Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Okwu Rere Ure Adịghị n’Asụsụ Anyị”

“Okwu Rere Ure Adịghị n’Asụsụ Anyị”

“Okwu Rere Ure Adịghị n’Asụsụ Anyị”

GỊNỊ bụ okwu rere ure? Ọ bụ “okwu mkparị, okwu rụrụ arụ, ma ọ bụ okwu na-adịghị enye nsọpụrụ.” (The American Heritage Dictionary) N’ụzọ dị mwute, n’ọtụtụ mba, ọtụtụ mmadụ na-ekwu okwu rere ure. Ọ bụ ezie na n’oge ochie, ọ bụ ụmụ nwoke ka a maara na-ekwukarị okwu rere ure, taa, ọ na-adịwaga mfe ịnụ okwu ọjọọ n’ọnụ ụmụ nwanyị. Otú ọ dị, n’ọdịnala ụfọdụ, a dịbughị anụ ebe a na-ekwu okwu rere ure. Were, dị ka ihe atụ, ihe James Kaywaykla, bụ́ onye Apache Indian nke America, kwuru.

A mụrụ James n’ihe dị ka afọ 1873 n’obodo New Mexico, nke dị na United States. N’afọ ndị ikpeazụ ya, bụ́ mgbe ọ fọrọ nke nta ka o ruo afọ 90, ọ kọrọ ihe a na-esonụ:

“N’ụtụtụ otu ụbọchị, olu nna m ochie kpọtere m n’ụra. Ọ nọ ọdụ n’ihu ụlọ anyị, chee anyanwụ ụtụtụ ihu ma na-abụ abụ a na-akpọ Abụ Ụtụtụ. Nke a bụ abụ a na-abụrụ Ussen . . . na-ekele Ya maka otu n’ime onyinye ndị kasị mma o nyere—ịhụnanya dị n’etiti nwoke na nwanyị, bụ́ nke ndị Apache weere dị ka ihe dị nsọ. * Ọ dịtụghị mgbe ha na-eji ihe gbasara mmekọahụ ama njakịrị rụrụ arụ, ha apụghịkwa ịghọta ihe mere Ndị Bekee ji eji ihe metụtara ịtụrụ ime na ịmụ nwa ama njakịrị. N’anya ndị Apache, nke ahụ dị njọ dị ka iji aha Chineke eme ihe efu. Eji m eziokwu ahụ bụ́ na okwu rere ure adịghị n’asụsụ anyị anya nnọọ isi. Anyị na-ekele Onye Okike nke Ndụ maka ihe ùgwù nke ikere òkè n’ikepụta ndụ ọhụrụ.”—Akwụkwọ bụ́ Native Heritage, nke Arlene Hirschfelder dezigharịrị.

Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku afọ abụọ gara aga, Onye Kraịst bụ́ Pọl onyeozi dere, sị: “Ka okwu rere ure ghara isi unu n’ọnụ pụta, kama okwu ọ bụla dị mma maka iwuli elu dị ka ọ pụrụ ịdị mkpa, ka o wee nye ndị na-anụ ya ihe dị ụtọ.” O dekwara, sị: “Ka a ghara ihotadị ịkwa iko na ụdị adịghị ọcha ọ bụla ma ọ bụ anyaukwu n’etiti unu, dị nnọọ ka o kwesịrị ndị nsọ; ma ọ bụ omume ihere ma ọ bụ okwu nzuzu ma ọ bụ okwu njakịrị rụrụ arụ, bụ́ ihe ndị na-ekwesịghị ekwesị, kama nke ahụ ịdị na-enye ekele.”—Ndị Efesọs 4:29; 5:3, 4.

Olee otú mmadụ pụrụ isi wepụ okwu rere ure ma ọ bụ okwu njakịrị rụrụ arụ n’obi, n’uche nakwa n’ọnụ ya? Ndụmọdụ Pọl nyere ndị Filipaị pụrụ inyere anyị nile aka. O kwuru, sị: “Ụmụnna m, ihe ọ bụla nke bụ́ eziokwu, ihe ọ bụla nke kwesịrị nchebara echiche, ihe ọ bụla nke bụ́ ezi omume, ihe ọ bụla nke dị ọcha, ihe ọ bụla nke na-akpali ịhụnanya, ihe ọ bụla nke a na-ekwu okwu ọma banyere ya, omume ọma ọ bụla dịnụ na ihe ọ bụla dịnụ nke kwesịrị otuto, nọgidenụ na-atụle ihe ndị a.”—Ndị Filipaị 4:8.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Dị ka nkwenkwe ndị Apache si dị, Ussen bụ onye okike nke ndụ.

[Ebe E Si Nweta Foto Ndi Dị na peeji 23]

Foto nile: Library of Congress, Prints & Photographs Division; akara ndị Apache: Dover Publications, Inc.