Ntụtụaka Ònye Na-akwụ Ụgwọ Ya?
Ntụtụaka Ònye Na-akwụ Ụgwọ Ya?
NA Japan, otu onye nwere ụlọ ahịa jidere otu nwatakịrị nwoke ka ọ na-ezu ohi ma kpọọ ndị uwe ojii. Mgbe ndị uwe ojii bịara, nwa ahụ agbawa ọsọ. Ndị uwe ojii achụwa ya. Ka nwa ahụ si n’ụzọ ụgbọ okporo ígwè na-agbafe, ụgbọ akụgbuo ya.
N’ihi otú e si kọsaa ihe ahụ merenụ, ụfọdụ mmadụ katọrọ onye nwe ụlọ ahịa ahụ n’ihi ndị uwe ojii ahụ ọ kpọrọ. O mechiri ụlọ ahịa ya ahụ ruo mgbe akụkọ ahụ nyụrụ ka ọkụ. Mgbe ọ maliteghachiri ahịa, ndị aka ntụtụ abịawakwa ọzọ. Otú ọ dị, ihe mere ya mbụ mere ka ụjọ tụwa ya ijide ndị ohi ahụ. A bịaziri mara ụlọ ahịa ya dị ka ebe dị mfe izu ohi. O teghị aka, ahịa ya adaa.
N’ezie, ihe mere nwoke a dị njọ karịa ihe na-eme ọtụtụ ndị, ma ọ na-eme ka a ghọta otu eziokwu dị mkpa. Ntụtụaka na-efu ihe dị ukwuu—n’ọtụtụ ụzọ nakwa nye ọtụtụ ndị. Ka anyị lebatụkwuo anya n’oké ihe ụdị ohi a na-efu.
Otú Ndị Nwe Ụlọ Ahịa Si Akwụ Ụgwọ Ya
Ntụtụaka na-efu ndị ahịa nọ n’ụwa ijeri kwuru ijeri dollar kwa afọ. Ụfọdụ na-ekwu na ihe ọ na-efu ndị ahịa nọ na United States karịrị ijeri dollar iri anọ. Mmadụ ole ka ahịa ha ga-adịgideli ma òkè nke ha n’ego há otú ahụ funahụ ha? Ọtụtụ ụlọ ahịa apụghị ịnagide nsogbu a. Mgbe ndị ohi batara n’ụlọ ahịa, ha pụrụ izukpọ ahịa mmadụ gbawara mbọ ya ná ndụ ya nile.
“Tinyere asọmpi a na-enwe n’azụmahịa, ntụtụaka bụ ihe ọzọ na-akpata nchegbu. E jiri aka a, amaghị m ma ahịa anyị a ọ̀ ga-adịgidekwa,” ka Luke, bụ́ onye nwere ụlọ ahịa na New York City, kwuru. O jighị ego ịzụ kamera a na-edebe n’ụlọ ahịa iji na-ahụ ihe na-eme na ya. Banyere ndị ohi, o kwuru, sị: “Onye ọ bụla pụrụ izu m ohi, ọbụna ezigbo ndị ahịa m.”
Ụfọdụ na-ewere ya na nsogbu a Luke nwere adịghị ihe ọ bụ. Ha na-ekwu, sị, “Ndị a na-akpata ego buru ibu n’ahịa ha. Ya mere, ihe m weere adịghị ihe ọ bụ.” Ma, uru ego a na-enweta n’ụlọ ahịa ndị na-akpọsa ngwá ahịa akpọsa ọ̀ na-ehi nne n’ezie?
N’ebe ụfọdụ, onye nwere ụlọ ahịa na-atụkwasị pasent 30, 40, ma ọ bụ 50 n’isi ego nke otu ngwá ahịa, ma ego a ọ tụkwasịrị abụghị nanị uru. Ọ na-eji ego a ọ tụkwasịrị akwụ ụgwọ ndị dị ka ụgwọ ụlọ, ụgwọ ụtụ isi, ụgwọ ọnwa nke ndị o were n’ọrụ. O jikwa ya arụzi ebe mebiri emebi n’ụlọ ahịa ya nakwa ngwá ọrụ ndị mebiri emebi, jirikwa ya akwụ ụgwọ inshọransị, ụgwọ ọkụ, ụgwọ mmiri, ụgwọ ihe e ji eme ka ụlọ kporo ọkụ, ụgwọ telifon, na ụgwọ ngwá e ji eche nche. Mgbe ọ kwụsịrị ụgwọ a nile, uru ya pụrụ ịbụ pasent 2 ma ọ bụ 3. N’ihi ya, mgbe mmadụ zuuru ihe n’ụlọ ahịa, otu akụkụ nke ihe onye nwe ụlọ ahịa ahụ gaara eji biri efunahụla ya.
Gịnị Banyere Izuru Ụmụ Obere Ihe?
Mgbe otu nwatakịrị nwoke na nne ya so banye n’otu ụlọ ahịa, nwa ahụ gara n’ebe a kpọsara swiiti. Ya emepee otu mkpọ swiiti ma were otu swiiti zobanye n’akpa uwe ya. Izuru ụmụ obere ihe dị ka nke ahụ ọ̀ na-eme ka ahịa daa?
N’otu broshuọ Ngalaba Na-ahụ Maka Obere Ụlọ Ahịa na United States bipụtara, nke aha ya bụ Curtailing Crime—Inside and Out, ha kwuru, sị: “Onye na-emekarị ọ gaa ebe a ọ tụtụrụ mkpịsị akwụkwọ, ọ gaa ebe ọzọ tụtụrụ kakụletọ, nwere ike ọ gaghị ewere ya na ọ bu ezigbo ohi ka ọ na-ezu. Ma, ndị nwe obere ụlọ ahịa, bụ́ ndị na-adọga ịhụ na ahịa ha na-aga aga, na-ewere ya na ọ bụ ogbugbu ka a na-egbu ha.” Ebe uru ha na-enweta na-epe nnọọ mpe, iji nwetaghachi ihe ọnụ ahịa ha ruru otu puku dollar, bụ́ nke ndị aka ntụtụ na-ezuru n’otu ụlọ ahịa kwa afọ, onye nwe ụlọ ahịa aghaghị irekwasị narị swiiti itoolu ma ọ bụ narị mkpọ nri atọ na iri asatọ ọzọ kwa ụbọchị. Ya mere,
ahịa na-ada ma ọ bụrụ na ọtụtụ ụmụaka na-ezuru swiiti n’ụlọ ahịa. Ọ bụ ya bụ nsogbu dị na ya.Ọtụtụ iri nde mmadụ, ma nwata ma okenye, ma ọgaranya ma ogbenye, bụ́ ndị si n’agbụrụ nakwa n’obodo nile, na-ezuru ihe n’ọmà ahịa nakwa n’ụlọ ahịa dị iche iche. Gịnị si na ya apụta? Kansụl Na-ahụ Maka Igbochi Mpụ na United States na-ekwu na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ụlọ ahịa nile dị na United States na-emechi n’ihi ohi a na-ezu na ha. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ụlọ ahịa ndị dị ná mba ndị ọzọ nọkwa ná nsogbu dị otú ahụ.
Ndị Na-azụ Azụ Na-akwụ Ụgwọ Ya
Ọnụ ahịa na-arị elu mgbe ndị mmadụ na-ezuru ihe n’ụlọ ahịa. N’ihi ya, n’ebe ụfọdụ, ndị na-azụ ihe na-akwụ narị dollar atọ kwa afọ dị ka ego a tụkwasịrị n’ọnụ ahịa n’ihi ntụtụaka e mere. Nke a pụtara na ọ bụrụ na ị na-akpata dollar 60 n’ụbọchị, ị ga-arụ ọrụ ruo ihe dị ka otu izu kwa afọ iji kwụọ ụgwọ ihe ndị ọzọ zuuru. Ị̀ ga-emenwu ya? Nye ndị larala ezumike nká bụ́ ndị ihe ha ji biri bụ ụgwọ ezumike nká ha ma ọ bụkwanụ ndị nne na-azụ ụmụ nanị ha bụ́ ndị na-adọga ịhụ ihe ezinụlọ ha ga-eri, ego ha rụtara n’otu izu isi otú ahụ funahụ ha bụ igbu ha egbu. Ọ bụghị nanị ihe a ka ọ na-efu.
Ndị nile bi n’ógbè e nwere ụlọ ahịa pụrụ ịta ahụhụ ya ma ụlọ ahịa ahụ mechie. A kọrọ na ọ bụ ntụtụaka mere otu ụlọ ahịa na-ere ọgwụ n’otu ógbè dị n’America ji mechie. Iji zụta ọgwụ, ọtụtụ ndị agadi na ndị ahụ́ na-esighị ike bi n’ógbè ahụ aghaghị ịga kilomita abụọ na ọkara iji ruo ebe ọzọ a na-ere ọgwụ. Otu onye ọrụ gọọmenti kwuru, sị: “Jirigodị oche nkwagharị gaa ya ka ị mara ihe a na-akọ.”
Ihe Dị Ukwuu Ọ Na-efu Ndị Nne na Nna
Bruce bụ nwoke nwere ụkpụrụ omume dị elu, onye na-akụziri ụmụ ya ka ha na-eme ihe n’eziokwu. Otu ụbọchị, e jidere nwa ya nwanyị ka ọ na-ezu ohi. O kwuru, sị, “O nyeghị m ọnụ okwu. Chegodị ka ọ ga-adị gị ma a kpọọ gị na fon gwa gị na e jidere nwa gị nwanyị ka ọ na-eme aka ntụtụ. O were anyị ọtụtụ afọ iji zụlite nwa anyị a ka ọ bụrụ ezigbo mmadụ, ma legodị ihe o mere. Ọ dịtụghị mgbe anyị chere na ọ ga-enupụ isi n’ụdị a.”
Bruce bịara nwewe oké nchegbu banyere nwa ya nwanyị na ihe ga-abụ ọnọdụ ya n’ọdịnihu. Ọzọkwa, ọ kwụsịrị ọrụ ya dị ka onye nkụzi okpukpe a na-adịghị akwụ ụgwọ. “Olee ihu m ga-eji nọrọ n’elu ikpo okwu na-agwa ọgbakọ okwu? Olee otú m ga-esi jiri akọ na uche dị ọcha na-akụziri ha otú ha ga-esi zụlite ụmụ ha? Echeghị m na ọ dị mma ime ya otú ahụ.” O yiri ka nwa ya nwanyị echeghị echiche otú ohi ahụ o zuru ga-esi metụta nna ya.
Otú Ndị Aka Ntụtụ Si Akwụ Ụgwọ Ya
N’oge ochie, ndị nwere ụlọ ahịa jide ndị aka ntụtụ, ha na-adọsikarị ha aka ná ntị ike ma hapụ ha ka ha laa. Taa, ndị nwere ụlọ ahịa na-ejide ọbụna ndị mere aka ntụtụ na nke mbụ ya ma kpọchie ha. Mgbe ahụ ka ndị ohi ahụ na-aghọta na mpụ ha abụghị obere ihe. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Natalie chọpụtara nke a n’onwe ya.
Natalie kwuru, sị, “Ka m na-ezukwu ohi ka obi na-esikwu m ike. Obi m gwara m na ọ bụrụgodị na e jide m, ego m ga-akwụ ọkàiwu na ụlọikpe agaghị aharu ka ego m gaara akwụ iji zụta ọmarịcha uwe nile ahụ m na-ezuru.” Ihe obi Natalie gwara ya abụghị eziokwu.
E jidere ya ka ọ na-ezu ohi uwe, ndị uwe ojii atụọkwa ya ịga n’aka kpụrụ ya pụọ. Mgbe ha ruru n’ogige ndị uwe ojii, ọ bịanyere mkpịsị aka ya n’akwụkwọ, a kpọchiekwa ya n’ebe a kpọchiri ndị omekome ndị ọzọ. Ọ nọrọ ọtụtụ awa ebe ahụ ka ndị mụrụ ya na-eme ndokwa ịbịa gbapụta ya.
Natalie na-agwa onye ọ bụla na-eche echiche izu ohi, sị: “Nara ndụmọdụ m. Kama izuru uwe ma ọ bụ jean ọ bụ na-enweghị isi na ọdụ, ọ ka mma iji ego gị zụrụ ya.” Ọ na-ekwu na ọ bụrụ na ị họrọ izuru ya ezuru, “ị ga-akwa ụta maka ya ruo nnọọ ogologo oge.”
Mmadụ inwe ihe ndekọ na e jidetụla ya maka ịda iwu mpụ bụ ihe e kwesịrị ịkwara ụta. Ndị a matụrụla ikpe maka aka ntụtụ pụrụ ịbụ ndị ọ na-ewute ịchọpụta na e chefubeghị iwu ahụ ha dara, kama na a ka ji maka ya ele ha anya ọjọọ, dị ka à ga-asị na nsị tere ha n’uwe. O nwere ike bụrụ na onye aka ntụtụ aghaghị ikwupụta mpụ ahụ o mere ma ọ chọwa ịbanye na mahadum. Ọ pụrụ isiri ya ike inweta ọrụ ndị dị ka ọrụ dọkịta, dọkịta ezé, ma ọ bụ ọrụ ịtụ ụkpụrụ ụlọ. Ụlọ ọrụ ndị ọ bịara ịchọ ọrụ na ha ga-eche echiche ugboro abụọ tupu ha enyewe ya ọrụ. Ọ pụkwara inwe nsogbu ndị a n’agbanyeghị na ọ kwụọla ụgwọ ụlọikpe kwuru ka ọ kwụọ, ma kwụsịkwa izu ohi.
Ntụtụaka pụrụ ifu onye na-eme ya ihe, ọbụna ma a sị na e jideghị ya maa ya ikpe. Hector, bụ́ onye a kpọtụrụ aha ná mmalite, chọpụtara nke ahụ. O kwuru, sị, “Ana m alafere mgbe nile. E jidetụbeghị m ebe m na-ezu ohi.” Ma, ọ kwụrụ ụgwọ ya. Ka ọ na-echeta oge ọ na-eme ya, o kwuru, sị: “Echere m na ọ dị otu ihe ndị na-eto eto kwesịrị ịghọta: Ị na-aghọrọ mkpụrụ ị kụrụ. Ọ bụrụgodị na ndị uwe ojii ejidetụbeghị gị, ị ka ga-akwụ ụgwọ ya.”
Ntụtụaka abụghị mpụ ọ na-adịghị onye e megbutere na ya. Ihe ndị aka ntụtụ na-ezuru abụghịkwa nke a na-adịghị akwụ ụgwọ ha. Onye ọ bụla na-eme aka ntụtụ kwesịrị ịhapụ ya kpamkpam. Ma, olee otú onye na-eme aka ntụtụ pụrụ isi nweta ume iji kwụsị izu ohi? Ọ̀ dị mgbe a ga-eme ka ụdị mpụ a kwụsị?
[Foto dị na peeji nke 19]
Ntụtụaka na-eme ka ụlọ ahịa dị iche iche mechie
[Foto dị na peeji nke 19]
Ntụtụaka na-efu onye ọ bụla ihe
[Foto ndị dị na peeji nke 20]
Ime aka ntụtụ na-emetụta ọdịnihu gị
[Ebe E Si Nweta Foto]
Akara mkpịsị aka: © Morocco Flowers/ Index Stock Imagery