ọnụ, hapụrụ ha obere kaadị—ọ ga-akasị mma ma ọ dịrị sentimita 15 n’ogologo na sentimita 10 n’obosara—bụ́ nke ga-ebu aha gị, adres gị, nọmba fon gị, na adres e-mail gị, tinyere okwu dị nkenke nke na-egosi ọrụ ị mụrụ na ihe ndị ị rụpụtaworo. Ọ bụrụ na ọ dabara adaba, ị pụdịrị itinye foto gị ma ọ bụ nke gị na ndị ezinụlọ gị so see, n’azụ kaadị ahụ. Nye ya ndị nile pụrụ inye aka chọtara gị ọrụ, ma gwa ha ka ha nye ya onye ọ bụla ha ma na-achọ ndị ma ụdị ọrụ ị na-achọ. Mgbe onye chọrọ onye ọrụ hụrụ kaadị a, ọ pụrụ ịkpọ gị maka ajụjụ ọnụ—ọbụna wee gị n’ọrụ ma eleghị anya!

Ide akwụkwọ na-egosi iru eru gị ga-enyere gị aka ime ka ahụ́ ruo gị ala ka ị na-achọ ọrụ. Nigel, bụ́ onye a kpọtụrụ aha na mbụ, kwuru, sị: “Ide akwụkwọ na-egosi iru eru gị na-enyere gị aka ịkpakọ echiche gị ọnụ na ịma kpọmkwem ihe ndị bụ́ ihe mgbarụ ọsọ gị. Ọ na-emekwa ka obi sikwuo gị ike site n’inyere gị aka ịkwadebe ajụjụ ndị a pụrụ ịjụ gị mgbe a na-agba gị ajụjụ ọnụ.”—Lee igbe dị na peeji nke 7.

Na-akwadebe nke Ọma Maka Ajụjụ Ọnụ

Gịnị ka ịkwadebe nke ọma maka ajụjụ ọnụ gụnyere? Ị pụrụ ime nnyocha banyere ụlọ ọrụ ahụ ị na-atụ anya ịrụrụ ọrụ. Ka ị na-amatakwu banyere ụlọ ọrụ ahụ, ọ ga-eme ka i nwee ike ịza ajụjụ n’ụzọ ka mma mgbe a na-agba gị ajụjụ ọnụ. Nnyocha ahụ ga-enyekwara gị aka ịma ma ụlọ ọrụ ahụ ò nwere ụdị ọrụ ị na-achọ n’ezie ma ọ bụkwanụ mara ma ọ̀ bụ ụdị ụlọ ọrụ ị ga-achọ ịrụrụ ọrụ.

I mesịa nke ahụ, chee banyere ihe ị ga-eyi aga maka ajụjụ ọnụ ahụ. Ọ bụrụ na ọrụ ị na-achọ bụ ọrụ ọkpụkpụ aka, yiri uwe kwesịrị ekwesị ma dị ọcha. Iyi uwe dị ọcha na iji ejiji nke ọma ga-eme ka onye ị na-achọ ọrụ na nke ya mara na i ji onwe gị kpọrọ ihe, n’ihi ya kwa, na o yiri ka ị̀ ga-eji ọrụ gị akpọrọ ihe. Ọ bụrụ na ị na-atụ anya ịrụ n’ọfịs, yiri uwe kwesịrị ekwesị e weere na ọ dị mma maka ọrụ ọfịs n’ebe i bi. Nigel na-ekwu, sị: “Họpụta uwe ị ga-eyi ogologo oge tupu ị gawa maka ajụjụ ọnụ, ka i wee ghara ime ihe ọkụ ọkụ ma tinyekwuo onwe gị na gbalụ gbalu n’enweghị isi tupu oge eruo.”

Nigel tụkwara aro ka i rute n’ebe a kpọrọ gị maka ajụjụ ọnụ, ihe dị ka minit 15 tupu oge eruo. N’ezie, ọ dịghị mma ịbịa ogologo oge tupu oge eruo. Ma, ịbịa n’azụ oge pụrụ itinyere gị ájá na garị. Ndị ọkachamara na-ekwu na sekọnd atọ mbụ nke ajụjụ ọnụ dị nnọọ oké mkpa. N’ime ntakịrị oge ahụ, onye ga-agba gị ajụjụ ọnụ ga-ele otú i si jie ejiji na otú ahụ́ si ruo gị ala, bụ́ nke ga-emetụta echiche ọ ga-enwe banyere gị. Ọ bụrụ na ị bịa n’azụ oge, ọ ga-eme ka o nwee echiche na-ezighị ezi banyere gị. Cheta na ọ dịghị ohere ọzọ ị ga-enwe iji gbanwee echiche mbụ ọ ga-enwe banyere gị.

Chetakwa na onye ahụ ga-agba gị ajụjụ ọnụ abụghị onye iro gị. A sị kwuwe, ya onwe ya chọkwara ọrụ achọ ma eleghị anya, n’ihi ya, ọ maara otú obi dị gị. N’eziokwu, ọ pụrụ ịbụ na ahụ́ erughị ya ala, n’ihi na ikekwe e nyebeghị ya ọzụzụ banyere otú e si agba ajụjụ ọnụ ma ọ bụkwanụ nke e nyere ya enye erijughị afọ. Ọzọkwa, ọ bụrụ na ọ bụ ya nwe ụlọ ọrụ ahụ, ihe dị ukwuu pụrụ ifunahụ ya ma o were onye na-amaghị nke a na-akọ n’ọrụ ahụ.

Iji malite nke ọma, mụmụọrọ ya ọnụ ọchị ma kwee ya n’aka ma ọ bụrụ na nke ahụ bụ otú e si ekele ekele n’ebe i bi. N’oge a na-agba ajụjụ ọnụ ahụ, lekwasị anya n’ihe onye ahụ chọrọ gị n’aka na n’ihe ị ga-arụli. A bịa n’ihe ndị ị ga-ezere, Nigel na-ekwu, sị: “Anọgharịla n’oche ka onye ahụ́ na-erughị ala—ịnọzi anọzi na-egosi na obi siri gị ike. Atụsala ahụ́ gabiga ókè ma ọ bụ kwuo oké okwu, ekwukwala okwu rụrụ arụ. Zere ikwu okwu ọjọọ banyere ndị ị rụbuuru ọrụ ma ọ bụ ndị gị na ha rụkọburu ọrụ—ọ bụrụ na i mee otú ahụ, onye na-agba gị ajụjụ ọnụ nwere ike iche na ị ga-ekwukwa okwu ọjọọ banyere ọrụ a.”

Banyere ihe ndị ị ga-eme ma kwuo n’oge a na-agba gị ajụjụ ọnụ, ndị ọkachamara na-atụ aro ihe ndị na-esonụ: Na-ele onye na-agba gị ajụjụ ọnụ anya n’ihu, na-emegharị ahụ́ otú i si emegharị mgbe ị na-ekwu okwu, na-akpọpụtakwa okwu nke ọma. Kwuo eziokwu ma zaa ajụjụ ná nkenke, jụọkwa ajụjụ ndị dabara adaba banyere ụlọ ọrụ ahụ na ọrụ ahụ ị na-achọ. Mgbe a gbasịrị gị ajụjụ ọnụ, ọ bụrụ na ị ka chọrọ ọrụ ahụ, rịọ ha ka ha nye gị ya. Ime otú ahụ ga-egosi na ọ dị gị n’obi.

Site n’ịgbaso aro ndị ahụ a tụrụ n’elu, ị pụrụ ịchọta ọrụ n’oge na-adịghị anya. Ọ bụrụ otú ahụ, olee ihe ị pụrụ ime iji nwee ike ijigide ya?

[Igbe/Foto dị na peeji nke 6]

Ihe Atụ nke Akwụkwọ Na-egosi Iru Eru Mmadụ Maka Ndị A Na-ewetụbeghị n’Ọrụ

Aha Gị:

Adres Gị:

Nọmba Telifon na Adres E-Mail Gị:

Ebumnobi Gị: Ana m achọ ka enye m ọrụ dị ala n’ebe a na-emepụta ihe.

Agụmakwụkwọ: Agụsịrị m akwụkwọ n’Obodo Secondary School, n’afọ 2004.

Ihe Ndị Ị Gụrụ: Asụsụ, mgbakọ na mwepụ, ihe ọmụmụ kọmputa, na ọrụ ịkwa nkà.

Ihe Ndị Ị Na-emeli: Ana m arụ ọrụ aka nke ọma. Ana m arụzi ụgbọala ezinụlọ anyị mgbe nile. Anọ m n’ụlọ anyị rụọ oche na tebụl. Ọ na-atọ m ụtọ iji nkà m nwere ná mgbakọ na mwepụ eme ihe mgbe m na-arụ oche. Eso m ndị ọrụ afọ ofufo kụọ ụlọ gbamgbam. Apụrụ m iji ụdị kọmputa dị iche iche mee ihe ma na-enwe mmasị n’ịmụta ihe ọhụrụ na kọmputa.

Banyere Onwe Gị: Onye a pụrụ ịdabere na ya—aghara m akwụkwọ nanị ugboro abụọ n’afọ ahụ m gụsịrị akwụkwọ. Onye na-eme ihe n’eziokwu—ahụwo m wọlet ego dị na ya ma wegara ya onye nwe ya. Onye nwere omume enyi—ana m arụ ọrụ afọ ofufo mgbe nile n’obodo anyị ma na-enwe mmasị n’inyere ndị agadi aka. Egwuregwu—ana m enwe mmasị ịkụ basketball. Ihe ndị ị na-enwe mmasị ime—ana m enwe mmasị ịrụzi ụgbọala nakwa n’ọrụ ịkwa nkà.

Ndị A Pụrụ Ịjụ Ase: Ọ dị ma a chọọ ya. *

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 41 Ndị e nwere ike ịjụ ase gị pụrụ ịbụ onye nkụzi ụlọ akwụkwọ gị nke ma gị nke ọma ma ọ bụ onye ya na ezinụlọ unu dị ná mma nke na-achụ nta ego. Ọ bụrụ na onye ị na-achọ ọrụ n’ụlọ ọrụ ya agwa gị ka i nye ya aha ha, ị pụrụ ịtụwa anya na ọ pụrụ inwe mmasị iwe gị n’ọrụ. Hụ na ị natara ikike n’aka ndị ahụ ị chọrọ ka a jụọ ase.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 7]

Ajụjụ Ndị A Pụrụ Ịjụ Gị Mgbe A Na-agba Gị Ajụjụ Ọnụ

❑ N’ihi gịnị ka i ji tinye akwụkwọ maka ọrụ a?

❑ N’ihi gịnị ka i ji chọọ ịrụrụ ụlọ ọrụ a ọrụ?

❑ Olee ihe ị ma banyere ọrụ a/ụlọ ọrụ a?

❑ Ị̀ rụtụla ụdị ọrụ a?

❑ Olee ụdị ngwá ọrụ ị pụrụ iji rụọ ọrụ?

❑ Olee ahụmahụ i nwetụrụla n’ụdị ọrụ a?

❑ Olee nkà i nwere nke ị pụrụ iwebata n’ọrụ a?

❑ Kọọrọ m banyere onwe gị.

❑ Olee okwu ise i nwere ike iji kọwaa onwe gị n’ụzọ kasị mma?

❑ Ị̀ pụrụ ịrụ ọrụ ma ọrụ sie ike?

❑ N’ihi gịnị ka i ji hapụ ọrụ ikpeazụ ị rụrụ?

❑ N’ihi gịnị ka i ji nọrọ n’enweghị ọrụ ruo nnọọ ogologo oge?

❑ Olee echiche onye ikpeazụ ị rụụrụ ọrụ nwere banyere gị?

❑ Ugboro ole ka ị ghara ọrụ n’ebe ikpeazụ ị rụrụ ọrụ?

❑ Olee atụmatụ ị na-eme maka ọdịnihu?

❑ Olee oge ị ga-amalite ọrụ?

❑ Olee ihe ị kasị mara arụ?

[Igbe/Foto dị na peeji nke 9]

Gịnị Banyere Ụlọ Ọrụ Ndị Na-esi n’Intanet Achọtara Mmadụ Ọrụ?

Otu n’ime ebe ndị kasịnụ a na-achọ ọrụ n’Intanet nke ụlọ ọrụ na-achọtara mmadụ ọrụ na United States mepere, nwere nde akwụkwọ 17 na-egosi iru eru mmadụ, bụ́ ndị ha wepụtara ka ụlọ ọrụ ndị pụrụ iwe mmadụ n’ọrụ nwee ike ịhụ ha, nweekwa ọrụ dị ihe dị ka narị puku asatọ maka ndị na-achọ ọrụ. Nnyocha ndị e mere gosiri na ihe ruru pasent 96 nke ndị nọ ná mba ụfọdụ si n’Intanet achọ ọrụ. Ma, nnyocha ndị ọkachamara si ná mba 40 mere na-egosi na ọ bụ nanị pasent 5 n’ime ha si n’otú a achọta ọrụ n’ezie.

Idebe akwụkwọ na-egosi iru eru gị n’Intanet ga-eme ka ọnụ ọgụgụ ndị pụrụ iwe gị n’ọrụ bụ́ ndị maara na ị na-achọ ọrụ bukwuo ibu, ma, saa anya mmiri. Ọ na-enyekwu ndị mmadụ ohere igwu gị wayo. Ka i wee ghara ịdaba n’aka ndị wayo, ndị ọkachamara banyere ọrụ na-enye ndụmọdụ ndị na-esonụ:

1. Tupu i zigara ụlọ ọrụ ndị na-esi n’Intanet achọtara mmadụ ọrụ akwụkwọ na-egosi iru eru gị, gụọ banyere ụkpụrụ izobe ihe nke ha na-agbaso. Ụfọdụ ụlọ ọrụ ndị a na-eresị ụlọ ahịa ma ọ bụ ndị ọzọ nwere mmasị, akwụkwọ ahụ na-egosi iru eru gị.

2. Zigara nanị ụlọ ọrụ ole na ole na-esi n’Intanet achọtara mmadụ ọrụ, bụ́ ndị nwere aha ọma, akwụkwọ na-egosi iru eru gị. Ọ dị mkpa ka i chebe ihe ọmụma banyere onwe gị ka a ghara iji ya mee ihe n’ụzọ na-adịghị mma. N’akwụkwọ ahụ i dere banyere iru eru gị, i kwesịtụghị idenye ihe onye ohi pụrụ iji zuo gị ohi ma tinye gị ná nsogbu ego. Ọ dịghị mkpa na ezigbo ụlọ ọrụ na-ewe mmadụ n’ọrụ ga-ama nọmba ihe ndekọ ego gị n’ụlọ akụ̀, nọmba kaadị i ji azụ ihe n’aka, ma ọ bụ ụbọchị a mụrụ gị.

3. Kpachara anya maka nkwa ọrụ ndị a na-akpọghị okwu aha na ha. Pam Dixon, bụ́ onye nchọpụta na-arụ n’òtù World Privacy Forum, na-ekwu na ọ bụrụ na a kpọghị okwu aha mgbe a na-ekwe nkwa ọrụ, ọ na-egosikarị na nkwa ahụ abụchaghị ezigbo ya. “Nkwa ndị dị ka ‘Ọrụ anyị nwere karịrị akarị’ ma ọ bụ ‘Anyị na ụlọ ọrụ ndị a ma ama na-arụkọ ọrụ,’ bụ ihe ndị na-egosi na agwọ nọ n’akịrịka,” ka o kwuru, na-agbakwụnye, sị: “Ihe ọzọ na-egosi ya bụ ụlọ ọrụ i zigabuuru akwụkwọ na-egosi iru eru gị ịgwa gị ka i zite ọzọ.”

Cheta na ozugbo akwụkwọ na-egosi iru eru gị si n’Intanet banye n’aka ndị pụrụ iwe mmadụ n’ọrụ ma ọ bụ ndị ọzọ nwere mmasị na ya, ọbụnadị ụlọ ọrụ ndị kasị nwee aha ọma, apụghị ịchịkwa ihe e ji ya eme.

[Ihe Osise/Foto dị na peeji nke 5]

ỊCHỌ ỌRỤ

Na-akwadebe nke ọma maka ajụjụ ọnụ

Dee akwụkwọ dị mma nke na-egosi iru eru gị

Na-adị njikere ime mgbanwe

Na-achọ ọrụ n’ụlọ ọrụ ndị na-ekwughị na ha chọrọ ndị ọrụ

Na-akpakọ onwe gị ọnụ

[Foto dị na peeji nke 7]

Iji chọta ọrụ, ọ dị mkpa na ị ga-achọsi ya ike ma mee nnyocha nke ọma banyere ya

[Foto dị na peeji nke 8]

Iji ihe kpọrọ ihe ga-enyere gị aka mgbe a na-agba gị ajụjụ ọnụ