Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ntụtụaka Ọ̀ Bụ Egwuregwu Nsogbu Na-adịghị Na Ya Ka Ọ̀ Bụ Mpụ?

Ntụtụaka Ọ̀ Bụ Egwuregwu Nsogbu Na-adịghị Na Ya Ka Ọ̀ Bụ Mpụ?

Ntụtụaka Ọ̀ Bụ Egwuregwu Nsogbu Na-adịghị Na Ya Ka Ọ̀ Bụ Mpụ?

WEREGODỊ ya na ị na-ahụ ihe a na-esonụ. Ụmụ agbọghọ abụọ yi uwe na-ewu ewu emeghee ọnụ ụzọ e si aba n’otu nnukwu ụlọ ahịa ma banye na ya. Ha agara ruo ebe a kpọsara ihe ndị e ji achọ mma. Otu onye nche yi uwe ndị nche esochie ha ma kwụsị n’ebe dị ihe dị ka mita 10 site n’ebe ha nọ. Ya akwụrụ chịfee aka n’azụ. Ya ana-ele ụmụ agbọghọ ahụ ka ha na-emetụgharị mkpọ uhie ọnụ na nke uri anya aka.

Ha ejiri isi anya lee onye nche ahụ, bụ́ onye nọkwa na-ele ha. Obi amapụtụ ha. Otu n’ime ha agaa n’ebe a kpọsara ihe a na-ete ná mbọ aka ma welite mkpọ ole na ole n’ime ha. Ya emee ihu ka à ga-asị na ọ na-atụle nke ọ ga-azụ. Ya edebe otu n’ime ha ma welite ọzọ, bụ́ nke ụcha ya ka gbajie ojii.

Onye nche ahụ ewepụtụ anya n’ebe ha nọ ma tụgharịa lee anya n’azụ. Dị nnọọ ka à ga-asị na e gbuuru ha pịọm, ụmụ agbọghọ ahụ ewere uri ọnụ na mkpọ ihe a na-ete ná mbọ fabanye n’akpa ha ozugbo. Ha emee ihu ka ọ dịghị ihe ha mere, ma obi ha akụsiwezie ike. Ha anọrọ ebe ahụ ruo minit ole na ole, anya otu n’ime ha adịrị n’ebe a kpọsara ihe e ji akpụcha mbọ aka, ebe anya onye nke ọzọ dị n’ebe a kpọsara uri anya.

Ha abụọ elee ibe ha anya, kwee n’isi, ma malite ịpụ. Onye nche ahụ apụọrọ ha n’ụzọ, ha amụmụọrọ ya ọnụ ọchị ka ha na-agafe. Ha erutewe n’ebe a kpọsara ngwá ekwe ntị, bụ́ nke chere ihu n’ebe onye a na-akwụ ụgwọ nọ, ma kwụsị lewe ihe ndị ahụ. Ha abụọ atakwụnyere ibe ha banyere ihe ndị e ji etinye ekwe ntị. E mesịa, ha agawazie n’ebe ọnụ ụzọ.

Ụkwụ ọ bụla ha zọpụrụ, obi ha akụsiwekwuo ike, na-eme ka ụjọ na-atụ ha nakwa obi aṅụrị ha na-enwe mụbaa. Ka ụmụ agbọghọ ahụ na-agafe n’ọnụ ụzọ ụlọ ahịa ahụ, ya adị ha ka ha maliwe elu, ma ha ejidesie onwe ha ike mechie ọnụ. Ozugbo ha pụtara èzí, i lee ha anya n’ihu, ị ga-ahụ na ụjọ ji ha. Ụjọ ahụ ji ha ejiri nwayọọ kwụsị, ha ekutuo ume. Ha agasiwe ije ike, ahụ́ ana-atọkwa ha bịrịbịrị. Nanị ihe dị ha n’obi bụ: ‘Anyị alaferela!’

Ụmụ agbọghọ abụọ a bụ ndị e chepụtara echepụta, ma ihe a anyị kọrọ banyere ya na-eme nnọọ eme. A na-ekwu na ntụtụaka a na-eme nanị na United States n’otu ụbọchị na-eru ihe dị ka otu nde, ma ntụtụaka bụ nsogbu zuru ụwa ọnụ. Dị ka anyị ga-ahụ, nsogbu ọ na-akpata karịrị akarị. Otú ọ dị, ihe ka ọtụtụ ná ndị aka ntụtụ adịchaghị achọ ịma banyere nsogbu ha na-akpata. Ọbụna ụfọdụ ndị ji ego ịzụ ihe na-ahọrọ izuru ya ezuru. N’ihi gịnị?