Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

(A pụrụ ịchọta azịza nke ajụjụ ndị a n’akụkụ Bible ndị e zoro aka na ha, e bipụtakwara azịza ha nile na peeji nke 25. Iji nwetakwuo ihe ọmụma, lee akwụkwọ bụ́ “Insight on the Scriptures” nke Ndịàmà Jehova bipụtara.)

1. Ọ bụ ezie na e kwughị ókè ọ ga-aharu, olee ihe Jehova chọrọ ka mba Izrel were nke kasị mma nye ya n’onyinye? (Ọpụpụ 23:19)

2. N’ihi na ndị Chineke na-enwe ọganihu ma yie ndị na-enweghị nchebe, ònye ga-abịa ịwakpo ha? (Ezikiel 38:10-12, 14-16)

3. Olee onye ọchịchị hapụrụ Pọl onyeozi n’ụlọ mkpọrọ ruo afọ abụọ na Sesaria ka ọ na-atụ anya ka Pọl nye ya aka azụ? (Ọrụ 24:26, 27)

4. Olee ihe a chọrọ ka ndị ekpenta nọ n’Izrel jiri oké olu na-ekwu iji dọọ ndị mmadụ aka ná ntị iwezụga onwe ha ka ọrịa ahụ wee ghara ife ha? (Levitikọs 13:45)

5. Olee otú Jekọb si rịba ili Rechel ama? (Jenesis 35:20)

6. N’ihi gịnị ka Jehova ji mee ka a dọrọ ndị Izrel n’agha ọtụtụ ugboro? (2 Ndị Eze 18:11, 12)

7. Kama ịbụ ihe e ji ama amamihe nke sitere n’elu, olee ihe Jems kwuru na ekworo, esemokwu, na ịgha ụgha megide eziokwu ahụ bụ? (Jems 3:15)

8. Olee osisi Solomọn rịọrọ Eze Haịram ka o butere ya iji wuo ụlọ nsọ ahụ nakwa iji mee ụbọ akwara na une? (1 Ndị Eze 10:11, 12)

9. Olee mmadụ atọ Jehova gwara Ịlaịja ka o tee mmanụ? (1 Ndị Eze 19:15, 16)

10. Ònye bụ́ onyeisi nchụàjà “n’okwu ọ bụla nke Jehova” n’oge ọchịchị Jehoshafat? (2 Ihe E mere 19:11)

11. Olee ihe Pọl dụrụ Timoti ọdụ ka ọ bụrụ nzube o ji na-azụ onwe ya? (1 Timoti 4:7)

12. Olee Fero Ijipt nke Nebukadneza meriri n’agha na Kakemish n’oge ọchịchị Eze Jehoiakim nke Juda? (Jeremaịa 46:2)

13. N’ihi ezi uche Abigail, olee ihe ọjọọ Devid zeere? (1 Samuel 25:31)

14. Olee aha ọzọ a kpọrọ nnụnụ n’ime Bible? (Jenesis 1:26)

15. N’ihi gịnị ka akwụkwọ Ilu ji dụọ ọdụ ka ụkwụ gị kọọ ụkọ n’ụlọ ndị ọzọ? (Ilu 25:17)

16. Dị ka Pita si kwuo, olee akụkụ ahụ́ nke anyị na-aghaghị ịchịkwa iji nweta ihu ọma Jehova? (1 Pita 3:10-12)

17. Olee anụmanụ a na-eji achụ àjà mgbe a na-eme ndị si n’agbụrụ Erọn ndị nchụàjà? (Levitikọs 8:22-28)

18. N’ihi gịnị ka Chineke ji machibido ndị Izrel iwu igbu egbugbu n’ahụ́ ha? (Levitikọs 19:28)

19. Olee aha Jekọb nyere ebe ahụ ya na Leban nọ gbaa ndụ udo? (Jenesis 31:43-53)

20. Olee ọrụ ebube mbụ Jizọs rụrụ? (Jọn 2:7-11)

Azịza Nye Ajụjụ

1. Mkpụrụ mbụ nile nke ala ubi

2. Gọg

3. Filiks, onye ọchịchị Judia

4. “Onye rụrụ arụ, onye rụrụ arụ!”

5. O guzoro ogidi ọtọ n’elu ya

6. Ha ekwesịghị ntụkwasị obi nye ọgbụgba ndụ ya na ha gbara

7. “Nke ụwa, nke anụ ahụ́, nke ndị mmụọ ọjọọ”

8. Almug

9. Hazael ịbụ eze Siria, Jihu ịbụ eze Izrel, na Ịlaịsha ịbụ onye amụma ga-anọchi ya

10. Amaraịa

11. Iji zụlite “nsọpụrụ Chineke”

12. Neko

13. Ịbụ onye ikpe ọmụma ọbara mara

14. “Anụ ufe”

15. Ka ihe gị wee ghara iju ha afọ, ha wee kpọọ gị asị

16. Ire

17. Ebulu

18. Iji doo ha iche n’ebe mba ndị ọzọ nọ na iji mee ka ha ghọta na ọ dị mkpa ịkwanyere ahụ́ mmadụ ùgwù nke ọma dị ka ihe Chineke kere eke, nke a ga-eji na-enye ya nsọpụrụ

19. Galeed (nke e mesịrị mara dị ka Gilead)

20. Ime ka mmiri ghọọ mmanya