Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mụta ihe Bible Na-akụzi

Mụta ihe Bible Na-akụzi

Mụta ihe Bible Na-akụzi

Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? bụ broshuọ dị peeji 32 nke ya na magazin a hà. E mere ya iji nyere ndị mmadụ aka ịghọta ozizi Bible ndị bụ́ isi. Broshuọ a na-akọwa n’ụzọ doro anya ihe bụ́ nzube Chineke maka ihe a kpọrọ mmadụ ma na-enye ihe ọmụma sitere na Bible bụ́ ndị na-eme ka anyị mara ihe ọ dị mkpa ka anyị mee iji nweta ihu ọma ya. Ụfọdụ n’ime ihe ọmụmụ ndị na-adọrọ mmasị na ya bụ “Ònye Bụ Chineke?,” “Ònye Bụ Jisọs Kraịst?,” “Gịnị Bụ Nzube Chineke Maka Ụwa?,” na “Gịnị Bụ Alaeze Chineke?”

Anyị na-agba gị ume ịrịọ ka e zitere gị otu broshuọ a ma ọ bụ inweta ya n’ebe anyị na-edebe ihe ọmụma n’Intanet bụ́ www.watchtower.org. E nwere broshuọ a n’ihe karịrị narị asụsụ abụọ na iri ise.

Iji nweta otu broshuọ a, kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè unu. Ọ bụrụ na ị ga-enwe mmasị ka mmadụ kpọtụrụ gị, biko dejupụta akụkụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta dị na peeji a ma zite ya n’adres e dere na ya ma ọ bụ n’adres nke kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 5 na magazin a.

□ Biko kpọtụrụnụ m iji duziere m ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.